Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwukwe Otu Nwata

Okwukwe Otu Nwata

Okwukwe Otu Nwata

E NWERE otu nwatakịrị aha ya bụ Dustin. Ọ na-adị eso mama ya anọ mgbe ụfọdụ otu n’ime Ndịàmà Jehova na-eduziri mama ya ọmụmụ Bible. Ọ bụ ezie na ọ dị nanị afọ 11, ọ na-eche echiche nke ọma ma na-ajụ ọtụtụ ajụjụ ndị ezi uche dị na ha. N’oge na-adịghị anya, ọ gwara onye ahụ na-eduziri mama ya ọmụmụ ihe, nke bụ́ onye ozi ala ọzọ, ka o duziwere ya ọmụmụ Bible nke ya. Ọ malitekwara ịkọrọ ụmụ akwụkwọ ibe ya ihe ndị ọ na-amụta.

Dustin malitere ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọbụna soro na-aza ajụjụ mgbe a chọrọ ka ndị na-ege ntị tinye ọnụ. Mgbe ya na ụmụnne ya ndị nke ọ tọrọ letara papa ha, papa ha siri ọnwụ na ha nile ga-esorịrị ya gaa chọọchị. Dustin kọwara ihe mere o ji chọọ ịga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kama iso papa ya gaa chọọchị. Papa ya kwetara ma kwuo na ya ga-ekwe ka Dustin gaa ebe ahụ.

N’otu mgbede a gbasachara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, mama Dustin amaghị ebe Dustin tinyere isi. Dustin agwaghị mama ya agwa wee gakwuuru onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma gwa ya ka o deba aha ya n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe mama ya matara, mama ya kwetara ka e deba aha ya. Dustin ji nnọọ obi ụtọ tụsie anya ike maka ụbọchị ọ ga-eme ihe omume mbụ ya. Ma, n’otu oge ahụ, ọ malitere inwe úkwù mgbu, nke a mekwara ka a kpọgara ya ndị dọkịta dị iche iche ka ha lee ya ahụ́. N’ikpeazụ, abalị ahụ a na-atụsi anya ya ike nke Dustin ga-eme ihe omume mbụ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze bịara ruo. Ka ọ na-erule oge ahụ, o jizi mkpara aga ije. Ọ bụ ezie na onye ọ bụla chọpụtara na úkwù ya ka na-egbu ya mgbu, o jighị mkpara ya rịgoro n’elu ikpo okwu.

Obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, a chọpụtara na Dustin nwere ọrịa a na-akpọ Ewing’s sarcoma, bụ́ ụdị ọrịa cancer ọkpụkpụ nke ndị mmadụ na-adịghị arịakebe. N’afọ sochirinụ, ọ nọtere aka n’ụlọ ọgwụ a na-anọ agwọ ụmụaka, bụ́ nke dị na San Diego, California. Ụzọ dịgasị iche iche e si na-agwọ ya na mbepụ e mesịrị si n’ọkpụkpụ úkwù ya bepụ ụkwụ aka nri ya enweghị nke mere ka ịhụnanya na okwukwe siri ike o nwere n’ebe Jehova nọ gharazie isi ike. Mgbe ike na-adịtụghịzi ya ịgụ ihe, mama ya bụ́ onye na-anọdewekarị ya nso, na-agụrụ ya ihe.

N’agbanyeghị na ọrịa Dustin kawanyere njọ, ọ dịghị mgbe o mere mkpesa. Ọ na-eji oche nkwagharị ya agagharị mgbe nile na-akasi ndị ọrịa ndị ọzọ na ndị mụrụ ha obi, gụnyere otu onye ọrịa bụ́ Onyeàmà. Ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ ahụ chọpụtara na Dustin na Onyeàmà ahụ na-eto eto dị iche—na okwukwe ha na-enyere ha aka ịnagide ọnọdụ ha.

