Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Enyi A Na-emete n’Ụlọ Akwụkwọ—Olee Ókè Ọ Ga-eru Ya Abụrụ na A Kpachiwela Anya?

Ndị Enyi A Na-emete n’Ụlọ Akwụkwọ—Olee Ókè Ọ Ga-eru Ya Abụrụ na A Kpachiwela Anya?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Ndị Enyi A Na-emete n’Ụlọ Akwụkwọ—Olee Ókè Ọ Ga-eru Ya Abụrụ na A Kpachiwela Anya?

“Ụmụ akwụkwọ ibe m na-ekwukarị banyere otú ha si kporikọọ ndụ ọnụ ná ngwụsị izu. Ọ na-abịa dị m nnọọ ka m nọ nanị m.”—Michelle. *

“Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ m hụ ebe ụmụaka nọkọtara ọnụ, mụ ana-eche, sị, ‘Chei, ndị a bụ nnọọ ezigbo ndị enyi. Achọrọ m isonyere ha.’”—Joe.

“Imete enyi n’ụlọ akwụkwọ abụghịrị m nsogbu. Ọ naghị ara m ahụ́. Ọ bụkwa ya bụ nsogbu m na-enwe.”—Maria.

GỊ NA ụmụ akwụkwọ ibe gị na-anọkarị n’ụbọchị. Ị na-enwe ọtụtụ n’ime ụdị ihe ịma aka, nkụda mmụọ, na ihe ịga nke ọma ha na-enwe. N’ụzọ ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị ka ihe ọ̀ na-adabara gị na ha karịa ka o si adabara gị na ndị mụrụ gị, ụmụnne gị, ma ọ bụ Ndị Kraịst ibe gị. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na o nwere ike ịdị gị ka gị na ha bụrụ enyi. Nke ahụ ọ̀ dị njọ? È nwere nsogbu ndị na-esi na ya apụta? A bịa n’enyi ndị a na-emete n’ụlọ akwụkwọ, olee ókè ọ ga-eru ya abụrụ na a kpachiwela anya? Olee ebe mkpakọrịta gị na ha kwesịrị ijedebe?

Ahụ́ Gị Chọrọ Ndị Enyi

Ọ dị onye ọ bụla mkpa inwe ndị enyi—ndị pụrụ iso ha kporie ndụ ma ihe dịrị ha mma, gbatakwara ha ọsọ enyemaka ma ihe siwere ha ike. Jizọs nwere ndị enyi, obi na-adịkwa ya ụtọ ma ya na ha nọrọ. (Jọn 15:15) Mgbe e mesịrị, ka Jizọs nọ na-anwụ n’elu osisi ịta ahụhụ, ezigbo enyi ya bụ́ Jọn, bụ́ “onye . . . na-eso ụzọ ya [nke ọ kasị hụ] n’anya,” nọ ya nnọọ nso. (Jọn 19:25-27; 21:20) Ahụ́ gị chọrọ ndị enyi dị otú ahụ—ndị ga-anọ gị nso ma ihe siwere gị ike. Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.”—Ilu 17:17.

Ikekwe, obi gị na-agwa gị na i nwetala onye dị otú ahụ n’ụlọ akwụkwọ, otu n’ime ụmụ klas unu nke ihe na-adabara gị na ya. Otu ụdị ihe na-amasị unu, obi na-adịkwa unu ụtọ mgbe unu abụọ na-akparịta ụka. N’ezie, o nwere ike ịbụ na onye ahụ abụghị onye kwere ekwe ibe gị; ma dị ka i si ele ya anya, iso ya na-akpa abụghịkwa “mkpakọrịta ọjọọ.” (1 Ndị Kọrint 15:33) N’eziokwu, ụfọdụ ndị ntorobịa n’ekwenyeghị n’ihe ndị i kweere na Bible na-ebi ndụ dị mma. (Ndị Rom 2:14, 15) Ma nke ahụ ọ̀ pụtara na gị na ha kwesịrị ịbụ ezigbo ndị enyi?

Ndị Kraịst Anaghị Asọ Ndị Mmadụ Asọ

O doro anya na ezi Ndị Kraịst anaghị asọ ndị na-ekweghị ekwe asọ. A sị ka e kwuwe ya, iji nwee ike ịrụzu ọrụ ha nke bụ́ ‘ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso Jizọs,’ Ndị Kraịst na-ezi ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị si n’agbụrụ nile, okpukpe nile, na omenala nile ozi ọma. (Matiu 28:19) Ha anaghị agbara ndị agbata obi ha, ndị ọrụ ibe ha, na ụmụ akwụkwọ ibe ha ọsọ, ma ọ bụ jụ iso ha na-emekọ ihe. Kama nke ahụ, Ndị Kraịst na-enwe ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ.

