Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Influenza—Ihe Anyị Maara Banyere Ya Ugbu a

Influenza—Ihe Anyị Maara Banyere Ya Ugbu a

Influenza—Ihe Anyị Maara Banyere Ya Ugbu a

Ọ BỤ n’afọ 1997. Otu onye ọkà mmụta sayensị nọdụrụ ala na Brevig, bụ́ obodo nta ndị Eskimo bi na ya, nke dị n’otu ebe dị larịị nke ice juru na ya, n’ebe a na-akpọ Seward Peninsula n’Alaska. N’ihu onye ọkà mmụta sayensị ahụ, e nwere ozu otu nwa agbọghọ nke ndị Eskimo anọ nyeere ya aka bọpụta n’ala ice ahụ. Ihe gburu nwa agbọghọ ahụ bụ influenza ahụ mere n’afọ 1918. Ebe a ka ozu ya tọgbọ kemgbe ahụ. Ice agbasiela ya.

Olee uru a na-aga irite n’inyocha ozu a ugbu a? Onye ọkà mmụta sayensị ahụ nwere olileanya na nje kpatara ahụ́ ọkụ ahụ ka dị n’akpa ume nwa agbọghọ ahụ nakwa na a pụrụ iji ụzọ ndị bụ́ ọkpọka e si achọpụta mkpụrụ ndụ wepụta ya ma mata banyere ya. Olee ihe mere ịmata banyere ya pụrụ iji baa uru? Iji zaa ajụjụ a, ọ dị anyị mkpa ịghọtatụkwu otú nje virus si akpa ike na ihe mere ha ji adị ize ndụ.

Nje Virus nke Pụrụ Igbu Mmadụ

Taa, anyị maara na ihe na-akpata influenza bụ nje virus nakwa na onye bu ya pụrụ ibunye ya mmadụ mgbe ọ kwara ụkwara, mgbe o zere uzere, na mgbe ọ na-ekwu okwu. * Nje a dị ebe nile n’ụwa, ọbụna n’ebe ndị anwụ na-achasi ike, bụ́ ebe ọ pụrụ ime mgbe ọ bụla n’afọ. N’Ebe Ugwu Ụwa, oge ahụ́ ọkụ a na-emekarị na-abụ site na November ruo March; n’Ebe Ndịda Ụwa, ọ na-abụkarị site n’April ruo September.

Nje na-akpata influenza ụdị nke A, bụ́ nke kasị dị ize ndụ n’ime nje ndị na-akpata ahụ́ ọkụ, na-epe nnọọ mpe ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ nje virus ndị ọzọ. Ọ na-adịkarị okirikiri, na-enwekwa ihe ndị gbara ahụ́ ya gburugburu. Nje a banye n’ahụ́ mmadụ, ọ na-amụ ụmụ ngwa ngwa nke na ọtụtụ mgbe, n’ime awa iri, ọ na-amụta ihe dị n’agbata otu narị puku na otu nde.

Otu ihe dị njọ e ji mara obere nje a bụ otú o si agbanwe ngwa ngwa. Ebe ọ bụ na nje a na-amụ ụmụ ngwa ngwa (karịa nnọọ nje na-akpata ọrịa AIDS), ọtụtụ n’ime ụmụ ọ na-amụ anaghị eyi ibe ha. Ụfọdụ na-adị nnọọ iche nke na ihe ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ adịghị achọpụta ha. Ọ bụ ya mere e ji enwe nje dịgasị iche iche na-akpata ahụ́ ọkụ kwa afọ. Nke a na-abụkwara ihe ahụ́ anyị ji alụso ọrịa ọgụ nsogbu. Ọ bụrụ na nje a agbanwee otú ọ chọrọ, ihe ahụ́ anyị ji alụso ọrịa ọgụ agaghị enwe ike ịlụso ya ọgụ, nke a pụkwara ime ka ọrịa nje ahụ ga-akpata ruo onye ọ bụla ahụ́.

Ọzọkwa, ụmụ anụmanụ na-ebukwa nje virus ndị na-akpata ahụ́ ọkụ. Ọ bụ ebe a ka ụmụ mmadụ nọ baa ná nsogbu. E kweere na nje virus ndị na-akpatara ọkụkọ na ọbọgwụ ọrịa pụrụ ibi n’ahụ́ ezì. Nje virus ndị ọzọ na-akpatara ụmụ mmadụ ọrịa pụkwara ibi n’ahụ́ otu ezì ahụ.

