Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee otú m pụrụ isi mee ka ndị ọzọ ghọta ihe mere m ji kwere n’okike?

Olee otú m pụrụ isi mee ka ndị ọzọ ghọta ihe mere m ji kwere n’okike?

Olee otú m pụrụ isi mee ka ndị ọzọ ghọta ihe mere m ji kwere n’okike?

“Mgbe a kụziiri anyị evolushọn na klas, ọ dị nnọọ iche n’ihe a kụziiri m. Otú e si kụziere ya anyị mere nnọọ ka o yie eziokwu, nke na enweghị m ọnụ m ga-eji agbagha ya.”— Ryan, ọ dị afọ 18.

“Mgbe m dị afọ 12, onye nkụzi m ejighị ozizi evolushọn egwu egwu. O nwedịrị akara e ji mara Darwin n’ụgbọala ya! Nke a mere ka m ghara inwe ọnụ m ga-eji kọwaara ya ihe mere m ji kweere n’okike.”— Tyler, ọ dị afọ 19.

“Ụjọ jidere m mgbe onye na-akụziri anyị “social studies” kwuru na ọ bụ evolushọn ka anyị ga-amụ n’oge ọzọ anyị ga-amụ ihe. Amaara m na m ga-anọrịrị na klas kọwaa ebe m kwụ n’okwu a na-akpatakarị arụmarụ.”— Raquel, ọ dị afọ 14.

IKEKWE, dị ka ọ dị Ryan, Tyler, na Raquel, obi na-amafu gị mgbe ọ bụla onye nkụzi unu malitere ịkụzi evolushọn, nke bụ́ ihe ọmụmụ na-ekwu na e keghị anyị eke, kama na anyị rịpụtara arịpụta. I kweere na ọ bụ Chineke “kere ihe nile.” (Mkpughe 4:11) I lee anya gburugburu gị, ị na-ahụ ihe ndị na-egosi na e ji ọgụgụ isi kee ihe. Ma, akwụkwọ unu na-agụ n’ụlọ akwụkwọ na-ekwu na anyị rịpụtara arịpụta, onye nkụzi gị na-ekwukwa otu ihe ahụ. Obi gị ana-ajụ gị, sị, Ònye ka ị bụ ịbịa gbaghawa ihe ndị “ọkachamara” kwuru? Olee ihe ụmụ klas unu ga-ekwu ma ị malite ikwu banyere . . . Chineke?

Ọ bụrụ na obi gị na-ajụ gị ajụjụ ndị dị ka ndị a, obi efula gị! Ọ bụghị nanị gị kweere n’okike. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọbụna ọtụtụ n’ime ndị ọkà mmụta sayensị ekwenyeghị n’ozizi evolushọn. Ọtụtụ ndị nkụzi ekwenyeghịkwa na ya. Na United States, ihe dị ka mmadụ 4 n’ime ụmụ akwụkwọ 5 ọ bụla kweere na e nwere Onye Okike—n’agbanyeghị ihe akwụkwọ ndị ha na-agụ n’ụlọ akwụkwọ na-ekwu!

Ma, i nwere ike ịjụ, sị, ‘Olee ihe m ga-ekwu ma m chọọ ime ka ndị ọzọ ghọta ihe mere m ji kwere n’okike?’ Jide n’aka na a sịgodị na ị bụ onye ihere, ị ga-ekwuli ihe i kweere. Ma, ọ ga-adị mkpa na ị ga-akwado akwado maka ya.

Chọpụta Ma Ihe I Kweere Ọ̀ Bụ Eziokwu!

Ọ bụrụ na ọ bụ papa gị na mama gị bụ́ Ndị Kraịst zụlitere gị, o nwere ike ịbụ na ihe mere i ji kwere n’okike bụ n’ihi na ọ bụ ihe a kụziiri gị. Ma, ugbu a i torola, ị chọrọ iji ‘ikike iche echiche’ gị fee Chineke, ma nwee ihe ị gbakwasịrị ụkwụ na ya wee kwere n’ihe i kweere. (Ndị Rom 12:1) Pọl gbara Ndị Kraịst narị afọ mbụ ume ka ha “nwapụta ihe nile.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Olee otú ị ga-esi mee nke a ma a bịa n’ihe metụtara okike?

Nke mbụ, tụlee ihe Pọl dere banyere Chineke. O dere, sị: “Àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya bụ ndị a na-ahụ nke ọma site n’okike nke ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke.” (Ndị Rom 1:20) Buru okwu ndị ahụ n’obi ma leruo ahụ́ mmadụ, ụwa, mbara igwe, na oké osimiri, anya nke ọma. Leruo ụmụ ahụhụ, ahịhịa, ụmụ anụmanụ—ihe ọ bụla i nwere mmasị na ya—anya nke ọma. Jirizie ‘ikike iche echiche’ gị jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe mere m ji kwere na e nwere Onye Okike?’

Iji zaa ajụjụ ahụ, Sam, bụ́ onye dị afọ 14, lere anya n’ahụ́ mmadụ ma kwuo, sị, “Ihe nile zuru ezu, dịkwa mgbagwoju anya. Akụkụ ahụ́ nile na-arụkọkwa ọrụ ọnụ. O nweghị otú ọ ga-esi bụrụ na ahụ́ mmadụ pụtaara onwe ya n’enweghị onye kere ya!” Holly, bụ́ onye dị afọ 16, kwetara ihe ahụ Sam kwuru. O kwuru nke ya, sị, “Kemgbe a chọpụtachara na m na-arịa ọrịa shuga, amụtala m ọtụtụ ihe banyere otú ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe dị ịtụnanya ịhụ otú akụkụ ahụ́ a na-akpọ pancreas—nke bụ́ obere akụkụ ahụ́ dị n’azụ akpa afọ mmadụ—si eme ka ọbara na akụkụ ahụ́ ndị ọzọ nọgide na-arụ ọrụ.”

