Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Afọ gara aga bụ́ “afọ a kasị nwee okpomọkụ n’Ebe Ugwu Ụwa kemgbe e dekọwara banyere okpomọkụ,” bụrụkwa “afọ nke abụọ a kasị nwee okpomọkụ n’ụwa nile.” “Asatọ n’ime afọ 10 ndị [e dekọrọ na] a kasị nwee okpomọkụ n’ụwa manyere n’ime afọ iri ndị gara aga.”—AKỤKỌ ỤWA NKE NDỊ BBC, BRITAIN.

A bịa n’oké ifufe ndị e dekọrọ banyere ha, oké ifufe si n’Oké Osimiri Atlantic n’afọ 2005 “kasị ibe ya fee,” “a naghịkwa arụrụ ya ụka . . . na ọ bụ ya kasị bibie ihe.” Ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ nke oké ifufe asaa n’ime oké ifufe 14 ahụ e dekọrọ banyere ha gafere kilomita 177 n’otu awa.—ỤLỌ ỌRỤ NA-AHỤ MAKA OKÉ OSIMIRI NA IHU IGWE NA UNITED STATES.

“N’afọ 1850, e nwere ebe karịrị otu narị na iri ise ice kpụkọtara n’ogige a na-akpọ Glacier National Park, nke dị na Montana [U.S.A.]. Ugbu a, ha dịzi 27.”—AKWỤKWỌ AKỤKỌ BỤ́ THE WALL STREET JOURNAL, U.S.A.

“Otu eziokwu doro anya banyere ihe nile ndị ọchịchị na-ekwu banyere mgbanwe a na-enwe n’ihu igwe bụ na ọ dịghị mba ga-achọ ịchụ akụnụba ya n’àjà iji hụ na e meriri nsogbu a.”—TONY BLAIR, BỤ́ PRAỊM MINISTA BRITAIN.

Ndị Katọlik Hà Agawakwuola Site “n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ”?

Dị ka Cláudio Hummes, bụ́ bishọp ukwu nke São Paulo si kwuo, ọnụ ọgụgụ ndị na-ekpe Katọlik na Brazil esila na pasent 83 gbadaa ruo pasent 67 n’ime afọ 14 gara aga. Ụkọchukwu ahụ kwuru na ihe kpatara ya bụ na chọọchị ahụ, “n’ihi ihe ndị dịgasị iche iche, anaghị akụziri ndị òtù ya e mere baptizim okwu Chukwu nke ọma.” Hummes kwuru, sị: “Anyị aghaghị ịga kụziere ndị chọọchị anyị okwu Chukwu site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ, ọ bụghị nanị n’ụlọ ụka.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ Folha Online kwuru na ndị ga-arụ ọrụ a bụ ndị na-abụghị ndị ụkọchukwu, bụ́ ndị e nyere ọzụzụ dị ka ndị ozi ala ọzọ. Ụkọ ndị ụkọchukwu dị bụ otu n’ime nnukwu nsogbu Chọọchị Katọlik ndị dị na Brazil nakwa ná mba ndị ọzọ dị na Latin America na-enwe.

E Nwetala Nkwado Iwu na Germany

Ná mkpebi e mere n’ụlọikpe Federal Administrative Court nke dị na n’obodo Leipzig, nke dị na Germany, bụ́ nke e bipụtara na February 10, 2006, ụlọikpe ahụ kwuru na iwu ji Steeti Berlin ịnakwere Òtù Okpukpe Ndịàmà Jehova dị ka òtù na-arụ ọrụ ebere. Nke a mere ka ikpe a e kpewere kemgbe afọ 15 gara aga bie. N’ime afọ 15 ahụ, ụlọikpe dị iche iche nọ na Germany, nke gụnyere ụlọikpe Federal Constitutional Court, elebala anya n’okwu a. Dị ka òtù na-arụ ọrụ ebere, Òtù Okpukpe Ndịàmà Jehova nọ na Germany ekwesịghị ịdị na-atụ ụtụ isi, ha ekwesịghịkwa ịdị na-akwụ ụgwọ ndị ọzọ okpukpe ndị a ma ama na Germany na-anaghị akwụ.

Egwuregwu Intanet Na-echuzi Ndị Ntorobịa Nọ na China Ụra

“Egwuregwu Intanet na-echu ndị na-eto eto nọ na China ụra,” ka akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Hong Kong bụ́ South China Morning Post na-ekwu. A na-ahụkwa otu ihe ahụ n’etiti ndị na-eto eto nọ ná mba ndị ọzọ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, dị ka Hong Kong, Japan, na South Korea. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “Oké ọchịchọ ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe ịbanye n’Intanet ma leghara ndị nile nọ ha gburugburu anya bụ otu n’ime nsogbu ndụ tigbuo zọgbuo ndị mmadụ na-ebi na-ebute. Ihe ndị ọzọ so akpata ya bụ oké ihe ndị mụrụ ụmụ na-atụ anya n’aka ụmụ ha na oké mpi a na-asọ iji nwee ike ịbanye na mahadum.” A na-ekwu na enyemaka dị ihe ruru nde ụmụaka isii nọ na China mkpa iji kwụsị ihe a ririla ha ahụ́.