Ihe Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Chọpụtarala Ọ̀ Na-emegide Ihe E Dere na Jenesis?
Ihe Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Chọpụtarala Ọ̀ Na-emegide Ihe E Dere na Jenesis?
ỌTỤTỤ mmadụ na-ekwu na ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala na-emegide ihe Bible kwuru banyere okike. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara na-emegide, abụghị Bible, kama ọ bụ nkwenkwe nke ndị Christian Fundamentalist, bụ́ ndị na-akọwa Bible n’ụzọ nkịtị. Ụfọdụ n’ime okpukpe ndị a na-ekwu n’ụzọ na-ezighị ezi na Bible sịrị na e kere ihe nile a na-ahụ anya n’ime ụbọchị isii, nke ụbọchị nke ọ bụla n’ime ha dị awa 24, nakwa na nke a mere n’ihe dị ka puku afọ iri gara aga.
Ma Bible akwadoghị ihe ahụ ha kwuru. A sị na Bible kwadoro ya, ọtụtụ ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara n’ime otu narị afọ gara aga gaara eme
nnọọ ka e nwewa obi abụọ ma ihe ndị e dere na Bible hà bụkwa eziokwu. Ọ bụrụ na i jiri nlezianya mụọ Bible, ị ga-achọpụta na ihe e dere na ya adịghị emegide ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala. Ọ bụ ya mere na Ndịàmà Jehova ekwetaghị n’ihe ndị “Christian” Fundamentalist na ọtụtụ ndị ọzọ kweere n’okike na-ekwu. Ihe ndị na-esonụ bụ ihe ndị Bible na-akụzi n’eziokwu.Olee Oge Bụ́ “na Mbụ”?
Ihe ndekọ Jenesis ji okwu a dị mfe ma deekwa ude malite, nke bụ́: “Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) Ndị ọkà mmụta Bible kwetara na amaokwu a na-akọwa ihe ọzọ, nke na-abụghị ihe mere n’ụbọchị okike ndị ahụ a kọwara malite n’amaokwu nke 3 gaa n’ihu. Ihe nke a pụtara doro anya. Dị ka okwu mmalite nke Bible si kwuo, eluigwe na ala, tinyere ụwa anyị a, adịla adị kemgbe ọtụtụ afọ a na-amaghị ama tupu ụbọchị ndị ahụ e ji kee ihe amalite.
Ndị ọkachamara n’ihe banyere ala na-ekwu na ụwa a dị ihe dị ka ijeri afọ anọ, ndị na-enyocha mbara igwe ekwuokwa na eluigwe na ala nwere ike ịdị ihe dị ka ijeri afọ 15. Nchọpụta ndị a—ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike ịchọpụta n’ọdịnihu—hà na-emegide ihe dị na Jenesis 1:1? Mba. Bible ekwughị kpọmkwem afọ ole “eluigwe na ụwa” dị. Ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala adịghịkwa emegide ihe Bible kwuru.
Olee Otú Ụbọchị Ndị ahụ E Kere Ihe Hà n’Ogologo?
Oleekwanụ banyere otú ụbọchị ndị ahụ e kere ihe hà n’ogologo? Nke ọ bụla n’ime ha ọ̀ dị awa 24 n’ogologo? Ụfọdụ na-ekwu na ebe ọ bụ na Mozis—bụ́ onye dere Jenesis—mechara kwuo na ụbọchị nke sochiri ụbọchị isii ahụ e ji kee ihe ga-abụ ụkpụrụ a ga-agbaso wee na-agụ Ụbọchị Izu Ike, na ọ ga-abụrịrị na ụbọchị nke ọ bụla dị awa 24 n’ogologo. (Ọpụpụ 20:11) Ihe e dere na Jenesis ọ̀ kwadoro echiche a?
