Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Ike Okorobịa Ruo Mgbe Ebighị Ebi!

Inwe Ike Okorobịa Ruo Mgbe Ebighị Ebi!

Inwe Ike Okorobịa Ruo Mgbe Ebighị Ebi!

Ọ FỌRỌ nnọọ obere oge ka nwoke ahụ nọ n’akụkụ Jizọs nwụọ. N’ihi ya, ọ rịọrọ, sị: “Jizọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Jizọs zara ya, sị: “N’ezie asị m gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:42, 43) N’ezie, ọ bụghị na nwoke a a na-ekwughị aha ya emeela agadi ma na-aga ịnwụ n’ihi ọrịa; a na-egbu ya n’ihi mpụ o mere. Ma, ndị agadi pụrụ inweta agbamume dị ukwuu site n’ọnọdụ ọjọọ ya ahụ.

Ọ bụrụ na anyị echebara obi ike na-enweghị atụ nwoke ahụ nwere echiche, ọ na-adọrọ nnọọ mmasị anyị! Ọ bụ ezie na Jizọs nọ na-anwụ n’elu osisi ịta ahụhụ dị n’akụkụ ya, nwoke ahụ enweghị obi abụọ na Jizọs ga-achịrịrị dị ka Eze n’Alaeze Chineke. Obi ya gwakwara ya na, otu ụbọchị, Jizọs nwere ike icheta ya ma menyere ya. Chegodị nnọọ echiche—nwoke ahụ a mara ikpe ọnwụ ga-ebili n’ọnwụ baa na paradaịs dị ebube, bụ́ nke Jizọs ga-abụ Eze na ya!

Ụmụ mmadụ nọ n’ọnọdụ yiri nke onye mmehie ahụ na-anwụ anwụ. N’ụzọ dị aṅaa? N’agbanyeghị afọ ndụ anyị, anyị nile na-akwụ ụgwọ mmehie anyị, nzọpụta dịkwa anyị mkpa. (Ndị Rom 5:12) Dị ka onye omekome ahụ, anyị pụrụ inwe olileanya na Kraịst Jizọs ga-enyere anyị aka—ọbụna olileanya nke inwere onwe anyị pụọ ná nsogbu ndị dị mwute a na-enwe n’oge agadi! N’ezie, Jizọs emeela ka ụmụ mmadụ nwee olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs, bụ́ ebe ahụ́ ha na ụbụrụ ha ga-ezu okè.—Jọn 3:16, 36.

Ihe Nile Ga-adị Ọhụrụ Maka Ndị Agadi na Ụmụaka

N’Alaeze Kraịst, ‘ịba ụba nke udo ga-atọ ndị ga-ebi n’ụwa ụtọ.’ (Abụ Ọma 37:11) Ọ dịghị onye ga-asị: “Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Nkwarụ ọ bụla anyị nwere ugbu a ga-ala, n’ihi na “onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 35:6) Ndị agadi ga-enwetaghachi ike okorobịa ha; anụ ahụ́ ha ga-adịkwa “ọhụrụ karịa nke nwata.”—Job 33:25.

Ma, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya inwewe olileanya dị otú ahụ? Chegodị echiche banyere Onye mere ka nwoke ahụ na-anwụ anwụ nwee olileanya nke ibi na Paradaịs. Ọtụtụ ugboro, ndị mmadụ kpọtaara Jizọs ndị ngwụrọ, ndị nwere nkwarụ, ndị ìsì, na ndị ntị chiri ka ọ gwọọ ha. O ji obi ya nile gwọọ “ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla.” (Matiu 9:35, 36; 15:30, 31; Mak 1:40-42) N’ụzọ a na-ahụ anya, o gosiri ihe Alaeze ya ga-arụzu. Jizọs kpọlitedịrị ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Luk 7:11-17; Jọn 11:38-44) Site n’ime nke ahụ, o mesikwuru nkwa ahụ o kwere ike, nke bụ́ na “ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.”—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.

