Ebee Ka Ụwa A Na-eche Ihu?
Ebee Ka Ụwa A Na-eche Ihu?
OLEE ihe ọdịnihu ga-adị ka ya n’afọ 10, 20, ma ọ bụ afọ 30 na-abịa abịa? N’ụwa taa nke ndị na-eyi ọha egwu na-akpa ike na ya, mmadụ ichewe ihe ọdịnihu ga-adị ka ya pụrụ ịbụ ihe na-emenye ụjọ. A na-enwe ọganihu na nkà na ụzụ. Ahịa mba ụwa na-azụkọ ọnụ emeela ka ọtụtụ mba na-adabere n’ebe ibe ha nọ. Ndị ọchịchị ụwa hà ga-ejikọ aka ma mee ka ọdịnihu ka mma? Ụfọdụ sị na azịza ya bụ ee. Ndị dị otú a na-enwe olileanya na, tupu afọ 2015, ndị ọchịchị ga-akwụsịli ịda ogbenye na agụụ, mee ka ndị mmadụ kwụsị ibute ọrịa AIDS, meekwa ka ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị ezigbo mmiri ọṅụṅụ na ụzọ dị mma e si ekpofu ahịhịa jiri ọkara belata.—Lee igbe bụ́ “Iji Ihe Ndị A Tụrụ Anya Ime Tụnyere Ihe Ndị Na-eme Eme.”
Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ọdịnihu anaghị adị otú ụmụ mmadụ tụrụ anya ya. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ iri afọ gara aga, otu ọkachamara kwuru na ka ọ na-erule afọ 1984, ndị ọrụ ugbo ga-eji traktọ nke na-akọ ihe n’ala ala mmiri kọọ ugbo n’oké osimiri; onye ọkachamara ọzọ ekwuo na ka ọ na-erule afọ 1995, ụgbọala ga-enwe kọmputa nke ga-eme ka ụgbọala na ibe ya ghara ịdị na-akụkọta; ọkachamara ọzọ ekwuokwa na ka ọ na-erule afọ 2000, ihe dị ka iri puku mmadụ ise ga-ebi ma na-arụ ọrụ na mbara igwe. N’ezie, ma eleghị anya, ndị buru amụma ndị ahụ na-akwa ụta na a sịkwa na ha ma, ha emechie ọnụ. Otu onye nta akụkọ dere, sị: “Ihe kasị eme ka ndị kasị mara ihe n’ụwa yie nnọọ ndị nzuzu bụ ichere ka oge gafee.”
“Map” nke Ga-eduzi Anyị
Ihe ndị mmadụ na-ekwu na ha ga-eme n’ọdịnihu karịrị akarị, ma mgbe ụfọdụ, ihe ndị ahụ ha na-ekwu na-abụ ihe ha bu n’obi kama ịbụ ihe ga-eme eme. Olee otú anyị pụrụ isi mara ihe ọdịnihu ga-abụ n’ezie?
Tụlee otu ihe atụ. Were ya na ị nọ n’ime bọs na-agba n’obodo na-abụghị nke gị. Ebe ọ bụ na ị machaghị ebe ahụ, obi amalite ikoro gị n’elu. Gị ana-eche n’ime obi gị, sị, ‘Oleekwanụ ebe m nọ ihe a bikonụ? Ọ̀ bụ ebe m chọrọ ịga ka bọs a na-aga ihe a? Ebe m na-aga ọ̀ ka tere aka?’ Site n’ile anya n’ezigbo map na ilepụ anya na windo iji gụọ saịn bọọdụ ndị dị n’akụkụ ụzọ, ị pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị ahụ dị gị n’obi.
Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ ndị taa bụ́ ndị obi na-ekoro n’elu ma ha chewe banyere ọdịnihu. Ha na-eche n’obi ha, sị, ‘Olee ebe anyị na-aga aga? Ụzọ anyị nọ na ya ọ̀ bụ ụzọ na-eduga n’inwe udo zuru
ụwa ọnụ n’ezie? Ọ bụrụ na ọ bụ ya, olee mgbe anyị ga-eru ebe anyị na-aga?’ Bible dị ka map nke pụrụ inyere anyị aka inweta azịza nke ajụjụ ndị ahụ. Ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya na-agụ ya—ma na-elepụ anya na “windo,” dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iji mara ihe ndị na-eme n’ụwa—anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe banyere ebe anyị nọ na ebe anyị na-aga. Ma, ọ dị mkpa ka anyị burugodị ụzọ tụlee otú nsogbu anyị si malite.Mmalite Dị Nnọọ Mwute
Bible na-agwa anyị na nwoke na nwanyị mbụ zuru okè mgbe Chineke kere ha nakwa na o tinyere ha na paradaịs. E kere Adam na Iv ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi—ọ bụghị ruo nanị afọ 70 ma ọ bụ 80. Chineke gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” Nzube Chineke bụ ka Adam, Iv, na ụmụ ha mee ka Paradaịs gbasaruo ebe nile n’ụwa.—Jenesis 1:28; 2:8, 15, 22.
Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi. N’ihi ya, ebe obibi ha bụ́ Paradaịs funahụrụ ha. Ọzọkwa, ahụ́ ha na uche ha malitere iji nwayọọ nwayọọ na-emebi n’akwụsịghị akwụsị. Ụbọchị ọ bụla gaferenụ, Adam na Iv ana-akpụdewe ụbọchị ọnwụ ha nso. N’ihi gịnị? N’ihi na site n’ịgbakụta Onye Okike ha azụ, ha mehiere, “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ [bụkwa] ọnwụ.”—Ndị Rom 6:23.
Adam na Iv mechara nwụọ, ma tupu ha anwụọ, ha mụtara ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị. Ụmụ ha ndị a hà nwere ike imezu nzube mbụ nke Chineke? Mbanụ, n’ihi na ha ketara ezughị okè nke nne ha na nna ha. N’ezie, ụmụ Adam nile, ma ndị nke biri ndụ n’ọgbọ ndị gara aga ma ndị nke bi n’ọgbọ a, ketachara mmehie na ọnwụ. Anyị sokwa keta ya. Bible na-ekwu, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ Ndị Rom 3:23; 5:12.
bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.”—Ịmata Kpọmkwem Ebe Anyị Nọ Ugbu A
Nnupụisi Adam na Iv mere ka ihe a kpọrọ mmadụ malite ogologo njem na-agwụ ike bụ́ nke ha ka nọ na ya ruo taa. Otú otu onye so dee Bible si kwuo ya bụ na ‘e doro ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ ihe efu.’ (Ndị Rom 8:20) Lee nnọọ otú nke ahụ si kọwaa nke ọma ụdị nsogbu ụmụ mmadụ nọ na ya! Leenụ, a bịa n’ime ụmụ Adam, e nwere ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị bụ́ ọkà n’ihe banyere sayensị, ndị nwere nkà n’ịgwọ ọrịa, na ndị ma nke a na-akọ n’ihe banyere nkà na ụzụ. Ma, ọ dịbeghị nke ọ bụla n’ime ha nwere ike iweta udo zuru ụwa ọnụ na ezi ahụ́ ike nke Chineke zubeere ụmụ mmadụ.
Nnupụisi Adam na Iv metụtara anyị nile n’otu n’otu. Dị ka ihe atụ, ọ̀ dị onye na-enwetụbeghị obi mgbawa n’ihi ịbụ onye e kpere ikpe na-ezighị ezi, ọ̀ dị onye ụjọ mpụ na-atụtụbeghị, onye na-amaghị otú ọrịa na-adịghị ala ala si akpata mwute, ma ọ bụ onye na-amaghị ụdị iru újú a na-enwe mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ? O yiri ka ọ̀ na-abụ mgbe ọ bụla obi rutụrụ anyị ala, ọdachi abịa tisasịa ihe nile. Ọbụna n’oge ndị obi dịtụ anyị mma, ndụ anyị dị nnọọ otú nna ochie bụ́ Job si kọwaa ya mgbe o kwuru, sị: “Mmadụ . . . , ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.”—Job 14:1.
Aịsaịa 55:10, 11) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na nke a ga-eme n’oge na-adịghị anya?
Ọ bụrụ na anyị atụlee otú anyị si malite, na ọnọdụ ọjọọ anyị nọ na ya ugbu a, ọ pụrụ iyi anyị ka ọdịnihu ọ̀ ga-ajọgbu onwe ya. Ma Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke agaghị ekwe ka ọnọdụ ndị dị otú ahụ dịgide ruo mgbe ebighị ebi. Nzube mbụ ya maka ụmụ mmadụ ga-emezu. (Dị ka Bible si kwuo, anyị nọ ugbu a n’oge siri ike obibi nke a kpọrọ ‘ụbọchị ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1) Okwu ahụ adịghị egosi ọgwụgwụ nke mbara ala anyị na ihe nile dị ndụ na ya. Kama nke ahụ, ihe ọ pụtara bụ “ngwụsị nke usoro ihe a,” ya bụ, ngwụsị nke ọnọdụ ndị na-eme ka anyị na-enwe mwute. (Matiu 24:3) Bible kọwara ihe ndị ga na-eme na àgwà ụmụ mmadụ ga na-akpa n’ụbọchị ikpeazụ. Lee ụfọdụ n’ime ha n’igbe dị na peeji nke 8, ma lepụzie anya na “windo,” dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iji hụ ihe ndị na-eme n’ụwa. Map anyị, bụ́ Bible, na-enyere anyị aka ịhụ na anyị nọ nnọọ nso n’ebe usoro ihe a sọtụrụ. Ma, gịnị ga-esochi?
