Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nke Kasị Njọ n’Ime Ọrịa Na-efe Efe E Nwetụrụla n’Ụwa

Nke Kasị Njọ n’Ime Ọrịa Na-efe Efe E Nwetụrụla n’Ụwa

Nke Kasị Njọ n’Ime Ọrịa Na-efe Efe E Nwetụrụla n’Ụwa

N’OCTOBER 1918, a ka nọ na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ. Ọ bụ ezie na agha ahụ achọwala ibi, ndị ọchịchị ka nọgidere na-enyocha akụkọ ụwa tupu e bipụta ma ọ bụ kọọ ha. N’ihi ya, ọ bụ nanị Spen bụ́ mba na-esoghị lụọ agha ahụ, bịara nwee ike ịkọ na ndị nkịtị, bụ́ ndị nọ n’ọtụtụ ebe, na-arịa ọrịa ma na-anwụ n’ike n’ike. Otú a ka aha ahụ e ji mara ọrịa a ruo taa—ahụ́ ọkụ si Spen—si malite.

Ọrịa a na-efe efe malitere n’ọnwa March nke afọ 1918. Ọtụtụ ndị meworo nchọpụta iji mara ebe ọrịa a si, kwuru na o si na steeti Kansas, nke dị na U.S.A. Ọ dị ka ọ̀ bụ ndị agha United States batara ọhụrụ na France si ebe ahụ buru ya bata France. Ka ọ na-erule ọnwa July nke afọ 1918, mgbe influenza ahụ gbusịrịla ọtụtụ mmadụ, ọ bịara yie ka ihe ọ̀ dịghachila mma. Ma, ndị dọkịta amaghị na ọ na-abụ ebule laa azụ, ya abịa ọgụ, nke bụ́ na ọ bụ mmalite ka ọrịa ahụ ka na-amalite.

Mgbe Agha Ụwa nke Mbụ biri na November 11, 1918, ụwa nile ṅụrịrị ọṅụ. Ma ọ dị mwute na ọ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’otu oge ahụ ka ọrịa a na-efe efe tiwapụrụ n’ụwa nile. Ọ ghọrọ ogbu ara ọbara nke e jizi mere isi akụkọ n’ụwa nile. Ndị nọ ndụ n’oge ahụ bụ́ ndị ọrịa a na-ejideghị dị nnọọ ole na ole, ma ọ dịghị onye ụjọ na-ejideghị. Otu akwụkwọ a ma nke ọma nke kwuru banyere influenza kọrọ, sị: “N’afọ 1918, afọ ole ndị bi na United States na-atụ anya ịdịru ndụ ji ihe karịrị afọ 10 belata.” Olee otú ọrịa a na-efe efe si dị iche ná ndị ọzọ?

Ọrịa Na-efe Efe nke Pụrụ Iche

Ihe kasị mee ka ọrịa a pụọ iche bụ otú o si egbu ndị mmadụ na mberede. Olee otú ọ na-adaru na mberede? N’akwụkwọ bụ́ The Great Influenza, nke e dere n’oge na-adịbeghị anya, onye dere ya bụ́ John M. Barry hotara ahụmahụ a e dere ede, nke bụ́: “Na Rio de Janeiro, otu nwoke ji olu dị nnọọ mma jụọ Ciro Viera Da Cunha, bụ́ nwa akwụkwọ na-amụ banyere ịgwọ ọrịa, onye nọ na-eche ụgbọala, ajụjụ, nwoke ahụ adaa n’ala ozugbo ahụ, nwụọ; na Cape Town, South Africa, Charles Lewis bara otu ụgbọala o ji ala obodo ya nke dị kilomita ise site n’ebe ahụ ọ bara ụgbọ, onye na-eso ụgbọala ahụ adaa, nwụọ. Ka ha na-agbala kilomita ise, mmadụ isii bara ụgbọala ahụ nwụrụ, tinyere onye na-anya ya.” Ihe gburu ha nile bụ ahụ́ ọkụ ahụ.

