Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-achọ Nduzi na Bible?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-achọ Nduzi na Bible?

Echiche Nke Bible

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-achọ Nduzi na Bible?

“Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie.”—2 Timoti 3:16.

EBEE ka ị na-achọ nduzi ná ndụ gị? Taa, ndụmọdụ e nwere banyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla ị pụrụ ichetụ n’echiche, karịrị akarị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị ka na-achọ nduzi n’akwụkwọ ochie ahụ bụ́ Bible.

Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ na-ele Bible anya dị ka ihe na-abachaghị uru, karịsịa n’oge a kọmputa na nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ zuru ebe nile. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na ndị nkụzi a na-akwanyere ùgwù kwenyere n’echiche bụ́ na Bible abaghịzi uru. Echiche ha ò ziri ezi? Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ebe a pụrụ isi nweta nduzi taa, gịnịzi mere a ga-eji na-achọ nduzi na Bible?

Akwụkwọ Na-ekwu Eziokwu

N’otu oge, Jizọs Kraịst nọ na-ezu ike n’otu olulu mmiri ma soro nwanyị Sameria kwurịta okwu. Ọ gwara nwanyị ahụ, sị: “Chineke bụ Mmụọ, ndị na-efe ya aghaghịkwa ife ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Okwu ndị a na-egosi na e nwere ụdị ofufe Chineke na-anakwere. Ka ofufe anyị wee bụrụ nke a na-efe n’eziokwu, ọ ghaghị ikwekọ n’ihe Chineke mere ka a mara banyere onwe ya n’ime Bible. Okwu Chineke bụ eziokwu.—Jọn 17:17.

Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ okpukpe ndị sị na ha kweere na Bible, ma o yiri ka nke ọ bụla n’ime ha ọ̀ na-akụzi ihe dị iche n’ihe ibe ya na-akụzi. N’ihi ya, ndị mmadụ adịghịzi ama nke ha ga-ewere dị ka ihe Bible na-akụzi n’ezie. Jizọs ọ̀ bụ Chineke, ka ọ̀ bụ Ọkpara Chineke? À na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị ka ọ̀ bụ na a naghị adị? Hel ọ̀ bụ ebe dị adị n’ezie nke a na-ata ndị mmadụ ahụhụ na ya ma ha nwụọ? Setan ọ̀ bụ onye dị adị n’ezie? Gịnị ka ịbụ Onye Kraịst pụtara? Omume anyị na ihe ndị anyị na-eche n’echiche ọ̀ na-emetụta Chineke? Na nwoke na nwanyị hụrụ ibe ha n’anya nke ọma ọ̀ bụ ezi ihe mere ha ga-eji nwee mmekọahụ tupu ha alụọ? Ọ̀ dị njọ ịṅụ mmanya na-aba n’anya? * Okpukpe dị iche iche na-ekwu na ha na-akụzi ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ajụjụ ndị a. Ma, ihe otu okpukpe na-akụzi na-adị iche na nke okpukpe ọzọ na-akụzi. Azịza nile ahụ agaghị abụcha eziokwu.—Matiu 7:21-23.

Oleezi otú ị pụrụ isi chọpụta ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke nakwa ụdị ofufe na-amasị ya? Ka e were ya na ị chọpụtara na e kwesịrị ịwa gị ahụ́ iji gwọọ otu ọrịa ọjọọ ị na-arịa. Gịnị ka ị ga-eme? Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ị ga-agbalịsi ike ịchọta onye bụ́ ọkasị ibe n’ịwa ụdị ahụ́ ahụ. Ị ga-atụle ihe ndị gosiri na o ruru eru na ahụmahụ ndị o nwerela n’ịgwọ ọrịa, ị ga-agakwurukwa ya ma soro ya kwurịta okwu. N’ikpeazụ, mgbe ihe ndị ị chọpụtara mere ka obi kaa gị na ọ bụ ya kasị mara awa ụdị ahụ́ ahụ, ọ bụ mgbe ahụ ka ị ga-atụkwasị ya obi ma kwe ka ọ waa gị ahụ́. Ndị ọzọ pụrụ inwe echiche dị iche. Ma, i nweela ezigbo ihe mere obi ji kaa gị ka onye a waa gị ahụ́.

