Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụmụ Mmadụ Hà Na-aghọ Ndị Mmụọ Ozi Ma Ha Nwụọ?

Ụmụ Mmadụ Hà Na-aghọ Ndị Mmụọ Ozi Ma Ha Nwụọ?

Ụmụ Mmadụ Hà Na-aghọ Ndị Mmụọ Ozi Ma Ha Nwụọ?

E NWERE otu nwatakịrị nwanyị aha ya bụ Argyro. Ọ dị nanị afọ asaa nwụọ. Nne ya na nna ya nọ na-ebe ákwá ka ha na-ele ya ebe o yi uwe ọcha dinara n’igbe ozu. Ka ụkọchukwu ha na-achọ ịkasị ha obi, ọ gwara ha, sị: “Chineke chọkwuru mmụọ ozi, Ọ kpọrọkwala Argyro ka ya na ya nọrọ. Ka ọ dị ugbu a, mkpụrụ obi ya na-efegharị gburugburu ocheeze nke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.”

Ọtụtụ mmadụ kweere na ndị mmụọ ozi bụ mkpụrụ obi ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na okpukpe ndị na-akwado echiche a dị ole na ole. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi ejirila fim na ihe nkiri televishọn na-agbasa echiche a. Ha na-eme ya site n’igosi ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị mesịrị ghọọ ndị mmụọ ozi site n’ichebe na inyere ndị dị ndụ aka.

Ị̀ pụrụ ịtụ anya n’ezie na ndị ị hụrụ n’anya ga-aghọ ndị mmụọ ozi ma ha nwụọ? Gịnị ka Bible na-akụzi banyere nke a? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị buru ụzọ tụlee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru n’ezie banyere ọdịdị ndị mmụọ ozi na ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ nọ na ya kpọmkwem.

Ndị Mmụọ Ozi—Ndị E Kere n’Ụzọ Pụrụ Iche

Ndị mmụọ ozi bụ ndị ohu Chineke dị ike bi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, ndị a na-adịghịkwa ahụ anya. Ha abụghị ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ. Ndị mmụọ ozi bụ ndị mmụọ Chineke kere. Bible kwuru, sị: “Ka [ndị mmụọ ozi] too aha Jehova; n’ihi na Ya onwe ya nyere iwu, e wee kee ha.”Abụ Ọma 148:2, 5.

Bible na-egosi na ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi, gụnyere ndị seraf na ndị cherub, ji nrubeisi na-eje ozi pụrụ iche dị ka ọkwá na ọrụ e nyere ha si dị. (Abụ Ọma 103:20, 21; Aịsaịa 6:1-7; Daniel 7:9, 10) Ụmụ mmadụ hà nwụrụ tupu Chineke e nwee ike ime ka ndị mmụọ ozi ahụ nile dịrị? O doro anya na nke a enweghị ike ime eme. N’ihi gịnị?

Bible na-egosi na e kere ndị mmụọ ozi ogologo oge tupu a na-eke ụmụ mmadụ. Mgbe Jehova kere mbara ala nke ụmụ mmadụ mechara biri na ya, ndị mmụọ ozi—ndị a kpọrọ kpakpando ụtụtụ n’ụzọ ihe atụ—‘tiri mkpu ọṅụ, wee tisie mkpu ọṅụ ike.’ (Job 38:4-7) Ya mere, e keela ha kemgbe ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ tupu e kee mmadụ n’ụwa.

Ọzọkwa, e nwere nnukwu ọdịiche ma a bịa n’otú e si kee ndị mmụọ ozi na otú e si kee ụmụ mmadụ. Ọrụ Jehova nyere ha dịkwa iche. * Chineke kere mmadụ “ka ọ dịtụ ala karịa ndị mmụọ ozi,” n’ihi nke a, a na-ewere ndị mmụọ ozi n’ụzọ dabara adaba dị ka ndị ike ha na ikike iche echiche ha karịrị nke mmadụ. (Ndị Hibru 2:7) “Ebe obibi” ndị mmụọ ozi bụ eluigwe. (Jud 6) Ma, nzube Chineke bụ ka ụmụ mmadụ biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. (Jenesis 1:28; 2:17; Abụ Ọma 37:29) A sị na di na nwunye mbụ ahụ rubeere Chineke isi, ha agaraghị anwụ ma ọlị. Ya mere, site ná mmalite, ọnọdụ ụmụ mmadụ na nke ndị mmụọ ozi dịwagara nnọọ iche ma a bịa n’ihe metụtara nzube Chineke.

Gịnị Na-eme Mmadụ Ma Ọ Nwụọ?

Ajụjụ ndị ọzọ ọ dị mkpa ka anyị tụlee bụ: Gịnị na-eme ụmụ mmadụ ma ha nwụọ? Hà na-adịgide ndụ n’ụdị ọzọ, ma eleghị anya dị ka ndị mmụọ ozi nọ n’ógbè ndị bụ́ mmụọ? Bible zara ya n’ụzọ dị mfe ma doo anya, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Ya mere, mmadụ nwụọ, ọ na-akwụsị ịdị adị. Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ọ dịghị mmetụta ma ọ bụ ahụmahụ ọ bụla ha na-enwe.

