Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Di na Nwunye Hà Pụrụ Iguzogide Nsogbu Ndị Yiri Oké Ifufe?

Ndị Di na Nwunye Hà Pụrụ Iguzogide Nsogbu Ndị Yiri Oké Ifufe?

Ndị Di na Nwunye Hà Pụrụ Iguzogide Nsogbu Ndị Yiri Oké Ifufe?

“Ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—MATIU 19:6.

OKÉ ifufe si na ntọala kwatuo ma tikasịa ụlọ ndị yiri ka à rụsiri ha ike. Ajọ ifufe ndị kpara ọtụtụ ebe n’ụwa aka ọjọọ na nso nso a mere ka a chọpụta otú imerime ụlọ siruru n’ike.

Ma, e nwere ụdị oké ifufe ọzọ na-esi na ntọala akwatu ma na-etikasị alụmdi na nwunye, nke bụ́ ihe dịwara kemgbe ụwa. Stephanie Coontz, bụ́ onye na-akọ ihe ndị na-eme n’ezinụlọ, kwuru, sị: “E mee elu mee ala, ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa ọhaneze n’ozuzu ha ejighịzi alụmdi na nwunye akpọrọ ihe otú ha sibu jiri ya kpọrọ ihe.”

Ị̀ na-ahụ mmetụta omume dị otú ahụ na-enwe? Ọ̀ na-adị gị ka ọhaneze anaghịzi eji alụmdi na nwunye akpọrọ ihe? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị kpatara ya? Ọ̀ dị onye nwere olileanya na mmekọrịta dị n’etiti ya na onye ọ lụrụ ga-abụ nke obi ụtọ ma ọ bụkwanụ na ọ ga-anọgide na-abụ ya? Ma, ka anyị burugodị ụzọ chọpụta ihe na-eme ka di na nwunye na-enwe nsogbu.

Ndị Di na Nwunye Nọ ná Nsogbu

Nsogbu ndị di na nwunye na-enwe amaliteghị taa; ọ malitere kemgbe ụmụ mmadụ malitere. Àgwà nne na nna mbụ anyị kpara bụ ya mere ndị di na nwunye ji enwe nsogbu ndị anyị na-ahụ taa. Adam na Iv mehiere mgbe ha na-eguzogidelighị ọchịchọ nke onwe ha, nke a mekwara ka ‘mmehie bata n’ụwa.’ (Ndị Rom 5:12) Akụkọ ndị mere eme e dekọrọ na Bible kwuru na, n’oge na-adịghị anya nke a mesịrị, “nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi [mmadụ bịara bụrụ] nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.”—Jenesis 6:5.

O nwebeghị oké ihe gbanwere kemgbe ahụ. Otu n’ime nchepụta ndị na-akpa mmekọrịta di na nwunye aka ọjọọ bụ di ma ọ bụ nwunye ịdị na-emejụ ọchịchọ nke onwe ya n’achọghịdị ịma. Alụmdi na nwunye n’onwe ya pụrụ iyi ihe oge ya gaferela, ihe na-adịghịzi mkpa n’ụwa a nke na-agbasozi ụkpụrụ ọhụrụ n’ihe banyere omume. Ebe ọ bụ na e mere ka iwu ndị na-achịkwa ịtọsa di na nwunye gharazie isi ike, ịgba alụkwaghịm adịchaghịzi eme ndị mmadụ ihere.

Ndị na-adịghị enwe ndidi, bụ́ ndị na-achọ inweta ihe nile taa na echi na imejụ ọchịchọ anụ ahụ́ ha ozugbo, adịchaghị echebara ihe ga-esi n’ịgba alụkwaghịm pụta echiche, ma ọ bụrụkwarị na ha na-echebatụrụ ya. Ebe ọ bụ na ọ dị ha ụtọ ná ntị ịnụ na ha ga-enwere onwe ha ma ha gbaa alụkwaghịm, ha na-ekwere na nke a ga-eme ka ha nwee obi ụtọ.