Ihe Ọdịnihu Ga-abụ
Ozugbo Adam na Iv nupụrụ isi, Chineke malitere mewe ka a mara na ya na-ezube iguzobe otu Alaeze “nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Alaeze ahụ, nke a kụzierela ọtụtụ mmadụ ikpe ekpere banyere ya n’ekpere a na-akpọkarị Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ọtụtụ ngọzi.—Matiu 6:9, 10.
Alaeze Chineke abụghị echiche nkịtị na-edochaghị anya nke dị n’obi. Ọ bụ ọchịchị eluigwe dị adị, nke ga-akpakwa ike dị egwu n’ụwa. Tụlegodị ihe Chineke kwere nkwa iji Alaeze ya meere ụmụ mmadụ. Bible na-ekwu na Chineke ga-ebu ụzọ ‘bibie ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Gịnị ka ọ ga-emere ndị na-erubere ya isi? Okwu ya e dere ede na-ekwu na ọ “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Ò nwere mmadụ ga-emeli ihe ndị ahụ? Ọ bụ nanị Chineke nwere ike itinye anyị n’ọnọdụ ọ chọburu ka ihe a kpọrọ mmadụ nọrọ.
Olee otú ị pụrụ isi rite uru ná ngọzi ndị Alaeze Chineke ga-eweta? Jọn 17:3 na-ekwu, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ izi ihe n’ụwa nile, bụ́ nke na-enyere ndị mmadụ aka inweta ihe ọmụma ahụ. Ha na-eje ozi ha n’ihe dị ka narị ala abụọ na iri atọ, ha na-ebipụtakwa akwụkwọ ha n’ihe karịrị narị asụsụ anọ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịmụtakwu ihe, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ jiri adres nke kwesịrị ekwesị n’ime address ndị ahụ e depụtara na peeji nke 5 detara anyị akwụkwọ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
“Geenụ ntị, unu ndị na-asị, Taa ma ọ bụ echi ka anyị ga-aga obodo a, nọọkwa n’ebe ahụ otu afọ, zụọkwa ahịa, ritekwa uru: ma unu bụ ndị na-amataghị ihe ga-eme echi.”—Jems 4:13, 14, Union Igbo Version
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Bible na-akọwa na ọ bụ nwoke na nwanyị mbụ mụrụ anyị. N’ụzọ dị otú a, o mere ka anyị mara ebe anyị si. O mekwara ka anyị mara ebe anyị na-aga. Ma, iji ghọta ihe Bible na-agwa anyị, ọ dị anyị mkpa ịmụ ya nke ọma otú ahụ anyị ga-esi mụọ map
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]
Mgbe a na-ekwu banyere “mmehie,” ihe a na-ekwu bụ omume ọjọọ ma ọ bụ mmadụ inwe ọchịchọ ime ihe ọjọọ. A mụrụ anyị ná mmehie, nke a na-emetụtakwa omume anyị. “Ọ dịghị onye ezi omume n’ụwa, nke na-eme ezi ihe, na-adịghị emehiekwa.”—Eklisiastis 7:20
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]
Ọ bụrụ na i jiri ígwè photocopier mepụtaghachi ihe e dere n’akwụkwọ nwere ntụpọ, ntụpọ ahụ ga-agba n’akwụkwọ nile ahụ i mepụtaghachiri. Ebe anyị bụ ụmụ Adam—ndị e si n’ahụ́ ya mepụta, dị ka a pụrụ isi kwuo ya—anyị nwere ntụpọ mmehie n’ahụ́ anyị. Ọ bụ otu ntụpọ ahụ dị n’ahụ́ Adam, ya bụ, onye e si n’ahụ́ ya “mepụta” anyị
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]
Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Nke a na-eme ka a ghọta ihe mere mgbalị ụmụ mmadụ na-eme ịhụ na e nwere udo n’ụwa na-ejighị enwe isi. E keghị mmadụ “ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike” n’enwetaghị enyemaka Chineke
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]
Onye ọbụ abụ so dee Bible gwara Chineke, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) Dị ka oriọna, Bible na-enyere anyị aka iji amamihe mee ihe mgbe anyị nwere mkpebi ndị anyị ga-eme. Dị ka ‘ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị,’ ọ na-eme ka ìhè dị n’okporo ụzọ anyị na-eje ije na ya ka anyị wee nwee ike ịmata ihe ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-abụ
[Igbe dị na peeji nke 7]
IJI IHE NDỊ A TỤRỤ ANYA IME TỤNYERE IHE NDỊ NA-EME EME
Na September 2000, mba ndị so n’Òtù Mba Ndị Dị n’Otu ji otu olu kwuo ihe ndị ha tụrụ anya ime tupu afọ 2015. Ihe ndị na-esonụ so n’ihe ndị ha kwuru:
▪ Ịhụ na e mere ka ọnụ ọgụgụ ndị na-akpata ihe na-erughị otu dollar kwa ụbọchị nakwa ndị agụụ na-akpa aka ọjọọ jiri ọkara belata.