N’ihi ya, ọ bụrụ na ụdị nje virus abụọ a—nke na-akpatara anụmanụ ọrịa na nke na-akpatara mmadụ ọrịa—ebiri n’ahụ́ otu ezì, mkpụrụ ndụ nke nje abụọ ahụ pụrụ ịgwakọta ọnụ. Nje ha ga-amụta pụrụ ịbụ nje a na-ahụtụbeghị ụdị ya, bụ́ nke ahụ́ mmadụ na-agaghị alụsoli ọgụ. Ụfọdụ kweere na obodo ndị na-akpa anụ, bụ́ ebe ndị mmadụ na anụ ndị dị ka ọkụkọ na ezì na-ebikọ—dị ka a na-ahụkarị n’Eshia, dị ka ihe atụ—bụ ebe nje virus ndị ọhụrụ pụrụ isi pụta.

Gịnị Mere O Ji Kpaa Ike Dị Egwu?

Ajụjụ a na-ajụ bụ, Gịnị ka ọ pụrụ ịbụ ya mere nje ahụ pụtaranụ n’afọ 1918 ruo 1919 ji ghọọ nje na-eme ka oyi baa mmadụ n’ahụ́ ma taa isi ọtụtụ ndị na-eto eto? N’agbanyeghị na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime nje ahụ dị ndụ taa, ọ dịla anya ndị ọkà mmụta sayensị kweere na ọ bụrụ na ha enwetalie nke “ice” gbasirila agbasi, na ha nwere ike iwepụta RNA ya ndị na-emebibeghị ma chọpụta ihe mere nje a ji kpaa ụdị ike ahụ ọ kpara. N’ezie, ha emewo ya ruo n’ókè ụfọdụ.

Ozu ahụ a bọpụtara n’Alaska, bụ́ nke e kwuru banyere ya ná mmalite isiokwu a, emeela ka otu ìgwè ndị ọkà mmụta sayensị nwee ike ịchọpụta ọtụtụ n’ime ihe ndị mejupụtara nje kpatara influenza ahụ mere n’afọ 1918 ruo 1919 nakwa otú o si malite. Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtabeghị ihe mere ọrịa ahụ ji gbuo ndị mmadụ otú ahụ. Ọ dị ka nje a ò yiri otu nje virus nke na-akpatara ezì na ọkụkọ ahụ́ ọkụ.

Ọ̀ Pụrụ Ịlọghachi?

Dị ka ọtụtụ ndị ọkachamara si kwuo, ajụjụ abụghị ma nje ọjọọ ahụ ọ̀ ga-alọghachi kama ọ bụ olee mgbe ọ ga-alọghachi na ụzọ ọ ga-esi alọghachi. N’ezie, ụfọdụ na-atụ anya na a ga na-enwe influenza dịtụ njọ n’ime afọ 11 ọ bụla ma ọ bụ ihe dị ka ya, nakwa nke dị nnọọ njọ n’ihe dị ka afọ 30 ọ bụla. Dị ka atụmanya ha si dị, oge ọrịa ọzọ ga-ezu ụwa ọnụ kwesịrị ịkpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ eruola, gafee.

Akwụkwọ bụ́ Vaccine nke na-ekwu banyere ọgwụ na ahụ́ ike kọrọ n’afọ 2003, sị: “O ruola afọ 35 influenza ikpeazụ zuru ụwa ọnụ mere, nke kasị tee aka n’ime oge ndị e ji n’aka e dekọtụrụla na a nọrọ tupu ọrịa zuru ụwa ọnụ emeghachi bụ afọ 39.” Akwụkwọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Nje virus nke ga-egbu imerime mmadụ n’ọtụtụ ebe pụrụ isi China ma ọ bụ mba dị ya nso pụta, nje na-akpata influenza, bụ́ ndị si n’ahụ́ ụmụ anụmanụ, pụrụ iso na ya.”

N’akwụkwọ ahụ bụ́ Vaccine, e buru amụma banyere nje ahụ, sị: “Ọ ga-efesazu ụwa nile ngwa ngwa. A ga-enwe ya n’ụdị dịgasị iche iche. Nje ahụ ga-agbasa ma kpatara ndị nọ n’afọ ndụ nile ọrịa, ọ ga-etisasịkwa achụmnta ego na ihe ndị a na-eme n’obodo ná mba nile. Ọ ga-egbu ndị nọ n’ihe ka ọtụtụ n’afọ ndụ nile, ma ọ bụrụkwarị na ọ bụghị ha nile. O yighị ka ụlọ ọgwụ ndị dị ọbụna ná mba ndị bara ọgaranya hà ga-enwe ike ịnagide ọnụ ọgụgụ ndị ga na-abịa ka a gwọọ ha.”

