Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnagide Ihe Ịma Aka nke Ime Agadi

Ịnagide Ihe Ịma Aka nke Ime Agadi

Ịnagide Ihe Ịma Aka nke Ime Agadi

“AFỌ iri asaa agwụla ihe anyị nwere—afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na anyị siri ike; ma nanị ihe ha na-ewetara anyị bụ nsogbu na ihe mwute; ọ naghị ete aka ndụ anyị agwụsịa, anyị ewee laa.” (Abụ Ọma 90:10, Today’s English Version) Uri a e dere puku afọ atọ gara aga na-emesi ya ike na ọ dịla anya oge agadi malitere iweta ihe ịma aka. N’agbanyeghị ezigbo ọganihu ndị e nwerela n’ịgwọ ọrịa, ihe ụfọdụ a na-ahụ n’oge agadi ka na-eweta “nsogbu na mwute.” Olee ihe ndị ha bụ, oleekwa otú ụfọdụ ndị si na-emeri ihe ịma aka ndị ha na-eweta?

Ime Agadi Ma Nwee Ụbụrụ Na-aghọ Nkọ

Hans, bụ́ onye dị afọ 79 kwara arịrị, sị: “Ihe kasị atụ m ụjọ bụ ịdị na-echefukarị ihe.” Dị ka ọtụtụ ndị agadi na-eme, Hans malitere ichegbu onwe ya banyere nchefu ọ na-echefukarị ihe. Nchegbu ya bụ na ihe ahụ otu onye na-agụ uri n’oge ochie kpọrọ “ọkwá ọlaedo”—ụbụrụ dị oké ọnụ ahịa na ihe ndị dị na ya—na-achọ ifunahụ ya. (Eklisiastis 12:6) Hans jụrụ, sị, “Ọ̀ bụ iwu na mmadụ mewe agadi, ikike ụbụrụ ya nwere ịrụ ọrụ ga-ebelatarịrị?”

Ọ bụrụ na i chefuola aha ndị mmadụ dị ka Hans mere, ma ọ bụ na-eche na ihe ndị ahụ ị na-echefu na-egosi na ị na-achọ inwe ezigbo nsogbu n’ụbụrụ, biko buru nke a n’obi: Ndị nọ n’afọ ndụ nile na-echefu ihe, mgbanwe ndị agadi pụrụ inwe n’otú ụbụrụ ha si arụ ọrụ adịkebeghịkwa egosi na isi ezuchaghịzi ha okè. * Dr. Michael T. Levy, bụ́ onyeisi oche nke ngalaba na-ahụ maka akparamàgwà mmadụ n’ụlọ ọgwụ Staten Island University Hospital nke dị na New York, dere na ọ bụ ezie na a na-ahụkarị ndị na-echefu ihe ma ha mewe agadi, “ihe ka ọtụtụ ná ndị agadi na-ebicha ndụ ha n’enweghị ụdị nsogbu ụbụrụ a na-enwekarị n’oge agadi.”

N’eziokwu, ndị na-emebeghị agadi na-echeta ihe ngwa ngwa karịa ndị agadi. Ma, Richard Restak, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ụbụrụ, kwuru, sị: “E wepụ oge ọ na-ewe ha iji cheta ihe, ndị agadi na-echetakwa ihe otú ndị na-emebeghị agadi si echeta.” N’ezie, ọ bụrụ na a zụọ ya nke ọma, ụbụrụ ndị agadi, bụ́ nke na-enweghị nsogbu, na-anọgide na-amụta ihe, na-echeta ihe, na ọbụna na-amụta imetakwu ihe ụfọdụ nke ọma.

Nsogbu nke Ichefu Ihe na Ọrịa Ndị A Pụrụ Ịgwọta Agwọta

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na nsogbu mmadụ na-enwe n’icheta ihe aka njọ? Ọ dịgodị otú ahụ, onye ahụ ekwesịghị ikwu ozugbo na ya enwewela ụdị nsogbu ụbụrụ a na-enwekarị n’oge agadi. Ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ a pụrụ ịgwọta agwọta, bụ́ ndị a na-arịa n’oge agadi, pụrụ ime ka o siere mmadụ ike icheta ihe, kpatakwara ya uche mkpasasị na mberede. Ndị mmadụ—nakwa mgbe ụfọdụ, ọbụna ndị dọkịta na-amachaghị banyere ya—na-ewerekarị nsogbu ndị dị otú ahụ dị ka “ịka nká” ma ọ bụ “ọrịa ndị agadi.” Ọ bụghị nanị na nke a na-eweda ndị agadi ala, kama ọ pụkwara ime ka ụdị ọgwụgwọ a ga-enye ha ghara ime ka nsogbu ahụ laa. Olee ihe pụrụ ịbụ ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ahụ?

