Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkwadebe Nwa Gị Nwanyị Maka Ịhụ Nsọ Ya

Ịkwadebe Nwa Gị Nwanyị Maka Ịhụ Nsọ Ya

Ịkwadebe Nwa Gị Nwanyị Maka Ịhụ Nsọ Ya

A na-enwe ọtụtụ mgbanwe n’ahụ́ mmadụ ná mmalite oge okoro na agbọghọ. Ma, mgbanwe kasị apụta ìhè n’ahụ́ ụmụ nwanyị n’oge a bụ na ha na-amalite ịhụ nsọ ha.

OGE nwatakịrị nwanyị malitere ịhụ nsọ ya pụrụ ịbụrụ ya oge nchekasị, nsọ ahụ ọ hụrụ pụkwara ime ka obi dị ya mma, dịkwa ya njọ. Dịkwa ka ọtụtụ mgbanwe ndị ọzọ a na-enwe ná mmalite oge okoro na agbọghọ si agbagwoju anya, nke a na-agbagwojukwa anya. Ihe mere ụjọ ji atụ ọtụtụ ụmụntakịrị nwanyị, ha ana-echegbukwa onwe ha n’oge mbụ ha hụrụ nsọ ha na-abụkarị n’ihi na a gwaghị ha eziokwu banyere ya, ma ọ bụkwanụ, dị ka ọ na-adịkarị, ya abụrụ na a gwatụbeghị ha banyere ya.

Ụmụntakịrị nwanyị ndị dị njikere maka nsọ ha tupu ha ahụ ya adịkebeghị enwe nsogbu n’oge mbụ ha hụrụ ya. Ma nchọpụta ndị e mere na-egosi na ọtụtụ ụmụntakịrị nwanyị adịghị njikere maka ya tupu ha ahụ ya. N’otu nnyocha e ji ndị si ná mba 23 mee, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na a gwaghị ha banyere nsọ ha tupu ha amalite ịhụ ya. Mgbe ha hụziri ya na mberede, ha amaghị ihe ha ga-eme.

Ụfọdụ n’ime ndị kwuru na ha chegburu onwe ha n’oge mbụ ha hụrụ nsọ ha bụ ụmụ nwanyị ndị na-amaghị banyere nsọ nwanyị tupu ha ahụ ya. N’otu nnyocha e mere, ụmụ nwanyị ji okwu ndị dị ka “ụjọ,” “uche mkpasasị,” “ihere,” na “egwu” kọwaa ụdị mmetụta ha nwere n’oge ha malitere ịhụ nsọ ha.

Ụjọ na-atụkarị ndị mmadụ ma ha hụ ọbara, ebe ọ bụ na a na-ewerekarị na ihe ga-eme ka ọbara gbawa mmadụ bụ na o merụrụ ahụ́. N’ihi ya, ọ naghị esi ike ịhụ ihe mere o ji abụ ma á kọwaghịrị nwatakịrị nwanyị nke ọma banyere ịhụ nsọ ma ọ bụ mee ka ọ dị njikere maka ya, omenala, akụkọ ifo, ma ọ bụ ọbụna amaghị nke a na-akọ, emee ka o chee na ya ebutela ọrịa ma ọ bụ na ya emerụọla ahụ́ ma ọ malite ịhụ nsọ ya, ma ọ bụkwanụ ya elewe ya anya dị ka ihe ihere.

Ọ dị nwa gị nwanyị mkpa ịmata na ọbara ahụ na-apụta ya n’ahụ́ n’oge ọ nọ ná nsọ bụ ihe na-adịghị njọ nke na-eme ụmụ agbọghọ nile. Dị ka nne ma ọ bụ nna, ị pụrụ inyere ya aka mee ka nchegbu ọ bụla ọ na-enwe ma ọ bụ ụjọ ọ bụla ọ na-atụ belata. Olee otú ị ga-esi mee ya?

