Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Kweere Ọ̀ Dị Ihe O Mere?

Ihe I Kweere Ọ̀ Dị Ihe O Mere?

Ihe I Kweere Ọ̀ Dị Ihe O Mere?

Ì CHERE na ndụ nwere nzube? Ọ bụrụ na ozizi evolushọn bụ eziokwu, ọ pụtara na ihe a e kwuru na magazin bụ́ Scientific American bụkwa eziokwu. Magazin ahụ kwuru, sị: “Otú anyị si ghọta evolushọn ugbu a na-egosi . . . na e nweghị ihe bụ́ na ndụ nwere nzube.”

Ka anyị tụlee ihe okwu ahụ pụtara. Ọ bụrụ na e nweghị ihe bụ́ na ndụ nwere nzube, ọ pụtara na ọ dịghị uru ọ bụla ị bara n’ụwa a karịa imetụ ihe ọma na, ikekwe, ịmụ ụmụ ndị ga na-eme ka gị. Ọ bụrụ na ị nwụọ, ị gaghị ebilitekwa ọzọ. Ụbụrụ gị na ikike o nwere icheta ihe, iche echiche, ịtụgharị uche n’ihe ndụ pụtara, ga-abụ nnọọ ihe pụtaara onwe ya.

Nke ahụ abụghịkwa ebe ọ gwụrụ. Ọtụtụ ndị kweere n’evolushọn na-ekwu na ma ọ́ bụghị na Chineke adịghị, ya abụrụ na ọ chọghị ịma banyere ihe ụmụ mmadụ na-eme. Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ime ihe ahụ ha na-ekwu bụ eziokwu, ọ pụtara na ọdịnihu anyị dị n’aka ndị ọchịchị, ndị gụrụ oké akwụkwọ, na ndị ndú okpukpe. Ọ bụrụ na e jiri ihe ndị ha mere n’oge ndị gara aga tụlewe ya, ọ pụtara na ọgba aghara, esemokwu, na nrụrụ aka ndị e ji mara ụmụ mmadụ taa ga-anọgide na-aga n’ihu. Ya bụrụ n’ezie na ozizi evolushọn bụ eziokwu, o yiri ka à ga-enwe ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwu a bụ́: “Ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.”—1 Ndị Kọrịnt 15:32.

Biko ghọta ihe anyị na-ekwu ebe a. Ndịàmà Jehova adịghị anabata echiche ahụ e kwuru n’elu na ụfọdụ ndị nwere. Ha ekwetaghịkwa n’ihe okwu ndị ahụ dabeere na ya—nke bụ́ ozizi evolushọn. Kama nke ahụ, Ndịàmà Jehova kweere na ihe Bible kwuru bụ eziokwu. (Jọn 17:17) N’ihi ya, ha kwenyere n’ihe Bible kwuru na ọ bụ otú anyị si bịa nọrọ n’ebe a. Bible kwuru, sị: “N’ebe Ị [Chineke] nọ ka isi iyi ndụ dị.” (Abụ Ọma 36:9) Okwu ndị ahụ nwere ezigbo ihe ha pụtara.

Ndụ nwere nzube. Onye Okike anyị nwere ezigbo ihe o zubeere ndị nile chọrọ ibi ndụ dị ka uche ya si dị. (Eklisiastis 12:13) Nke ahụ na-agụnye nkwa nke ibi ndụ n’ụwa nke ọgba aghara, esemokwu, na nrụrụ aka—ọbụnadị ọnwụ—na-agaghị adị na ya. (Aịsaịa 2:4; 25:6-8) Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova n’ụwa nile pụrụ ịgba akaebe na ịmụta banyere Chineke na ime uche ya na-eme ka ndụ nwee nzube karịa ihe ọ bụla ọzọ!—Jọn 17:3.

Ihe i kweere dị ihe o mere n’ezie, n’ihi na ọ pụrụ ikpebi, ọ bụghị nanị ma ị̀ ga-enwe obi ụtọ ugbu a ma ọ bụ na ị gaghị enwe, kama, ọ pụkwara ikpebi ihe ọdịnihu gị ga-abụ. Ọ dịzi gị n’aka ikpebi nke ị ga-ekwere. Ị̀ ga-ekwere n’ozizi na-enwebeghị ike ịgbagha ọtụtụ ihe àmà na-egosi na e kere eluigwe na ụwa eke? Ka ị̀ ga-ekwere n’ihe Bible kwuru, nke bụ́ na ụwa na ihe nile dị ndụ dị n’ime ya nwere Onye kere ha—ya bụ, Jehova, Chineke nke “kere ihe nile.”—Mkpughe 4:11.