Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Pụrụ Isi Mee Ka Gị na Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-enwe Obi Ụtọ

Otú Ị Pụrụ Isi Mee Ka Gị na Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-enwe Obi Ụtọ

Otú Ị Pụrụ Isi Mee Ka Gị na Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-enwe Obi Ụtọ

“Nwoke [ga-arapara] n’ahụ́ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ́.”—JENESIS 2:24.

ONYE Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, guzobere alụmdi na nwunye dị ka ihe ga-ejikọta nwoke na nwanyị n’oge nile ha dị ndụ. Jenesis 2:18, 22-24 na-ekwu, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee sị, Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ nanị ya; M ga-emere ya onye inyeaka kwesịrị ya. . . . Jehova bụ́ Chineke wee wuo [ọgịrịga ahụ, bụ́ nke O wepụtara n’ahụ́ mmadụ ahụ] dị ka ụlọ ka ọ ghọọ nwanyị, O mee ka ọ bịakwute mmadụ ahụ. Mmadụ ahụ wee sị, Ehee! nke a bụ nnọọ ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ m pụta, na anụ ahụ́ si n’anụ ahụ́ m pụta: nke a ka a ga-akpọ Nwanyị, n’ihi na e wepụtara nke a n’ahụ́ Nwoke. N’ihi nke a ka nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ́ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ́.”

N’eziokwu, di na nwunye ịhụ na mmekọrịta dị n’etiti ha bụ nke obi ụtọ na nke ga-adịgide adịgide adịghị mfe, ma o kwere omume n’ezie. Ọtụtụ ndị anọgidela na-enwe obi ụtọ kemgbe afọ 50, 60, ma ọ bụ karịa, ha lụrụ. Olee otú ha si mee ya? Ha nọgidere na-agbasi mbọ ike ịhụ na ha ‘nwetara nnwapụta’ nke di ma ọ bụ nwunye ha, ha na-emekwa ya n’achọghị ọdịmma onwe ha nanị. (1 Ndị Kọrint 7:33, 34) Nke ahụ abụghị obere ọrụ. Ọ bụrụ na ị dị njikere itinye oge na mgbalị ọ chọrọ, gị onwe gị pụkwara ime ka mmekọrịta gị na onye ị lụrụ bụrụ nke ga na-enye unu obi ụtọ na nke ga-adịte aka.

Jiri Nlezianya Na-agbaso Ntụziaka E Nyere Maka Ya

Onye ma nke a na-akọ n’iwu ụlọ agatụghị amalite iwu ụlọ n’ebughị ụzọ leba anya n’ebe e sere otú ụlọ ahụ kwesịrị ịdị. N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị apụghị ime ka mmekọrịta anyị na onye anyị lụrụ bụrụ nke obi ụtọ n’ejighị nlezianya tụlee ntụziaka Chineke nyere banyere ụzọ a ga-esi mee ya. Ntụziaka a dị n’Okwu Chineke. Pọl onyeozi dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru . . . maka ime ka ihe guzozie.”—2 Timoti 3:16.

Ndị di na nwunye pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe banyere alụmdi na nwunye site n’ịtụle otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na n’ime Bible, e ji mmekọrịta dị n’etiti Jizọs na ndị ga-eso ya achị n’eluigwe tụnyere mmekọrịta dị n’etiti di na nwunye. (2 Ndị Kọrint 11:2) Jizọs rapagidesiri ike n’ahụ́ ndị enyi ya, ọbụna n’oge ihe kasị siere ya ike. Ọ “hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.” (Jọn 13:1) Ebe Jizọs bụ onye ndú na-emetere mmadụ ebere, ọ dịghị mgbe o chefuru na ụmụazụ ya bụ ndị na-adịghị ike. Ọ dịtụghị mgbe ọ gwara ha ka ha nye ma ọ bụ mee ihe karịrị ike ha.—Jọn 16:12.

Ọbụna mgbe ndị bụ́ ezigbo ndị enyi ya mechuru ya ihu, Jizọs nọgidere jiri ụzọ dị nro na-emeso ha ihe. Ọ baghịrị ha mbá, kama o ji obi umeala na obiọma yiri nke Chineke gbalịa ịgbazi ha. (Matiu 11:28-30; Mak 14:34-38; Jọn 13:5-17) N’ihi ya, i nyochaa nnọọ ụzọ Jizọs si jiri nwayọọ mesoo ụmụazụ ya ihe na ụzọ ha si hụkwa ya n’anya, ị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere ụzọ ị ga-esi mee ka mmekọrịta gị na onye ị lụrụ bụrụ nke na-enye obi ụtọ.—1 Pita 2:21.

