Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Mmadụ Ga-esi Na-achịkwa Otú O Si Ekiri TV

Ụzọ Mmadụ Ga-esi Na-achịkwa Otú O Si Ekiri TV

Ụzọ Mmadụ Ga-esi Na-achịkwa Otú O Si Ekiri TV

OTU nwanyị aha ya bụ Claudine kwuru, sị: “Anyị gbanyehaala TV, anyị na-ekiri ihe ọ bụla e gosiri na ya, site n’isi ruo n’ọdụ. Anyị anaghị agbanyụ ya ruo mgbe anyị chọrọ ihi ụra.” Ụfọdụ na-asị, “Ọ na-esiri m ike iwepụ anya m na ya,” ebe ndị ọzọ na-asị, “Achọghị m ikiriru TV otú m na-ekiriru ya, ma ọ naghị ekwe m nhapụ.” Ị̀ na-ekiribiga TV ókè? Mmetụta TV pụrụ ịdị na-enwe n’ezinụlọ gị ọ̀ na-eche gị uche? Lee ụfọdụ aro ndị pụrụ inyere gị aka ịchịkwa otú i si ekiri ya.

1. CHỌPỤTA ÓKÈ Ị NA-EKIRIRU YA. “Onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya,” ka Ilu 14:15 na-ekwu. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịtụle ókè ị na-ekiriru TV iji mara ma ì kwesịrị ime mgbanwe. Na-edetu awa ole i ji kirie TV kwa ụbọchị ruo ihe dị ka otu izu. I nwekwara ike ide ihe ndị i kiriri, ihe ị mụtara na ha, na otú ha tọruru gị ụtọ. Ma, isi ihe anyị na-ekwu bụ, chọpụta awa ole i ji ekiri TV. Ihe ị ga-achọpụta pụrụ ịtụ gị n’anya. Nanị ịmara awa ole ị na-eji ekiri televishọn pụrụ ịkpali gị ime mgbanwe.

2. WETULATA AKA N’OGE I JI EKIRI YA. Gbalịa ịnọ n’ekirighị TV otu ụbọchị n’izu, otu izu, ma ọ bụ otu ọnwa. Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ iwetulata aka n’oge i ji ekiri ya kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na ị na-ewepụ minit 30 n’oge i ji ekiri TV kwa ụbọchị, ị ga na-enweta awa 15 kwa ọnwa. Jiri oge ahụ na-eme ihe ndị bara uru, dị ka iji ya na-eme ihe ndị metụtara ofufe Chineke, iji ya agụ akwụkwọ dị mma, ma ọ bụ iji ya eso ezinụlọ gị na ndị enyi gị na-anọkọ. Nnyocha ndị e merela gosiri na ndị na-ekiri TV nke nta na-anụ ụtọ ya karịa ndị na-ekiri ya nnukwu. Otu ihe na-eme ka a kwụsịlata ikiri TV bụ ibupụ ya n’ime ụlọ a na-anọ ehi ụra. Ụmụaka ndị TV dị n’ime ụlọ ha na-eji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu awa n’ọkara kwa ụbọchị ekiri TV karịa ụmụaka ndị TV na-adịghị n’ime ụlọ ha. Ọzọkwa, ọ bụrụ na TV dị n’ime ụlọ nwatakịrị, ndị mụrụ ya adịghị ama ihe nwa ahụ na-ekiri. Ndị nne na nna na ndị di na nwunye ga-achọpụta na ọ bụrụ na ha ebupụ TV n’ime ụlọ ha na-anọ ehi ụra, ha ga-aka enwe oge ha ga-eji na-akọrị akụkọ. Ụfọdụ ejirila aka ha kpebie na ha agaghị enwe TV n’ụlọ ha.

3. MEE ATỤMATỤ BANYERE IHE NDỊ Ị GA NA-EKIRI. N’ezie, e nwere ọtụtụ ezigbo ihe ndị a na-egosi na TV. Kama ịnọ na-eme, ị gbanye chanel nke a, ị gbanye chanel ọzọ, ma ọ bụkwanụ ịnọ na-ekiri ihe ọ bụla a na-egosi na TV, buru ụzọ chọpụta ihe ndị a ga-egosi ma họrọ ndị nke ị ga-ekiri. Gbanye TV gị mgbe a malitere igosi ihe ahụ i mere atụmatụ ikiri, gbanyụọkwa ya mgbe e gosichara ya. Ma ọ bụkwanụ, kama ikiri ya mgbe ahụ a na-egosi ya na TV, i nwere ike itinye ya na teepu ma kirie ya n’oge ọzọ. Nke a ga-eme ka o kwe gị omume ikiri ya mgbe i nwere oge maka ya na ịhapụ ikiri ebe ndị e gosiri ebe a na-akpọsa ngwa ahịa.

4. NA-AHỌ IHE Ị NA-EKIRI AHỌ. Bible kwuru na ihe a ga-eji ama oge anyị a bụ mmadụ ndị “hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, [na] ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” Ikekwe, ị ga-ekweta na ọtụtụ n’ime ndị a na-egosi na televishọn dị otú ahụ. Bible na-agba ume, sị: “Gbakụtakwa ndị a azụ.” (2 Timoti 3:1-5) A dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ka a ghara iduhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.”—1 Ndị Kọrint 15:33.

Iji nwee ike ịhọ ihe ị na-ekiri ahọ, ọ dị mkpa na ị ga-abụ onye na-enwe njide onwe onye. Ì kiritụla fim ruo minit ole na ole ma chọpụta na fim ahụ adịghị mma, n’agbanyeghị nke ahụ, gị ekirigide ya ruo mgbe ọ gwụrụ nanị n’ihi na ị chọrọ ịma otú ọ ga-esi gwụ? Ụdị ihe ahụ emeela ọtụtụ ndị. Ma, a sị na obi kara gị ịgbanyụ TV ahụ ma hapụ ya gaa mewe ihe ọzọ, ikekwe ị ga-achọpụta na ị gaghịzi achọ ịma otú ọ ga-esi gwụ.

Ọtụtụ afọ tupu e mepụta televishọn, ọbụ abụ ahụ dere, sị: “M gaghị edo ihe jọgburu onwe ya n’ihu m.” (Abụ Ọma 101:3) Lee nnọọ ka nke ahụ si bụrụ ezigbo ihe anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-ahọrọ ihe anyị ga-ekiri! Ụfọdụ ndị, dị ka Claudine, ekpebiela na ha agaghịzi enwe televishọn. O kwuru, sị: “N’oge ahụ, achọpụtaghị m otú TV meruru ka ihe ụfọdụ sie m. Mgbe ọ bụla m nwere ohere kirie TV ugbu a, ihe ndị na-adịbughị awụ m akpata oyi n’ahụ́ na-awụzi m akpata oyi n’ahụ́. Ana m echebu na m na-akpachapụ anya n’ihe m na-ekiri, ma o doola m anya ugbu a na adịbughị m akpachapụ anya. Mgbe m kiriri ihe ndị dị mma, ọ na-aka atọ m ụtọ.”

[Foto dị na peeji nke 8]

Detuo awa ole ị na-eji ekiri TV

[Foto dị na peeji nke 8]

Jiri oge ndị ahụ i ji ekiri TV mewe ihe ndị ka baa uru

[Foto dị na peeji nke 9]

Alala azụ n’ịgbanyụ TV gị!