Olee otú m pụrụ isi kwụsị imerụ onwe m ahụ́?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee otú m pụrụ isi kwụsị imerụ onwe m ahụ́?
“Apụghị m ịchịkwa obi mgbawa m na-enwe. Ma, ahụrụ m otu ihe m ga-achịkwali—ahụ́ mgbu.”—Jennifer, ọ dị afọ 20. *
“Mgbe ọ bụla iwe were m, ana m achapu onwe m ahụ́. Nke a bụ ụzọ m si ebe ákwá. Obi na-abịa dịkwuo m ụtọ ma m mechaa ya.”—Jessica, ọ dị afọ 17.
“Emebeghị m ya kemgbe izu abụọ ugbu a. Ọ dị m nnọọ ka o teela m mere ya. Echeghị m na ọ dị mgbe m ga-akwụsị ya kpamkpam.”—Jamie, ọ dị afọ 16.
JENNIFER, Jessica, na Jamie amaghị ibe ha, ma àgwà ha atọ yitewere. Ha atọ na-enwekarị obi mgbawa. Ihe ha atọ na-eme banyere obi mgbawa ha bụkwa otu. Jennifer, Jessica, na Jamie na-eme ka obi jụrụtụ ha site n’imerụ onwe ha ahụ́. *
N’agbanyeghị otú o si agbaka ntị ịnụ na mmadụ na-emerụ onwe ya ahụ́, ọ bụ nnọọ ihe ijuanya na omume a aghọọla ihe na-ewu ewu n’etiti ndị na-eto eto. Akwụkwọ akụkọ bụ́ National Post nke a na-ebipụta na Canada kwuru na omume a “na-emenye ndị nne na nna ụjọ, na-eju ndị ndụmọdụ [ụlọ akwụkwọ] anya, ma bụrụ ihe ịma aka nye ndị dọkịta.” Ọ gakwara n’ihu ikwu na mmadụ imerụ onwe ya ahụ́ “pụrụ ịghọ otu n’ime àgwà ndị kasị eri ahụ́ nke ndị dọkịta maara.” Omume a ọ̀ marala gị ma ọ bụ onye gị na ya na-akpachi anya ahụ́? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime banyere ya?
Buru ụzọ chọpụta ihe mere i ji enwe ọchịchọ imerụ onwe gị ahụ́. Cheta na ihe mere mmadụ ji achapu onwe ya ahụ́ abụghị nanị n’ihi na ahụ́ ya kpaliri ya ime ya. Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ na-ewere ya dị ka ụzọ ha si anagide ihe ụfọdụ na-enye ha nsogbu n’obi. Onye na-emerụ onwe ya ahụ́ na-akpatara onwe ya ahụ́ mgbu nkịtị iji mee ka obi mgbawa ọ na-enwe belata. Ya mere, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji emerụ onwe m ahụ́? Olee ihe ndị m na-eche banyere ya nke na-eme ka m nwee ọchịchọ imerụ onwe m ahụ́?’ È nwere ọnọdụ—ikekwe n’ezinụlọ gị ma ọ bụ n’ebe ndị enyi gị nọ—na-akpatara gị nchegbu ná ndụ?
Obi abụọ adịghị ya na ka i wee nwee ike inyocha onwe gị n’ụzọ dị otú ahụ, ọ ga-adị mkpa ka i nwee obi ike. Ma, ọ pụrụ ịbara gị uru dị ukwuu. Nke a na-abụkarị ihe mbụ mmadụ na-eme iji kwụsị imerụ onwe ya ahụ́. Ma, ka i wee nwee ike ịkwụsị imerụ onwe gị ahụ́, ị ga-eme ihe karịrị nanị ịmata ihe mere i ji eme ya.
Uru Ịkọrọ Onye Ọzọ Obi Gị Bara
Ọ bụrụ na ị na-emerụkarị onwe gị ahụ́, ọ ga-abara gị uru ịkọrọ otu enyi gị torurula ogo mmadụ, nke ị tụkwasịrị obi, ihe ndị na-enye gị nsogbu n’obi. Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Nchegbu pụrụ ịnapụ gị obi ụtọ, ma okwu ọma na-eme ka ị ṅụrịa.” (Ilu 12:25, Today’s English Version) Gị ịkọrọ onye ọzọ nsogbu gị pụrụ ime ka i nwee ohere nke ịnụ okwu nkasi obi na okwu ọma ndị ahụ́ gị chọrọ.—Ilu 25:11.