Olileanya ọ̀ dịịrị ndị nwụrụ anwụ? Ee! Bible kwuru na olileanya dịịrị ihe ka ọtụtụ ná ndị nwụrụ anwụ bụ mbilite n’ọnwụ. A ga-akpọlite imirikiti ndị nwụrụ anwụ ka ha bịa biri na paradaịs elu ala dị ka mmadụ.—Luk 23:43; Jọn 5:28.

Ọ bụ mmadụ ole na ole nwere olileanya ịbụ ndị a ga-akpọlite ka ha gaa biri n’eluigwe. Ọnụ ọgụgụ ha dị obere—ha nile dị otu narị puku na iri puku anọ na anọ. Otú ọ dị, narị puku na iri puku anọ na anọ a na ndị ahụ a na-akpọkarị ndị mmụọ ozi abụghị otu. Dị ka ihe atụ, narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ ga-achị dị ka ndị eze na ndị nchụàjà Kraịst, ọ dịghịkwa ihe ga-eme ka ha nwụọ. E nyere ha ike ịbụ ndị ikpe. (1 Ndị Kọrint 6:3; Mkpughe 20:6) Hà bụ ụmụ ọhụrụ nwụrụla anwụ? Mba. Ha bụ ụmụazụ Kraịst ndị a nwalerela nke ọma, ma ha anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi!—Luk 22:28, 29.

Tụleekwa ọdịiche dị n’ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ na ndị mmụọ ozi dị ndụ. Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla,” ndị mmụọ ozi maara ihe nile na-eme gburugburu ha, na-enwe mmetụta, nweekwa ikike ime mkpebi. Ha nweere onwe ha ime nhọrọ. (Jenesis 6:2, 4; Abụ Ọma 146:4; 2 Pita 2:4) A kọwara ndị nwụrụ anwụ dị ka “ndị na-adịghị ndụ,” ma ọ bụ ndị na-enweghị ike, ebe a kọwara ndị mmụọ ozi dị ka “ndị dike dị ike.” (Aịsaịa 26:14; Abụ Ọma 103:20) Ọ bụkwa ezie na ụmụ Adam nile na-anwụ n’ihi mmehie na ezughị okè, ndị mmụọ ozi, bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, zuru okè, ha na Jehova dịkwa nnọọ ná mma.—Matiu 18:10.

N’ihe nkiri televishọn ma ọ bụ na fim, a pụrụ igosi ebe mkpụrụ obi mmadụ ndị nwụrụ anwụ mesịrị ghọọ ndị mmụọ ozi, ma e nweghị ebe ọ bụla Akwụkwọ Nsọ kwadoro echiche a. Eziokwu Bible ndị e mere ka ha pụta ìhè n’isiokwu a na-enyere anyị aka izere inwe echiche ọ bụla na-ezighị ezi banyere ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Bible na-emesikwa anyị obi ike na ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi—bụ́ ndị ohu Chineke dị ike, ndị Chineke ji aka ya kee—dị elu karịa ụmụ mmadụ, dịrịkwa njikere mgbe nile ime uche Jehova. Ọ bụ ihe obi ụtọ ịmara na uche Chineke bụ ka ndị mmụọ ozi a na-elekọta ma na-enyere ndị ji ezi obi ha akwanyere Jehova ùgwù ma na-achọ ijere ya ozi aka.—Abụ Ọma 34:7.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 N’ụzọ nkịtị, okwu ahụ bụ́ “mmụọ ozi” pụtara “onye ozi.” Mgbe ụfọdụkwa, ọ pụrụ ịpụta ihe ndị ọzọ, dị ka ndị mmụọ na-ejere Chineke ozi na ọbụna mmadụ ndị na-ejere Chineke ozi. Ma n’isiokwu a, anyị na-ekwu banyere ndị mmụọ e kere eke, bụ́ ndị Bible na-akpọkarị ndị mmụọ ozi.

[Foto dị na peeji nke 27]

Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?

Ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ, hà bụ ndị mmụọ ozi na-ejere Chineke ozi n’eluigwe ugbu a?—Eklisiastis 9:5, 10.

▪ Ihe mere ụmụaka ji anwụ ọ̀ bụ n’ihi na Chineke chọrọ inwetakwu ndị mmụọ ozi?—Job 34:10.

▪ Ndị nwụrụ anwụ hà pụrụ ịlọghachi bịa chebe ndị dị ndụ?—Aịsaịa 26:14.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

“Ka [ndị mmụọ ozi] too aha Jehova; n’ihi na Ya onwe ya nyere iwu, e wee kee ha.”—Abụ Ọma 148:2, 5