▪ Ịhụ na ụmụaka nile gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị.
▪ Ịhụ na a dịghị eji maka na mmadụ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị eleda ya anya n’ebe ọ bụla a na-akụzi ihe.
▪ Ịhụ na e ji ihe karịrị ọkara belata ọnụ ọgụgụ ụmụaka ndị na-adịghị eru afọ ise wee na-anwụ.
▪ Ịhụ na ọnụ ọgụgụ ndị nne na-anwụ mgbe ha na-amụ nwa ji pasent 75 belata.
▪ Ịhụ na a kwụsịrị mgbasa ọrịa AIDS na-agbasa ma malite ibelata otú ha si agbasa, tinyere ịhụ na a kwụsịrị ọrịa ọjọọ ndị ọzọ, dị ka ịba.
▪ Ịhụ na ọkara nke ndị na-adịghị enweta ezigbo mmiri ọṅụṅụ ga na-enwetazi ya.
Hà ga-emezuli ihe ndị a ha tụrụ anya ime? Mgbe ndị ọrụ ahụ́ ike si gburugburu ụwa tụlesịrị banyere ya n’afọ 2004, ha kwubiri na ihe ọ sọkwara sị tụwa anya na a ga-emezu, e kwesịrị ịghọta na ọganihu ndị a tụrụ anya ha abụghị ihe a na-ahụ n’ezie. Okwu mmalite nke akwụkwọ bụ́ State of the World 2005 na-akọ, sị: “Ịda ogbenye nọgidere na-eme ka a ghara ịdị na-enwe ọganihu n’ọtụtụ ebe. Ọrịa ndị dị ka ọrịa AIDS na-amụba n’ike n’ike, na-eme ka ọtụtụ mba nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị imerime ụmụ amaala ha ga-ebute ọrịa a. N’afọ ise gara aga, ihe dị ka nde ụmụaka iri abụọ nwụrụ n’ihi ọrịa ndị a ṅụtara na mmiri bụ́ ndị a gaara egbochiteli, ọtụtụ narị nde mmadụ na-enwekwa nsogbu kwa ụbọchị n’ihi ụkọ ezigbo mmiri ọṅụṅụ nakwa n’ihi enweghị usoro dị mma e si ekpofu ahịhịa.”
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
IHE ỤFỌDỤ E JI AMATA “ỤBỌCHỊ IKPEAZỤ”
Agha a na-alụtụbeghị ụdị ya.—Matiu 24:7; Mkpughe 6:4.
Ụkọ nri.—Matiu 24:7; Mkpughe 6:5, 6, 8.
Ọrịa na-efe efe.—Luk 21:11; Mkpughe 6:8.
Ịba ụba nke mmebi iwu.—Matiu 24:12.
Ibibi ụwa.—Mkpughe 11:18.
Oké ala ọma jijiji.—Luk 21:11
Oge pụrụ iche nke siri ike obibi.—2 Timoti 3:1.
Ịhụbiga ego n’anya ókè.—2 Timoti 3:2.
Ụmụ inupụrụ ndị mụrụ ha isi.—2 Timoti 3:2.
Enweghị obi mmadụ.—2 Timoti 3:3.
Ịhụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.—2 Timoti 3:4.
Enweghị njide onwe onye.—2 Timoti 3:3.
Enweghị ịhụnanya maka ezi ihe.—2 Timoti 3:3.
Achọghị ịma maka ọdachi ndị na-abịa n’ihu.—Matiu 24:39.
Ndị na-akwa emo ịjụ ịnabata ihe àmà ndị na-egosi na a nọ n’ụbọchị ikpeazụ.—2 Pita 3:3, 4.
Ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa nile.—Matiu 24:14.
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
© G.M.B. Akash/Panos Pictures
© Paul Lowe/Panos Pictures
[Foto dị na peeji nke 9]
E ji ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke mara Ndịàmà Jehova