Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Anyị Ji Aka Nká?

Gịnị Mere Anyị Ji Aka Nká?

Gịnị Mere Anyị Ji Aka Nká?

“Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.”—JOB 14:1.

Ọ PỤRỤ ịbụ na i chetụla n’echiche na ike ga-emesịrịrị gwụ ihe nile dị ndụ. Ụgbọala na injin ọka ndị e ji eme ihe kwa ụbọchị na-emesị mebie. Ọ dị mfe iwere ya na ụmụ anụmanụ na-aka nká ma na-anwụ n’ụzọ yiri nke ahụ. Ma Steven Austad, bụ́ prọfesọ n’ihe banyere ụmụ anụmanụ, kọwara, sị: “Ihe ndị dị ndụ na ígwè ọrụ abụghị otu. N’eziokwu, otu ihe ọ pụrụ ịbụ ya ka a kasị jiri mara ihe ndị dị ndụ bụ ikike ahụ́ ha nwere iji aka ha dozie onwe ha.”

Otú ahụ́ gị si edozi onwe ya ma i merụọ ahụ́ bụ ihe dị ịtụnanya, ma otú o si edozi onwe ya site n’oge ruo n’oge na-akadị atụ n’anya n’ụzọ ụfọdụ. Were ọkpụkpụ gị dị ka ihe atụ. Magazin bụ́ Scientific American kọwara, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ elee ọkpụkpụ anya, ọ ga-adị ya ka ọ dịghị ndụ, ma ọkpụkpụ bụ ihe dị ndụ nke na-ebibi ma na-emepụtaghachi onwe ya n’akwụsịghị akwụsị ruo ogologo oge nile onye ahụ dị ndụ. N’ihi otú a ọkpụkpụ si emepụtaghachi onwe ya, ihe ndị mejupụtara ọkpụkpụ ndị dị gị n’ahụ́ n’ime afọ 10 gara aga abụghịzi ha mejupụtara ọkpụkpụ ndị dị gị n’ahụ́ ugbu a.” Akụkụ ahụ́ gị ndị ọzọ na-emepụtaghachi onwe ha ugboro ugboro karịa ka ọkpụkpụ si emepụtaghachi onwe ya. Ụfọdụ mkpụrụ ndụ ndị dị n’akpụkpọ ahụ́ gị, n’imeju gị, nakwa n’eriri afọ gị pụrụ imepụtaghachi onwe ha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị. N’ime otu ntabi anya ọ bụla, ahụ́ gị na-emepụta nde mkpụrụ ndụ iri abụọ na ise ndị o ji edochi ndị nke merela ochie. A sị na nke a adịghị eme, a sịkwa na akụkụ ahụ́ gị nile adịghị edozi onwe ha ma na-edochi mkpụrụ ndụ ndị nke merela ochie, ị gaara aka nká mgbe ị ka bụ nwata.

Mgbe ndị ọkà n’ịmụ banyere ihe ndị dị ndụ malitere ịmụ banyere ihe ndị mejupụtara mkpụrụ ndụ, ha bịara chọpụta na ihe kadị dị ịtụnanya bụ na ike adịghị agwụ mkpụrụ ndụ anyị. Mgbe ahụ́ gị bibiri mkpụrụ ndụ ochie ma mepụta ndị ọhụrụ, nke ọ bụla n’ime mkpụrụ ndụ ọhụrụ ahụ na-enwe ihe ndị Bekee na-akpọ DNA, nke bụ́ ihe na-agwa ahụ́ gị otú ọ ga-esi emepụtaghachi ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị dị gị n’ahụ́. Chegodị echiche ugboro ole DNA mepụtaghachirila onwe ya, ọ bụghị nanị n’ahụ́ gị n’oge ndụ gị kama, kemgbe ụmụ mmadụ malitere ndụ! Ka i wee ghọta otú nke a dịruru ịtụnanya, tụlee ihe ga-eme ma i jiri ígwè photocopier mepụtaghachi ihe e dere n’otu akwụkwọ ma jiri nke ahụ i mepụtaghachiri mepụtakwa ọzọ. Ị nọgide na-eji ndị nke i mepụtaghachiri na-emepụta ndị ọzọ, ihe e dere n’akwụkwọ ahụ agaghịzi na-apụtacha nke ọma, oge ga-erukwa mgbe ị ga-emepụta nke a na-agaghị agụtali ihe e dere na ya. Ọ bụ ihe obi ụtọ na ike adịghị agwụ DNA anyị, ọ dịghịkwa emebi, mgbe mkpụrụ ndụ anyị na-anọgide na-ekewa. N’ihi gịnị? N’ihi na mkpụrụ ndụ anyị nwere ọtụtụ ụzọ o si edozi ihe ndị mebiri mgbe DNA na-emepụtaghachi onwe ya. A sị na ọ dịghị eme ya, ụmụ mmadụ gaara anwụchapụworị kemgbe!

