Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

GOSI NKE BỤ́ NKE N’IME NDỊ MMỤỌ OZI A E SERE EBE A

Jiri pensịl kaa akara site n’aha ndị mmụọ ozi e depụtara ebe a gaa na foto ndị mmụọ ozi nke kwekọrọ n’aha ahụ. Ị kasịa ya, ị zaa ajụjụ ya na ya so.

Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi

Olee aha e ji mara onyeisi ndị mmụọ ozi?

Ndị Cherub

Gịnị ka ndị cherub chere nche n’Iden?

Ndị Seraf

Gịnị ka Aịzaịa nụrụ ndị seraf na-ekwu?

Ndị Mmụọ Ozi

Ọ dịkarịa ala, ndị mmụọ ozi ole ka e nwere?

1. ․․․․․

2. ․․․․․

3. ․․․․․

4. ․․․․․

Ajụjụ A Ga-eji Ekwurịta Okwu: Olee otú gị ịma banyere ndị mmụọ ozi pụrụ isi mee ka i nwekwuo obi ike?—2 Ndị Eze 6:15-17.

OLEE AFỌ O MERE?

Jiri pensịl kaa akara site n’ihe osise ahụ ruo n’afọ ihe ahụ e sere mere.

1761 T.O.A. Ihe dị ka 538 T.O.A. 33 O.A.

1728 T.O.A. Ihe dị ka 455 T.O.A. 44 O.A.

5. Ọrụ 12:5-11

6. Jenesis 32:22-30

7. Daniel 6:22

ÒNYE KA M BỤ?

8. Eleghaara m ịdọ aka ná ntị nke mmụọ ozi anya, legharakwa mkpesa ịnyịnya ibu m mere anya.

ÒNYE KA M BỤ?

9. Ezigaara m Daniel, Zekaraịa, na nne Immanuel, ozi.

N’IME MBIPỤTA NKE A

Zaa ajụjụ ndị a ma depụta amaokwu Bible ndị a na-edepụtaghị.

Peeji nke 4 Olee otú ikiri televishọn si yie ịracha mmanụ aṅụ? (Ilu 25:____)

Peeji nke 7 Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya banyere ihe anyị na-ekiri na televishọn? (Ilu 13:____)

Peeji nke 25 Gịnị na-eme echiche mmadụ ma onye ahụ nwụọ? (Abụ Ọma 146:____)

Azịza

1. Ndị Cherub. ‘Ụzọ e si abanye n’ebe osisi nke ndụ ahụ dị.’—Jenesis 3:24.

2. Onyeisi ndị mmụọ ozi. Maịkel.—Jud 9.

3. Ndị mmụọ ozi. Ọtụtụ nde.—Daniel 7:10.

4. Ndị seraf. “Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova dị.”—Aịsaịa 6:3, 6, 7.

5. 44 O.A.

6. 1761 T.O.A.

7. Ihe dị ka 538 T.O.A.

8. Belam.

9. Gebriel.