Gịnị Mere M Ji Emerụ Onwe M Ahụ́?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Mere M Ji Emerụ Onwe M Ahụ́?
“Achapuru m aka m ruo n’ókè nke na a dụrụ ya adụ. N’oge ahụ, agwara m dọkịta na ọ bụ bọlb eletrik ka m ji chapuo ya, nke bụ́kwanụ eziokwu—ma agwaghị m ya na akpachapụrụ m anya chapuo ya.”—Sasha, ọ dị afọ 23.
“Ndị mụrụ m ahụla ebe ndị m merụrụ onwe m ahụ́, ma ndị nke ha na-ahụ bụ nanị ndị obere na ndị nke yiri ihe chihịara echihịa. . . . Mgbe ụfọdụ, ha na-ahụ ndị nke ha na-ahụbughị, n’ihi ya, ana m achọta ihe m ga-agwa ha iji gbara isi m. . . . Achọghị m ka ha mara.”— Ariel, ọ dị afọ 13.
“Anọwo m na-emerụ onwe m ahụ́ kemgbe m dị afọ 11. Ama m na Chineke ejighị ahụ́ mmadụ egwuri egwu, ma nke a adịghịdị egbochi m ime ya.” —Jennifer, ọ dị afọ 20.
Ị PỤRỤ ịma onye na-eme ka Sasha, Ariel, ma ọ bụ Jennifer. * Ọ pụrụ ịbụ nwa akwụkwọ ibe gị. Ọ pụrụ ịbụ onye nne ji gị na ya. Ọ pụrụ ịbụ gị onwe gị. Na United States nanị, a na-ekwu na ọtụtụ nde mmadụ—ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ntorobịa—na-akpachapụ anya eji ụzọ dịgasị iche iche emerụ onwe ha ahụ́. Ụzọ ndị dị ka ịchapu ahụ́ ha, ire onwe ha ọkụ, ichihịa ahụ́ ha, ma ọ bụ ịkpụcha akpụkpọ ahụ́ ha. *
Ọ̀ bụ eziokwu na ha na-akpachapụ anya emerụ onwe ha ahụ́? N’oge mbụ, ọtụtụ ndị ga-ewere ya na onye kpachapụrụ anya merụọ onwe ya ahụ́ mere ya n’ihi na ibe ya na-eme ya ma ọ bụ n’ihi na ọ nọ n’òtù nzuzo. Ma, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, a matala nnọọ ọtụtụ ihe banyere ahụ́ ndị mmadụ na-akpachapụ anya emerụ onwe ha. Ikekwe, ndị na-apụta ekwu na ha na-eme ya ebuwokwa ibu. Michael Hollander, bụ́ onyeisi nke ebe a na-anọ agwọ ndị dị otú a na United States, kwuru, sị: “Dọkịta ọ bụla na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ndị na-eme ya na-amụba amụba.”
Ahụ́ ndị mmadụ na-emerụ onwe ha adịkebeghị egbu ha, ma ihe ahụ ha na-eme dị ize ndụ. Were Beth dị ka ihe atụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ana m eji ágụbá emerụ onwe m ahụ́. E nyela m àkwà ugboro abụọ n’ụlọ ọgwụ. Otu ugboro, e buuru m banye n’ebe a na-ahụ maka ndị nọ n’ọnọdụ mberede n’ihi otú ahụ́ m merụrụ
onwe m si baa ime.” Dị ka ọ dị ọtụtụ ndị na-eme omume a, Beth emegidela ya ruo ugbu a o torurula ogo mmadụ. O kwuru, sị: “Anọwo m na-eme ya kemgbe m dị afọ 15, adịkwa m afọ 30 ugbu a.”Ọ̀ dị onye ị ma na-emerụ onwe ya ahụ́ ma ọ bụkwanụ gị onwe gị ị̀ na-eme ya? Ọ bụrụ na ị na-eme ya, obi amapụla gị. Enyemaka dị. Na Teta! na-eso nke a, anyị ga-atụle otú a pụrụ isi nyere ndị na-emerụ onwe ha ahụ́ aka. * Otú ọ dị, ọ ga-adị mma ibu ụzọ tụlee banyere ndị na-eme omume a na ihe mere ha ji eme ya.
