Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Nwatakịrị Nwụrụ

Mgbe Nwatakịrị Nwụrụ

Mgbe Nwatakịrị Nwụrụ

▪ Ọnwụ nwatakịrị na-abụrụ ụmụnne ya nakwa karịsịa, ndị mụrụ ya, ihe mgbawa obi. Otu nne nke ọkụ gbagburu nwa ya nwoke dị afọ 16 n’otu ihe mberede ọjọọ, kwara arịrị, sị: “Chineke adịghị ekwe ka anyị nwụchitere ụmụ anyị ọnwụ, nke o ji ekwe ka anyị soro ha nwụọ.”

Ma nke ahụ apụtaghị na o nweghị olileanya n’ihi na ọ kọwara, sị: “Chineke agwawo anyị eziokwu banyere ọnwụ, nke a na-emekwa ka mụ na di m ghara ịnọ n’oké mwute ma ọ bụ ghara iche echiche n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.” Nwanyị ahụ kwetara, sị: “Ọ bụghị Chineke anyị gburu nwa anyị, O zubewokwa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ka ha wee biri n’ụwa paradaịs. Anyị ji anya nke uche anyị ahụ nwa anyị nwoke ka ọ dị ndụ, nwee ezi ahụ́ ike, nweekwa obi ụtọ, ma soro ndị enyi na ndị ezinụlọ ya biri.”

N’agbanyeghị nke ahụ, nkasi obi dịkwa ọbụna ndị nwere olileanya siri ike ná nkwa Chineke kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ mkpa. Nwanyị a nwa ya nwụrụ nwere obi ekele na o nwetara nkasi obi n’aka ọtụtụ ndị enyi ya. O kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime ihe ndị ha gwara anyị site n’Akwụkwọ Nsọ nakwa obiọma ha gosiri anyị, si na broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Anyị gbara ndị nile bịaara anyị mgbaru ume ka ha gụọ ya ma nwee ike ghọta anyị nke ọma karị, ghọtakwa ụdị újú anyị ga-anọgide na-eru.”

Eleghị anya, gị onwe gị ma ọ bụ onye ị maara ga-enweta nkasi obi site n’ịgụ broshuọ a bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta broshuọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.