Ihe ndị nwere ike ịkpatara mmadụ uche mkpasasị na mberede bụ erighị nri ndị na-edozi ahụ́, mmiri ịgwụ ya n’ahụ́, ọbara ịkọ ya n’ahụ́, ya imerụ ahụ́ n’isi, ya inwe nsogbu n’akpịrị, vitamin ịkọ ya n’ahụ́, nsogbu ọgwụ ọ ṅụrụ kpataara ya, ma ọ bụ nkwaga ọ kwagara ebe ọzọ. Nchekasị nwere ike ime ka mmadụ na-echefukarị ihe, a makwa nje ama dị ka ihe na-akpatara ndị agadi uche mkpasasị. Ịda mbà n’obi pụkwara ime ka ndị agadi na-echefukarị ihe, ọ pụkwara ịkpatara ha uche mkpasasị. N’ihi ya, Dr. Levy na-adụ ọdụ na “ọ bụrụ na onye agadi enwewe uche mkpasasị, e kwesịghị ileghara nsogbu ya ahụ anya ma ọ bụ were ya dị ka ọrịa ndị agadi nke na-abaghị uru ịgwọwa.” Ọ bụrụ na ndị dọkịta elee ya ahụ́ nke ọma, ha nwere ike ịchọpụta ihe kpatara nsogbu ahụ.

Ịnagide Ịda Mbà n’Obi

Ịda mbà n’obi abụghịrị ụmụ mmadụ, ọbụna ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ihe ọhụrụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Na-agụgụnụ mkpụrụ obi ndị dara mbà.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) N’oge anyị a nke nchekasị jupụtara na ya, ọ dị mkpa ime otú ahụ ọbụna karị. Ma, ọ bụ ihe mwute na mgbe mgbe, ma ọ́ bụghị na a chọpụtaghị na ndị agadi dara mbà n’obi, ya abụrụ na e weere ya dị ka ihe ọzọ.

N’ihi echiche na-ezighị ezi a na-enwekarị nke bụ́ na mmadụ na-enwekarị nkụda mmụọ na obi ilu ma o mewe agadi, ndị ọzọ nakwa ndị agadi n’onwe ha, pụrụ iwere nsogbu ahụ dị ka ihe ndị a na-ahụkarị ma mmadụ mewe agadi. “Ma, nke ahụ abụghị eziokwu. Ịda mbà n’obi esoghị n’ihe ndị a na-ahụkarị ma mmadụ mewe agadi,” ka akwụkwọ bụ́ Treating the Elderly, na-ekwu.

Mmadụ ịda mbà n’obi ruo ogologo oge—nke dị iche n’inwe obi ilu ma ọ bụ ihu mgbarụ nkịtị—bụ nnukwu ọrịa nke nwere ike ịkpata nnukwu ọdachi. E kwesịghịkwa ileghara ya anya. Ọ bụrụ na a hapụ ịgwọ mmadụ mgbe ọ dara mbà n’obi, ọ pụrụ ịka nnọọ njọ nke na ụfọdụ ndị nọ ná nsogbu a na-ekpebi igbu onwe ha. Dị ka Dr. Levy si kwuo, ihe kasị abụ nsogbu ma ndị agadi daa mbà n’obi bụ na “ụdị nsogbu ụbụrụ ndị kasị mfe ọgwụgwọ nwere ike bụrụ nke ga-akasị egbu ha.” Ọ bụrụ na onye agadi anọgide na-ada mbà n’obi, ọ pụrụ ịdị mkpa ka dọkịta ma nke a na-akọ n’ịgwọ ọrịa uche, gwọọ ya. *Mak 2:17.

Ndị dara mbà n’obi pụrụ ijide n’aka na Jehova “nwere mmetụta dị nnọọ nro, na-emekwa ebere.” (Jems 5:11) Ọ “nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa.” (Abụ Ọma 34:18) N’ezie, ọ bụ ya kacha ‘akasi ndị e wedara n’ala obi.’—2 Ndị Kọrint 7:6.