N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na i jiri obi ọcha nyochaa ihe àmà ndị e nwere nke ọma, ị pụrụ ịmalite inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ na ikwere n’ihe Bible na-ekwu. (Ilu 2:1-4) Ka ị na-achọ azịza nye ajụjụ ndị metụtara ụdị ofufe Chineke na-anakwere, ọ dị gị n’aka ịhọrọ ebe ị ga-esi achọta ya. Ị pụrụ ịhọrọ ịchọ ya n’ozizi na n’echiche mmadụ bụ́ ndị na-emegiderịta onwe ha, ma ọ bụkwanụ tụlee ihe Bible kwuru banyere ya.

O Ziri Ezi Ma Baa Uru

Ọ bụrụ na i jiri nlezianya nyochaa Bible, ị ga-ahụ ihe àmà ndị na-egosi na “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru.” * (2 Timoti 3:16, 17) Dị ka ihe atụ, ihe jupụtara na Bible bụ amụma ndị e nyere nkọwa zuru ezu na ha. Ihe ndị mere eme na-agba akaebe na amụma ndị ahụ mezuru. (Aịsaịa 13:19, 20; Daniel 8:3-8, 20-22; Maịka 5:2) Ọ bụ ezie na Bible abụghị akwụkwọ sayensị, o kwekọrọ na sayensị. Ọtụtụ puku afọ tupu ndị ọkà mmụta sayensị enwee ike ịchọpụta ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ihe ndị e kere eke na ahụ́ ike, e deela ha n’ime Bible.—Levitikọs 11:27, 28, 32, 33; Aịsaịa 40:22.

Ọzọkwa, Bible na-enyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha. N’ime ya, e nwere ndụmọdụ ndị bara uru bụ́ ndị metụtara ndụ ezinụlọ, ụzọ e si enweta ezi ahụ́ ike na obi iru ala, achụmnta ego, na ihe ndị ọzọ a na-eme n’ụbọchị. Ilu 2:6, 7 na-ekwu, sị: “Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta: Ọ na-ezobere ndị ziri ezi nzube ihe.” Site n’ilegara Bible anya maka nduzi, ị pụrụ ịzụ ikike nghọta gị “ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.”—Ndị Hibru 5:14.

Okwu Chineke na-enyekwara anyị aka ịghọta nzube nke ndụ. (Jọn 17:3; Ọrụ 17:26, 27) Ọ na-akọwa ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara. (Matiu 24:3, 7, 8, 14; 2 Timoti 3:1-5) N’ime ya, Chineke na-egosi anyị ụzọ ọ ga-esi ewepụ ihe ọjọọ n’ụwa ma mee ka ihe a kpọrọ mmadụ nwee ahụ́ zuru okè na ndụ ebighị ebi.—Aịsaịa 33:24; Daniel 2:44; Mkpughe 21:3, 4.

Ọtụtụ nde mmadụ achọpụtala n’onwe ha na Bible bụ ebe dị mma a pụrụ isi nweta ezi amamihe n’ezie. Ndị na-ebipụta Teta! na-agba gị ume inyocha usoro isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible,” nke ga na-apụta ná mbipụta ọ bụla nke magazin a. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị pụrụ ịchọtakwu ihe àmà ndị na-egosi na Bible bụ ebe kasị mma ị pụrụ isi nweta nduzi ná ndụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 “Echiche nke Bible”—bụ́ isiokwu a ga na-ebipụta mgbe nile na Teta!—ga-aza ajụjụ ndị a na ndị ọzọ ná mbipụta ndị na-abịanụ.

^ par. 12 Ị chọọ ịhụ ihe àmà na-egosi na e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee Bible, lee akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?

▪ Olee ụdị ofufe Chineke na-anakwere?—Jọn 4:24.

▪ Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji rite uru n’amamihe Chineke?—Ilu 2:1-4.

▪ Olee otú Bible si bụrụ ebe bụ́ isi e si enweta nduzi bara uru?—Ndị Hibru 5:14.