Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Jụ Inwe Mmekọahụ n’Ụlọ Akwụkwọ?

Olee Otú M Ga-esi Jụ Inwe Mmekọahụ n’Ụlọ Akwụkwọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Ga-esi Jụ Inwe Mmekọahụ n’Ụlọ Akwụkwọ?

“Kwa ụbọchị, ụmụaka na-ekwurịta banyere mmekọahụ. Ụmụ agbọghọ na-ejidị ụkwụ ha agakwuru ụmụ okoro ma soro ha na-enwe mmekọahụ kpọmkwem n’ụlọ akwụkwọ. ”—Eileen, ọ dị afọ 16.

“N’ụlọ akwụkwọ anyị, ndị na-edina ụdị onwe ha na-eme ihe ndị rụrụ arụ n’ihu ụmụaka ndị ọzọ. Ha achọghịdị ịma.”—Michael, ọ dị afọ 15. *

ỤMỤ klas unu hà na-ekwurịtakarị banyere mmekọahụ? Ụfọdụ n’ime ha hà na-eme ihe karịrị nanị ikwu ya n’ọnụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịdị gị otú ọ dị otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ụma, bụ́ onye ji ịnọ n’ụlọ akwụkwọ tụnyere “mmadụ ịrụ n’ebe a na-emepụta fim a na-egosi mmekọahụ́ na ya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na, n’ụlọ akwụkwọ, ọtụtụ ndị ntorobịa na-enwekarị ohere nke ikwurịta banyere mmekọahụ—ma ọ bụ, ọbụna nke inwe ya enwe.

Ị pụrụ ịnụ ka ụmụ klas unu na-ekwu banyere “iri ọrụ”—nke pụtara nwoke na nwanyị inwe mmekọahụ n’enyeghị ibe ha obi ha. Mgbe ụfọdụ, ndị na-eto eto na-eso ndị ha na-amachaghị eme ya. Mgbe ụfọdụ kwa, ha na-agakwuru onye ha na-amatụghịdị, nke ha na ya kwurịtara n’Intanet, iji nwee mmekọahụ. Ụdị onye ọ sọkwara ha na ha mee ya, nzube ha ji eme ya bụ iji soro ndị ọzọ nwee mmekọahụ n’enyeghị ndị ahụ obi ha. Danielle nke dị afọ 19 kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ ọ pụtara karịa mmadụ abụọ imejụ ọchịchọ anụ ahụ́ ha.”

Ọ bụghị ihe ijuanya na iri ọrụ aghọọla ihe e jizi mere isi akụkọ n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ. Otu nwa agbọghọ dị afọ 17 dere n’akwụkwọ akụkọ ụlọ akwụkwọ ha na-ebipụta, sị: “Ná mmalite izu ọ bụla, na paseji ọ bụla ị gara, ọ na-adị ka nanị ihe ị ga na-anụ ụmụ akwụkwọ na-akọrọ ndị enyi ha ọ̀ bụ banyere ndị ọhụrụ ha riri ọrụ. Ha na-akọkwara ha ihe nile ha na onye ahụ mere n’ezoghị ọnụ.”

Ọ bụrụ na ị na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, ọ pụrụ ịdị gị ka ị̀ gbara iche ma ọ bụrụ na o yiri ka ọ̀ bụ nanị mmekọahụ ka ndị gbara gị gburugburu na-ekwu banyere ya. Ọ bụrụkwa na i sonyeghịrị ha, ha pụrụ ịkọ gị ọnụ. Ruo n’ókè ụfọdụ, e kwesịrị ịtụ anya nke a n’ihi na Bible na-ekwu na mgbe ndị ọzọ na-aghọtaghị ụzọ ndụ ị na-agbaso, ha pụrụ ịmalite ‘ikwujọ gị.’ (1 Pita 4:3, 4) Otú ọ dị, ọ dịghị onye ọ na-amasị ka e jiri ya mewe ihe ọchị. N’ihi ya, olee otú ị ga-esi jụ inwe mmekọahụ n’ụlọ akwụkwọ ma nọgide na-ele mkpebi gị anya dị ka ihe i kwesịrị iji na-eme ọnụ? Ọ dị mkpa ibu ụzọ ghọta ihe mere ọnwụnwa nke inwe mmekọahụ ji esi nnọọ ike.

Mara Otú Ahụ́ Gị Si Arụ Ọrụ

N’oge uto, ahụ́ gị na-enwe mgbanwe ndị na-aga n’ihu n’ihu, ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’otú i si enwe mmetụta. Ka ahụ́ gị na-eme mgbanwe ndị a, ị ga-abịa nwewe nnọọ agụụ mmekọahụ. Ghọta na nke a bụ ihe dị otú o kwesịrị. Ya mere, ọ bụrụ na ọ na-adị agụ gị agụụ iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị n’ụlọ akwụkwọ nwee mmekọahụ, a gwala onwe gị na ị bụ nnọọ onye ọjọọ ma ọ bụ na e keghị gị ka i bie ndụ dị ọcha. Ị pụrụ ibi ndụ dị ọcha ma ị chọọ!