E Nwere Ihe Dịgasị Iche Iche Na-akpata Ya
Ọ na-esi ike iwere ndị nile na-emerụ onwe ha ahụ́ dị ka ndị nsogbu ha bụ otu. Ụfọdụ si n’ezinụlọ na-enwe nsogbu; ndị ọzọ si n’ezinụlọ obi ụtọ, nke na-adịghị enwekarịkwa nsogbu. Ụfọdụ n’ime ha amaghị akwụkwọ, ebe ọtụtụ n’ime ha ma akwụkwọ nke ọma. Ọtụtụ mgbe, ndị na-emerụ onwe ha ahụ́ adịchaghị egosi na ha nwere nsogbu, ma ọ bụrụkwarị na ha gositụrụ ya egosi, n’ihi na onye na-ahụsi anya abụghị mgbe nile ka ị na-ahụ ya n’ihu ya. Bible na-ekwu, sị: “Ọbụna n’ọchị ka ihe na-egbu obi mgbu.”—Ilu 14:13.
E wezụgakwa nke ahụ, otú ahụ́ otu onye na-emerụ onwe ya na-aharu na-adị iche n’otú ahụ́ onye ọzọ na-emerụ onwe ya na-aharu. Dị ka ihe atụ, n’otu nnyocha e mere, a chọpụtara na ụfọdụ na-achapu ahụ́ ha nanị otu ugboro n’afọ, ebe ndị ọzọ na-achapu ahụ́ ha ihe dị ka ugboro abụọ n’ụbọchị. Ọ dị mma ịmara na ụmụ nwoke ndị na-emerụ onwe ha ahụ́ karịrị ole e cheburu na ha dị. Ma, ndị a chọpụtarala na ha kasị emerụ onwe ha ahụ́ bụ ụmụ agbọghọ.
N’agbanyeghị na e nwere ihe dịgasị iche iche mere ndị mmadụ ji emerụ onwe ha ahụ́, ụfọdụ ndị na-emerụ onwe ha ahụ́ yiri ka ha na-akpa otu ụdị àgwà. Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma, nke na-ekwu banyere ndị ntorobịa, kwuru, sị: “Ndị ntorobịa na-emerụ onwe ha ahụ́ na-ewerekarị onwe ha dị ka ndị na-adịghị ike, obi adịghị aka ha ịkọrọ ndị ọzọ ihe na-enye ha nsogbu n’obi, ọ na-adị ha ka à na-agbara ha ọsọ, ha na-abụ ndị ụjọ na-atụ, onwe ha adịghịkwa eju ha afọ.”
N’ezie, ụfọdụ pụrụ ikwu na ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla na-eto eto nke mgbanwe ndị ọ na-ahụ n’ahụ́ ya na-emenye ụjọ ma na-eme ka ahụ́ ghara iru ya ala. Ma, onye na-emerụ onwe ya ahụ́ na-aka egosipụta àgwà ndị a. Ike a ọ na-esiri ya ịkọrọ mmadụ ihe na-enye ya nsogbu n’obi na-eme ka nsogbu ndị ọ na-enwe n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, ma ọ bụ n’ebe obibi na-anyịgbu ya. Ọ naghị adị ya ka ọ̀ dị ihe a ga-eme iji kwụsị nsogbu ndị ahụ, n’ihi ya, ya ewerezie na ọ dịghị onye ọ pụrụ ịkọrọ banyere ha. Obi mgbawa ọ na-enwe adịghịkwa enye ya ọnụ okwu. N’ikpeazụ, ya achọpụta ihe ọ ga-eme: Site n’imerụ onwe ya ahụ́, ọ na-adị ya ka obi mgbawa ọ na-enwe ò belatatụla nakwa na ya pụrụ ịga n’ihu n’ihe ndị dịịrị ya ná ndụ—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, n’oge ahụ.
