Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Anyị Aka Ichebe Ụmụ Anyị

Ihe Ga-enyere Anyị Aka Ichebe Ụmụ Anyị

Ihe Ga-enyere Anyị Aka Ichebe Ụmụ Anyị

N’afọ gara aga, otu nwanyị bi na Virginia, U.S.A., detara akwụkwọ ozi iji kwupụta ekele o nwere maka akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. O dere, sị: “Tupu ụmụ ụmụ m alakpuo ụra, ha na-agwa m, sị: ‘Nne nne, gụọrọ anyị otu akụkọ site n’akwụkwọ Jizọs ahụ.’ Ha dị afọ 4, afọ 6, na afọ 7, akụkọ ndị ahụ na-atọkwa ha ụtọ nke ukwuu.”

Nwanyị ahụ kọwara, sị: “Agụụrụ m ha isi nke 32 nke isiokwu ya bụ ‘Otú E Si Chebe Jizọs.’ Nke a masịrị m nke ukwuu n’ihi na mgbe isiokwu ahụ kwusịrị otú Jehova si chebe Jizọs, o nyeziri ndụmọdụ ndị bara uru ga-enyere ndị na-eto eto aka ichebe onwe ha. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwaa ime ya, gwa ya n’olu dara ụda, n’ụzọ na-egosi na ị naghị egwu egwu, sị:“Kwụsị ya! Aga m akọrọ ndị ọzọ ihe ị na-eme m!”’”

Na Mexico, nne otu nwatakịrị nwanyị dị afọ ise nke aha ya bụ Betsaịda kwuru na nke a bụ nke ugboro abụọ ya na-agụrụ nwa ya nwanyị akwụkwọ Onye Ozizi. Nne Betsaịda kwuru, sị: “Ụwa na-emikpuwanye n’omume rụrụ arụ, ụmụ anyị na-echekwa ihe ịma aka ndị ka ibe ya ihu. Nwa m nwanyị sịrị na ya nwere ekele maka ndụmọdụ o nwetara banyere ụzọ ọ ga-esi chebe onwe ya pụọ ná mmetụta ọjọọ dị ka ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’isi nke 32.”

Akwụkwọ a dị peeji 256, nke nwekwara ọmarịcha ihe osise, bụ́ nke nke ọ bụla n’ime peeji ya hà ka nke magazin a, enyeworo ndị nne na nna aka ịgbaso nduzi Bible n’ịzụlite ụmụ ha. (Ilu 22:6) E ji okwu ndị dị mfe kọọ ihe mmụta ndị dị na ya, bụ́ ndị dabeere n’ozizi Jizọs Kraịst; n’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndị e dere na ya bụ maka ndị nọ n’afọ ndụ dị nile. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.