E wezụga ihe gị na ahụ́ gị na-alụ nke bụ́ otu n’ime ihe ndị a na-ahụ n’oge uto, e nwere ihe ọzọ ọ dị mkpa ka ị mara. N’ihi ịbụ ndị na-ezughị okè, mmadụ nile nwere ọchịchọ ime ihe ọjọọ. Ọbụna Pọl onyeozi kwetara, sị: “Ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m.” Pọl kwuru na ezughị okè ya kpataara ya “nhụsianya.” (Ndị Rom 7:23, 24) Ma o meriri n’agha ahụ, gị onwe gị pụkwara imeri!

Ghọta Ọnọdụ Ụmụ Klas Unu

Dị ka e kwuru na mbụ, ụmụ klas unu pụrụ ịdị na-ekwu banyere mmekọahụ mgbe nile ma ọ bụ jiri mmekọahụ ha sị na ha na-enwe eme ọnụ. I kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịnwata gị. (1 Ndị Kọrint 15:33) Ma ọ dịghị mkpa ka i lewezie ụmụ klas unu anya dị ka ndị iro gị. N’ihi gịnị?

Ụmụ klas unu nwere otu ọchịchọ ahụ i nwere. Ha nwekwara ọchịchọ ime ihe ọjọọ. Ma, n’adịghị ka gị, ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịbụ “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha si n’ezinụlọ a “na-enweghị obi mmadụ” na ya. (2 Timoti 3:1-4) Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ n’ime ụmụ klas unu anataghị ọzụzụ e ji ịhụnanya nye banyere omume ọma, bụ́ nke a na-enweta n’aka ezigbo ndị nne na nna.—Ndị Efesọs 6:4.

N’ihi enweghị ihe e si na ya enweta amamihe ka elu—Okwu Chineke, bụ́ Bible—bụ́kwanụ nke nọ gị n’ọbụ aka, ụmụ klas unu nwere ike ha agaghị ama nsogbu mmadụ imejụ ọchịchọ anụ ahụ́ ya mgbe nile na-akpata. (Ndị Rom 1:26, 27) Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na ndị mụrụ ha bunyere ha ụgbọala bụ́ chara chara ma gwa ha ka ha buru ya gbawa n’okporo ụzọ awara awara nke ụgbọala na-ekwo ekwo na ya—ma ha akụzighịrị ha otú e si akwọ ụgbọala. Ụgbọala ahụ pụrụ inye ha obi ụtọ ruo nwa oge, ma o doro anya na ọdachi ga-esochirịrị ya. Ya mere, gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ụmụ klas unu na-ekwurịta banyere mmekọahụ n’ihu gị ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na ha na-anwa ime ka i sonyere ha n’omume rụrụ arụ?

Jụ Okwu Rụrụ Arụ

Ọ bụrụ na ụmụ klas unu ebido ikwurịta banyere mmekọahụ, a pụrụ ịnwa gị ige ntị nakwa ọbụna itinye ọnụ—nanị ka i wee ghara ịgba iche. Ma chegodị echiche banyere ihe nke ahụ ga-agwa ha. Mmasị i gosiri n’ihe ha na-ekwu ọ̀ ga-eme ka ha mara ụdị mmadụ ị bụ ma ọ bụ ụdị mmadụ ị chọrọ ịbụ?

Gịnịzi ka i kwesịrị ime mgbe gị na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu, e mesịa ha ahapụ ihe ahụ unu na-ekwu kwuwezie banyere mmekọahụ rụrụ arụ? Ì kwesịrị ibili ọtọ ma pụọ? Eenụ! (Ndị Efesọs 5:3, 4) Bible na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya.” (Ilu 22:3) N’ihi ya, i si ebe ahụ pụọ, ọ bụghị mkparị ka ị kparịrị ha—ihe ị kpara bụ àgwà onye nwere ezi uche.

N’ezie, ihere ekwesịghị ime gị isi n’ebe a na-ekwu okwu rụrụ arụ pụọ. O doro anya na e nwere ihe ndị ọzọ ọ ga-abụ e kwuwe, ihere agaghị eme gị isi ebe a na-ekwu ya pụọ, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ masịghị gị ma ọ bụkwanụ na ị chọghị itinye ọnụ na ya. Dị ka ihe atụ, were ya na ụmụ klas unu malitere ikwu banyere otú ha ga-esi jiri égbè gaa ohi. Ị̀ ga-anọ ebe ahụ gewe ka ha na-ekwurịta ụzọ ha ga-esi gaa ohi ahụ? Ọ bụrụ na ị nọrọ ebe ahụ, a pụrụ iwere gị dị ka onye òtù ha. N’ihi ya, ị ga-eji amamihe họrọ isi ebe ahụ pụọ. Mee otú ahụ mgbe ndị gị na ha na-ekwurịta okwu hapụrụ ihe unu na-ekwu ma kwuwezie banyere mmekọahụ rụrụ arụ. Ọtụtụ mgbe, ị pụrụ ịchọta otú ị ga-esi si ebe ahụ pụọ n’emeghị ka à ga-asị na ị na-eme nsọ nsọ, nke ga-eme ka ha kọwa gị ọnụ.