Ònye ka i kwesịrị ịkọrọ ya? Ọ ga-adị mma ka ị họrọ onye tọrọ gị nke nwere amamihe, ahụmahụ, na ọmịiko. Ndị Kraịst enweghị nsogbu n’akụkụ a n’ihi na ha nwere ndị okenye ọgbakọ bụ́ ndị dị ka “ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.”—Aịsaịa 32:2.
N’ezie, echiche nke ịkọrọ onye ọzọ ihe nzuzo gị pụrụ iyi ihe na-emenye ụjọ. Ọ pụrụ ịdị gị otú ọ dị Sara. Sara kwetara, sị: “Na mbụ, o siiri m ike ịtụkwasị onye ọ bụla obi. Obi m bụ na ndị mmadụ matahaala ụdị onye m bụ—ya bụ, ọ bụrụ na ha amata m nnọọ nke ọma—ha ga-amalite ịgbara m ọsọ ma lewe m anya ọjọọ.” Ma, site n’ịkọrọ onye ọzọ ihe dị ya n’obi, Sara bịara ghọta eziokwu dị n’ihe Bible kwuru n’Ilu 18:24, bụ́ ebe na-ekwu, sị: “Onye na-ahụ n’anya dị [nke] na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” Sara na-ekwu, sị: “Ndị Kraịst tozuru okè m kọọrọ ihe dị m n’obi adịghị mgbe ọ bụla ha kwujọrọ m, n’agbanyeghị ihe m gwara ha banyere mmerụ m na-emerụ onwe m ahụ́. Kama nke ahụ, ha tụụrụ m aro ndị dị mma banyere ụzọ m pụrụ isi kwụsị ya. Ha ji Akwụkwọ Nsọ mee ka m ghọta otú Chineke si ele àgwà a anya, ha jikwa ndidi mesie m obi ike n’oge a m nwerela nkụda mmụọ ma na-eche na abaghịzi m uru ọ bụla.”
Í cheghị na ọ dị mma ịkọrọ onye ọzọ banyere nsogbu a ị na-enwe, nke bụ́ imerụ onwe gị ahụ́? Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị gaghị enwe ike iso onye ahụ kwurịta ya ihu na ihu, gbalịa iji akwụkwọ ozi ma ọ bụ fon gwa ya ya. Ịkọrọ onye ọzọ banyere nsogbu a pụrụ ịbụ otu ụzọ dị mma isi mee ka ị kwụsị ya. Jennifer na-ekwu, sị, “Ihe kasị mkpa bụ ịmara na e nwere onye na-eche nnọọ banyere m, na e nwere onye m pụrụ ịkọrọ nsogbu m mgbe ọ dị ka à ga-asị na olileanya adịghịzi.” *
Mkpa Ekpere Dị
Donna nọ n’ọnọdụ a pụrụ ikwu na ọkụ ya nyụrụ, ya awụsa ọwa. Otu obi na-agwa ya na enyemaka Chineke dịkwanụ ya mkpa. Obi ọzọ ana-agwa ya na Chineke agaghị enyere ya aka ruo mgbe ọ kwụsịrị ịchapu onwe ya ahụ́. Gịnị nyeere Donna aka? Otu ihe nyeere ya aka bụ ịtụgharị uche n’Ihe Emere nke Mbụ, isi iri abụọ na itoolu, amaokwu nke iri na asaa, bụ́ ebe a kpọrọ Jehova Chineke onye “na-anwapụta obi.” Donna na-ekwu, sị: “Jehova maara na, n’ime obi m, achọrọ m ịkwụsị imerụ onwe m ahụ́. Ozugbo m malitere ikpegara Ya ekpere maka enyemaka, ihe ịtụnanya mere. Mkpebi m mere ịkwụsị imerụ onwe m ahụ́ bịara jiri nwayọọ nwayọọ na-esikwu ike.”
