Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Mara M Ikpe Ugboro Abụọ Ịrụ Ọrụ Ahụhụ Ruo Afọ 25

A Mara M Ikpe Ugboro Abụọ Ịrụ Ọrụ Ahụhụ Ruo Afọ 25

A Mara M Ikpe Ugboro Abụọ Ịrụ Ọrụ Ahụhụ Ruo Afọ 25

DỊ KA EFREM PLATON SI KỌỌ

Ná ngwụsị afọ 1951, a mara m ikpe nke ugboro abụọ ịrụ ọrụ ahụhụ ruo afọ 25. Na nke a, a kpọgara m n’otu ogige ọrụ ahụhụ nwere aha ọjọọ nke ndị Soviet guzobere na Vorkuta, nke dị n’Ógbè Arctic. Ka m kọọrọ gị otú m si gaa ebe ahụ na otú m si lagbụrụ ọnwụ ike.

A MỤRỤ M na July 16, 1920, n’ezinụlọ dara ogbenye nke bi na Bessarabia, bụ́ obodo dị n’ebe a na-akpọzi Republic of Moldova. Papa m nwụrụ obere oge tupu a mụọ m, mama m nwụkwara mgbe m dị afọ anọ. Nke a mere ka anyị bụ́ ụmụaka isii ha mụrụ ghọzie ndị na-enweghị nne na nna. Ana m ekele ụmụnne m ndị nke nwoke tọrọ m, bụ́ ndị ghọọrọ anyị bụ́ ndị nke obere nne na nna.

Mgbe m bụ nwa okorobịa, enwere m nnọọ mmasị n’ihe ndị metụtara okpukpe, ana m esokwa eme ihe ndị a na-eme na Chọọchị Ọtọdọks dị n’obodo anyị. Otú ọ dị, ka oge na-aga, chọọchị ahụ, karịsịa ndị ụkọchukwu ya, emeghị ihe m tụrụ anya n’aka ha, n’ihi na ha nọ na-agọzi ndị agha nke mba dị iche iche n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ nke malitere na September 1939.

Agha dara n’etiti ndị Romania na ndị Soviet Union ná mmalite afọ ndị 1940, ọ kpụkwara ọkụ n’ọnụ na Bessarabia. Obodo Bessarabia bịara banyeghachi n’aka Ọchịagha bụ́ Ion Antonescu, onye na-achị Romania mgbe ahụ. Gọọmenti malitere inye ụmụ nwoke ndị dị site afọ 20 gbagowe ọzụzụ ịghọ ndị agha. Eso m ná ndị a họọrọ maka ọzụzụ a. E nyere anyị ọzụzụ a na Boroşeni, bụ́ ebe na-adịghị anya site n’ebe mụ na nwunye m, bụ́ Olga, bi.

Ịnata Eziokwu Bible

Otu ụbọchị n’oge anyị nọ na-anara ọzụzụ ahụ, ka anyị nọ na-ezu ike n’ehihie, ahụrụ m ebe ụmụ nwoke ole na ole zukọtara ma na-akpa nkata na-atọ ha ụtọ; n’oge na-adịghị anya, achọpụtara m na ha bụ Ndịàmà Jehova. Mụ na ha kparịtara ruo obere oge, nke a mekwara ka mụ na ha nwekwuo mkparịta ụka ndị ọzọ. Ka oge na-aga, obi tọrọ m nnọọ ụtọ ịmata na achọtala m eziokwu Bible, akụzikwaara m ya Olga na ndị mụrụ ya.

Mkparịta ụka dọọrọ mmasị m n’ụbọchị ahụ bụ banyere nnọpụiche. Ndịàmà ahụ kpebiri n’oge ahụ na ọ dị ha mkpa ime ka a mara ebe ha kwụ n’okwu ahụ. Mkpebi ha bụ iso nara ọzụzụ ahụ ma ha agaghị aṅụ iyi ịkwado agha, nke bụ́ ihe a chọrọ n’aka ndị ga-aghọ ndị agha.

Agwara m Olga na ndị mụrụ ya na achọrọ m iso jụ ịṅụ iyi ahụ, ha kwadokwara mkpebi m. Ụbọchị a ga-ewe ndị mmadụ n’agha—January 24, 1943—nke bụ́kwa ụbọchị a ga-aṅụ iyi ahụ, mesịrị ruo. N’ụbọchị ahụ, anyị asatọ garuru ndị ụkọchukwu na-ewe ndị mmadụ n’agha nso. Kama ịṅụ iyi ahụ, anyị kwuru na anyị agaghị eso lụọ agha n’ihi na anyị nọpụrụ iche.