N’eziokwu, o nwere ike ọ gaghị ekwe omume mgbe nile isi ebe ahụ pụọ. Dị ka ihe atụ, ụmụaka ndị oche ha nọdebere nke gị na klas pụrụ ịnwa ime ka i soro ha kwurịtawa banyere mmekọahụ. Ya dị otú ahụ, ihe ị pụrụ ime bụ iji olu ọma gwa ha hoo haa ka ha kwụsị ịdọpụ uche gị. Ọ bụrụ na nke ahụ emeghị ka ha kwụsị, ị pụrụ ime ihe Brenda mere. O kwuru, sị: “Eji m akọ gwa onye nkụzi m ka o nye m ebe ọzọ m ga na-anọ.”

Jiri Nghọta Mee Ihe

Ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ụmụ klas unu ga-achọ ịma ihe mere na ị dịghị esonyere ha ná mkparịta ụka rere ure ha na-enwe. Ọ bụrụ na ha ajụọ gị banyere omume gị, jiri akọ zaghachi ha. N’ezie, ụfọdụ pụrụ ịjụ gị nke a nanị iji kwaa gị emo, ọ bụghị iji ghọta echiche gị. Ma, ọ bụrụ na ọ dị gị ka onye ahụ ò ji obi ọcha na-ajụ gị ya, jiri obi ụtọ gwa ya banyere ihe ndị i kweere, ekwula okwu ka onye ihere na-eme. Ọtụtụ ndị na-eto eto ejirila akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè nyere ụmụ klas ha aka ịghọta uru ndị dị n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. *

Kpebisie Ike Ịjụ Ya

Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na obi kara nwa akwụkwọ ibe gị ruo n’ókè nke na ọ chọrọ imetụ gị aka n’ahụ́ ma ọ bụ isusu gị ọnụ? Ọ bụrụ na i kwe ka o mee ya, nke a nwere ike ime ka obi kakwuo ya imere omume ọjọọ a gaa n’ihu. Bible kwuru banyere otu nwa okorobịa nke kwere ka nwanyị na-akwa iko jide ya aka ma sutụ ya ọnụ. O kwere ka nwanyị a gwa ya okwu ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Gịnị si na ya pụta? “Nwa okorobịa ahụ [jesoro] ya na mberede. Dị ka ehi si abịa n’ogbugbu ya.”—Ilu 7:13-23.

N’adịghị ka nwa okorobịa ahụ, tụlee ihe Josef mere mgbe ọ banyere n’ụdị ọnọdụ ahụ. Nwunye nna ya ukwu gbagidere mbọ ịrata ya ka o soro ya dinaa, ma ọ jụwapụrụ isi. Mgbe o mesịziri chọọ ijide ya, Josef gbapụrụ ozugbo.—Jenesis 39:7-12.

Dị ka Josef mere, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i mee ihe ozugbo ma ọ bụrụ na nwa klas unu ma ọ bụ onye ọzọ ị maara achọọ imetụ gị aka n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Eileen kwuru, sị, “Ọ bụrụ na nwoke achọọ imetụ m aka n’ahụ́, ana m agwa ya ka ọ kwụsị ya. Ọ jụ ịkwụsị ya, ana m eji olu ike agwa ya ka ọ hapụ m aka.” Eileen kwukwara banyere ụmụ okorobịa nọ n’ụlọ akwụkwọ ya, sị: “Ha agaghị akwanyere gị ùgwù, ọ gwụla ma i mere ka ha kwanyere gị ùgwù.”

Ụmụ klas unu ga-akwanyere gị onwe gị ùgwù ma ọ bụrụ na ị jụ ige ntị n’okwu ha ndị rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na i jiri nkwanye ùgwù kọwaara ha omume ndị na-amasị gị na ndị na-adịghị amasị gị mgbe ọ dị mkpa ka ime otú ahụ, nakwa ma ọ bụrụ na ị dịtụghị ekwe ka ha mere omume rụrụ arụ ha bịa gị nso. Uru ọzọ ị ga-erite na ya bụ na onwe gị ga-eju gị afọ. Nke kasị mkpa bụ na ị ga-enweta ihu ọma Jehova!—Ilu 27:11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 A gbanweela aha ụfọdụ.

^ par. 22 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Gịnị ka ị pụrụ ikwu iji si n’ebe a na-ekwurịta banyere mmekọahụ rụrụ arụ pụọ?

▪ Gịnị ka ị ga-ekwu ma mee ma ọ bụrụ na nwa klas unu agwa gị okwu ma ọ bụ mesoo gị omume na-eduga ná mmekọahụ rụrụ arụ?

[Foto dị na peeji nke 14]

Ọ bụrụ na mkparịta ụka i so na-enwe aghọzie nke rụrụ arụ, si ebe ahụ pụọ

[Foto dị na peeji nke 15]

Ekwekwala ka ndị na-eme omume rụrụ arụ mere ya bịa gị nso