Ọ Dịghị Mkpa Ichewe na Ị Baghị Uru

N’ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, Eze Devid kwesịrị ntụkwasị obi kpere ekpere, sị: “Atụfula m na mgbe agadi; mgbe ike m gwụsịrị ahapụla m.” (Abụ Ọma 71:9) Ọbụna na narị afọ nke 21, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ na ndị agadi egwu na-atụ na a gaghịzi ewere ha dị ka ndị bara uru, na-enwekwa mmetụta yiri nke ahụ. Ihe ọzọ na-esokarị eme ka mmadụ chewe na ya abaghịzi n’ihe bụ mgbe ọrịa mere ka ọ gharazie inwe ike ime ihe ụfọdụ. Mmadụ ịla ezumike nká n’ike pụkwara ime ka o chewe na ya abaghịzi uru.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ihe ndị anyị ga-emeli kama ịdị na-ekwe ka ihe ndị anyị na-agaghịzi emeli na-akpatara anyị nkụda mmụọ, anyị pụrụ ịnọgide na-ahụ onwe anyị dị ka ndị ka bara uru. A bịa na nke a, otu akụkọ e si n’aka òtù UN nweta tụrụ aro na ndị agadi pụrụ ‘ịnọgide na-eto eto site n’ịdị na-amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ụzọ ndị ọzọ, site n’isonye n’òtù ụfọdụ e nwere n’obodo, nakwa site n’iso na-eme ihe omume okpukpe.’ Ernest, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova si Switzerland, onye bụ́ ọkà n’ime bred, onye lakwarala ezumike nká, so ná ndị ritere uru ‘n’ịnọgide na-eto eto site n’ịmụ ihe.’ Mgbe ọ dị afọ iri asaa na ụma, o kpebiri ịzụta kọmputa na ịmụ otú e si eji ya eme ihe. Gịnị mere o ji mee otú ahụ ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị ọgbọ ya na-atụ ngwá nkà na ụzụ ụjọ? Ọ kọwara, sị: “Ihe mbụ m ji mee ya bụ ka uche m wee nọgide na-arụ ọrụ ka m na-eme agadi. Nke abụọ bụ iji mee ka m ka nwee ike ịma otú e si eji ngwá nkà na ụzụ eme ihe. Nke a pụrụ inyere m aka mgbe m na-eme nnyocha na Bible, nyekwara m aka n’ọrụ m na-arụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst.”

Ọ bụrụ na ndị agadi ana-arụ ọrụ ndị bara uru, ọ pụrụ igbo ọtụtụ mkpa ndị bụ́ isi ha na-enwe: Ọ na-eme ka ha ghọta na ha bara uru ná ndụ, ọ na-enyekwa ha afọ ojuju, ọbụna na-eme ka ha nwetatụ ego. Eze Solomọn maara ihe kwuru na mmadụ ‘ịṅụrị ọṅụ, ime ezi ihe n’ogologo ndụ ya, iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịhụ ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ,’ bụ onyinye Chineke.—Eklisiastis 3:12, 13.

Ime Otú Ike Anyị Ha

N’ọtụtụ obodo, ọ bụ ndị agadi na-enye ndị ka na-eto eto ihe ọmụma, na-akụzikwara ha ka ha na-eme omume ọma ma na-akpa àgwà ndị na-amasị Chineke. Eze Devid dere, sị: “Ọbụna ruo agadi na isi awọ ahapụla m, Chineke; ruo mgbe m ga-egosi ọgbọ ọzọ ogwe aka Gị, gosikwa onye ọ bụla nke ga-abịa ịdị ike Gị.”—Abụ Ọma 71:18.

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ọrịa ma ọ bụ ọnọdụ ndị agadi nọ na ya emee ka ihe ndị ha na-emeli belata nke ukwuu? Ọnọdụ ọjọọ a kpasuru Sarah, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nke dị afọ 79, iwe. Ọ kọkwaara otu okenye ọgbakọ nkụda mmụọ ọ na-enwe. Okenye ahụ chetaara ya ụkpụrụ Bible bụ́ na ‘arịrịọ nke onye ezi omume na-arịọsi ike nwere ike dị ukwuu.’ (Jems 5:16) Okenye ahụ gwara ya, sị: “N’ime ọtụtụ afọ garala aga, gị na Chineke anọrọla na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ugbu a, ị pụrụ ime ka anyị rite uru ná mmekọrịta ahụ site n’ịdị na-etinye anyị n’ekpere mgbe ị na-ekpe ekpere n’onwe gị.” Obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu mgbe okenye ahụ gwara ya, sị, “Sarah, ọ dị anyị mkpa ka ị na-etinye anyị n’ekpere.”