Ndị Mụrụ Ụmụ Na-ekere Òkè Dị Mkpa na Ya

E nwere ọtụtụ ebe e nwere ike isi mata banyere nsọ nwanyị, dị ka site n’aka ndị nkụzi, ndị dọkịta na ndị nọọsụ, akwụkwọ ọgụgụ, na ọbụna site na fim ndị na-akụzi ihe. Ọtụtụ ndị nne na nna achọpụtala na ebe ndị a e si amata maka nsọ nwanyị na-ekwukarị ihe ndị bara uru banyere ihe mere nwanyị ji ahụ nsọ ya, nakwa otú nwanyị ga-esi na-edebe onwe ya ọcha n’oge ọ nọ ná nsọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụ agbọghọ nwere ike inwe ajụjụ ndị ha na-adịghị enweta azịza ha n’ebe ndị a. Ọ bụrụgodị na ha ma ihe ha ga-eme ma ha hụ nsọ ha, ụmụ agbọghọ anaghị amacha ihe ha ga-eme banyere mmetụta dịgasị iche ha na-enwe ma ha hụ nsọ ha.

Mama ukwu ha, ụmụnne ha ndị nwanyị bụ́ ndị tọrọ ha, nakwa karịsịa nne ha, pụrụ inye aka mee ka ha matakwuo banyere nsọ nwanyị ma mee ka obi ruo ha ala, nke bụ́kwanụ ihe ahụ́ ha chọrọ mgbe ahụ. Dị ka ọ na-adịkarị, ụmụntakịrị nwanyị na-ewere mama ha dị ka onye bụ́ isi ga-agwa ha banyere nsọ nwanyị.

Olee maka ndị nna ha? Ihere na-eme ọtụtụ ụmụntakịrị nwanyị ịgwa nna ha banyere nsọ ha. Ụfọdụ na-achọ ka nna ha nyewere ha aka n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè site n’inye ha nkwado na igosi na ọ ghọtara ọnọdụ ha, ebe ndị ọzọ na-adịghị achọ ka nna ha batadị n’okwu ahụ.

N’ọtụtụ mba, ọnụ ọgụgụ ndị nna nanị ha na-azụ ụmụ arịala elu n’ime iri afọ ole na ole gara aga. * N’ihi ya, ọ dị ọtụtụ ndị nna mkpa iweghara ọrụ nke ịkụziri ụmụ ha ndị nwanyị banyere nsọ nwanyị. Ọ dị ndị nna dị otú a mkpa ịmata ihe ndị bụ́ isi banyere nsọ nwanyị, matakwa banyere mgbanwe ndị ọzọ ụmụ ha ndị nwanyị na-enwe n’ahụ́ nakwa mmetụta ndị ha na-enwe. Ndị nna nwere ike ịgakwuru nne nke ha ma ọ bụ ụmụnne ha ndị nwanyị maka ndụmọdụ na enyemaka n’akụkụ a.

Mgbe E Kwesịrị Ịmalite Ikwurịta Ya

Ná mba ndị mepere emepe dị ka United States, South Korea, na akụkụ ụfọdụ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, oge nwanyị na-amalitekarị ịhụ nsọ ya bụ n’agbata afọ 12 na 13, o nwekwara ike ịmalite ịhụ ya mgbe ọ ka dị afọ 8 nakwa mgbe o rurula afọ 16 ma ọ bụ 17. N’ebe ụfọdụ n’Africa nakwa n’Eshia, o yiri ka afọ nwanyị na-amalite ịhụ nsọ ya ọ̀ na-adị elu karịa. Dị ka ihe atụ, na Nigeria, ọ na-abụkarị mgbe nwanyị dị afọ 15. Ọtụtụ ihe, dị ka ihe dị mmadụ n’ọbara, ọnọdụ akụnụba, ihe mmadụ na-eri, otú ọ na-emegaru ahụ́, na otú o toruru n’ogologo, nwere ike ikpebi oge nwanyị ga-amalite ịhụ nsọ ya.