Weregodị anya nke uche gị hụ ebe i si n’ọnwụ bilie na Paradaịs ma nwee ahụ́ ọhụrụ, na-ahụ ụzọ nke ọma, na-anụ ube nnụnụ na olu ndị na-enwe aṅụrị, aka na ụkwụ gị adịghịzi egbu gị mgbu, uche gị ezuokwa nnọọ okè. ‘Ụbọchị ọjọọ’ mmadụ na-enwe ma o mewe agadi ga-ala kpamkpam. (Eklisiastis 12:1-7; Aịsaịa 35:5, 6) A ga-emekwa ka ọbụna ọnwụ “ghara ịdị irè”—‘a ga-eloda ya ruo mgbe ebighị ebi.’—1 Ndị Kọrint 15:26, 54.

Ọ bụrụ na anyị ejiri amụma Bible tụlee ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a, anyị ga-ahụ na oge ihe anyị maara taa dị ka ime agadi ga-abịa na njedebe ji nnọọ ọsọ na-akpụdewe nso. (Matiu 24:7, 12, 14; Luk 21:11; 2 Timoti 3:1-5) Oge eruwela mgbe ndị agadi, bụ́ ndị gosipụtara okwukwe n’ebe Chineke nọ ma jeere ya ozi, ga-enwetaghachi ike okorobịa ha—ma, nke ugbu a ga-abụ ruo mgbe ebighị ebi!

[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]

Jiri Ụbụrụ Gị ahụ Rụọ Ọrụ!

Dị nnọọ ka mmega ahụ́ nkịtị si eme ka uru ahụ́ sikwuo ike, otú ahụ ka iji ụbụrụ arụ ọrụ si azụ ụbụrụ. Iji kpalie ụbụrụ ịrụ ọrụ, anyị kwesịrị ịdị na-eme ihe ọhụrụ. Ihe ndị na-esonụ bụ ihe ụfọdụ ọ ga-abụ anyị na-eme, ụbụrụ anyị ana-aghọkwu nkọ:

▪ Malite ịdị na-enwe mmasị n’ihe ndị ọhụrụ, dị ka ise ihe osise, ịkpụ ihe ọkpụkpụ, na egwuregwu a jụọ a zaa; mụọ asụsụ ọzọ.

▪ Soro ndị dị iche iche na-emekọ ihe; soro ha na-akpakọ ma na-ekwurịta okwu iji mee ka ndụ ghara ịgbụ gị nakwa iji mee ka ụbụrụ gị na-aghọkwu nkọ.

▪ Na-ekere òkè n’ihe ime mmụọ. “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

▪ Na-agụ ezigbo akwụkwọ; na-akọrọ mmadụ ihe ị gụtara.

▪ Na-agbalị icheta na ịkọrọ mmadụ akụkọ ụwa i getara na redio ma ọ bụ na TV iji tinye ụbụrụ gị n’ọrụ nke icheta ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya na ndị mere na nso nso a.

▪ Jiri aka ekpe gị ma ọ bụrụ na ị na-eme aka nri ma ọ bụkwanụ aka nri gị ma ọ bụrụ na ị na-eme aka ekpe na-agbanye TV, na-aza fon, ma ọ bụ na-asa ezé gị.

▪ Jiri akụkụ ahụ́ nile i ji amata ihe ndị na-emenụ, dị ka anya, imi, ntị na-eme ihe kwa ụbọchị ruo ókè o kwere mee.

▪ Mụọ banyere ebe ndị mara mma ma gaa ebe ndị ahụ, ma hà dị anya ma hà dị nso.

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

Nkwa Jizọs kwere bụ na ụdị ime agadi nke na-akpata ahụ́ mgbu ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. A ga-eme ka ndị agadi nwetaghachi ike okorobịa ha ruo mgbe ebighị ebi