Ihe ọzọ mere ọrịa a ji pụọ iche bụ ụjọ ya—ụjọ a na-atụ ihe a na-amaghị ama. Ndị ọkà mmụta sayensị amaghị ihe kpatara ọrịa ahụ ma ọ bụkwanụ kpọmkwem otú o si efere onye ọzọ. Ndị ọchịchị mere ihe iji chebe ọhaneze: e kweghịzi ka ụgbọ mmiri na-eru n’ọdụ ụgbọ mmiri; e mechiri ebe ndị a na-eme fim, ụlọ chọọchị, na ebe ndị ọzọ ọhaneze na-agbakọta. Dị ka ihe atụ, na San Francisco, California, U.S.A., ndị ọchịchị nyere ndị nile bi n’obodo ahụ iwu iji ihe e ji ekpuchi imi na ọnụ na-ekpuchi imi na ọnụ ha. A na-eri onye ọ bụla e jidere ka ọ na-ekpuchighị imi na ọnụ ya mgbe ya na ndị mmadụ nọ nhá ma ọ bụ kpọchie ya. Ma ọ dịghị nke nwere isi n’ihe nile a e mere. Ihe nile ahụ bịara dị nnọọ ka ịchụwa ewu ojii mgbe chi jimirila.

Ụjọ jikwa ndị mmadụ n’ihi na ahụ́ ọkụ ahụ nọ na-egbu mmadụ n’eleghị anya n’ihu. N’ihi ihe a na-amabeghị ihe kpatara ya, ọrịa a kpara mkpamkpa na 1919 abụghị ndị okenye ka ọ kasị gbuo; o jidere ndị ntorobịa ahụ́ gbasiri ike ma gbuo ha. Ihe ka ọtụtụ ná ndị influenza ahụ gburu nọ n’agbata afọ 20 na afọ 40.

Ọzọkwa, ọ bụ ọrịa zuru ụwa ọnụ n’ezie. O ruru ọbụna n’agwaetiti ndị dị n’ebe anwụ na-achasi ike n’ụwa. Ụgbọ mmiri buuru ọrịa a bata na Western Samoa (nke a maara ugbu a dị ka Samoa) na November 7, 1918. N’ime ọnwa abụọ, ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ ise nke mmadụ 38,302 bi ebe ahụ nwụrụ. Ọrịa a kpara mkpamkpa ná mba ukwu nile dị n’ụwa!

Ihe ọzọkwa mere ọrịa a ji pụọ iche bụ otú ọ kpụruru ọkụ n’ọnụ. Dị ka ihe atụ, Philadelphia, Pennsylvania, U.S.A. so n’ebe mbụ ọrịa a batara ma kpaa ike dị egwu. Ka ọ na-erule etiti ọnwa October 1918, a hụghịzi igbe e ji eli ozu ndị mmadụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Alfred W. Crosby kọrọ, sị: “Otu onye na-arụ igbe ozu kwuru na ọ bụrụ na ya nwere igbe ozu ruru puku ise, na ya pụrụ irechapụ ha n’ime awa abụọ. Mgbe ụfọdụ, ozu ndị na-adọrọ n’ebe a na-ebusa ozu n’obodo ahụ na-eji okpukpu iri akarị igbe ozu e nwere.”

N’ime oge dị nnọọ mkpirikpi, ọrịa ahụ gburu mmadụ karịa ọrịa ndị ọzọ yiri ya ụmụ mmadụ hụtụrụla. Mmadụ ole a na-ekwukarị na ọrịa ahụ gburu n’ụwa nile bụ nde mmadụ 21, ma ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwuzi na ọ karịrị nnọọ otú ahụ. Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe banyere ọrịa na-efe efe na-ekwu na o yiri ka ọrịa ahụ ò gburu nde mmadụ iri ise ma ọ bụkwanụ ihe ruru otu narị nde mmadụ! Barry, nke a kpọtụrụ aha na mbụ, kwuru, sị: “Influenza gburu ọtụtụ mmadụ n’ime otu afọ karịa ka otu ọrịa na-efe efe nke kpara ike n’oge ụwa na-emepebeghị anya gburu n’ime otu narị afọ; o gburu ọtụtụ mmadụ n’ime izu iri abụọ na anọ karịa ka ọrịa AIDS gburula n’ime afọ iri abụọ na anọ.”