Gịnị mere onye a ji akpatara onwe ya ihe mgbu nkịtị iji mee ka obi mgbawa ọ na-enwe belata? Iji maa atụ, tụlee ihe na-eme mgbe ị gara na nke dọkịta ka a gbaa gị ọgwụ. Ọ̀ dịtụla ụbọchị ị chọpụtara na mgbe a chọrọ ịdụnye gị agịga n’ahụ́, na ị tụrụ onwe gị mbọ ma ọ bụ ikekwe tụgidesie ya ike iji mee ka ị ghara ịnụcha ụfụ agịga ahụ? Ihe onye na-emerụ onwe ya ahụ́ na-eme yiri nke ahụ, ọ bụ eziokwu na nke ya ka njọ. Onye na-emerụ onwe ya ahụ́ na-ewere ya na ịchapu onwe ya ahụ́ ga-eme ka obi ya pụtụ n’obi mgbawa ọ na-enwe ma mee ka ahụ́ rutụ ya ala. Obi mgbawa ahụ na-adị ukwuu nke na e jiri
ahụ́ mgbu nkịtị tụnyere ya, onye ahụ ga-ahọrọ ahụ́ mgbu nkịtị. Ikekwe, ọ bụ ya mere otu onye na-emerụ onwe ya ahụ́ ji kọwaa ahụ́ ọ na-achapu onwe ya dị ka ‘ọgwụ o ji agwọ ụjọ na-atụ ya.’“Ụzọ E Si Anagide Nchegbu”
Ndị na-amaghị banyere nsogbu a pụrụ ile onye na-emerụ onwe ya ahụ́ anya dị ka onye na-achọ igbu onwe ya. Ma nke ahụ abụchaghị eziokwu. Sabrina Solin Weill, bụ́ editọ ukwu nke otu magazin na-ekwu banyere ndị dị afọ iri na ụma, dere, sị: “N’ikwu ya n’ozuzu, ihe ndị a na-eme bụ nanị ịhụ na ihe mgbu ha kwụsịrị, ha adịghị achọ igbu onwe ha.” Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ ji kwuo na mmadụ imerụ onwe ya ahụ́ bụ “‘ihe na-echebe ndụ,’ ọ bụghị ihe na-egbu ndụ.” O kwukwara na omume ahụ bụ “ụzọ e si anagide nchegbu.” Olee ụdị nchegbu ọ bụ?
A chọpụtawo na ọtụtụ ndị na-emerụ onwe ha ahụ́ enwetụla ahụmahụ ndị na-agbawa obi. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na e megburu ha ma ọ bụ leghara ha anya mgbe ha ka bụ ụmụaka. Ndị ọzọ pụrụ ịbụ nsogbu ezinụlọ ma ọ bụ oké mmanya nne ha ma ọ bụ nna ha na-aṅụ mere ha ji emerụ onwe ha ahụ́. Ụfọdụ bụ isi ezuchaghị okè mere ha ji eme ya.
A pụrụ inwe nsogbu ndị ọzọ na-akpata ya. Dị ka ihe atụ, ihe e ji mara Sara bụ ịchọ imetecha ihe nile nke ọma. Ọ bụ eziokwu na o mewo mmehie ndị dị oké njọ ma nweta enyemaka n’aka ndị okenye ọgbakọ, ụdị obi amamikpe ọ na-enwe n’ihi ihe ndị ọ na-adịghị emeta nke ọma kwa ụbọchị enweghị atụ. Sara na-ekwu, sị, “Obi m na-agwa m na m kwesịrị ‘imesi onwe m ike.’ Eweere m ahụ́ m na-emerụ onwe m nanị dị ka ịdọ onwe m aka ná ntị. Ihe ndị m na-eme iji ‘dọọ onwe m aka ná ntị’ na-agụnye ịtụpụ ntutu isi m, ịchapu aka m, ịkụ onwe m ihe ma merụọ onwe m ezigbo ahụ́, nakwa itinye aka m na mmiri ọkụ, ịnọ n’èzí mgbe oké oyi na-atụ n’eyighị uwe oyi, ma ọ bụ ịkwụ agụụ ruo otu ụbọchị.”