Pọl onyeozi setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a. Ọ maara otú e si eso “ụdị mmadụ nile” ekwurịta okwu, ọ bụ ezie na ha ekweghị n’ihe ndị o kweere. N’ezie, nzube Pọl abụghị iji soro ha na-akpakọ. Kama nke ahụ, o kwuru, sị: “M na-eme ihe nile n’ihi ozi ọma, ka m wee bụrụ onye ya na ndị ọzọ na-ekerịta ya.”—1 Ndị Kọrint 9:22, 23.

Ị pụrụ iṅomi Pọl. Na-emeso ndị ọgbọ gị omume ọma. Mụta iso ha na-ekwurịta okwu nke ọma. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ ibe gị na-achọ inwe otu olileanya ahụ dabeere na Bible i nwere. Tụlee ihe atụ nke otu nwatakịrị nwanyị bụ́ Onye Kraịst nke aha ya bụ Janet. A gwara ya na ụmụ klas ha ka ha dee obere edemede banyere nke ọ bụla n’ime ụmụ klas ha. Mgbe ha desịrị ya, onye nke ọ bụla n’ime ha bịara nwee ike ịgụ ihe ndị ọzọ dere banyere ya onwe ya. Otu n’ime ihe Janet nwetara e dere banyere ya na-agụ, sị: “O yiri ka obi ọ̀ na-adị gị ụtọ mgbe nile. Biko gwa anyị ihe kpatara ya!”

Dị ka ahụmahụ a na-egosi, ụfọdụ n’ime ụmụ klas unu nwere ike ịchọ ịmata banyere ihe ndị i kweere na ha. N’ezie, ọ bara uru imeso ndị dị otú ahụ omume enyi. Obi abụọ adịghị ya na nke a ga-eme ka i nwee ohere ịkọwara ha ihe ndị i kweere na ha. Nyekwa ụmụ klas unu ohere ka ha kwuo echiche ha, ma jiri obi ọcha gee ha ntị mgbe ha na-ekwu okwu. Ahụmahụ i nwetara n’iso ndị ọgbọ gị na-ekwurịta okwu ga-abara gị ezigbo uru ma i mechaa nweta ọrụ ma chọta onwe gị n’ọnọdụ yiri nke ahụ. Ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ụlọ ọrụ, inwe omume enyi ga-enyere gị aka ‘ịchọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe nile.’—Taịtọs 2:10.

Ndị Enyi ‘E Kekọtara n’Ụzọ Na-ekwekọghị Ekwekọ’

N’ezie, e nwere ọdịiche dị na mmadụ na nwa klas ya ịdị ná mma na ya na ya ịbụ ezigbo enyi. Pọl dere, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ.” (2 Ndị Kọrint 6:14) Ka gị na mmadụ wee bụrụ ezigbo enyi, ihe ndị na-amasị gị ga-abụrịrị ihe ndị na-amasị ya, ihe ndị ị na-achụso abụrụkwa ihe ndị ọ na-achụso. Nke a agatụghị ekwe omume ma ọ bụrụ na onye gị na ya na-akpa ekweghị n’ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ otú i si kwere ha, nakwa ma ọ bụrụ na ọ dịghị agbaso ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị na-agbaso. Ikekọta onwe gị n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ n’ebe nwa klas unu na-ekweghị ekwe nọ nwere ike ime ka i tinye aka n’omume ọjọọ ma ọ bụ ya emebie àgwà ndị bara uru i nwere.

Maria chọpụtara na nke a bụ eziokwu mgbe o nwesịrị ahụmahụ dị mwute. Omume enyi ya mere ka ọ na-adịrị ya mfe imete enyi, meekwa ka ọ na-esiri ya ike ịma ebe mkpakọrịta ya na ha kwesịrị ijedebe. O kwuru, sị, “Ọ na-atọ m ụtọ ma ndị mmadụ, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị, nwee mmasị n’ebe m nọ. N’ihi ya, abịara m jiri nke nta nke nta na-adaba ná nnukwu nsogbu nke ụwa a.”