Tọọ Ntọala Ya nke Ọma

O doro anya na nsogbu ndị yiri oké ifufe ga-akpa ntọala nke alụmdi na nwunye gị aka. Nke a ga-anwale otú mmekọrịta gị na onye ị lụrụ siruru n’ike. Otú ọ dị, ka mmekọrịta di na nwunye wee bụrụ nke ga-enye ha obi ụtọ, o kwesịrị ịdabere ná nkwa siri ike ha ji ịhụnanya kwe ibe ha. Jizọs mere ka mkpa ọ dị di na nwunye ịhụ na ha kwesiri ibe ha nkwa ike pụta ìhè mgbe o kwuru, sị: “Ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:6) Mgbe Jizọs sịrị “mmadụ ọ bụla,” nwoke na nwunye ya, bụ́ ndị ṅụworo iyi na ha agaghị ahapụ ibe ha, so ná ndị o bu n’uche.

Ụfọdụ pụrụ iwere ya na ikwe nkwa abụghị obere ihe, na ihe ọ na-achọ na ihe ndị ọ na-efu karịrị akarị. Taa, ndị mmadụ na-achọ ntụsara ahụ́ kama ikwe ịchụ àjà ndị ha gaara achụ ma ha kwe ibe ha nkwa.

Olee ihe pụrụ ime ka di na nwunye mezuo nkwa ha kwere ibe ha? Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha.” (Ndị Efesọs 5:28, 29) Ya mere, di na nwunye ịbụ ndị e ‘kekọtara’ pụtara na ha ga na-eche banyere ibe ha otú ha si eche banyere onwe ha. Di na nwunye kwesịrị ịkwụsị ịdị na-eche banyere “nke m” ma chewezie banyere “nke anyị,” kwụsịkwa ịdị na-eche banyere “mụ” ma chewezie banyere “anyị.”

Di na nwunye iguzogide nsogbu ndị yiri oké ifufe ga-eme ka ha bụrụ ndị maara ihe. Amamihe dị otú ahụ ha nwere pụrụ ime ka ha nwee obi ụtọ. Ilu 3:13 kwuru, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma [ma ọ bụ, onye obi ụtọ] ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ.”

Jiri Ihe Ndị Ga-eguzogide Nsogbu Ndị Kpụ Ọkụ n’Ọnụ Tọọ Ntọala Ya

Ka ụlọ wee dịtee aka ma guzosie ike, a ghaghị ịrụ ya nke ọma. N’ihi ya, kpebisie ike ime ka mmekọrịta gị na onye ị lụrụ bụrụ nke ga-adịgide adịgide. Jiri ihe ndị na-adịghị emebi ngwa ngwa mee ya, bụ́ ihe ndị ga-eme ka i nwee ike ịrapagidesi ike n’ahụ́ ya mgbe unu nwere nsogbu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ. Jiri ọmarịcha àgwà ndị dị ka amamihe si n’aka Chineke, mmesapụ aka, nghọta, egwu Chineke, obi ụtọ, inwe ezigbo mmasị n’iwu Chineke, na inwe ezigbo okwukwe kpọrọ ihe otú ị ga-esi jiri ọlaedo kpọrọ ihe.

Obi ụtọ na afọ ojuju di na nwunye na-enwe adịghị esi n’ihe onwunwe ma ọ bụ n’ọkwá ha nọ na ya. Ọ na-esi n’obi na n’uche, eziokwu nke Okwu Chineke na-emekwa ka àgwà ndị a sikwuo ike. A pụkwara itinye ndụmọdụ ahụ bụ́ “ka onye ọ bụla nọgide na-elezi anya otú o si na-ewukwasị ihe” n’ọrụ ná mmekọrịta di na nwunye.—1 Ndị Kọrint 3:10.

Mgbe Unu Nwere Nsogbu

Ka ụlọ wee dịtee aka n’emebighị emebi, ọ dị mkpa ịnọgide na-elekọta ya nke ọma. Mgbe di na nwunye na-akwado ibe ha mgbe nile n’ihe mgbaru ọsọ ha nakwa mgbe ha na-asọpụrụ ma na-akwanyere ibe ha ùgwù, ha na-anọgide na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ịchọ ọdịmma onwe onye nanị adịghị abata na ya, ọ na-adịkwara ha mfe ịchịkwa iwe.

Iwe oké iwe na inwe ahụ́ mgbakasị ruo ogologo oge pụrụ ime ka di na nwunye kwụsị ịhụ ibe ha n’anya. Pọl onyeozi dụrụ ndị bụ́ di ọdụ, sị: “Unu ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, unu adịkwala na-eweso ha iwe n’ụzọ dị ilu.” (Ndị Kọlọsi 3:19) Ndị bụ́ nwunye kwesịkwara itinye ụkpụrụ ahụ n’ọrụ. Mgbe di na nwunye na-agbasi mbọ ike ịdị na-echebara ibe ha echiche, na-egosi ibe ha obiọma, ma na-aghọta ibe ha, ha na-enwe obi ụtọ na afọ ojuju. Izere obi ọkụ na olu ike na-enyere ha aka igbochi nsogbu mgbe ihe siiri ha ike. Pọl gbara ume, sị: “Bụrụnụ ndị na-emere ibe unu ebere, na-enwe obi ọmịiko, na-agbaghara ibe unu kpamkpam.”—Ndị Efesọs 4:32.