Ọ kasị mma ibido gwawa nwa gị nwanyị banyere nsọ nwanyị tupu ya amalite ịhụ ya. N’ihi ya, i kwesịrị ịmalite n’oge kwuwe banyere mgbanwe ndị a na-enwe n’ahụ́ n’oge nsọ nwanyị, ikekwe mgbe nwa gị nwanyị dị ihe dị ka afọ asatọ. I nwere ike iche na ị maliteka ya n’oge, ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na nwa gị nwanyị nọ n’agbata afọ asatọ na afọ iri, o yiri nnọọ ka ime ahụ́ ya ọ̀ malitewela itozu etozu n’ihi mmụba mmiri ọgwụ ụfọdụ dị n’ahụ́ ya ga na-amụba. Ị ga-ahụkwa mgbanwe ụfọdụ n’elu ahụ́ ya bụ́ nke e ji ama oge nwanyị na-abanye n’oge agbọghọ, dị ka ịkpụ ara na ịgba ajị. Ọtụtụ ụmụntakịrị nwanyị na-amalite ito ngwa ngwa kpọmkwem tupu ha amalite ịhụ nsọ ha.

Otú Ị Ga-esi Agwa Nwa Gị Nwanyị Banyere Ya

Ụmụntakịrị nwanyị ndị na-etoru oge ịhụ nsọ ha na-achọkarị ịma ihe ha ga-atụ anya ya. O nwere ike ịbụ na ha anụla ka ụmụntakịrị nwanyị ibe ha na-ekwurịta banyere ya n’ụlọ akwụkwọ. Ha nwere ọtụtụ ajụjụ ha ga-ajụ, ma ọtụtụ n’ime ha amaghị otú ha ga-esi jụọ ya. Ọ pụrụ ịbụ na ihere na-eme ha ikwu banyere ya.

Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ndị nne na nna. Ọ bụ eziokwu na ọ na-abụkarị ndị nne na-akọrọ ụmụ ha ndị nwanyị banyere nsọ nwanyị, ha anaghị adịcha njikere ịkọ ya, ọ na-emekwa ha ihere ma ha kọwa ya. Ikekwe, ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gị. Ya mere, olee otú ị ga-esi malite ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na nwa gị nwanyị kwurịta banyere mmalite nke oge nsọ nwanyị na nsọ nwanyị n’ozuzu ya?

O yiri ka ụmụaka ndị na-erubeghị afọ iri, bụ́ ndị na-etoru oge ha ga-amalite ịhụ nsọ ha, hà ga-aghọta okwu ndị dị mfe i kwuru n’ụzọ doro anya. Ihe ndị ị ga-ekwu nwere ike ịgụnye ugboro ole nwanyị na-ahụ nsọ ya, ogologo oge ọ na-anọ, ma ọ bụ ókè ọbara na-agbaru. N’ihi ya, n’oge mbụ ị malitere ịkụziri nwa gị banyere nsọ nwanyị, ọ ga-akasị mma ilekwasị anya n’ihe ndị bara uru mmadụ ga-eme ozugbo ọ malitere ịhụ nsọ ya. Tụkwasị na nke ahụ, ọ ga-adị mkpa ka ị zaa ajụjụ ndị dị ka: Olee otú ahụ́ ga-adị m ma o mewe m? ma ọ bụ Gịnị ka m kwesịrị ịtụ anya ya?

Ka oge na-aga, i nwere ike ịkọwakwuru ya ihe mere nwanyị ji ahụ nsọ ya. Ọtụtụ mgbe, ị pụrụ inweta akwụkwọ ị ga-eji akụzi banyere nsọ nwanyị n’aka ndị ọrụ ahụ́ ike ma ọ bụkwanụ gị enweta ya n’ọ́bá akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe a na-ere akwụkwọ. Akwụkwọ ndị ahụ nwere ike inye aka n’ịkọwa ya nke ọma. Ụfọdụ ụmụntakịrị nwanyị nwere ike ịchọ ịgụ akwụkwọ ndị ahụ n’onwe ha. Ndị ọzọ nwere ike ịchọ ka gị na ha gụkọọ ya.