Ọbụ abụ bụ́ Devid, bụ́ onye nhụjuanya na-abụghịrị ihe ọhụrụ, dere, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa Abụ Ọma 55:22) N’ezie, Jehova maara ahụhụ ị na-ata. Ọzọkwa, ‘ọ na-eche banyere gị.’ (1 Pita 5:7) Ọ bụrụ na obi gị na-ama gị ikpe, cheta na Chineke ‘karịrị obi gị, marakwa ihe nile.’ Ee, Ọ maara ihe mere i ji emerụ onwe gị ahụ́ na ihe mere o ji esiri gị ike ịkwụsị ya. (1 Jọn 3:19, 20) Ọ bụrụ na ị gakwuru Ya n’ekpere ma gbasie mbọ ike ịkwụsị ya, Ọ “ga-enyere gị aka.”—Aịsaịa 41:10.
gị.” (Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị daghachi azụ? Nke ahụ ọ̀ pụtara na ị kụọla afọ n’ala? Mbanụ! Ilu 24:16 na-ekwu, sị: “Ugbo asaa ka onye ezi omume na-ada, biliekwa ọzọ.” Ka Donna nọ na-atụgharị uche n’amaokwu Bible a, o kwuru, sị, “Adara m ihe karịrị ugboro asaa, ma ike agwụghị m.” Donna chọpụtara na mmadụ ịnọgidesi ike n’ihe, dị oké mkpa. Karen chọpụtakwara otu ihe ahụ. Karen kwuru, sị, “Amụtara m ile ihe ndọghachi azụ anya dị ka ihe na-agaghị anọte aka, anaghị m ewere ya na m kụrụ afọ n’ala. Amụtakwara m ịmalite n’isi gbawakwa mbọ mgbe ọ bụla m daghachiri azụ.”
Mgbe A Chọkwuru Enyemaka
Jizọs ghọtara na ‘ndị na-arịa ọrịa nwere mkpa maka dibịa.’ (Mak 2:17) Ọtụtụ mgbe, ọ na-adị mkpa ka onye na-emerụ onwe ya ahụ́ gakwuru ọkachamara ma nke a na-akọ iji chọpụta ma è nwere ọrịa ọ na-arịa nke mere o ji emerụ onwe ya ahụ́. Ọ bụrụ na ọ dị, a gwọwazie ya. * Jennifer họọrọ ịchọ ụdị enyemaka a. Nke a, tinyere nkwado o nwetara n’aka ndị okenye ọgbakọ hụrụ ya n’anya, bịara mee ka o nwee ike ịkwụsị omume ahụ. Ọ sịrị: “Ndị okenye abụghị ndị dọkịta, ma ha nyeere m aka. Ọ bụ ezie na ana m enwe ọchịchọ imerụ onwe m ahụ́ mgbe ụfọdụ, ma site n’enyemaka Jehova, ọgbakọ ya, na ime ihe ndị a gwara m ka m na-eme iji na-achịkwa nsogbu a, enweela m ihe ịga nke ọma n’ịchịkwa ya.” *
Jide n’aka na ị pụrụ ịmụta iji ụzọ ndị ka baa uru e si anagide nsogbu dochie omume a. Kpee ekpere dị ka ọbụ abụ ahụ kpere, sị: “Mee ka nzọụkwụ m nile guzosie ike n’okwu ọnụ Gị; ekwekwala ka ajọ ihe ọ bụla bụrụ onyeisi m.” (Abụ Ọma 119:133) N’ezie, ị ga-enweta afọ ojuju na ùgwù mgbe ị mụtara ịchịkwa omume a, mgbe ọ na-abụghịzi ya na-achịkwa gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A gbanweela aha ụfọdụ dị n’isiokwu a.
^ par. 6 Ị chọọ ịmatakwu banyere mmadụ imerụ onwe ya ahụ́—ihe ọ bụ na ihe ndị na-akpata ya—lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Gịnị Mere M Ji Emerụ Onwe M Ahụ́?” nke gbara na Teta! nke January-March 2006.
^ par. 14 Ị pụrụ ịnwale ịdị na-edetu otú obi dị gị edetu mgbe ụfọdụ. Ndị dere akwụkwọ Bible bụ́ Abụ Ọma bụ ndị ikom nwere nnọọ mmetụta, ndị ji okwu ọnụ mee ka a mara ụdị ịkwa ụta, iwe, obi mgbawa, na obi ilu ha nwere. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịtụle Abụ Ọma nke 6, 13, 42, 55, na nke 69.
