Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okirikiri Ndị Ala Gbara n’Africa nke A Na-amaghị Ihe Kpatara Ya

Okirikiri Ndị Ala Gbara n’Africa nke A Na-amaghị Ihe Kpatara Ya

Okirikiri Ndị Ala Gbara n’Africa nke A Na-amaghị Ihe Kpatara Ya

N’ebe ndịda nke ọdịda anyanwụ Africa, e nwere otu ọzara a na-akpọ Ọzara Namib. Ọzara a dị puku kilomita abụọ n’ogologo. N’ebe ọzara a sọtụrụ n’ebe ọdịda anyanwụ ya, e nwere ebe ndị ala gbara okirikiri n’ájá uzuzu ndị ahụ ahịhịa na-adịghị eto nke ọma na ha. Okirikiri ndị a na-adị mita 3 site n’otu isi ya ruo n’isi ya nke ọzọ. Ahịhịa ndị totụrụ ogologo gbara nke ọ bụla n’ime okirikiri ndị a gburugburu. Ebe ndị ahụ gbara okirikiri na-adị ụfọdụ ndị bịara nleta ka à ga-asị na ọ bụ kịtịkpa gbara ala ahụ ma ọ bụkwanụ na ọ bụ nnukwu mkpụrụ mmiri ozuzo tasasịrị na ha. Ndị obodo ahụ kweere kemgbe ụwa na okirikiri ndị ahụ nwere ikike karịrị nke mmadụ. Ụfọdụ ndị bi ebe ahụ kweere na okirikiri nke ọ bụla dị n’ili onye Bushman nwụrụ n’otu n’ime agha ndị Bushman na ndị ọcha chịburu ebe ahụ lụrụ n’ime ọtụtụ narị afọ gara aga.

Ọ dịkwala anya ndị ọkà mmụta sayensị gbalịwara ịkọwa otú okirikiri ndị ahụ si malite. N’afọ 1978, ndị ọkà mmụta sayensị gwunyere ígwè ndị toro ogologo gburugburu ụfọdụ n’ime okirikiri ndị ahụ, n’ihi na ha chere na ka oge na-aga, okirikiri ndị ahụ a gaghịzi adị kpọmkwem ebe ndị ahụ ha dị. Ma, afọ 22 mgbe ha gwunyesịrị ígwè ndị ahụ, okirikiri ndị ahụ ka dịkwa kpọmkwem ebe ndị ahụ ha dị. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph nke a na-ebipụta na London kọrọ na e kwuola ọtụtụ ihe banyere otú okirikiri ndị ahụ si malite. Ụfọdụ n’ime ihe ndị e kwuru mere o ji malite bụ “akịka, nsí si n’ahịhịa ụfọdụ ndị dị n’ebe ahụ, na akụ̀ ndị dị n’ala bụ́ ndị e metọrọ emetọ. Ihe ọzọkwa ha kwuru mere o ji malite bụ na enyi nnụnụ nọ n’ebe ndị ahụ tụrụọ onwe ha.” Gretel van Rooyen bụ́ prọfesọ n’ihe banyere ihe ọkụkụ na Mahadum nke Pretoria, South Africa, nọ n’isi otu nnyocha e mere ná nso nso a iji nwee ike ịghọta otú okirikiri ndị a si malite. Nwanyị a kwuru, sị: “Anyị tụlere nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ a na-ekwu na ọ bụ ha kpatara ya, anyị chọpụtakwara na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha ọ bụ ya kpatara ya.”

Ikekwe ọ bụ ihe dị ịrịba ama na ndị ọkà mmụta ahụ chọpụtara na ahịhịa na-akpọnwụ mgbe a dọrọ ha n’ájá e si n’ime ebe ahụ dị okirikiri kute. Ma, ọ na-eme nke ọma n’ájá e kutere n’ebe ahụ ahịhịa toro na ya gburugburu okirikiri ahụ. Nke a na-agba akaebe na ájá dị n’ebe abụọ ahụ abụghị otu. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọ bụla a chọpụtara n’oge mbụ e nyochara ájá ndị ahụ, Van Rooyen kweere na ọ bụrụ na e jiri ngwá ọrụ a na-akpọ spectrometer nyochaa ya, a pụrụ ịchọpụta ihe ụfọdụ banyere ha. Ọ na-eche ma ọ̀ ga-abụ na e nwere ihe ndị na-egbu egbu dị n’ájá ndị dị n’ime okirikiri ahụ. Na magazin bụ́ New Scientist, Van Rooyen kwuru, sị: “Ọ bụrụgodị na anyị achọpụta ha, nsogbu ọzọ anyị ga-enwe bụ ịchọpụta otú ha si bịa dịrị ebe ahụ.” N’ihi ya, ka ọ dị ugbu a, okirikiri ndị ahụ ka bụ otu n’ime ọtụtụ ihe ndị na-adọrọ mmasị ma dị mgbagwoju anya e nwere n’ụwa.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 30]

Site n’ikike nke Austin Stevens