Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Pụrụ Inyere Ndị Nwụrụ Anwụ Aka?

Ị̀ Pụrụ Inyere Ndị Nwụrụ Anwụ Aka?

Echiche Nke Bible

Ị̀ Pụrụ Inyere Ndị Nwụrụ Anwụ Aka?

“Chọọchị anọwo kemgbe ụwa . . . na-ekpe ekpere n’isi [ndị nwụrụ anwụ], . . . a na-emekwa nke a iji hụ na ha dị ọcha, ma nweekwa ike ịhụ Chineke ihu n’ihu.” —“Katkizim nke Chọọchị Katọlik.”

NDỊ si n’agbụrụ nile na-enwe nchegbu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ma eleghị anya, ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya emetụla ka i ruo újú, meekwa ka ọ dị gị ka ị̀ tọgbọ chakoo. Ị pụrụ ịdị na-eche ma ndị nwụrụ anwụ hà ka dị ndụ ebe ha nọ, ma hà na-ata ahụhụ ka hà nọ n’udo, nakwa ma ò nwere ihe ọ bụla i nwere ike ime iji nyere ha aka.

Ọtụtụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe kweere na ha pụrụ inyere ndị nwụrụ anwụ aka. Dị ka ihe atụ, ndị Hindu kweere na ha pụrụ ime ka mkpụrụ obi onye ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ nwee obi ụtọ ebighị ebi site n’ịkpọ ozu ya ọkụ n’ikpere mmiri nke Osimiri Ganges ma fesasịa ntụ ya n’ime Osimiri ahụ. N’ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ndị Buddha na-akpọ ụgbọala, ụlọ, na uwe ndị e ji akwụkwọ mee ọkụ, tinyere ego, na-eburu n’obi na onye ahụ nwụrụ anwụ ga-eji ha eme ihe n’ụwa ọzọ. N’Africa, a na-awụsa mmanya ọkụ n’ili onye nwụrụ anwụ, na-eburu n’obi na ọ ga-abara ya uru.

Okpukpe Katọlik na-akụzi na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’echegharịghị na “njọ ogbugbu” ndị o mere, na ọ gaghị enweta ihu ọma Chineke. Ha na-ekwu na “onye nọ n’ọnọdụ a nọ ‘n’ọkụ ala mmụọ.’” N’aka nke ọzọ, okpukpe a na-akụzi na onye nwetara ihu ọma Chineke pụrụ ịtụ anya na ya ga-eso Chineke nweta “obi ụtọ ebighị ebi” n’eluigwe. Ma tupu ya enweta obi ụtọ ahụ, a ga-ebu ụzọ mee ka ọ dị ọcha n’ụzọ zuru ezu. Iji mee ka ọ dị ọcha, ọ pụrụ ịdị mkpa na ọ ga-anọ na pọgatrị ruo oge ụfọdụ, bụ́ ebe a ga-eji ‘ọkụ mee ka ọ dị ọcha.’ Nke a bụ iji taa ya ahụhụ maka njọ dị mgbaghara o mere. Ma, mgbe mmadụ ka nọ na pọgatrị, a pụrụ inyere ya aka site n’ịhụ na chọọchị na-ekpere ya ekpere ma na-edoro ya Mas. Ndị enyi na ndị ikwu nke onye ahụ nwụrụ anwụ na-akwụkarị ụgwọ maka ihe ndị a.

Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị ịchọ ime ihe nile i nwere ike ime iji mee ka ndị ị hụrụ n’anya kwụsị ịta ụdị ahụhụ ọ bụla ha na-ata. Ọ bụrụ na o kwere omume inyere ha aka, í cheghị na Chineke gaara akọwara anyị otú anyị ga-esi enyere ha aka? Ka anyị hụ ihe Bible na-akụzi banyere inyere ndị nwụrụ anwụ aka.

Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ

Ihe mere ndị mmadụ ji eme ihe a nile e kwuru banyere ha bụ n’ihi na ha kweere na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ, ya bụ, na mmadụ nwere ihe e kenyere n’ime ya, nke na-adịrị ndụ gawa ma onye ahụ nwụọ. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe Bible na-akụzi? Bible na-ekwu, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ; n’ihi na e chezọwo ncheta ha. Ma ịhụnanya ha, ma ịkpọasị ha, ma ekworo ha, na mgbe dị anya gara aga ka ọ laworo n’iyi; ọ dịghịkwa òkè ha nwere ọzọ ruo mgbe ebighị ebi n’ihe ọ bụla nke e meworo n’okpuru anyanwụ. Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Shiol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.” (Eklisiastis 9:5, 6, 10) Shiol bụ okwu Hibru nke pụtara nanị ili nkịtị nke ụmụ mmadụ.

A bịa n’ihe ọnwụ na-eme echiche onye nwụrụ anwụ, ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ dere, sị: “Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”—Abụ Ọma 146:4.

Ihe ndị ahụ Bible kwuru bụ ihe ndị a pụrụ ịtụkwasị obi na ndị ezi uche dị na ha. Olee ihe i chere banyere ajụjụ a? Nna na-ahụ n’anya ọ̀ ga-ata ụmụ ya ahụhụ n’ihi ọchịchọ ime mmehie nke si ha n’ọbara? (Jenesis 8:21) Mbanụ! Ọ bụrụ na nna na-ahụ n’anya agaghị eme ya, oleezi otú Nna anyị nke eluigwe ga-eji mee ihe ọ bụla yiri ya? Mgbe ụfọdụ ndị Izrel n’oge ochie malitere jiri ụmụ ha chụwara arụsị àjà site n’ịkpọ ha ọkụ, Jehova katọrọ omume ahụ ha tara obi mmiri mee. O kwuru na nke ahụ bụ ‘ihe ya n’enyeghị n’iwu nakwa ihe na-abatabeghị ya n’obi.’—Jeremaịa 7:31.

Ihe mmehie ụmụ mmadụ na-akpatara ha bụ ọnwụ, ọ bụghị ime ka ha tawa ahụhụ ma ha nwụọ. Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ,” o kwukwara na “a tọhapụwo onye nwụworo anwụ ná mmehie ya.”—Ndị Rom 5:12; 6:7, 23.

Ndị nwụrụ anwụ adịghị ata ahụhụ. Kama nke ahụ, ha nọ dị ka ndị nọ n’oké ụra, ndị na-enweghị ike iche echiche, na-enweghịkwa ike ịnụ ụtọ ndụ ma ọ bụ ime ihe ọ bụla ọzọ. Ya mere, obi abụọ adịghị ya na mgbalị nile ụmụ mmadụ na-eme iji nyere ndị nwụrụ anwụ aka ekwekọghị n’ihe Bible na-akụzi.

Olee Olileanya Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ?

Ihe anyị na-ekwu abụghị na ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-anọgide n’ili ruo mgbe ebighị ebi. Kama nke ahụ, ọnọdụ ha ga-emesị dị mma.

Tupu Jizọs akpọlite ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs n’ọnwụ, O kwuru na ya na-eje “ịkpọte ya n’ụra.” (Jọn 11:11) N’oge ọzọ, o kwuru na “ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) A ga-atọhapụworị ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ná mmehie ndị ha mere mgbe ha nọ ndụ, n’ihi ya kwa, a gaghị ata ha ahụhụ n’ihi ihe ndị ahụ ha metere mgbe ha nọ ndụ. Ha ga-enwe ohere nke ịmụta ịnụ ụtọ ndụ n’ọnọdụ zuru oké. Lee ọmarịcha atụmanya nke a bụ!

Ọ bụrụ na ị chọrọ inwe olileanya dị otú a, egbula oge ime nnyocha iji chọpụta ma nkwa ndị a hà ga-emezukwa. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka.

Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?

▪ Ndị nwụrụ anwụ hà ma ihe?—Abụ Ọma 146:4; Eklisiastis 9:5, 6, 10.

▪ Chineke ọ̀ ga-ekwe ka ndị nwụrụ anwụ taa ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ?—Jeremaịa 7:31.

▪ Olileanya ọ̀ dịịrị ndị nwụrụ anwụ?—Jọn 5:28, 29.