Gịnị ma ọ bụrụ na ihe mere iwe ji ewe gị bụ n’ihi na ọ na-adị gị ka ị dịghịzi ike, ka à na-akpasu gị iwe, ma ọ bụkwanụ ka e jichaghịzi gị kpọrọ ihe? Jiri olu dị nro kọọrọ di ma ọ bụ nwunye gị ihe mere iwe ji ewe gị, kọọkwara ya ya otú ọ ga-aghọta ya. Otú ọ dị, ọ ga-akasị mma ka i jiri ịhụnanya kpuchie ya ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ihe ahụ bụ.—1 Pita 4:8.

Otu nwoke nke ya na nwunye ya gabigarala ọtụtụ nsogbu n’ime afọ 35 ha lụrụ, kwuru na ụdị iwe ọ sọkwara gị na-ewesa onye ị lụrụ, “ya adịla mgbe ị ga-akwụsị ịtụpụrụ ya ọnụ.” O ji amamihe kwuokwa, sị, “Ya adịkwala mgbe ị ga-akwụsị ịhụ ya n’anya.”

Pụrụ Ime Ka Gị na Onye Ị Lụrụ Na-enwe Obi Ụtọ!

Nke bụ́ eziokwu bụ na ime ka gị na onye ị lụrụ na-enwe obi ụtọ adịghị mfe. Ma, mgbe di na nwunye kpebisiri ike ịhụ na Chineke batara n’alụmdi na nwunye ha, ha ga-enwe obi ụtọ na obi iru ala. N’ihi ya, lebaranụ mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ unu anya; meenụ ka nkwa unu kwere ịlụ onwe unu sie ike. Chetakwa na dị ka Jizọs kwuru, obi ụtọ di na nwunye na-enwe adịghị esi nanị di ma ọ bụ nwunye n’aka. Kama, onye ọ kasị esi n’aka ya bụ Jehova Chineke, bụ́ Onye guzobere alụmdi na nwunye. “Ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:6.

AKWỤKWỌ ỌZỌ I NWERE IKE ỊGỤ

Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, tụrụ aro ndị dị mma banyere ụzọ di na nwunye pụrụ isi mee ka mmekọrịta ha bụrụ nke ga na-enye ha obi ụtọ na nke ga-aga nke ọma. Ọtụtụ narị puku ndị di na nwunye n’ụwa nile achọpụtala na ndụmọdụ ya ndị dabeere na Bible enyerela ha aka ime ka mmekọrịta ha na onye ha lụrụ ka mma.—Lee peeji nke 32 nke magazin a.

[Igbe dị na peeji nke 9]

Olee Ihe Pụrụ Inyere Di na Nwunye Aka Ịhụ na Ha Na-enwe Obi Ụtọ?

▪ Na-amụkọnụ Okwu Chineke ọnụ mgbe nile, na-ekpekukwanụ Chineke ekpere maka enyemaka na nduzi iji na-edozi nsogbu ndị unu na-enwe.—Ilu 3:5, 6; Ndị Filipaị 4:6, 7; 2 Timoti 3:16, 17.

▪ Hụ na ọ bụ nanị di ma ọ bụ nwunye gị ka ị na-enwe mmasị iso enwe mmekọahụ.—Ilu 5:15-21; Ndị Hibru 13:4.

▪ Jirinụ ịhụnanya na-ekwurịta banyere nsogbu unu na-enwe, n’ezoghị ọnụ.—Ilu 15:22; 20:5; 25:11.

▪ Jiri obiọma na nchebara echiche na-agwa onye ị lụrụ okwu; zere iwe ọkụ, ime mkpesa, na okwu ọjọọ.—Ilu 15:1; 20:3; 21:9; 31:26, 28; Ndị Efesọs 4:31, 32.

▪ Jiri obi umeala na-etinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ ọbụna ma a sị na ọ na-adị gị ka onye ị lụrụ adịghị eme ihe nile o kwesịrị ime.—Ndị Rom 14:12; 1 Pita 3:1, 2.

▪ Gbasie mbọ ike ịhụ na ị zụlitere àgwà ndị na-amasị Chineke bụ́ ndị e dekọrọ na Bible.—Ndị Galeshia 5:22, 23; Ndị Kọlọsi 3:12-14; 1 Pita 3:3-6.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Gbasoonụ ntụziaka Chineke nyere n’ime Bible banyere alụmdi na nwunye

[Foto dị na peeji nke 7]

Jirinụ ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị na ikwesị ntụkwasị obi tọọ ntọala nke alụmdi na nwunye unu

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Zụlitenụ àgwà ọma ndị pụrụ iguzogide nsogbu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Ọ dị mkpa ka di na nwunye nọgide na-agbasi mbọ ike ịhụ na ha na-enwe mmekọrịta dị mma