Ọ bụ nnọọ ihe ijuanya na ndị America ọrịa a gburu n’ihe dị ka otu afọ karịrị ndị nke nwụrụnụ n’agha ụwa nke mbụ na nke abụọ ma a gụkọta ha ọnụ. Onye edemede bụ́ Gina Kolata na-akọwa, sị: “Ọ bụrụ na ụdị ọrịa ahụ abịa taa ma gbuo ọnụ ọgụgụ ndị America há otú ahụ, ọ pụtara na ọ ga-egbu otu nde ndị America na ọkara. Nke a karịrị ndị nile ọrịa obi, ọrịa cancer, ọrịa strok, ọrịa akpa ume, ọrịa AIDS, na ọrịa Alzheimer na-egbu n’ime otu afọ ma a gụkọta ha ọnụ.”

A sị ka e gbuo okwu nkenke, ahụ́ ọkụ ahụ si Spen bụ nke kasị kpaa ike n’ime ọrịa na-efe efe e nwetụrụla n’ụwa. Olee enyemaka e nwetara n’aka ndị ọkà mmụta sayensị?

Mgbe Sayensị Na-apụghị Inye Aka

Ka ọ na-erule oge Agha Ụwa nke Mbụ bidoro, ndị dọkịta enweela ihe a pụrụ iwere dị ka ọganihu dị ukwuu n’igbochi ọrịa. Ọbụnadị n’oge agha ahụ, ndị dọkịta nọ na-anya nnọọ isi n’ihi ọganihu ha nwere n’ibelata ike ọrịa na-efe efe na-akpa. N’oge ahụ, akwụkwọ bụ́ The Ladies Home Journal kwuru na ọ dịghịzi ndị America mkpa inwe ọnụ ụlọ a na-adọba ozu maka nkiri tupu e liwe ya. Akwụkwọ ahụ tụrụ aro ka a kpọwazie ọnụ ụlọ dị otú ahụ palọ, kama ịkpọwa ya ọnụ ụlọ a na-adọba ozu. Ma, ka a na-ekwu nke a na-ekwu, influenza esi ebe o si bịa, ọ bịakwara fọdụ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ndị dọkịta meliri banyere ya.

Crosby dere, sị: “Ndị dọkịta nile e nwere n’afọ 1918 so kere òkè n’ọdịda kasịnụ e nwere n’ịgwọ ọrịa n’ime narị afọ nke iri abụọ, ma ọ bụkwanụ, a sị ka e jiri ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụnụ tụlewe ya, ha so kere òkè n’ọdịda e nwetụrụla kemgbe ụwa.” Ka e wee ghara ịkwalara ndị dọkịta ụta nile, Barry kwuru, sị: “N’oge ahụ, ndị ọkà mmụta sayensị ghọtara nnọọ nke ọma otú ọrịa ahụ dịruru ná njọ, mara otú e si agwọ ọrịa ụfọdụ metụtara oyi ịba mmadụ n’ahụ́, ma nye ndụmọdụ banyere otú ọhaneze ga-esi zere ọrịa ahụ, bụ́ nke gaara echebe ndụ ọtụtụ iri puku mmadụ nọ n’America ma a sị na a gbasoro ya. Ma, ndị ọchịchị leghara ndụmọdụ ahụ anya.”

Ugbu a, bụ́ ihe dị ka afọ 85 ihe a nile mere, gịnị ka a matarala banyere ọrịa ọjọọ a? Gịnị kpatara ya? Ò nwere ike ịlọghachi? À pụrụ ịgwọta ya ma ọ lọghachi? Ụfọdụ n’ime azịza nke ajụjụ ndị a pụrụ ịtụ gị n’anya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]

Ihe ka ọtụtụ ná ndị influenza ahụ gburu nọ n’agbata afọ 20 na afọ 40

[Foto dị na peeji nke 14]

Ebe ụmụ akwụkwọ nọ na-amụ ihe na klas n’afọ 1919, na Canyon City, Colorado, U.S.A.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke Colorado Historical Society, 10026787

[Foto dị na peeji nke 14, 15]

Onye uwe ojii

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto si n’aka Topical Press Agency/Getty Images

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndị na-egwu egwuregwu “baseball” ka ha kpuchiri imi na ọnụ ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Underwood & Underwood/CORBIS