Inwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Ọ̀ Ga-ekwe Omume?
Inwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Ọ̀ Ga-ekwe Omume?
N’afọ gara aga, otu nne na-akatabeghị ahụ́ detaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico akwụkwọ ozi, na-arịọ ha ka ha gwa ya ihe ọ ga-eme ka ezinụlọ ya wee nwee obi ụtọ. Ọ kọrọ na obi na-adị ya ụtọ ịgụ Teta! ma kwuo, sị:
“Anọọla m na di ruo afọ atọ ugbu a, m ga-achọ ka unu gwa m ihe m ga-eme ka ezinụlọ m wee nwee obi ụtọ. N’afọ abụọ gara aga, mụ na di m mụtara otu ọmarịcha nwa nwoke, m ga-enwekwa mmasị ịzụlite ya nke ọma.”
Nwanyị a anụla banyere akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ ma deta akwụkwọ ka e zitere ya otu. Ọtụtụ puku mmadụ e meekwala otú ahụ. Ọtụtụ ndị gụcharala akwụkwọ a akọọla otú o sirila nyere ha aka. Ụfọdụ n’ime isiokwu ya ndị na-akụzi ihe bara uru bụ “Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ,” “Chebe Ezinụlọ Gị Pụọ n’Ihe Ndị Na-eweta Mbibi,” na “Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Gị.”
Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.
□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.