Ndị ọzọ na-eme, ha na di ma ọ bụ nwunye ha nwee nnukwu nsogbu, ha agaa chọwa enyemaka n’aka ndị dọkịta na ndị na-enye ndị di na nwunye ndụmọdụ, ma ọ bụkwanụ ha agaa gụwa akwụkwọ ndị dị otú ahụ dere. Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị “ọkachamara” n’ihe banyere alụmdi na nwunye na-akazi akwado ịgba alụkwaghịm karịa ka ha si akwado di na nwunye ịrapagidesi ike n’ahụ́ ibe ha. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ikekwe, na nke mbụ ya kemgbe ụwa, a nọgidewo na-achọ ịkwatu alụmdi na nwunye nke ndị mmadụ na-achọsi ike. Ọ bụkwa ihe dị ịtụnanya na ọ dawala n’ihi aka ahụ a na-akwa ya. Mgbe ụfọdụ, a na-akwatu ya site n’ịgbaso ụzọ doro anya na nke ‘ndị ọkachamara’ tụpụtara, bụ́ ndị kweere na mmadụ ịrapagidesi ike n’ahụ́ onye ọ lụrụ, ruo ogologo ndụ ya nile, bụ ihe na-adabaghị adaba ma ọ bụkwanụ bụrụ ịgba ohu.”

Mgbanwe E Nwere n’Ụzọ Ndị Mmadụ Si Eche Echiche

Echiche e nwere banyere otú di na nwunye kwesịrị isi na-ebi na nzube e ji alụ di na nwunye agbanweekwala. Ikekwe, ị chọpụtala na a dịghịzi ewere di na nwunye ịrapara n’ahụ́ ibe ha ma na-akwado ibe ha dị ka ihe dị mkpa. Ndị a na-ewerezi dị ka ndị ma ebe a nọ bụ ndị na-atụ anya ka onye ha lụrụ na-egboro ha mkpa ha—ọtụtụ mgbe, ha adịghị achọ ịma ma ọ̀ na-anwụ anwụ. Akwụkwọ bụ́ Journal of Marriage and Family kwuru na mgbe ndị di na nwunye malitere nwewa echiche nke ịchọ ọdịmma onwe ha nanị a bụ “n’afọ ndị 1960, ọ bịakwara ka njọ n’afọ ndị 1970.” Ihe ndị e jibu maka ha alụ di ma ọ bụ nwunye—dị ka ọchịchọ maka ịhụnanya, mmadụ inwe onye ya na ya ga na-emekọ, izere omume rụrụ arụ, ịmụ ụmụ, na igborịta mkpa—abụchaghịzi ihe ndị mere e ji alụ ya.

Ọtụtụ mgbanwe ndị ọzọ e nwerela na nso nso a emekwuola ka mmekọrịta di na nwunye gbanwee n’ọtụtụ mba. Nke mbụ, ọrụ e ji mara nwoke, nke bụ́ ịkpa afọ ezinụlọ, na nke e ji mara nwanyị, nke bụ́ ọrụ ụlọ, agbanweela n’ọtụtụ mba. N’ihi mbanye ụmụ nwanyị banyeziri n’ịrụ ọrụ ego, ezinụlọ ma di ma nwunye na-arụ ọrụ ego adịla nnọọ ọtụtụ. Nke abụọ, ọtụtụ mmadụ adịghịzi ele ịmụ nwa n’alụghị di anya ọjọọ, nke a emewokwa ka ọnụ ọgụgụ ezinụlọ nanị nne ma ọ bụ nna na-azụ ụmụ na ya mụbaa. Nke atọ, kama ịlụ alụ, imirikiti ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na-ebikọzi ọnụ n’alụghị alụ. (Lee igbe bụ́ “Alụmdi na Nwunye Kadị Ya Esi Ike”) Nke anọ, ọtụtụ mmadụ na-anabatazi nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị ịlụ onwe ha, na-akwadokwa mbọ a na-agba ịhụ na iwu kwadoro ya. Ihe a nile, bụ́ ihe ndị na-eme n’oge a, ò metụtawo ụzọ i si ele alụmdi na nwunye anya?