E jidere anyị ma kpọga anyị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị na Boroşeni. Ha kụtaara anyị isi aba okpu ebe ahụ nke na o siiiri nwunye m ike ịmata m mgbe ọ hụrụ m. Ha kpọfeziri anyị na Chişinău (ebe a na-akpọbu Kishinev), nke bụ́ obodo a kasị mara amara ná mba ahụ, ka anyị wee wụchaa n’ụlọikpe ndị agha.

Anyị ji ụkwụ gaa ihe dị ka otu narị kilomita na iri anọ, bụ́ nke were anyị ụbọchị 21 n’ihi oké oyi na-atụ n’oge ahụ. Ndị soja bú égbè ji ágbụ̀ ígwè kekọta anyị asatọ ọnụ ma kpụrụ anyị na-aga, n’enyeghị anyị ma nri ma mmiri. N’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ọ bụla anyị rutere, a na-akụ anyị ihe. Tupu anyị eruo ebe anyị na-aga, ụlọ ọrụ ndị uwe ojii anyị kwụsịrị na ha dị 13! Anyị anwụghị n’ihi na n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ndị ahụ anyị kwụsịrị iji hie ụra, ndị obodo ahụ nyere anyị nri na mmiri. Obiọma ha gosiri anyị mere ka anyị mara na Chineke na-elekọta anyị.

E Mere Ka Anyị Guzosie Ike n’Agbanyeghị Nkụda Mmụọ

Mgbe anyị asatọ nọ n’ụlọ mkpọrọ na Chişinău na-echere ka e kpee anyị ikpe, e mekpọrọ anyị ọnụ ọzọ. Ná mgbalị ha iji mee ka anyị gọnahụ okwukwe anyị, ndị ọchịchị gwara anyị na Ndịàmà nọ na Zăicani, bụ́ obodo nta dị n’ebe ugwu Moldova, agọnahụla okwukwe ha, nakwa na a hapụla ha ka ha laghachi n’ụlọ ha. Anyị mesịrị chọpụta na nanị ihe e mere bụ ịgwa ha ka laa n’ụlọ gaa chere mgbe a ga-ekpe ha ikpe. Ọzọkwa, otu onye uwe ojii gwara anyị na otu akwụkwọ akụkọ kwuru na ụlọikpe ndị agha dị na Ukraine amaala Ndịàmà 80 ikpe ọnwụ.

Ụfọdụ n’ime anyị asatọ malitere inwe nkụda mmụọ, na-eche na ha agaghịzi ahụ ụmụ ha. E kwere anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị agọnahụ okwukwe anyị, na a ga-atọhapụ anyị. E nyere anyị nile otu izu ịga nọnyere ndị ezinụlọ anyị ma chebara ọdịnihu anyị echiche. Mgbe nke ahụ gasịrị, nanị mmadụ atọ n’ime anyị ka kpebisiri ike ịnọpụ iche.

Na February 20, 1943, a kpọgaghachiri m n’otu ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ahụ dị na Boroşeni, bụ́ ebe a nọbu kụọ m ihe tinka kụrụ pan. Ahụrụ m Ndịàmà ibe m abụọ ahụ nọgidesiri ike ná mkpebi ha. Anyị nwere obi ụtọ dị ukwuu ịhụ onwe anyị ọzọ! Ka e mesịrị, e ji ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ buga anyị Bălţi. Mgbe anyị na-aga n’ụzọ, adara m ọrịa nke mesịrị ghọọrọ anyị ngọzi n’ihi na ọ bụ bọs buruziri anyị Chişinău.

Mgbe anyị rutere, ndị nche matara na ọ bụ anyị bụ mmadụ atọ ahụ nọgidesiri ike n’ihe anyị kpebiri. N’ihi ya, ha ji ịkụ ihe sị anyị nnọọnụ. Otu ọnwa mgbe nke a gasịrị, a mara anyị ikpe ịrụ ọrụ ahụhụ ruo afọ 25 n’otu ogige ọrụ ahụhụ dị na Romania.