Dị ka Maria, o nwere ike isiri gị ike ịma mgbe gị na onye gị na ya na-ekweghị n’otu ihe malitere ịkpachi anya. Ka o sina dị, ị pụrụ ichebe onwe gị pụọ n’obi mgbawa na-esi na ya apụta site n’ikpebi nke ọma ụdị onye gị na ya ga-adị ná mma na ụdị onye ga-abụ ezigbo enyi gị. Olee otú ị pụrụ isi mee ya?

Otú E Si Emete Ezigbo Ndị Enyi

Dị ka e kwuru na mbụ, Jizọs metere ezigbo ndị enyi mgbe ọ nọ n’ụwa. Jizọs mere nke a site n’ibi ndụ dị mma nakwa site n’ịkọrọ ndị mmadụ banyere Chineke. Ọ bụrụ na ndị mmadụ anabata ozizi ya na otú o si ebi ndụ, ọ na-abịaru ha nso. (Jọn 15:14) Dị ka ihe atụ, mgbe mmadụ anọ gechara okwu Jizọs, o metụrụ ha nnọọ n’ahụ́ nke na ha ‘gbahapụrụ ihe nile ma soro ya.’ Mmadụ anọ a—Pita, Andru, Jems, na Jọn—ghọrọ ezigbo ndị enyi Jizọs.—Luk 5:1-11; Matiu 4:18-22.

Okwu Jizọs na omume ya mere ka ọ pụta ìhè na o ji ihe ndị o kweere kpọrọ ihe, o kwenyesikwara ike na ha. Ndị na-achọghị ịnabata ya na ihe ọ na-akụzi hapụrụ ya, Jizọs hapụkwara ha ka ha gawara onwe ha.—Jọn 6:60-66.

Dị ka ihe atụ, obi eziokwu nke otu nwa okorobịa metụrụ Jizọs n’ahụ́ nke ukwuu. Bible na-ekwu, sị: “Jizọs legidere ya anya ma nwee ịhụnanya n’ebe ọ nọ.” Ma mgbe nwoke ahụ matara ihe Jizọs chọrọ n’aka ndị enyi ya, “ọ pụrụ.” Nwoke ahụ yiri ezigbo mmadụ—n’ezie, Jizọs ‘nwere ịhụnanya n’ebe ọ nọ.’ Ma, Jizọs chọrọ ihe karịrị nke ahụ n’aka ndị enyi ya. (Mak 10:17-22; Matiu 19:16-22) Gịnị banyere gị?

Ihe nwere ike ịdị na-adabara gị na otu nwa akwụkwọ ibe gị. Ma, jụọ onwe gị, sị: ‘Onye a ọ̀ dị njikere ime ihe Jizọs nyere n’iwu? Ọ̀ chọrọ ịmata banyere Jehova, bụ́ onye Jizọs gwara anyị ka anyị fee ofufe?’ (Matiu 4:10) Ka gị na ụmụ klas unu na-ekwurịta okwu, gị ana-ebikwa ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, azịza nke ajụjụ ndị a ga-abịa doo gị anya.

Ọ dị mma ka gị na ụmụ klas unu na-adị ná mma, dị nnọọ ka Jizọs na ụdị mmadụ nile si dị ná mma. Ma Jizọs gbara mbọ ịhụ na ndị bụ́ ezigbo enyi ya hụrụ Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, n’anya. Gị onwe gị pụkwara ime otú ahụ. ‘Nọgide na-eme omume dị mma’ n’ụlọ akwụkwọ, ma jiri nkà na-akọrọ ndị ọzọ banyere ihe ndị i kweere. Karịsịa, jide n’aka na ị họọrọ ụdị ndị enyi kasị mma.—1 Pita 2:12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanweela aha ụfọdụ.

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee nsogbu ndị ị pụrụ ịdaba na ha site n’ịdị na-eso nwa klas gị na-ekweghị ekwe anọrị ma a gbasaa akwụkwọ? Nke ahụ ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ime?

▪ Mgbe ị gụchara isiokwu a, obi gị ọ̀ na-agwa gị na e nwere nwa klas unu gị na ya na-akpachi anya? Ọ bụrụ na e nwere, gịnị ka ị pụrụ ime banyere ya?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17]

OLEE OTÚ M PỤRỤ ISI METE EZIGBO NDỊ ENYI?

Na vidio a Ndịàmà Jehova mepụtara, e gosiri ndị ntorobịa a gbara ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị si United States, Itali, France, na Spen. E nwere ya n’asụsụ 36.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ụfọdụ n’ime ụmụ klas unu nwere ike ịchọ ịmata ihe ndị i kweere na ha