Otú Ndị Na-agba Alụkwaghịm Si Na-amụba

Ka anyị lebagodị anya ná mba ụfọdụ iji hụ otú alụkwaghịm ọtụtụ mmadụ na-agba si soro na-atọsa di na nwunye. Dị ka akụkọ e nwetara n’aka otu ụlọ ọrụ dị na United States si kwuo, n’obodo ahụ, “ọnụ ọgụgụ ndị gbara alụkwaghịm ji okpukpu anọ mụbaa n’agbata afọ 1970 na 1996.” Ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ ise ọ bụla torurula ogo mmadụ agbaala alụkwaghịm. Olee ndị kasị agba alụkwaghịm? Nnyocha e mere na-egosi na ihe dị ka atọ n’ime ndị di na nwunye ise ọ bụla gbara alụkwaghịm bụ n’ime afọ iri mbụ ha lụrụ ka ha gbara ya.

Ná mba ndị ọzọ kwa, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm amụbaala n’ike. Ọnụ ọgụgụ ndị gbara alụkwaghịm n’England nakwa na Wales ruru 153,490 n’afọ 2004. Ndị Australia pụrụ ịtụ anya na abụọ n’ime ndị di na nwunye ise ọ bụla nọ ná mba ahụ ga-agba alụkwaghịm. Na Republic of Korea, ndị gbara alụkwaghịm nanị n’ime otu afọ—site n’afọ 2002 ruo 2003—ji 21,800 mụbaa. Nke a bụ n’ihi na ná mba ahụ, ndị di na nwunye nile gbara alụkwaghịm n’afọ ahụ dị 167,100. Japan, bụ́ ebe otu n’ime ndị di na nwunye anọ ọ bụla na-agba alụkwaghịm, afọla obere ka ndị na-agba alụkwaghịm na ya haruo ka ndị na-agba ya na Europe. Otu ọkachamara n’ihe banyere ndụ ezinụlọ, nke na-arụ na mahadum bụ́ Japan Red Cross University, kwuru, sị: “N’oge mbụ, ọ bụ nanị di na nwunye nsogbu ha siri oké ike na-agba alụkwaghịm. Ugbu a, ịgba alụkwaghịm aghọọla ihe a na-eme dị ka ụzọ mmadụ họọrọ isi bie ndụ ya.”

N’ọtụtụ mba, okpukpe na omenala ndị dịwara eri oge gboo, so mee ka alụmdi na nwunye sie ike. Ma, ha apụghịzi ime ka ọhaneze kwụsị ịkwado ịgba alụkwaghịm. Were Chọọchị Roman Katọlik dị ka ihe atụ, bụ́ ebe e weere alụmdi na nwunye dị ka ihe dị nsọ. N’afọ 1983, chọọchị ahụ wetulatara aka n’iwu ya banyere nkekọ dị n’etiti di na nwunye ma mee ka ọ dịkwuoro ndị Katọlik mfe ịgba alụkwaghịm. N’ihi ya, ndị di na nwunye chọọchị ahụ tọsarala adịla ọtụtụ kemgbe ahụ.

N’ezie, o doro anya na eriri e ji kegide alụmdi na nwunye atọpụwala. Ma, ọ bụghị ihe nile na-akpata ịgba alụkwaghịm na-apụta ìhè. N’ezie, e wezụga nsogbu a na-enwe ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya, e nwere ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ nke mere ọtụtụ mmadụ ji agba alụkwaghịm—imerime mmadụ adịghịkwa ahụ ya.