Dustin chọrọ ka e mee ya baptizim. N’ihi nke a, ka o dina edina n’oche agada, ebe ọ na-enweghị ike ịnọdụ ọdụ, ndị okenye ọgbakọ sooro ya tụlee ajụjụ ndị a na-ajụ ndị chọrọ ka e mee ha baptizim n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. N’October 16, 2004, mgbe Dustin dị afọ 12 na ọnwa 6, e mere ya baptizim ná mgbakọ sekit.

Ka okwu baptizim na-aga ịmalite, a kwaara Dustin n’oche nkwagharị gaa n’ebe ndị ọzọ a na-aga ime baptizim nọdụrụ ala. Mgbe e kwuru ka ndị a na-aga ime baptizim bilie ọtọ, Dustin, bụ́ onye yi nke kachasị mma n’ime kootu ya, ji otu ụkwụ guzoro ma jide aka n’oche. O ji olu dara ụda ma doo anya zaa ajụjụ abụọ a jụrụ ndị a na-aga ime baptizim. Ndị ezinụlọ Dustin nile bịachara mgbakọ ahụ, gụnyere nna ya na nwunye nna ya. Ndị ọrụ ụlọ ọgwụ na ndị nne na nna nke ụmụaka ndị ọzọ a na-agwọ ọrịa cancer n’ụlọ ọgwụ ahụ bịakwara mgbakọ ahụ.

N’ụbọchị sotere ụbọchị Dustin mere baptizim, a kpọghachiri ya n’ụlọ ọgwụ ahụ. N’oge ahụ, ọrịa cancer ahụ agazuola n’ọkpụkpụ ya nile. Ka ike nọ na-agwụkwu ya, obi ya ana-agwakwa ya na ya na-aga ịnwụ, ọ jụrụ nne ya ma ya ga-anwụ. Nne ya jụrụ ya, sị: “Gịnị mere i ji ajụ? Ụjọ ọnwụ ọ̀ na-atụ gị?”

Dustin zara ya, sị: “Mba. M nwụọ, ihe m ga-eme agwụla imechi anya m, mgbe m ga-esikwa n’ọnwụ bilie ma meghee anya m, ọ ga-adị m ka ebe m mechiri anya ma meghee ya n’otu sekọnd. M gaghị enwekwa ahụ́ mgbu ọzọ.” Ọ kọwaziri, sị: “Ọ bụ ndị ezinụlọ m na-eche m uche.”

Dustin nwụrụ n’ọnwa sochirinụ. Ndị dọkịta, ndị nọọsụ, ndị ezinụlọ nke ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ ahụ, ndị nkụzi, ndị agbata obi, nakwa ndị ezinụlọ Dustin—ma ndị nke bụ́ Ndịàmà Jehova ma ndị nke na-abụghị, nọcha ya mgbe e liri ya. Mgbe Dustin ka nọ ndụ, ọ rịọrọ ka a gbaara ndị nile ga-abịa mgbe a ga-eli ya ezi àmà banyere ihe ndị o kweere. Ọ bụ onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke ọgbakọ ha, bụ́ onye nyere ya nanị otu ihe omume ahụ o mere, kwuru ezigbo okwu na-ewusi okwukwe ike nye ìgwè ndị na-ege ntị, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha guzo eguzo n’ihi na e nweghị oche zurunụ.

E nyere ndị bịara olili ozu ahụ akwụkwọ e dere akụkụ Akwụkwọ Nsọ abụọ kasị amasị Dustin—Matiu 24:14 na 2 Timoti 4:7. Ikwesị ntụkwasị obi ya na okwukwe siri ike o nwere gbara ndị nile maara ya ume. Anyị na-atụ anya ịnabata ya mgbe ọ ga-esi n’ọnwụ bilie.—Dị ka Onyeàmà duziiri Dustin ọmụmụ Bible si kọọ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

“Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ.”—2 Timoti 4:7

[Foto dị na peeji nke 14]

N’elu: Dustin, mgbe ahụ́ ka siri ya ike

[Foto dị na peeji nke 14]

N’okpuru: Ebe a na-eme Dustin baptizim mgbe ọ dị afọ 12 na ọnwa 6