Mba, ọ kwadoghị ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị nanị awa 24 ka okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ụbọchị” pụtara. O nwere ike ịpụta oge karịrị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Mozis na-achịkọta okwu ya banyere ihe ndị Chineke kere, ọ kọwara ụbọchị isii ahụ e kere ihe dị ka otu ụbọchị. (Jenesis 2:4) Tụkwasị na nke ahụ, n’ụbọchị mbụ e kere ihe, ‘Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọkwa ọchịchịrị ahụ Abalị.’ (Jenesis 1:5) Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “Ehihie” n’ebe a bụkwa otu okwu Hibru ahụ a na-asụgharị ịbụ “ụbọchị.” Ma n’ebe a, e ji ya mee ihe nanị maka ihe dị ka awa 12. N’eziokwu, ọ dịghị ebe mmadụ ga-agbakwasị ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ wee na-ekwesi olu ike na nke ọ bụla n’ime ụbọchị ndị ahụ e kere ihe dị awa 24 n’ogologo.
Oleezi otú ụbọchị ndị ahụ e kere ihe hà n’ogologo? Ihe e dere na Jenesis isi nke 1 na isi nke 2 na-egosi na o toro ogologo.
Ihe Ndị E Kere Eke Ji Nwayọọ Nwayọọ Pụta
Mozis dere Jenesis n’asụsụ Hibru, o dekwara ya dị ka onye nọ n’ụwa na-ahụ ihe na-emenụ. Eziokwu abụọ a, tinyere ọmụma anyị maara na e keela eluigwe na mbara ụwa tupu ‘ụbọchị’ okike ndị ahụ amalite, na-enye aka eme ka a kwụsị inwe ọtụtụ n’ime nghọtahie ndị a na-enwe n’akụkọ banyere okike. N’ụzọ dị aṅaa?
Ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya gụọ ihe ndekọ Jenesis, anyị ga-aghọta na ihe ndị malitere ime n’otu “ụbọchị” meere banye n’ụbọchị (ndị) ọzọ na-esonụ. Dị ka ihe atụ, tupu “ụbọchị” mbụ e ji kee ihe amalite, o nwere ihe kpuchiri ìhè nke sitere n’anyanwụ e kerela eke ka ọ ghara ịchabata n’ụwa. Ikekwe, ọ bụ igwe ojii kpuchiri ya. (Job 38:9) N’ime “ụbọchị” nke mbụ, ihe a kpuchiri anyanwụ malitere ịpụ, ìhè wee batawa n’ụwa. *
Ihe àmà gosiri na ‘n’ụbọchị’ nke abụọ, ihe ndị kpuchiri ihu igwe nọgidere na-apụ, na-eme Jenesis 1:14-16) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụ n’oge ahụ ka onye nọ n’ụwa malitere ịhụ anyanwụ na ọnwa. Ihe ndị a emeghị n’otu mgbe.
ka e nwee mbara nke kpara ókè n’etiti igwe ojii nke dị n’elu mbara ahụ na oké osimiri nke dị n’okpuru mbara ahụ. ‘N’ụbọchị’ nke anọ, ihe ndị ahụ kpuchiri ihu igwe apụọla ruo n’ókè nke na a malitere ịhụ anyanwụ na ọnwa “na mbara igwe.” (Jenesis kwukwara na ka ihe ndị ahụ kpuchiri ihu igwe nọgidere na-apụ, anụ ndị na-efe efe—gụnyere ụmụ ahụhụ na ụmụ nnụnụ—malitere ịpụta ‘n’ụbọchị’ nke ise. Otú ọ dị, Bible na-egosi na ‘n’ụbọchị’ nke isii, Chineke ka nọkwa ‘na-akpụ anụ ọhịa nile ọ bụla, na anụ ufe nile ọ bụla nke eluigwe.’—Jenesis 2:19.
N’ụzọ doro anya, okwu ndị e ji mee ihe na Bible na-eme ka e nwee ike ịghọta na ihe ụfọdụ e kere eke ‘n’ụbọchị’ nke ọ bụla ji nwayọọ nwayọọ pụta kama ịpụta n’otu ntabi anya. Ụfọdụ n’ime ha sidị n’otu “ụbọchị” okike pụtagide banye ‘n’ụbọchị’ ndị ọzọ.