Chọta ebe ụ̀zụ̀ na-adịghị unu ga-anọ kwurịta okwu ahụ. Malite site n’iji ụzọ dị mfe nghọta kọwaara ya banyere otú nwanyị si etogide ghọọ agbọghọbịa. Ikekwe, i nwere ike ikwu ihe dị ka: “Otu ụbọchị, otu ihe na-adịghị njọ nke na-eme ụmụ agbọghọ nile ga-amalite ime gị. Ị̀ ma ihe ọ bụ?” Ma ọ bụ, nne nwere ike ịmalite ịkọ ahụmahụ nke onwe ya, dị ka: “Mgbe m dị afọ ole ị dị ugbu a, amalitere m iche banyere ihe nwanyị ịhụ nsọ ya dị ka ya. Mụ na ndị enyi m kwurịtara banyere ya n’ụlọ akwụkwọ. Ndị enyi gị hà amalitela ikwurịta banyere ya?” Chọpụta ihe ọ maara banyere nsọ nwanyị ma mee ka ihe ndị ọ na-aghọtachaghị banyere ya doo ya anya. Ghọta na ná mkparịta ụka mbụ unu ga-enwe, o nwere ike ịbụ gị ga-aka ekwu okwu ma ọ bụrụdị na ọ bụghị nanị gị ga-ekwucha ihe nile.

Ebe ọ bụ na ị bụ nwanyị nke obi abụọ na-adịghị ya na i nwere nchegbu n’oge mbụ ị hụrụ nsọ gị, i nwere ike ịkọrọ ya ahụmahụ nke gị mgbe ị na-agwa ya banyere nsọ nwanyị. Olee ihe ndị ọ dị mkpa na ị ga-amata n’oge ahụ? Olee ihe ndị ị chọrọ ịmata? Olee ihe ndị nyeere gị aka? Gbalịa ịkọwara ya nke ọma uru nsọ nwanyị bara na nsogbu ndị a na-enwe na ya. Dịrị njikere ịza ajụjụ ọ bụla ọ jụrụ gị.

Ọ Bụ Ihe A Na-eme Site n’Oge Ruo n’Oge

Unu kwesịrị ile ịkụziri nwa unu nwanyị banyere nsọ nwanyị anya dị ka ihe unu ga na-eme site n’oge ruo n’oge, ọ bụghị dị ka ihe unu ga-eme nanị otu ugboro. Ọ gaghị adị mkpa ịkọcha ihe nile n’otu mgbe. Nwatakịrị ahụ nwere ike ichefu ọtụtụ n’ime ihe ndị unu kọọrọ ya ma ọ bụrụ na unu kọọrọ ya ọtụtụ ihe n’otu mgbe. Ụmụaka na-eji nwayọọ nwayọọ amụta ihe. O nwekwara ike ịdị mkpa ka unu na-ekwughachi ihe ndị unu kwurula n’oge ndị ọzọ. Ka ụmụntakịrị nwanyị na-etolite, ha ga-enwe ike ịghọta ihe ndị ọzọ a ga na-akọwakwuru ha.

Ihe ọzọ unu ga-echeta bụ na ka nwatakịrị nwanyị na-etokwu agbọghọ, otú ahụ ka ụzọ o si ele nsọ nwanyị anya ga na-agbanwe. Mgbe nwa unu nwanyị nwetakwuru ahụmahụ banyere nsọ ya, o yiri ka ọ̀ ga-enwe ihe ndị ọzọ ga na-enye ya nsogbu n’obi nakwa ajụjụ ndị ọzọ ọ ga na-ajụ. N’ihi ya, unu kwesịrị ịnọgide na-akụziri ya banyere nsọ nwanyị ma na-aza ya ajụjụ ndị ọ ga na-ajụ banyere ya. Na-akọrọnụ ya ihe ndị ga-akasị abara ya uru na ndị kasị kwesị ekwesị dabere n’afọ ole ọ dị nakwa n’otú o si aghọta ihe.

Butenụ Ụzọ

Gịnịkwanụ ka unu ga-eme ma ọ bụrụ na ò yiri ka nwa unu nwanyị achọghị ikwu ihe ọ bụla banyere nsọ nwanyị? O nwere ike ịbụ na ọ chọghị ikwu ihe gbasara ahụ́ ya. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ chọrọ ka e nyetụ ya oge ka ahụ́ wee ruo ya ala ikwu banyere nsọ nwanyị, tupu ya enwee ike ịma ihe ọ ga-ajụ. O nwedịrị ike ịsị na ya amarachaala ihe nile ya kwesịrị ịma banyere nsọ nwanyị.