E Mere M Baptizim n’Otu Olulu Bọmbụ Gwuru

Mgbe e mesịrị, e zigara anyị Cugir, nke dị na Romania, bụ́ ebe e nyere anyị ọrụ igbutu osisi n’oké ọhịa. Ọ na-abụ anyị rụchaa ọrụ ụfọdụ e nyere anyị, nri a ga-ekenye anyị ebukwuo ibu. Ma mụ ma Ndịàmà itoolu mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-arụ ka jakị, n’ihi ya, anyị na-eriju afọ n’ebe ahụ karịa ka anyị na-eri mgbe anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ.

Na 1944, ndị agha United States malitere ịtụ bọmbụ n’ebe dị nso n’ogige ọrụ ahụhụ anyị nọ na ya. Otu ụbọchị, bọmbụ ha tụrụ gwuru olulu n’akụkụ otu mmiri iyi dị n’ebe ahụ. Mmiri malitere ịsọnye n’olulu ahụ, n’oge na-adịghịkwa anya, mmiri sọnyere n’olulu ahụ bịara buo ibu. Na September 1944, e mere m baptizim n’ime olulu ahụ, nke bụ́ ihe àmà nke nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke ihe karịrị otu afọ na ọkara gara aga.

E Mesịa Tọhapụ M!

Izu ole na ole ka e mesịrị, ndị agha Russia tọhapụrụ ọtụtụ narị Ndịàmà n’ógbè ahụ nile, nke a mekwara ka anyị nwee ike ịlaghachi n’ụlọ anyị. Mgbe ahụ bụ oge mbụ m hụrụ nwa m nwoke bụ́ Vasile, nke a mụrụ na 1943 mgbe m nọ n’ogige ọrụ ahụhụ.

Obere oge tupu Agha Ụwa nke Abụọ ebie na Europe na May 1945, Bessarabia abanyela n’aka ndị Soviet Union wee ghọzie Moldavian Soviet Socialist Republic. Ndị ọchịchị amaliteghị ozugbo ahụ megidewe ọrụ Ndị Kraịst anyị na-arụ. Otú ọ dị, ha chọpụtara na anyị atụghị vootu, ndị ọchịchị Soviet wekwaara ya na iwu anyị dara abụghị obere iwu.

Na 1946, anyị mụrụ nwa anyị nwoke nke abụọ bụ́ Pavel, na 1947 kwa, anyị mụrụ ada anyị bụ́ Maria. Otú anyị si bikọọ ọnụ dị ka ezinụlọ tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu. Ma mgbe ihe dị ka afọ abụọ gasịrị, ọdachi dakwasịrị anyị. Nwa anyị nwanyị bụ́ Maria dara ọrịa ma nwụọ n’ike. E liri ya na July 5, 1949. Ma nke ahụ ka bụ nanị mmalite nke ahụhụ anyị tara.

A Chụga Anyị Siberia

N’isi isi ụtụtụ echi ya, nke ka bụ́ awa ole na ole anyị lisịrị Maria, ndị soja atọ kpọtere anyị n’ụra. Ha gwara anyị na a ga-achụga anyị obodo ọzọ n’ihi na ‘omume anyị na-emegide ọchịchị Soviet.’ Ha kwere ka anyị were obere nri na uwe ole na ole. N’ụbọchị ahụ bụ́ July 6, 1949, e buuru anyị gaa Kurgan, nke dị na Siberia, n’ebe ugwu Kazakhstan. Ebe a dị ihe dị ka puku kilomita anọ site n’ebe anyị bi.

Njem ahụ were ụbọchị 18. E bu anyị n’ụgbọ okporo ígwè dị ka à ga-asị na anyị bụ ehi. Nanị ugboro abụọ ka e nyere anyị nri n’ụzọ. Anyị ji nwayọọ nwayọọ na-eri ihe ndị anyị ji ka o wee zuoro anyị ogologo oge anyị mere njem ahụ. Ndị nile nọ n’ụgbọ okporo ígwè ahụ bụcha Ndịàmà Jehova. Okwu ndị dabeere na Bible, bụ́ ndị anyị kwurịtara ọtụtụ ugboro, mere ka anyị nọgide na-agbasi ike n’ụzọ ime mmụọ. Ihe kasị dị oké ọnụ ahịa anyị ji bụ Akwụkwọ Nsọ.