N’ụdị Ha Dị Iche Iche
Otú a ahịhịa na ụmụ anụmanụ si jiri nwayọọ nwayọọ pụta ọ̀ na-egosi na Chineke mepụtara ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ n’ụzọ ahụ ozizi evolushọn kwuru na ha siri pụta? Mbanụ. Ihe ndekọ ahụ kwuru n’ụzọ doro anya na Chineke kere ahịhịa na ụmụ anụmanụ n’ụdị ha dị iche iche. (Jenesis 1:11, 12, 20-25) Ahịhịa na ụmụ anụmanụ ndị ahụ e kere n’ụdị ha dị iche iche, è kere ha otú ha ga-enwe ike ịdị na-agbanwe ụdị ha dabere n’ọnọdụ ihu igwe e nwere n’ebe ha nọ? Gịnị na-ekpebi ókè otu ụdị anụmanụ ma ọ bụ osisi ga-agbanweru? Bible ekwughị ihe ọ bụla banyere ihe ndị a. Ma o kwuru na ihe ndị dị ndụ ‘nupụtara n’ụdị ya dị iche iche.’ (Jenesis 1:21) Nke a na-egosi na e nwere ókè otu ụdị anụmanụ ga-agbanweru. Ma anụmanụ na osisi ndị a chọpụtara na ha dịrị ndụ n’oge ochie ma ihe ndị a chọpụtarala n’oge a, na-akwadocha echiche bụ́ na a bịa n’ụdị osisi na anụmanụ ndị e nwere, ọ dịbeghị oké ihe gbanwere n’ahụ́ ha n’ime ogologo oge ndị gaferelanụ.
N’adịghị ka ihe ndị Christian Fundamentalist na-ekwu, Jenesis adịghị akụzi na e kere eluigwe na ụwa, na ihe nile dị ndụ nọ n’ụwa, n’ime mkpirikpi oge. Ọ dịghịkwa akụzi na ọ dịchabeghị oké anya e kere ha. Kama nke ahụ, otú Jenesis si kọwaa e si kee eluigwe na ụwa na otú ihe ndị dị ndụ n’ụwa si malite ịdị kwekọrọ n’ihe ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a chọpụtarala.
N’ihi nkwenkwe ha bụ́ nke dabeere nanị n’amamihe mmadụ, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị adịghị ekwenye n’ihe Bible kwuru, nke bụ́ na ọ bụ Chineke kere ihe nile. Otú ọ dị, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịmata na n’ime akwụkwọ Bible bụ́ Jenesis, bụ́ nke e dere n’oge gboo, Mozis dere na eluigwe na ala nwere mmalite, nakwa na ihe ndị dị ndụ apụtaghị nnọọ n’otu mgbe, kama na ha ji nke nta nke nta pụta ma malite ịdị, na o wekwara nnọọ ogologo oge tupu ha apụtachaa. Olee otú o si bụrụ na, n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga, Mozis amarala ihe a kwekọrọ n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala? E nwere otu nkọwa ezi uche dị na ya. Ọ ga-abụrịrị Onye ahụ nke nwere ma ike ma amamihe ike eluigwe na ala mere ka Mozis mara ya eri ogologo oge gara aga otú ahụ. Nke a na-eme ka nzọrọ Bible na-azọrọ na o “sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke” gbakwuo mkpọrọgwụ.—2 Timoti 3:16.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 13 Ka a na-akọwa ihe mere ‘n’ụbọchị’ nke mbụ, okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ ìhè bụ ohr, nke bụ́ ìhè nkịtị; ma a bịa n’ụbọchị nke anọ, okwu e ji mee ihe bụ ma·ʼohr ʹ, nke bụ́ ihe na-enye ìhè ahụ.
[Foto dị na peeji nke 30]
Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?
▪ Ò meela afọ ole Chineke kere eluigwe na ala?—Jenesis 1:1.
▪ Ọ̀ bụ n’ime ụbọchị isii ndị nke ọ bụla n’ime ha dị awa 24 ka e kere ụwa?—Jenesis 2:4.
▪ Gịnị mere ihe Mozis dere banyere otú ụwa si malite ji kwekọọ n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala?—2 Timoti 3:16.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]
Jenesis adịghị akụzi na e kere eluigwe na ụwa n’ime mkpirikpi oge. Ọ dịghịkwa akụzi na ọ dịchabeghị oké anya e kere ha
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]
“Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa.”—Jenesis 1:1
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 28]
Mbara igwe: Foto IAC/RGO/David Malin
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 30]
Foto NASA