A bịa na nke Sara, ahụ́ ọ na-emerụ onwe ya bụ ụzọ o si egosi na ya na-ewesa onwe ya iwe. O kwuru, sị, “Ana m ama mgbe ụfọdụ na Jehova agbagharala m mmehie m, ma achọghị m ka ọ gbaghara m. Achọrọ m ịta ahụhụ n’ihi na akpọrọ m onwe m asị nke ukwuu. N’agbanyeghị na m ma na Jehova enweghị ike ime ebe a na-ata mmadụ ahụhụ dị ka ọkụ ala mmụọ ndị Krisendọm, achọrọ m ka o mee otu maka m.”
“Oge Pụrụ Iche”
Ụfọdụ pụrụ ịnọ na-eche ihe mere ọ ka ji bụrụ na nso nso a ka a matara banyere omume a na-ewe ndị mmadụ iwe. Ma, ndị na-amụ Bible maara na ihe a bụ “oge pụrụ iche nke siri ike obibi.” (2 Timoti 3:1) N’ihi ya, ọ dịghị eju ha anya ịmata na ndị mmadụ—tinyere ndị ntorobịa—na-akpa àgwà ndị dị mgbagwoju anya.
Bible kwetara na “mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu.” (Eklisiastis 7:7) Ihe ịma aka mmadụ na-enwe n’oge uto—nakwa mgbe ụfọdụ, ahụmahụ ọjọọ o nwere ná ndụ—pụrụ ime ka ọ kpawa àgwà ọjọọ, nke gụnyere imerụ onwe ya ahụ́. Onye ntorobịa obi ya na-agwa na a na-agbara ya ọsọ nakwa na ọ dịghị onye ọ pụrụ ịkọsara nsogbu ya, pụrụ ịmalite ịchapu ahụ́ ya iji mee ka obi jụrụtụ ya. Ma, obi iru ala ọ bụla ọ pụrụ ịdị mmadụ ka ò nwetara site n’imerụ onwe ya ahụ́ anaghị adịte aka. E mesịa, nsogbu ahụ na-alọghachi, onye ahụ na-amalitekwa imerụ onwe ya ahụ́ ọzọ.
Dị ka a na-ahụkarị, ndị na-eme omume a na-achọ ịkwụsị ya, ma ọ na-esiri ha ezigbo ike. Olee otú ụfọdụ ndị siworo nwee ike ịkwụsị imerụ onwe ha ahụ́? A ga-atụle nke a n’isiokwu “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” nke bụ́ “Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Imerụ Onwe M Ahụ́?” nke ga-apụta na Teta! nke April-June 2006.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 A gbanwewo aha ụfọdụ dị n’isiokwu a.
^ par. 6 Mmadụ imerụ onwe ya ahụ́ dị iche na mmadụ ịkpọpu ahụ́ ya ma ọ bụ igbu egbugbu n’ahụ́ ya. A na-emekarị ndị nke ahụ iji chọọ mma, ọ dịkarịghị abụ n’ihi na ahụ́ mmadụ kpaliri ya ime ya. Lee Teta! nke August 8, 2000, peeji nke 22-23.
^ par. 9 Levitikọs 19:28 kwuru, sị: “Unu egbula egbugbu n’anụ ahụ́ unu n’ihi mkpụrụ obi mmadụ [“mkpụrụ obi nwụrụ anwụ,” NW].” Omenala ndị ọgọ mmụọ a—nke ihe àmà na-egosi na a na-eme ya iji mee ka obi jụrụ ndị bụ́ chi bụ́ ndị e weere na ha na-elekọta ndị nwụrụ anwụ—dị iche n’ụdị mmerụ ahụ́ a na-ekwu okwu ya ebe a.
IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Gịnị mere ụfọdụ ndị na-eto eto ji emerụ onwe ha ahụ́?
▪ Mgbe ị gụsịrị isiokwu a, ọ̀ dị ụzọ ndị ka mma i chetara ị pụrụ isi na-anagide ihe ndị na-enye gị nsogbu n’obi?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
“Ọbụna n’ọchị ka ihe na-egbu obi mgbu.”—Ilu 14:13
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
“N’ikwu ya n’ozuzu, ihe ndị a na-eme bụ nanị ịhụ na ihe mgbu ha kwụsịrị, ha adịghị achọ igbu onwe ha”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]
Anyị bi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.”—2 Timoti 3:1