Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Elu Obe n’Eziokwu?

Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Elu Obe n’Eziokwu?

Echiche Nke Bible

Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Elu Obe n’Eziokwu?

OBE bụ otu n’ime ihe ndị a kasị mara amara e ji ekpe okpukpe. Ọtụtụ nde mmadụ na-asọpụrụ ya nke ukwuu, na-ewere ya dị ka ihe dị nsọ nke a kpọgburu Jizọs na ya. Adolphe-Napoleon Didron bụ́ onye Roman Katọlik na-ede akwụkwọ, bụrụkwa ọkà n’ịmụ ihe mgbe ochie, kwuru, sị: “E feela obe ofufe yiri nke a na-efe Kraịst, ma ọ bụrụkwarị na ofufe a na-efe obe aharughị ka nke a na-efe Kraịst; a na-efe osisi a dị nsọ ofufe fọrọ nnọọ nke nta ka ọ haruo ka nke a na-efe Chineke n’Onwe Ya.”

Ụfọdụ na-ekwu na obe na-eme ka ọ̀ dị ha ka hà nọkwu Chineke nso mgbe ha na-ekpe ekpere. Ndị ọzọ na-eji ya emere ọtụmọkpọ, na-eche na ọ na-echebe ha ka ihe ọjọọ ghara ịdakwasị ha. Ma, Ndị Kraịst hà kwesịrị ife obe ofufe? Jizọs ọ̀ nwụrụ n’elu obe n’eziokwu? Gịnị ka Bible na-akụzi n’okwu a?

Gịnị Ka Obe Na-anọchi Anya Ya?

Ogologo oge tupu oge Ndị Kraịst, ndị Babịlọn oge ochie na-eji obe efe chi ọmụmụ, bụ́ Tammuz. Ndị Ijipt, India, Siria, na China malitekwara iji obe eme ihe. E mesịa, ka ọtụtụ narị afọ gasịrị, ndị Izrel bịara jiri ofufe nke chi ụgha bụ́ Tammuz gwagbuo ofufe ha na-efe Jehova. Bible na-akpọ ụdị ofufe a “ihe arụ.”—Ezikiel 8:13, 14.

Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn ji okwu Grik bụ́ stau·rosʹ mee ihe mgbe ha na-ekwu banyere ihe e ji kpọgbuo Jizọs. (Matiu 27:40; Mak 15:30; Luk 23:26) Okwu ahụ bụ́ stau·rosʹ na-ezo aka na poolu ma ọ bụ osisi kwụ ọtọ. Akwụkwọ bụ́ The Non-Christian Cross, nke J. D. Parsons dere, na-akọwa, sị: “Ọ dịghị otu ahịrịokwu dị na nke ọ bụla n’ime ọtụtụ akwụkwọ mejupụtara Agba Ọhụrụ e dere n’asụsụ Grik oge ochie, nke nyetụrụ echiche na stauros a kpọgburu Jizọs na ya nwere ihe ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị stauros nkịtị; ma ya fọdụkwa inye echiche na ọ bụ osisi abụọ e ji ntú kụkọta ọnụ kama ịbụ otu osisi.”

Dị ka e dekọrọ n’Ọrụ 5:30, Pita onyeozi ji okwu bụ́ xyʹlon, nke pụtara “osisi,” mee ihe dị ka okwu ya na stau·rosʹ pụtara otu ihe. Nke a na-egosi na ọ bụ osisi nkịtị ma ọ bụ osisi kwụ ọtọ, ọ bụghị osisi abụọ a kụkọtara ọnụ ka ọ ghọọ obe. Ọ bụ ihe dị ka narị afọ atọ Jizọs nwụsịrị ka ụfọdụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst malitere izi ozizi bụ́ na a kpọgburu Jizọs n’elu obe, bụ́ osisi abụọ a kụkọtara ọnụ. Otú ọ dị, ozizi a dabeere n’ọdịbendị, nakwa n’ojiji e ji okwu Grik bụ́ stau·rosʹ mee ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Ọ dị mma ịmara na ụfọdụ ihe osise oge ochie, bụ́ ndị na-egosi otú ndị Rom si gbuo ndị mmadụ, gosiri ebe ndị a kwụgburu ndị mmadụ n’elu osisi kwụ ọtọ.

“Cheenụ Onwe Unu Nche Pụọ n’Arụsị”

Ihe kwesịrị ịdị ezi Ndị Kraịst mkpa karịa bụ ịma ma ò kwesịrị ekwesị ife ihe e ji gbuo Jizọs ofufe. Ọ sọ ya ya bụrụ osisi ịta ahụhụ nke kwụ ọtọ, obe, akụ́, ube, ma ọ bụ mma, è kwesịrị iji ya efe ofufe?

Were ya na e ji obi ọjọọ gbuo onye ị hụrụ n’anya, e wetakwa ihe e jiri gbuo ya n’ụlọikpe dị ka ihe akaebe na-egosi na e gburu ya. Ị̀ ga-agbalị inweta ihe ahụ e ji gbuo onye ị hụrụ n’anya, see ya foto, saa foto ahụ ebe o buru ibu iji kesaa ya? Ị̀ ga-emepụta ihe ahụ n’ụdị ya dị iche iche? Ị̀ ga-abịazi mepụta ọla ndị yiri ihe ahụ e ji gbuo ya? Ma ọ bụkwanụ, ị̀ ga-emepụta ya ebe o buru ibu ma resịwa ya ndị ikwu na ibe gị ka ha fewe ya ofufe? O yiri ka ị gaghị echetụ ime ihe dị otú a n’echiche! Ma, ọ bụ nnọọ ihe ndị a ka ndị mmadụ ji obe na-eme!

E wezụga nke ahụ, iji obe efe ofufe na iji ihe a kpụrụ akpụ efe ofufe bụ otu ihe, Bible katọkwara omume dị otú ahụ. (Ọpụpụ 20:2-5; Deuterọnọmi 4:25, 26) Jọn onyeozi kwuru ihe kwekọrọ nnọọ n’ozizi nke ndị ji ezi obi eso ụzọ Kraịst mgbe ọ dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ, sị: “Cheenụ onwe unu nche pụọ n’arụsị.” (1 Jọn 5:21) Ha mere nke a ọbụna mgbe ọ pụtara na ha ga-anwụ n’ọgbọ egwuregwu ndị Rom.

Otú ọ dị, Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ji ọnwụ Kraịst nwụrụ iji chụọ àjà kpọrọ oké ihe. Taakwa, ọ bụ ezie na ezi Ndị Kraịst ekwesịghị ife ihe e ji taa Jizọs ahụhụ ma gbuo ya ofufe, ha na-echeta ọnwụ Jizọs dị ka ụzọ Chineke si wetara ụmụ mmadụ na-ezughị okè nzọpụta. (Matiu 20:28) Ụzọ a kasịnụ Chineke si gosipụta ịhụnanya ya ga-ewetara ndị hụrụ eziokwu n’anya ọtụtụ ngọzi, nke gụnyere olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3; Mkpughe 21:3, 4.

[Foto dị na peeji nke 30]

Ụfọdụ ihe osise oge ochie na-egosi na ndị Rom ji osisi kwụ ọtọ akpọgbu mmadụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Rare Books Division, The New York Public Library, Astor, Lenox and Tilden Foundations