Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Nanị Otu Ezi Chineke?

È Nwere Nanị Otu Ezi Chineke?

Echiche Nke Bible

È Nwere Nanị Otu Ezi Chineke?

MỌLEK, Ashtọret, Bel, Dagọn, Merodak, Zus, Hamis, na Atemis bụ ụfọdụ n’ime chi na chi nwanyị ndị a kpọtụrụ aha na Bible. (Levitikọs 18:21; Ndị Ikpe 2:13; 16:23; Jeremaịa 50:2; Ọrụ 14:12; 19:24) Otú ọ dị, nanị Jehova ka a kpọrọ aha n’Akwụkwọ Nsọ dị ka Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. N’otu abụ mmeri Mozis na ndị obodo ya bụrụ bụ́ nke Mozis duziri, ha bụrụ, sị: “Ònye dị ka Gị n’etiti chi nile, Jehova?”—Ọpụpụ 15:11.

N’ụzọ doro anya, Bible gosiri na Jehova ka chi nile ọzọ. Ma, gịnị ka obere chi ndị a na-arụ? Ha na chi ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ́ ndị e ferela ofufe kemgbe ọtụtụ afọ, hà bụ chi ndị dị adị, ndị nọ n’okpuru Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova?

Ihe Ndị E Chepụtara Echepụta

Bible kọwara Jehova dị ka onye nanị ya bụ ezi Chineke ahụ. (Abụ Ọma 83:18; Jọn 17:3) Aịzaịa onye amụma dekọrọ ihe Chineke n’onwe ya kwuru, mgbe o dere, sị: “Ọ dịghị chi ọzọ e buru Mụ onwe m ụzọ kpụọ, ọ dịghịkwa nke ga-eso m n’azụ. Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Jehova; ọ dịghịkwa onye nzọpụta dị ma ọ́ bụghị nanị m.”—Aịsaịa 43:10, 11.

Ọ bụghị nanị na chi ndị ọzọ ahụ dị ala ma e jiri ha tụnyere Jehova. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha adịghị adị—ha bụ kpọmkwem chi ụmụ mmadụ chepụtara n’onwe ha. Bible kpọrọ chi ndị a ‘ọrụ aka mmadụ nke na-adịghị ahụ ụzọ ma ọ bụ na-anụ ihe ma ọ bụ na-eri ihe ma ọ bụ na-anụ ísì.’ (Deuterọnọmi 4:28) Bible na-akụzi n’ụzọ doro anya na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ.

Ka a sịkwa ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji dọsie aka na ntị ike megide ife chi ọ bụla ọzọ na-abụghị Jehova ofufe. Dị ka ihe atụ, n’iwu mbụ e nyere Mozis n’ime Iwu Iri ahụ, a gwara mba Izrel oge ochie ka ha ghara ife chi ọ bụla ọzọ ofufe. (Ọpụpụ 20:3) N’ihi gịnị?

Nke mbụ, ife chi na-adịghị adị ofufe bụ nnọọ ịkparị Onye Okike. A kọwara ndị na-efe chi ụgha ndị a n’ime Bible dị ka ndị “ji eziokwu nke Chineke gbanwere okwu ụgha, sọpụrụkwa ma jeere ihe e kere eke ozi dị nsọ kama Onye ahụ nke kere ihe.” (Ndị Rom 1:25) Ọtụtụ mgbe, a na-eji arụsị ndị e ji ihe ndị sitere n’okike, dị ka ígwè ma ọ bụ osisi mee, eme ihe nnọchianya nke chi ndị a e chepụtara echepụta. A na-ewere ya na ọtụtụ chi nwere ihe jikọrọ ha na ihe ụfọdụ e kere eke, dị ka égbè eluigwe, oké osimiri, na ifufe. N’ihi ya, o doro anya na ife chi ndị a e chepụtara echepụta bụ nnọọ ịkparị Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile.

Chi ụgha ndị ahụ na arụsị ha na-asọ Onye Okike oyi. Ma, ọ bụ ndị chepụtara chi ụgha ndị ahụ ka okwu Chineke ji iwe kwuo banyere nke a kasị metụta. A kọwara ihe bụ́ echiche ya banyere arụsị ndị a n’ụzọ dị ike, sị: “Arụsị nile nke mba nile bụ ọlaọcha na ọlaedo, ọrụ aka mmadụ. Ha nwere ọnụ, ma ha adịghị ekwu; ha nwere anya abụọ, ma ha adịghị ahụ ụzọ; ha nwere ntị abụọ, ma ha adịghị aṅa ntị; ọ dịghịkwa iku ume dị n’ọnụ ha. Ndị na-eme ha ga-adị ka ha; ee, onye ọ bụla nke na-atụkwasị ha obi.”—Abụ Ọma 135:15-18.