Mgbe anyị mesịrị rute Kurgan, anyị chọpụtara na ọ bụ ezie na anyị bi n’ogige ọrụ ahụhụ, anyị nwetụụrụ onwe anyị ime mkpagharị. Arụrụ m ọrụ n’ebe a na-akpụ ụzụ́, ana m agwakwa ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ banyere olileanya m nke dabeere na Bible. Mgbe afọ abụọ gasịrị, na September 27, 1951, e jidere m ma kpụpụ m ụlọikpe ọzọ. Ndị gbara m akwụkwọ kpọtara mmadụ 18 bụ́ ndị kwuru na m buru amụma na a ga-ebibi ọchịchị ha. N’ezie, o nweela mgbe m ji amụma dị na Daniel 2:44 kọwaa na a ga-eji Alaeze Chineke dochie ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ.

Tụkwasị na nke ahụ, ndị ọchịchị abịala n’ụlọ anyị ma chọta otu magazin Ụlọ Nche nke e si Moldova zobata. Ihe ndị ọchịchị na-ahụkarị ma ha bịa ịchọ ihe bụ magazin ndị e ji aka dee ma ọ bụ ndị e biri n’ógbè ahụ. Otú ọ dị, nke a bụ nke e biri n’ebe na-abụghị Soviet Union. N’ihi ya, a mara m ikpe ịrụ ọrụ ahụhụ ruo afọ 25 nke ugboro abụọ. Na nke ugbu a, e zigara m ịga rụọ ọrụ n’ebe a na-egwupụta coal na Vorkuta, bụ́ ogige ọrụ ahụhụ nwere aha ọjọọ, bụ́ nke dị n’ebe Ugwu Ural sọtụrụ n’ebe ugwu, n’Ógbè Arctic.

Alagbụụrụ M Ọnwụ na Vorkuta

Vorkuta bụ nnukwu ụlọ mkpọrọ nwere ogige ọrụ ahụhụ 60. Nanị n’ogige anyị, e nwere ihe karịrị puku ndị ọrụ isii. Nnukwu oyi na-atụ n’ebe ahụ, ọnọdụ ndị na-eme ka ibi ndụ sie ike, na ọnụnọ a na-anọ n’ime ala egwu coal socha n’ihe ndị tara isi ọtụtụ mmadụ. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-enwe ozu ndị a ga-eli eli kwa ụbọchị. Ọrịa malitere ịrịasi m ike nke na enweghịzi m ike ịrụ ọrụ siri ike. E kenyere m ọrụ a sịrị na ọ bụ ọrụ na-esighị ike, nke bụ́ iji shọvel ekunye coal n’ụgbọ okporo ígwè.

Ihe bịara ka nnọọ njọ na Vorkuta nke na ndị na-egwu coal bịara fanye aka n’ụkwụ, ma nfanye aka n’ụkwụ ahụ mechaziri ghọọ ọgba aghara. Ha họpụtaara onwe ha ndị isi, ma nwee ihe dị ka otu narị mmadụ na iri ise ga-alụrụ ha ọgụ ma ndị agha gọọmenti bịa. Ha chọrọ ka mụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Ndịàmà 30 ọzọ soro ná ndị ga-alụrụ ha ọgụ. Ma anyị ekweghị.

Ha kpara aghara ahụ ruo izu abụọ bụ́ mgbe ndị agha gọọmenti bịara ma gbagbusịa ndị nnupụisi ahụ nile. A gwara anyị na ndị nnupụisi ahụ mere atụmatụ ịkwụgbu anyị n’elu osisi kpọmkwem n’ebe ahụ anyị na-arụ ọrụ! Obi dị anyị ụtọ na atụmatụ ha kụrụ afọ n’ala. Ị tụlee ụzọ dị iche iche ndị Soviet si chọọ ime ka anyị gọnahụ okwukwe anyị, i nwere ike ịghọta ihe mere anyị ji sị na ọ bụ Chineke ukwu anyị, bụ́ Jehova, mere anyị ji lagbụrụ ọnwụ!

Iji Oge M Nwekwuuru Onwe M Mee Ihe n’Ụzọ Zuru Ezu

Ọnwụ Stalin na March 1953 mere ka ihe dịkwuoro anyị mma. Na 1955, a tọhapụrụ m na Vorkuta ma kwe ka m lakwuru ezinụlọ m, bụ́ ndị ka bi n’ogige ahụ dị n’oké ọhịa na Kurgan. Anyị nọgidere na-ekwusara ndị ebe ahụ banyere olileanya anyị dị ebube.