Olee nnọọ otú ọnọdụ dị otú ahụ dịruru ná njọ? John M. Barry, bụ́ onye dere akwụkwọ bụ́ The Great Influenza, kwuru, sị: “Onye na-eyi ọha egwu nke ji ngwá agha nuklia na-abụrụ onye ọchịchị ọ bụla ihe iyi egwu. Na a ga-enwe influenza ọhụrụ nke ga-ezu ụwa ọnụ kwesịkwara ịbụ ihe iyi egwu.”

Olee Ọgwụ Ndị E Nwere?

Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ọ̀ bụ na e nwebeghị ọgwụ ndị na-agwọ ya?’ Azịza ya dị ụtọ ná ntị ma na-agbakakwa ntị. Ọgwụ nje ndị e mepụtarala pụrụ ime ka mmadụ ghara ịnwụ n’ihi ọrịa ndị na-esichaghị ike nje na-akpata ahụ́ ọkụ pụrụ ịkpata n’ahụ́ ya, e nwekwara ọgwụ ndị nke pụrụ igbu nje ụfọdụ na-akpata ahụ́ ọkụ. E nwere ọgwụ mgbochi ọrịa ndị pụrụ ime ka nje ndị a ghara ịbanye n’ahụ́ mmadụ ma a chọpụta ha nke ọma ma mepụta ọgwụ mgbochi ọrịa ndị a n’oge. Nke a bụ azịza ya nke dị ụtọ ná ntị. Oleekwanụ maka nke na-agbaka ntị?

Akụkọ ndị a kọrọla banyere ọgwụ e ji egbochi ahụ́ ọkụ adịtụghị atọ ọchị. À ga-ekwu ole ghara ibe ya? Ọ̀ bụ ọgwụ mgbochi ọrịa ahụ a gbara n’America iji ghara ibute ahụ́ ọkụ ezì n’afọ 1976 nke gawara igbu ọtụtụ mmadụ, ka ọ̀ bụ ụkọ ọgwụ mgbochi ọrịa nke kọrọ n’afọ 2004? Ọ bụ ezie na ndị ọkà mmụta sayensị enweela ọganihu dị ukwuu n’ịchọpụta ọgwụ e ji agwọ ọrịa kemgbe Agha Ụwa nke Mbụ, ndị dọkịta amabeghị ụzọ e si egbu nje virus ndị na-akpa ike.

N’ihi ya, ajụjụ na-egbu mmụọ a na-ajụ bụ: Ihe ahụ mere n’afọ 1918 ruo 1919 ọ̀ pụrụ imeghachi? Rịba ama ihe a e kwuru n’akwụkwọ e nwetara n’aka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Inyocha Ọgwụ na London. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “N’ụzọ ụfọdụ, ihe mere n’afọ 1918 ka na-eme: ndị na-esi otu mba aga n’ọzọ ebuola ibu n’ihi mmepụta e mepụtara ụgbọ njem dịgasị iche iche, e nwere ọtụtụ ebe a na-alụ agha bụ́ ebe ndị mmadụ na-adịghị eri nri ndị na-edozi ahụ́, bụ́kwa ebe a na-adịghị edebe ihe ọcha na ha, ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa amụbaala ruo ijeri isii na ọkara, ihe ka ọtụtụ n’ime ha bikwa n’obodo ukwu ndị ọtụtụ n’ime ha ruru nnọọ unyi n’ihi enweghị ụzọ dị mma e si ekpofu ahịhịa.”

Otu ọkachamara a na-akwanyere ùgwù na United States kwuru, sị: “N’ikwu ya n’ụzọ dị nkenke, afọ ọ bụla gaferenụ, anyị na-eru nso oge ọrịa ọzọ ga-ezu ụwa ọnụ ga-etiwapụ.” Ma, ihe a nile ọ̀ pụtara na ọdịnihu agatụghị adị mma, na olileanya adịghịdị? Mbanụ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Akwụkwọ bụ́ Viruses, Plagues, and History kwuru, sị: “Ọ bụ ndị Ịtali malitere iji okwu ahụ bụ́ influenza eme ihe n’ihe dị ka afọ 1500 maka ọrịa ndị e weere na ha si na kpakpando.”

[Foto dị na peeji nke 18]

Nje “virus” ndị ọhụrụ na-akpata ahụ́ ọkụ pụrụ ịmalite n’obodo ndị a na-akpa anụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

BAY ISMOYO/AFP/Getty Images

[Foto dị na peeji nke 18, 19]

Nje “virus” nke na-akpata influenza ụdị nke A

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Science Source/ Photo Researchers, Inc

[Foto dị na peeji nke 19]

Ndị ọkà mmụta enyochaala ihe ụfọdụ si n’ahụ́ nje ahụ kpara mkpamkpa n’afọ 1918 ruo 1919

[Ebe E Si Nweta Foto]

© TOUHIG SION/CORBIS SYGMA