Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ka Anyị Hụ n’Olulu Mmiri”

“Ka Anyị Hụ n’Olulu Mmiri”

“Ka Anyị Hụ n’Olulu Mmiri”

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA MOLDOVA

OTU nwanyị a na-alụ ọhụrụ ji nnọọ ụjọ na-ele anya ka a na-esete mmiri n’olulu mmiri ma na-awụsa ya n’okporo ụzọ. Ma ọchị pụrụ ya n’ọnụ mgbe nwoke ahụ na-alụ ya kuliri ya elu ma kuru ya gafee n’ebe ahụ a wụrụ mmiri. Ndị enyi na ndị ezinụlọ gbakọtara ikiri na ito di na nwunye ọhụrụ ahụ ka ha na-eme omenala a dịwara kemgbe ụwa. Ụdị agbamakwụkwọ a a na-adịkebeghị ahụ na-egosi nke ọma na n’obodo Moldova, ihe mere e ji egwu olulu mmiri n’obodo abụghị nanị iji na-esere mmiri na ya.

Moldova dị n’ebe ndịda nke ọwụwa anyanwụ Europe. Ya na Ukraine gbara n’ebe ugwu, n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’ebe ndịda, ebe ya na Romania gbara n’ebe ọdịda anyanwụ. Ọ dị ihe dị ka 34,000 kilomita n’akụkụ ya nile.

Ọ bụ ezie na e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ osimiri 3,100 na Moldova, oké ọkọchị na-emekarị ka osimiri ndị ahụ ghara ịdị na-enye mmadụ 4,300,000 bi ná mba ahụ mmiri ga-ezuru ha. Iji nwetakwuo mmiri, ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ ise nke mmiri e ji eme ihe ná mba ahụ bụ n’olulu mmiri ka e si enweta ya. A na-ekwu na e nwere ihe dị ka otu narị puku olulu mmiri ma ọ bụ narị puku abụọ n’ógbè Osimiri Prut si gafee na Moldova!

Olulu mmiri ndị e ji ihe ndị mara nnọọ mma kpuchie elu ha nọcha n’ebe ndị a pụrụ ịhụ ha nke ọma n’okporo ụzọ ndị dị na Moldova, ka ndị njem ike gwụrụ wee nwee ike ịhụ mmiri ha ga na-aṅụ mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ. N’ọtụtụ obodo nta ndị dị ná mba ahụ, olulu mmiri bụ ebe mmadụ pụrụ ịnọ hụ ndị enyi ya iji kparịta ihe ndị mere n’ụbọchị.

Ùgwù A Na-akwanyere Mmiri n’Ụzọ Omenala

Na Moldova, e nwere ọtụtụ ụzọ e si akwanyere mmiri dị n’olulu mmiri ùgwù. Dị ka ihe atụ, a naghị arụ ụlọ mposi n’akụkụ olulu mmiri ezinụlọ. Iji hụkwa na e metọghị mmiri dị n’olulu mmiri, e sete mmiri, a naghị awụghachi mmiri fọrọ n’ihe ahụ e ji sete ya, n’ime olulu mmiri ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ esete mmiri karịrị òkè ọ chọrọ, ọ ga-awụfu ya ma ọ bụ wụnye ya n’ite e debere n’akụkụ olulu mmiri ahụ. Ọzọkwa, a na-ele ịgbụ asọ n’akụkụ olulu mmiri anya dị ka àgwà ọjọọ. Ọbụna ịnọ n’akụkụ olulu mmiri arụrịta ụka bụ ihe megidere iwu ọdịnala!

Olulu mmiri na-eme ka ndị Moldova nwee ohere nke imekọ ihe ọnụ. Igwu olulu mmiri ọhụrụ abụghị ọrụ dịịrị otu onye, ndị obodo na-agbakọ aka egwu ya. A na-ewerekwa ya dị ka ihe dị mkpa ka ịrụ ụlọ ọhụrụ. A na-ahụ nke a n’okwu a a na-ekwukarị n’obodo ahụ, nke bụ́, Onye na-arụtalighị ụlọ, nke na-azụpụtalighị nwa nwoke, nke na-egwulighị olulu mmiri, nke na-akụlighị osisi, furu nnọọ ọhịa. E gwusịa olulu mmiri, a na-akpọ ndị nile so gwuo olulu ahụ ma meere ha oriri.

