Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Ga-ezeteli Ịka Nká?

Ị̀ Ga-ezeteli Ịka Nká?

Ị̀ Ga-ezeteli Ịka Nká?

“Afọ iri asaa agwụla ihe anyị nwere—afọ iri asatọ ma ọ bụrụ na anyị siri ike; . . . ọ naghị ete aka ndụ anyị agwụsịa, anyị ewee laa.”—ABỤ ỌMA 90:10, TODAY’S ENGLISH VERSION.

WEREGODI ya na ị nọ n’ùjú ndụ gị n’enweghị mgbe i mere agadi. Werekwa ya na ahụ́ gbasiri gị ike, ụbụrụ gị anọgidekwa na-aghọ nkọ n’esepụghị aka. Ọnọdụ ọma dị otú ahụ ọ̀ na-ada gị ka nrọ nkịtị? Ọ bụrụ otú ahụ, tụlee eziokwu a dị ịtụnanya: Ọ bụ ezie na icheoku ụfọdụ pụrụ ịdịgide ndụ ruo otu narị afọ, ọ na-esi ike ịhụ òké dịruru ihe karịrị afọ atọ. Otú a afọ ndụ ụmụ anụmanụ ụfọdụ si dịgasịa iche emeela ka ndị ọkachamara banyere ihe ndị dị ndụ kwuo na a ga-enwerịrị ihe na-akpata ịka nká, na ọ bụrụkwa na e nwere ihe na-akpata ya, a ga-enwerịrị ihe ga-agwọta ya.

Ọtụtụ ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ emefuola nnukwu ego ka ha na-achọ ọgwụ ha ga-eji mee ka ịka nká kwụsị. Ọzọkwa, nchegbu ndị a mụrụ mgbe a lụsịrị Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ ndị na-abanyezi n’afọ iri isii na ụma ha, na-enwezi bụ ịchọpụta ihe ha ga-eme ka ha wee ghara ịka nká ngwa ngwa.

Ọtụtụ ndị na-enyocha mkpụrụ ndụ, ụmụ anụmanụ, na ịka nká elekwasịkwala anya n’ịchọpụta ihe mere ụmụ mmadụ ji aka nká. Akwụkwọ bụ́ Why We Age, nke Steven Austad dere, kwuru, sị: “A na-ahụ na ndị ọkà n’ịmụ banyere ịka nká na-enwezi obi ụtọ ma ha zukọta. Anyị achọpụtawala isi ihe na-akpata ịka nká.”

Ihe ndị a sịrị na ọ bụ ha na-akpata ịka nká karịrị akarị. Otu n’ime ihe ndị e kwuru na-akpata ya bụ ike ịgwụ mkpụrụ ndụ; ihe ọzọ abụrụ na o si n’otú e si kee anyị. Ụfọdụ na-ekwu na ihe abụọ ahụ jikọtara aka na-akpata ya. Olee ókè a ghọtaruru ihe mere anyị ji aka nká? È nwere ihe mere a ga-eji tụwa anya na a ga-enweta ọgwụ ga-agwọtali ịka nká?

[Foto dị na peeji nke 19]

Ụfọdụ icheoku pụrụ ịdịru otu narị afọ, ma ụmụ mmadụ na-adịru ihe dị ka afọ iri asatọ. Ndị ọkà mmụta na-ajụ, sị: “Gịnị mere anyị ji aka nká?”