Ebe ọ bụ na akụkụ ahụ́ anyị dum—ma ndị ukwu ma ndị nta—na-edochi ma ọ bụ na-edozi onwe ha n’esepụghị aka, ọ na-egosi na ike ịgwụ mkpụrụ ndụ abụchaghị ihe na-akpata ịka nká. Akụkụ ahụ́ dị iche iche na-edozi ma na-edochi onwe ha ruo ọtụtụ iri afọ, akụkụ ahụ́ nke ọ bụla na-emekwa ya n’ụzọ dịgasị iche nakwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche. Ya bụrụ otú ahụ, gịnịzi mere ha nile ji akwụsị ọrụ n’otu mgbe?

Nká Anyị Na-aka Ò Si n’Otú E Si Kee Anyị?

Gịnị mere nwamba ji adịru afọ 20, ma anụ a na-akpọ opossum, nke ya na nwamba hà, ana-adịru nanị afọ 3? * Gịnị mere ụsụ ga-eji adịru afọ 20 ma ọ bụ 30, ebe òké na-adịru nanị afọ 3? Gịnị mere mbe ukwu ga-eji adịru afọ 150, ebe enyí na-adịru nanị afọ 70? Ihe ndị dị ka ụdị nri ha na-eri, otú ha bururu n’ibu, otú ụbụrụ ha haruru, ma ọ bụ ụzọ ha si adị ndụ adịghị akọwa ihe mere afọ ndụ anụmanụ ndị a ji dịgasịa iche. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “E nwere ihe dị ná mkpụrụ ndụ nke na-ekpebi afọ ole ihe ndị dị ndụ na-agaghị agafe.” Ọ bụ mkpụrụ ndụ na-ekpebi afọ ole ihe ndị dị ndụ ga-adịru. Ma, ka afọ ndụ ha na-abịaru ná njedebe, olee ihe ọ bụ ya na-akpali ahụ́ ha ịkwụsị ịrụ ọrụ?

Onye ọkà n’ịmụ banyere mkpụrụ ndụ, bụ́ Dr. John Medina, dere, sị: “Ọ dị ka è nwere ihe a na-amabeghị ihe ọ bụ, nke na-apụta n’otu oge mgbe mmadụ merela okenye ma gwa mkpụrụ ndụ ka ha kwụsị ịrụ ọrụ e ji mara ha.” O dekwara, sị: “E nwere ihe dị anyị n’ọbara nke pụrụ ịgwa mkpụrụ ndụ, nakwa ahụ́ anyị dum, ka ha kaa nká ma nwụọ.”

A pụrụ iji ahụ́ anyị tụnyere ụlọ ọrụ nọrọla na-arụ ọrụ nke ọma ruo ọtụtụ iri afọ. Na mberede, ndị na-elekọta ya akwụsị iwe ndị ọhụrụ n’ọrụ, kwụsị ịrụzi ngwá ọrụ ndị mebirinụ na ịzụta ngwá ọrụ ndị ọhụrụ, kwụsịkwa ilekọta na idozi ụlọ ọrụ ahụ n’onwe ya. N’oge na-adịghị anya, ụlọ ọrụ ahụ ga-amalite imebi. Ma, gịnị mere ndị ahụ na-elekọta ụlọ ọrụ a ji kwụsị atụmatụ ọma ha, nke mere ụlọ ọrụ ahụ jibu na-eme nke ọma? Ajụjụ a yiri ajụjụ ndị ọkà n’ịmụ banyere ihe ndị dị ndụ, bụ́ ndị na-achọ ịchọpụta ihe mere anyị ji aka nká, na-ajụ. Akwụkwọ bụ́ The Clock of Ages kwuru, sị: “Ná nnyocha ndị a na-eme iji chọpụta ihe mere anyị ji aka nká, otu n’ime ihe ndị kasị mgbagwoju anya bụ ịghọta ihe mere mkpụrụ ndụ ji akwụsị imepụtaghachi onwe ha ma malite ịnwụ.”

À Pụrụ Ime Ka Ụmụ Mmadụ Kwụsị Ịka Nká?