Ka ọ na-erule afọ 1961, anyị bịara nwee ọchịchọ ịkwaga n’ókèala ọhụrụ anyị ga na-ekwusa ozi ọma. Ya mere, anyị degaara onyeisi ala ahụ, bụ́ Nikita Khrushchev, akwụkwọ ozi, ma rịọ ya ka o kwe ka anyị kwaga ebe ọzọ, ebe ọ bụ na ọ dịghị ụlọ akwụkwọ dị ebe a maka ụmụ anyị—nke bụ́kwanụ eziokwu. E kwere ka anyị kwaga n’otu obere obodo bụ́ Makushino, bụ́ ebe e nwekwara ogige ọrụ ahụhụ. Lee nnọọ obi ụtọ anyị nwere inyere nnukwu ezinụlọ anọ bi ebe ahụ aka ịghọ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye!

N’ikpeazụ, n’afọ 1965, a tọhapụrụ m n’ogige a. Ọ bụ ezie na e kwebeghị ka anyị laghachi Moldova n’oge ahụ, e kwere ka anyị kwaga obodo ọ bụla dị na Soviet Union. N’afọ na-eso ya, anyị kwagara Qostanay (bụ́ ebe a na-akpọbu Kustanai), nke dị na Kazakhstan, bụ́ ebe Ndịàmà nwere ọgbakọ abụọ. Ebe ọ bụ na e ziela ozi ọma n’ókèala a nile, mgbe anyị nọsịrị afọ atọ ebe ahụ, anyị kwagara Chirchik, nke dị na Uzbekistan. N’oge ahụ, ụmụ anyị bụ́ Vasile na Pavel alụchaala nwanyị. Ya mere, anyị lekwasịrị anya n’ọganihu ime mmụọ nke ụmụ anyị ndị fọdụrụnụ—Dumitru, nke dị afọ 10, na Liuba, nke dị afọ 7.

Anyị biri na Uzbekistan ruo afọ iri, bụ́ oge anyị nyekwaara ndị ọzọ aka ịbịa mara Jehova. Na 1979, anyị kwagara n’obodo Krasnodar, nke dị nso n’Oké Osimiri Ojii, n’ebe ndịda Russia. Ebe a dị ihe dị ka otu puku kilomita na narị isii site n’Uzbekistan. N’ebe ahụ, mụ na Olga rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile ruo afọ abụọ, anyị nyekwaara ndị ọzọ aka ịghọ Ndịàmà.

Ịlaghachi Moldova

N’ikpeazụ, n’oge ọkọchị nke afọ 1989—afọ 40 a chụgasịrị anyị Siberia—anyị kpebiri ịlaghachi n’obodo anyị bụ́ Moldova. Ozugbo ahụ, anyị maliteghachiri ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ ma rụgide ya ruo afọ 1993. N’ebe ahụ, anyị nyeere ihe karịrị mmadụ 30 aka ịghọ Ndịàmà Jehova na-ejechi ozi anya. Ọṅụ na-eju m obi mgbe ọ bụla m chetara otú Jehova sirila gọzie ezinụlọ anyị! Ma, ọ dị mwute ikwu na nwunye m m hụrụ n’anya nwụrụ na May 2004.

N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụụrụ m ihe nkasi obi na ụmụ anọ anyị, tinyere ụmụ ụmụ anyị dị 14 na ụmụ ụmụ ụmụ anyị dị 18, na-ejechara Jehova ozi. N’ezie, anyị tara ahụhụ ná ndụ, ma lee ka o si magbuo onwe ya ịmara na Jehova nyeere anyị aka ịnọgide na-ekwesịrị ya ntụkwasị obi n’oge ndị anyị nọ n’ọnwụnwa!

Ugbu a m mekwurula agadi, ọrịa na nká emeela ka òkè m na-ekere n’ozi ubi belata. N’agbanyeghị nke ahụ, ana m eme ike m nile. Amụtala m na n’agbanyeghị ihe isi ike ndị anyị pụrụ inwe ná ndụ, Jehova nọ ya mgbe nile inye anyị ume na agbamume dị anyị mkpa. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 42 Efrem Platon nwụrụ na July 28, 2005, mgbe a ka na-akwadebe ibipụta isiokwu a.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ndịàmà Jehova nọ n’ogige ọrụ ahụhụ dị na Vorkuta

[Foto dị na peeji nke 27]

Mụ na Olga n’afọ 2002