Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nye Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị

Nye Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị

Nye Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị

MALITE na Teta! nke a, a ga-agbanwe ihe ụfọdụ na Teta! Ọ bụ ezie na ihe ụfọdụ ga-adị iche, ihe ka ukwuu n’ime ya ga-adị otú ha dịbu.

Nzube e ji na-ebipụta Teta! bụ́ nke e mere ka ọ pụta ìhè ọtụtụ iri afọ gara aga, ka bụkwa otu ihe ahụ. Dị ka a kọwara na peeji nke 4, “a na-ebipụta magazin a iji kụziere onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ihe.” Teta! ga-anọgide na-akụziri ndị na-agụ ya ihe, na-eme ka ha mụrụ anya banyere ihe ndị na-eme gburugburu ha n’ihi na ọ ka ga na-enyocha ihe ndị na-eme n’ụwa, na-akọ banyere ndị nọ n’obodo dịgasị iche iche na ihe ndị dị ebube e kere eke, na-atụlekwa ihe ndị metụtara ahụ́ ike ma ọ bụ nkà mmụta sayensị maka ọdịmma nke ndị na-amaghị banyere sayensị.

Na Teta! (Bekee) nke August 22, 1946, ndị na-ebipụta Teta! kwere nkwa, sị: “Ihe mbụ magazin a ga na-eme bụ ịnọgidesi ike n’eziokwu.” N’ụzọ kwekọrọ ná nkwa ahụ ha kwere, Teta! anọgidewo na-agba mbọ ikwu ihe ndị mere eme. Iji mezuo nke ahụ, a na-eji nlezianya enyocha ihe ndị e dere iji jide n’aka na ha bụ eziokwu. Magazin a egosiwokwa na ọ ‘na-anọgidesi ike n’eziokwu’ ọbụna n’ụzọ ndị ọzọ ka mkpa.

Ọ dịghị mgbe Teta! na-adịghị adọrọ uche ndị na-agụ ya aga na Bible. Otú ọ dị, malite ná mbipụta nke a, Teta! ga na-enwekwu isiokwu ndị dabeere na Bible ọbụna karịa ka ọ na-enwebu. (Jọn 17:17) Na Teta!, a ga-anọgidekwa na-enwe isiokwu ndị na-egosi otú ndụmọdụ ndị bara uru dị na Bible pụrụ isi nyere anyị aka ibi ndụ dị mma na nke na-aga nke ọma taa. Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ ndụmọdụ dabeere na Bible n’usoro isiokwu ndị bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” na “Echiche nke Bible,” bụ́ isiokwu ndị a ga-anọgide na-ebipụta mgbe nile na magazin a. Tụkwasị n’isiokwu ndị a, Teta! ga anọgide na-eme ka ndị na-agụ ya mara nkwa Bible kwere banyere ụwa ọhụrụ nke udo ga-adị na ya bụ́ nke ga-anọchi usoro ihe dị ugbu a nke na-emebi iwu, n’oge na-adịghị anya.—Mkpughe 21:3, 4.

Olee ihe ọzọ ga-adị iche na ya? Malite na Teta! nke a, a ga na-ebipụtazi Teta! nanị ugboro anọ n’afọ n’asụsụ Igbo. Nke Bekee na nke asụsụ ndị ọzọ a na-ebipụtabu ugboro abụọ n’ọnwa bụzi otu ugboro n’ọnwa ka a ga na-ebipụta ha. * “Ikiri Ụwa,” bụ́ nke a na-ebipụta mgbe nile n’asụsụ Bekee kemgbe afọ 1946, ka ga na-agba na Teta! Bekee ọ bụla, ma ọ gaghịzi na-ewe peeji abụọ, kama ọ ga na-ewezi nanị otu peeji. E nwere ihe ọhụrụ ga na-apụta mgbe nile na peeji nke 31. Isiokwu ya bụ “Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?” Gịnị ka a ga na-ede na ya, oleekwa otú ị pụrụ isi jiri ya mee ihe?

Lebatụgodị anya na peeji nke 31 nke magazin a. Ụfọdụ n’ime ihe ndị dị na peeji ahụ ga-amasị ndị na-eto eto; ndị ọzọ ga-esitụrụ ndị nwere ihe ọmụma Bible ike. Akụkụ bụ́ “Olee Afọ O Mere?” ga-enyere gị aka inwe ihe ndepụta na-egosi oge mmadụ ndị a kọrọ banyere ha na Bible dịrị ndụ na oge ihe ndị dị mkpa a kọrọ banyere ha mere. Ọ bụ ezie na a pụrụ ịhụ azịza nke akụkụ bụ́ “N’ime Mbipụta Nke A” n’ebe nile na Teta! ahụ, azịza nke ihe ka ọtụtụ n’ajụjụ ndị nke ọzọ ga-apụta n’otu n’ime peeji nke Teta! ahụ ajụjụ ndị ahụ dị na ya, ma a ga-akpọgide ha isi n’ala. Ọ ga-adị mma ka i mee nnyocha tupu gị agụọ ebe ahụ e depụtara azịza ha. E mesịa, ị kọọrọ ndị ọzọ ihe ị mụtara. Gị na ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị pụdịrị iji ihe ọhụrụ a e tinyere na Teta! nke bụ́, “Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?,” na-enwe mkparịta ụka dabeere na Bible.

Ihe dị ka afọ 60 gara aga, ndị na-ebipụta Teta! kwere nkwa, sị: “A bịa n’ihe ndị a na-ede na magazin a, a ga-agba mbọ ịhụ na ọ na-ekwekọ n’ụzọ e si ele ihe anya n’ụwa nile kama ịbụ n’ụzọ e si ele ya anya n’otu ógbè. Ọ ga-amasị ndị nile nwere obi eziokwu n’obodo nile. . . . Isiokwu ndị dị na magazin ahụ na ihe ndị e dere na ha . . . ga-abụ ndị a ga na-amụta ihe na ha, ọ ga na-amasịkwa ọnụ ọgụgụ mmadụ kasị ukwuu, ma okenye ma ụmụaka.” Ndị na-agụ Teta! n’ụwa nile kwetara na ndị na-ebipụta Teta! emezuwo nkwa ahụ ha kwere. Anyị na-ekwe gị nkwa na anyị ga-anọgide na-eme otú ahụ.

Ndị Na-ebipụta Ya

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ụfọdụ n’ime ihe ndị e kwuru na ha ga na-adị na Teta! nwere ike ọ gaghị na-adị na Teta! ndị a na-ebipụta ugboro anọ n’afọ.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

A kpọrọ ya “The Golden Age” n’afọ 1919. N’afọ 1937, a gbanwere aha ya ka ọ bụrụ “Consolation,” gbanweekwa ya ọzọ n’afọ 1946 ka ọ bụrụ “Teta!”

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Ọ dịla anya “Teta!” mewere ka ndị na-agụ ya mara banyere Bible

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Égbè: Foto nke U.S. National Archives; nwa agụụ na-egbu: Foto nke WHO nke W. Cutting sere