E nwere ihe ọzọ mere Bible ji adọsi aka ná ntị ike megide ife onye ọ bụla ọzọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ofufe, ma e wezuga Jehova Chineke. Ife ụdị ofufe ahụ ga-abụ mmadụ ịkwọ aka tiere ọkụkọ akị. Aịzaịa onye amụma kwuru n’ụzọ dabara adaba, sị: “Ònye kpụworo chi, ma ọ bụ wụọ arụsị a pịrị apị nke na-abaghị uru ma ọlị?” (Aịsaịa 44:10) Bible na-ekwukwa na “chi nile nke ndị nile dị iche iche bụ ihe efu.” (Abụ Ọma 96:5) Chi ụgha bụ ihe efu, ọ bụkwa ihe efu ka a na-enweta n’ife ihe efu ofufe.

Jizọs, Ndị Mmụọ Ozi, na Ekwensu

Mgbe ụfọdụ, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ndị dị adị dị ka ndị bụ́ chi. Ma, ọ bụrụ na e jiri nlezianya nyochaa ebe ndị ahụ a kpọrọ ha chi, a na-achọpụta n’ụzọ doro anya na ọkpụkpọ a kpọrọ ha “chi” adịghị egosi na ha bụ ndị e kwesịrị ife ofufe dị ka chi. Kama nke ahụ, n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible, e jikwa okwu ahụ bụ́ “chi” kọwaa onye dị ike ma ọ bụ onye dị n’ụdị Chineke ma ọ bụ onye ya na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile nwere njikọ chiri anya.

Dị ka ihe atụ, ụfọdụ amaokwu ndị dị na Bible na-akpọ Jizọs Kraịst chi ma ọ bụ Chineke. (Aịsaịa 9:6, 7; Jọn 1:1, 18) Nke a ọ̀ pụtara na e kwesịrị ife Jizọs ofufe? Jizọs n’onwe ya sịrị: “Ọ bụ Jehova Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa nanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.” (Luk 4:8) N’ụzọ doro anya, ọ bụ ezie na Jizọs bụ dike, dịrịkwa ka Chineke, Bible egosighị na e kwesịrị ife ya ofufe.

A kpọkwara ndị mmụọ ozi “ndị dị ka chi.” (Abụ Ọma 8:5, NW; Ndị Hibru 2:7) Otú ọ dị, ọ dịghị ebe ọ bụla Akwụkwọ Nsọ gbara ụmụ mmadụ ume ife ndị mmụọ ozi ofufe. N’eziokwu, n’otu oge, oké ụjọ jidere agadi nwoke bụ́ Jọn onyeozi mgbe ya na otu mmụọ ozi nọ nke na o hulatara ala ịkpọ isiala nye mmụọ ozi ahụ. Ma, mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: “Kpachara anya! Emela ya! . . . Kpọọ isiala nye Chineke.”—Mkpughe 19:10.

Pọl onyeozi kọwara Ekwensu dị ka “chi nke usoro ihe a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Dị ka “onye na-achị ụwa a,” Ekwensu emewo ka a na-efe imirikiti chi ụgha dị iche iche ofufe. (Jọn 12:31) N’ihi nke a, ofufe nile a na-enye chi ndị mmadụ mere bụ Setan ka a ga-ekwu na a na-enye ya. Ma, Setan abụghị chi ruru eru ịnara ofufe anyị. O ji aka ya mee onwe ya onye ọchịchị, o ji aghụghọ nweta ọchịchị. A ga-emesị kpochapụ Setan na ụdị nile nke ofufe ụgha. Mgbe nke a mere, ihe nile a kpọrọ mmadụ—ee, ihe nile e kere eke—ga-ekwupụta na Jehova bụ nanị ezi Chineke nke dị ndụ, ha ga-emegidekwa nke a ruo mgbe ebighị.—Jeremaịa 10:10.

Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?

▪ Gịnị ka Bible na-akụzi banyere ife arụsị ofufe?—Abụ Ọma 135:15-18.

▪ È kwesịrị ife Jizọs na ndị mmụọ ozi ofufe?—Luk 4:8.

▪ Ònye bụ nanị ezi Chineke ahụ?—Jọn 17:3.

[Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]

Ihe osise, site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Meri, Ịtali; chi ọka nke ndị Maya, Mexico na Ebe Etiti America; Ashtọret, Kenan; arụsị a kpụrụ akpụ, Sierra Leone; Buddha, Japan; Chicomecóatl, Aztec, Mexico; Horus nke yiri agụ nkwọ, Ijipt; Zus, Gris

[Ebe E Si Nweta Foto]

Chi ọka, Horus nke yiri agụ nkwọ, na Zus: Ndị nyere ikike ka e see foto ndị a bụ British Museum