N’otu nnyocha e ji ụmụntakịrị nwanyị ndị dị ihe dị ka afọ iri na otu mee na United States, ihe ka ọtụtụ n’ime ha chere na ha amarachaala ihe ha ga-atụ anya ya ma ha malite ịhụ nsọ ha. Ma, mgbe a jụkwuru ha ajụjụ, ọ bịara doo anya na ọ bụghị ihe nile ka ha ma, nakwa na ha ekwetala ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu a kọọrọ ha, bụ́ ndị e nwetara site n’omenala nakwa n’akụkọ ifo. Ya mere, nwa unu nwanyị sịgodị na ya amarachaala ihe nile ya kwesịrị ịtụ anya ya ma ya malite ịhụ nsọ ya, ọ ka dịkwa mkpa ka unu gwa ya banyere ya.

O yiri nnọọ ka ọ̀ bụ unu bụ́ ndị nne na nna ka ọ dị n’aka ikwulite okwu banyere nsọ nwanyị ma nọgidekwa na-ekwu ya. N’eziokwu, ọ bụ ọrụ dịịrị unu dị ka nne na nna. Ma nwa unu nwanyị ọ ghọtara nke a n’oge ahụ ma ọ bụ na ọ ghọtaghị ya, enyemaka unu dị ya mkpa. Ikwu banyere ya nwere ike ịdị na-agwụ unu ike, ọ pụkwara ịdị unu ka unu erughị eru ikwu ya, ma ike agwụla unu. Nweenụ ndidi. Ka oge na-aga, obi abụọ adịghị ya na nwa unu nwanyị ga-emesị mata uru mgbalị unu mere ịkọrọ ya ihe ndị a baara ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Na Japan, ọnụ ọgụgụ ndị nna nanị ha na-azụ ụmụ rịrị nnọọ elu n’afọ 2003. Na United States, e kee ezinụlọ nile nanị nne ma ọ bụ nna na-azụ ụmụ na ha ụzọ isii, otu ụzọ n’ime ha bụ ezinụlọ nanị ndị nna na-azụ ụmụ na ha.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

Ọ kasị mma ịgwa nwa gị nwanyị banyere nsọ nwanyị tupu ya amalite ịhụ nsọ ya

[Foto dị na peeji nke 13]

OTÚ Ị GA-ESI AGWA NWA GỊ NWANYỊ BANYERE NSỌ NWANYỊ

[Foto dị na peeji nke 13]

Chọpụta ihe ndị ọ ma banyere ya. Kọwaa ihe ndị na-abụghị eziokwu. Hụ na gị na ya ma nke a na-akọ n’ihe banyere nsọ nwanyị.

Kọọrọ ya ahụmahụ nke gị. Site n’ịtụgharị uche n’ahụmahụ i nwere n’oge mbụ ị hụrụ nsọ nke gị na ịkọrọ ya nwa gị nwanyị, i nwere ike ime ka obi ruo ya nnọọ ala, nke bụ́kwanụ ihe ahụ́ ya chọrọ.

Gwa ya ihe ndị ga-abara ya uru. Ajụjụ ụmụntakịrị nwanyị na-ajụkarị na-agụnye: “Gịnị ka m ga-eme ma m hụ nsọ m n’ụlọ akwụkwọ?” “Olee ihe ndị m ga-eji na-ejichi ọbara n’oge nsọ m?” “Olee otú m ga-esi jiri ha mee ihe?”

Gwa ya ihe ndị bụ́ eziokwu n’ụzọ dị mfe nghọta. Kụziere nwa gị nwanyị ihe dabere n’afọ ole ọ dị nakwa n’otú o si aghọta ihe.

Na-akụziri ya banyere ya site n’oge ruo n’oge. Malite ịgwa nwa gị nwanyị banyere nsọ nwanyị tupu ya amalite ịhụ nke ya, nọgidekwa na-agwa ya banyere ya ọbụna mgbe ọ maliterela ịhụ nsọ ya.

[Foto dị na peeji nke 12]

Ghọta ọnọdụ ya. Nwa gị nwanyị nwere ike ọ gaghị achọ ikwu ihe ndị gbasara ahụ́ ya