Dị ka Sarah ghọtara, ekpere bụ otu ụzọ dị mma ọtụtụ ndị agadi pụrụ isi na-arụsị ọrụ ike kwa ụbọchị maka ọdịmma nke ndị ọzọ. (Ndị Kọlọsi 4:12; 1 Timoti 5:5) N’otu mgbe ahụ, ekpere ndị dị otú ahụ na-enyere ndị agadi na-ekwesị ntụkwasị obi aka ịbịarukwu “Onye na-anụ ekpere,” bụ́ Jehova, nso.—Abụ Ọma 65:2; Mak 11:24.

Ndị agadi ọnọdụ ha na-adịghịzi ekwe ka ha mee ihe ndị ha gaara achọ ime, bụ́kwa ndị ji ahụmahụ ha na ihe ndị ha nwere enyere ndị ọzọ aka, na-abara nnọọ ndị obodo ha uru. Ha na-agba akaebe na “okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.”—Ilu 16:31.

Ma, ọ pụrụ ịbụ ihe dabara adaba ịjụ, sị: Gịnị ka ọdịnihu ga-abụrụ anyị ka anyị na-agbadakwu n’afọ ndụ? Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na anyị pụrụ ibi ndụ ka mma ma anyị katakwuo ahụ́?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta na-ekwu na “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 90 nke ndị nile gaferela afọ 65 adịghị enwe ụdị nsogbu ụbụrụ a na-enwekarị n’oge agadi.” Iji matakwuo otú e si agwọ nsogbu ụbụrụ a a na-enwekarị n’oge agadi, biko lee usoro isiokwu bụ́ “Ọrịa Alzheimer—Ime Ka Ihe Mgbu Ya Belata,” nke dị na Teta! (Bekee) nke September 22, 1998.

^ par. 13 Teta! adịghị akwado ụdị usoro ọgwụgwọ ọ bụla. Ndị Kraịst kwesịrị ijide n’aka na ọgwụgwọ ọ bụla ha na-anata emegideghị ụkpụrụ Bible. Biko lee usoro isiokwu bụ́ “Ịghọta Nsogbu Mgbanwe Mberede n’Ọnọdụ Uche,” nke dị na Teta! nke January 8, 2004.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Ọ na-adịkarị ndị agadi ka à na-eleghara ha anya n’ụwa anyị a nke e ji ndụ gbalụ gbalụ mara

[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]

Otú Ị Pụrụ Isi Nyere Ndị Agadi Aka

Na-akwanyere Ha Ùgwù. “Abarala okenye oké mba, kama na-arịọ ya arịrịọ dị ka nna; . . . ndị inyom, ndị bụ́ okenye, dị ka ndị nne.”—1 Timoti 5:1, 2, Union Igbo Version.

Na-ege Ha Ntị nke Ọma. “[Dị] ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu, ghara ịdị ngwa n’inwe ọnụma.”—Jems 1:19.

Na-egosi Ha Mmetụta Ọmịiko. “Ka unu nile nwee otu obi, na-egosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna, na-enwe obi ọmịiko, na-adị umeala n’obi, ghara ịkwụghachi ihe ọjọọ maka ihe ọjọọ, nkwujọ maka nkwujọ.”—1 Pita 3:8, 9.

Mara Mgbe Agbamume Dị Ha Mkpa. “Mkpụrụ osisi apụl ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ.”—Ilu 25:11.

Na-akpọ Ha Ka Ha Sonyere Gị n’Ihe Ụfọdụ Ị Na-eme. “Na-agbasonụ omume nke ile ọbịa.”—Ndị Rom 12:13.

Na-enyere Ha Aka n’Ụzọ Ihe Onwunwe. “Onye ọ bụla nwere ihe ụwa a ndị e ji akwado ndụ ma hụ nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa ma mechibidokwa ya ọnụ ụzọ nke obi ọmịiko ya, n’ụzọ dị aṅaa ka ịhụnanya maka Chineke si adịgide n’ime ya? Ụmụntakịrị, ka anyị na-ahụ n’anya, ọ bụghị n’okwu ma ọ bụ site n’ire, kama n’omume na n’eziokwu.”—1 Jọn 3:17, 18.

Na-atachiri Ha Obi. “Yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 3:12.

Site n’ilekọta ndị agadi, anyị na-agbaso ụkpụrụ Chineke ji aka ya setịpụ, n’ihi na Okwu ya na-ekwu, sị: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ.”—Levitikọs 19:32.

[Foto dị na peeji nke 22]

Ọ pụrụ ịba uru ka dọkịta lee ya ahụ́ nke ọma