^ par. 20 Mgbe ụfọdụ, ihe na-eme ka mmadụ na-emerụ onwe ya ahụ́ bụ ọrịa ndị dị ka ịda mbà n’obi, mmadụ ịbụ onye ihe na-emetụ n’isi, mmadụ enweghị ike ịchịkwa echiche na àgwà ya, ma ọ bụkwanụ nsogbu iri ihe. Teta! adịghị akwado ụdị usoro ọgwụgwọ ọ bụla. Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ na ụdị ọgwụgwọ ọ bụla ha nwetara emegideghị ụkpụrụ Bible.
^ par. 20 Teta! ndị e bipụtara n’oge ndị gara aga nwere isiokwu ndị kwuru banyere ihe ụfọdụ ndị na-akpalikarị mmadụ imerụ onwe ya ahụ́. Dị ka ihe atụ, lee usoro isiokwu bụ́ “Ịghọta Nsogbu Mgbanwe Mberede n’Ọnọdụ Uche” (January 8, 2004), “Enyemaka Maka Ndị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Dara Mbà n’Obi” (September 8, 2001), na “Gịnị Na-akpata Nsogbu Iri Ihe?” (January 22, 1999, Bekee), nakwa isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ndị Mụrụ M Bụ Ndị Aṅụrụma?” (August 8, 1992, Bekee).
IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Mgbe i nwere ihe na-enye gị nsogbu n’obi, olee ihe ndị ọzọ ị pụrụ ime banyere ya nke na-abụghị imerụ onwe gị ahụ́?
▪ Ọ bụrụ na ị na-emerụ onwe gị ahụ́, ònye ka ị pụrụ ịkọrọ banyere ya?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 12]
INYERE ONYE NA-EMERỤ ONWE YA AHỤ́ AKA
Olee otú ị pụrụ isi nyere onye òtù ezinụlọ gị ma ọ bụ enyi gị nke na-emerụ onwe ya ahụ́ aka? Ebe ọ bụ na ọ pụrụ ịdị onye ahụ na-emerụ onwe ya ahụ́ mkpa nke ukwuu inwe onye ọ ga na-akọrọ obi ya, ị pụrụ igosi ya na ị dị njikere ịṅa ya ntị. Gbalịa ịbụrụ ya “enyi na-ahụ n’anya,” nke ‘a mụrụ maka mgbe ahụhụ.’ (Ilu 17:17) N’ezie, ihe mbụ obi gị pụrụ ịgwa gị ka i mee bụ iwesa ya iwe na ịgwa ya ozugbo ka ọ kwụsị imerụ onwe ya ahụ́. Ma, i si otú ahụ meghachi omume, o nwere ike gbawara gị ọsọ. Ọzọkwa, a chọrọ ihe karịrị ịgwa onye ahụ ka ọ kwụsị ya. Iji nyere onye ahụ na-emerụ onwe ya ahụ́ aka ịmụta ụzọ ọhụrụ ọ ga-esi na-anagide nsogbu ndị ọ na-enwe, ọ dị mkpa na ị ga-eji nghọta mee ihe. (Ilu 16:23) Ọ ga-ewekwa oge. Ya mere, nwee ndidi. Dị “ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu.”—Jems 1:19.
Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, echela na ị pụrụ inyere onye na-emerụ onwe ya ahụ́ aka n’onwe gị. Cheta na a pụrụ inwe nsogbu ndị na-apụtachaghị ìhè ma ọ bụ ọrịa kwesịrị ka a gwọọ ya. Ọzọkwa, mmadụ pụrụ ịnwụ site n’ahụ́ o merụrụ onwe ya—ọbụna mgbe ọ na-ebughị n’obi igbu onwe ya. N’ihi ya, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịgwa onye ahụ na-emerụ onwe ya ahụ́ ka ọ kọọrọ onye toruworo ogo mmadụ, nke hụrụ ya n’anya, banyere nsogbu ahụ.
[Foto ndị dị na peeji nke 11]
Echekwala na ịkọrọ onye hụrụ gị n’anya nsogbu gị na ikpe ekpere banyere ya abaghị uru