A kọwaala na, n’ime nsogbu nile ihe ndị dị ndụ na-enwe, ịka nká bụ “nke kasị dị mgbagwoju anya.” Ka ndị ọkà mmụta sayensị mesịrịla nnyocha ruo ọtụtụ iri afọ, ha achọpụtabeghị ihe mere anyị ji aka nká, ma ya fọdụzie ịchọpụta ọgwụ e ji agwọ ya. N’afọ 2004, magazin bụ́ Scientific American bipụtara okwu ịdọ aka ná ntị ndị ọkà mmụta sayensị 51 kwuru, bụ́ ndị na-eme nnyocha iji mara ihe mere mmadụ ji aka nká. Magazin ahụ kwuru, sị: “Ọ dịghị ọgwụ a na-ere ugbu a maka nká—ọbụnadị otu—nke nwerela ike ime ka ịka nká belata, ime ka ọ kwụsị, ma ọ bụ ime ka onye kara nká bụrụghachi okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa.” Ọ bụ eziokwu na iri ezigbo nri na imega ahụ́ nke ọma pụrụ ime ka ahụ́ dịkwuo gị mma, meekwa ka ị ghara ịnwụchu ọnwụ n’ihi ọrịa, ka ọ dị ugbu a, ọ dịbeghị ihe nwere ike ime ka mmadụ ghara ịka nká mgbe oge ya ruru. Ihe ndị a a chọpụtara na-echetara anyị okwu Jizọs e dekọrọ na Bible, nke bụ́: “Ònye n’etiti unu pụrụ ịtụkwasị otu cubit n’ogologo ya site n’ichegbu onwe ya?”—Matiu 6:27.

Ka Medina nọ na-achịkọta ọganihu e nwerela ná mbọ a na-agba ịchọta ọgwụ e ji agwọ nká, o dere, sị: “N’eziokwu, anyị amaghị ihe mere anyị jidị aka nká. . . . Kemgbe iri afọ ole na ole gara aga anyị malitere gbasiwe mbọ ike ịhụ na anyị kpochapụrụ ọrịa cancer, anyị achọtabeghị ọgwụ ya. Ihe ndị na-akpata ịka nká dịkwa nnọọ mgbagwoju anya karịa ihe ndị na-akpata ọrịa cancer.”

Ihe Ndị A Chọpụtara Emeela Ka A Ghọta Otu Eziokwu Dị Mkpa

Nchọpụta ndị e merela banyere otú ahụ́ ihe ndị dị ndụ si arụ ọrụ na ihe mere ha ji aka nká emebeghị ka a kwụsị inwe olileanya nke ịdịtekwu ndụ aka. Ụfọdụ achọpụtala na nnyocha ndị ha mere emeela ka ha mata otu ihe dị nnọọ mkpa nke na-eme ka a ghọta ihe mere anyị ji aka nká. Michael Behe, bụ́ ọkachamara banyere mkpụrụ ndụ, dere, sị: “N’ime afọ iri anọ gara aga, ndị na-enyocha mkpụrụ ndụ n’oge a achọpụtala ihe ndị a na-amabughị banyere mkpụrụ ndụ. . . . Ihe ndị a chọpụtara ná mbọ a e jikọrọ aka gbaa n’inyocha mkpụrụ ndụ bụ na o doro nnọọ anya, kwekwa nghọta, na ọ dị onye ‘kere’ ihe ndị a!” Ọ dị onye ji amamihe kee ihe ndị dị ndụ. N’ezie, ọ bụghị Behe bụ onye mbụ kwuru ya. Mgbe otu ọbụ abụ oge ochie tụgharịchara uche banyere otú ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ, o dere, sị: “E jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ.”—Abụ Ọma 139:14.

Ọ bụrụ na e kere ihe nile dị ndụ eke, mgbe ahụ, otu ajụjụ anyị ga-achọsi ike ịmata azịza ya bụ, Chineke, bụ́ Onye Okike, ò kere ụmụ mmadụ ka ha na-adịru afọ ole ọtụtụ ụmụ anụmanụ na-adịru, ka ọ̀ chọrọ ka ha na-adịte ndụ aka karịa ụmụ anụmanụ?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Anụ a a na-akpọ opossum bụ n’Ebe Ugwu America ka a na-ahụ ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

‘E mere ka anyị bụrụ oké ọrụ’

[Foto dị na peeji nke 20, 21]

Ihe mere mmadụ ji aka nká ọ̀ bụ n’ihi na ike gwụrụ mkpụrụ ndụ ya?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 22]

DNA: Foto: www.comstock.com