Nchegbu Ndị A Na-enwe n’Ihi Ihe Ndị Metụtara Gburugburu Ebe Obibi

N’ọtụtụ olulu mmiri ndị dị na Moldova, a na-enweta mmiri n’ebe dị n’agbata mita 5 na mita 12 n’ime ala. Ebe ọzọ a na-enweta mmiri bụ n’ebe dị n’agbata mita 150 na mita 250 n’ime ala. N’agbanyeghị ihe ndị obodo na-eme iji chebe mmiri ndị a, ihe mkpofu ndị si n’ụlọ ọrụ a na-emepụta ihe na kemikal ndị e ji kọọ ugbo emetọọla ọtụtụ olulu mmiri ndị dị na Moldova. Akwụkwọ Òtù Mba Ndị Dị n’Otu bipụtara na 1996 nke aha ya bụ Republic of Moldova Human Development Report na-ekwu na fatịlaịza na nje ndị na-akpata ọrịa emetọọla “ihe dị ka ụzọ atọ n’ụzọ ise nke olulu mmiri ndị dị na Moldova.” Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, mmiri a na-enweta n’olulu mmiri adịwala mma n’ihi na ọnụ ọgụgụ ụlọ ọrụ na-emepụta ihe na Moldova ebelatala, kemikal ndị na-abanye ná mmiri ndị dị n’ime ala n’ebe ahụ ebelatakwala.

Ị gaa Moldova, ọ dịghị mkpa na ị ga-awụsa mmiri n’ala ka gị na ndị mmadụ wee nwee mkparịta ụka dị mma. Ị pụdịrị ịnụ ihe ndị mere n’obodo mgbe ị nọ n’olulu mmiri na-aṅụ otu iko mmiri juru oyi. Nanị ihe a chọrọ bụ ka otu onye Moldova nwere omume ile ọbịa gwa gị ka gị na ya hụ n’olulu mmiri.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 28, 29]

ỌRỤ NKÀ E JI MARA OBODO AHỤ

Oleg bụ omenkà n’ihe gbasara ígwè, ọ nọwokwa na-emepụta ọmarịcha ígwè ndị e ji ekpuchi olulu mmiri kemgbe ọ pụtara n’ụlọ akwụkwọ. Oleg na-ekwu, sị, “Ana m eche na ọrụ nkà a anyị ji ígwè arụ dị anyị n’ọbara. Ná mmalite narị afọ gara aga ka nna nna m mụtara ọrụ a n’aka otu nwoke onye Juu. Nwoke a biiri n’otu ógbè ọtụtụ ndị Juu bi na ya n’otu obodo nta dịdewere obodo Lipcani, bụ́ nke nna nna m bibu na ya. Mgbe e gbukpọsịrị ndị Juu n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ndị omenkà ole na ole fọdụrụnụ abụghị ndị Juu. Ọ bụ mgbe ahụ ka nna m mụtara ọrụ ahụ, ọ bụkwa ya kụziiri m ọrụ a.”

Ọ bụrụ na Oleg achọọ ịchọ ihe e ji ekpuchi olulu mmiri mma site n’itinye ya ihe ịchọ mma ndị ahụ na-adị mgbagwoju anya, ọ na-eji ngwá ọrụ ndị dị mfe ma na-ele anya na nke a rụrụla arụ; omenala na nkà o nwere ichepụta ihe na-eduzi ya mgbe ọ na-arụ ya. Ndị obodo ahụ ejighị ọrụ ya egwu egwu. Oleg na-ekwu, sị: “Ndị mmadụ na-adị ekwe ọnụ ma ha gaa na nke ndị ọzọ, ma, mgbe ọ bụla m rụụrụ ha ihe e ji ekpuchi olulu mmiri, obi na-adị ha ụtọ ịkwụ ihe ọ bụla m gwara ha kwụọ.”

[Map ndị dị na peeji 28, 29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

UKRAINE

MOLDOVA

ROMANIA

Oké Osimiri Ojii