Otu Ihe Zoro Ezo nke Na-akpata Nsogbu Ahụ

Bible gwara anyị na Setan bụ́ Ekwensu, onye kasị achọ ọdịmma onwe ya nanị, na-enwe mmetụta a na-adịghị ahụ anya na nke jọgburu nnọọ onwe ya n’ebe ụwa a dị. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na a chụdatala ya n’ụwa ebe a, oké iwe jikwa ya. N’eziokwu, o fooro ntutu taa na ya ga na-akpatara ụmụ mmadụ “ahụhụ” ma ọ bụ nsogbu ruo ókè ike kwere ya, alụmdi na nwunye, nke bụ́ ihe Chineke guzobere, bụkwa nanị otu n’ime ihe ndị Setan na-ewesa oké iwe.—Mkpughe 12:9, 12.

Ka Jizọs na-ekwu banyere oge a chụdatasịrị Setan n’ụwa, ọ sịrị: “N’ihi ịba ụba nke mmebi iwu, ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.” (Matiu 24:12) N’ụzọ yiri nke ahụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ [ma ọ bụ, ndị na-ahụghị ndị òtù ezinụlọ ha n’anya], ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:2-4) Ọ bụghị taa ka ndị mmadụ bidoro kpawa àgwà ọjọọ ndị a, ma n’oge anyị a, ọ kaala njọ, dị ka ọtụtụ mmadụ chọpụtarala.

N’ihi oké nsogbu a ndị lụrụ di na nwunye na-enwe, gịnị ka anyị pụrụ ime iji chebe onwe anyị ma hụ na mmekọrịta anyị na onye anyị lụrụ bụ nke obi ụtọ na nke ga-adịgide adịgide? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

“N’obodo e ji ịtụfu ihe mara, o yiri ka ndị mmadụ hà ga na-eme otu ihe ahụ ma a bịa ná mmekọrịta ha na mmadụ ibe ha.”—SANDRA DAVIS, BỤ́ ỌKACHAMARA N’IHE BANYERE IWU NA-ACHỊKWA EZINỤLỌ

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

‘Alụmdi na Nwunye Kadị Ya Esi Ike’

Ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na-ebikọ ọnụ n’alụghị alụ. Otú ọ dị, akụkọ e nwetara n’aka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa na United States kwuru na ‘alụmdi na nwunye kadị mmekọrịta dị otú ahụ esi ike.’ Ụfọdụ n’ime ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị a na-ebikọ ọnụ iji chọpụta ma ihe ọ̀ ga-adabara ha ma ha lụọ. Ma, nke a ọ̀ na-eme ka mmadụ ghara ịlụ onye ihe na-agaghị adabara ya na ya? Dị ka akwụkwọ bụ́ Journal of Marriage and Family si kwuo, ihe àmà na-egosi na ọ naghị adị otú ahụ. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “A bịa ná ndị nke lụrụla alụ, mbikọ ha bikọrọ ọnụ tupu ha alụwa so mee ka ọlụlụ ha lụrụ ghara ijucha ha afọ . . . , ka ha na-enwekarị nsogbu ezinụlọ, nakwa . . . ka ha gbaa alụkwaghịm ngwa ngwa.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Ogologo Ndụ na Alụmdi na Nwunye

Ndị mmadụ na-adị ogologo ndụ taa karịa ka ha na-adị n’oge gboo. Ọbụna ọnọdụ ọma a esorola mee ka ndị di na nwunye na-enwe nsogbu. Taa, ịgba alụkwaghịm na-atọsa di na nwunye ndị ọnwụ gaara atọsa ma a sị na ọ bụ n’oge mbụ. Tụlee nsogbu ụmụ nwanyị ndị nọterela aka na di na-enwe na Japan. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Washington Post si kwuo, ndị ọkachamara kpọrọ nsogbu a “nsogbu ụmụ nwanyị na-enwe ma di ha laa ezumike nká.” Ka otu nwanyị nke lụrụla di kemgbe afọ iri anọ chetara oge di ya lara ezumike nká, o kwuru na n’oge ahụ, ya chere, sị: “Aga m agba ya alụkwaghịm ugbu a. Imere ya ihe ma o si ọrụ lọta abụghịrị m obere ihe, ma ya fọdụzie nke a mụ na ya ga na-anọ n’ụlọ mgbe nile. Echeghị m na m ga-edili ya.”