Ndị ntorobịa ọzọ lere okwu ahụ anya n’ụzọ ọzọ. Jared, bụ́ onye dị afọ 19, kwuru, sị, “Ihe kasị eme ka m kweta na e kere anyị eke bụ eziokwu ahụ bụ́ na anyị na-enwe ọchịchọ ife ofufe, na-enwe mmasị n’ihe ndị mara mma, na-enwekwa ọchịchọ ịmụta ihe. Àgwà ndị a abụghị ihe a chọrọ iji dị ndụ, dị nnọọ ka ndị evolushọn na-akụzi. Nanị nkọwa m weere dị ka nke ezi uche dị na ya bụ na ọ dị onye debere anyị ebe a, onye ahụ chọkwara ka anyị nụ ụtọ ndụ.” Tyler, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, chekwara otú ahụ. O kwuru, sị, “Mgbe m tụlere ọrụ osisi na-arụ iji mee ka ndụ dịgide nakwa ụzọ dị ịtụnanya e si kee ha, ana m ekwenyesi ike na e nwere Onye Okike.”

Ọ ga-aka adịrị gị mfe ime ka ndị ọzọ mara na e kere anyị eke ma ọ bụrụ na i chebarala ya echiche ma kwere n’onwe gị na ọ bụ eziokwu. N’ihi ya, dị ka Sam, Holly, Jared, na Tyler mere, wepụta oge tụlee otú ihe ndị Chineke kere si dị ebube. I mee otú ahụ, “gee ntị” n’ihe ha “ga-agwa” gị. Obi abụọ adịghị ya na ị ga-ekwu otu ihe ahụ Pọl onyeozi kwuru—nke bụ́ na ọ bụghị nanị na ‘ihe ndị e kere eke ga-eme ka ị ghọta’ na Chineke dị, kamakwa ha ga-eme ka ị ghọta àgwà ya nke ọma. *

Mara Ihe Bible Na-akụzi n’Ezie

E wezụga ilerukwu anya n’ihe ndị Chineke kere, iji nwee ike ịkọwa nke ọma na e kere ihe nile eke, ọ dịkwa gị mkpa ịma ihe Bible na-akụzi n’ezie banyere ya. Ọ dịghị mkpa ịgbaghawa ihe ndị ọ na-enweghị ihe Bible kwuru kpọmkwem banyere ha. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

Akwụkwọ m ji amụ sayensị na-ekwu na ụwa na mbara igwe adịrịla kemgbe ọtụtụ ijeri afọ gara aga. Bible ekwughị ihe ọ bụla banyere afọ ole ụwa ma ọ bụ mbara igwe dị. Ihe Bible na-ekwu kwekọrọ n’echiche bụ́ na mbara ụwa anyị a amalitela ịdị kemgbe ọtụtụ ijeri afọ tupu “ụbọchị” mbụ a malitere ike ihe.—Jenesis 1:1, 2.

Onye nkụzi m sịrị na o nweghị otú ọ ga-esi bụrụ na e kere ụwa nanị n’ime ụbọchị isii. Bible ekwughị na ụbọchị nke ọ bụla n’ime “ụbọchị” isii ahụ e ji kee ihe dị nanị awa 24. Ị chọọ imatakwu banyere ya, lee peeji nke 28-30 nke magazin a.

Na klas anyị, e nyere anyị ọtụtụ ihe atụ nke otú ụmụ anụmanụ na mmadụ sirila gbanwee. Bible na-ekwu na Chineke kere ihe ndị dị ndụ “n’ụdị ha dị iche iche.” (Jenesis 1:20, 21, NW) Ọ naghị akwado echiche bụ́ na ndụ si n’ihe ndị na-adịghị ndụ malite ma ọ bụ na Chineke kere nanị otu mkpụrụ ndụ, otu mkpụrụ ndụ ahụ ebidozie na-enwogha onwe ya, ma mezie ka e nwee ihe nile dị ndụ anyị na-ahụ taa. N’agbanyeghị nke ahụ, ‘ụdị’ nke ọ bụla nwere ike ịpụta n’ụdị dịgasị iche iche. Ya mere, otú Bible si kwuo okwu na-egosi na a pụrụ inwe ụdị dịgasị iche iche n’ime otu ‘ụdị’ anụmanụ ma ọ bụ osisi.

Obi Sie Gị Ike n’Ihe Ndị I Kweere!

Ọ dịghị ihe mere ị ga-eji nwewe obi abụọ ma ọ bụ mewe ihere maka na i kweere n’okike. Ọ bụrụ na ị tụlee ihe àmà ndị e nwere, ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya—nakwa n’ezie, ihe kwekọrọ n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala—ikwere na ọ bụ onye nwere ọgụgụ isi kere anyị. A sị ka e nyochawa ya, ọ bụ ozizi evolushọn—ọ bụghị nke okike—chọrọ oké okwukwe, ọ bụkwa ya yiri ikwere n’ọrụ ebube nke a na-enweghị onye rụrụ ya. N’ezie, mgbe ị tụlechara isiokwu ọzọ dị na Teta! a, nke kwuru banyere okike, obi abụọ adịghị ya na ị ga-aghọta na ihe àmà ndị e nwere na-akwado na e kere ihe nile eke. Ozugbo i jichara ikike iche echiche gị tụlee okwu a, obi ga-esikwu gị ike ime ka ụmụ klas unu na onye nkụzi unu ghọta ihe mere i ji kwere n’okike.

Ihe a ka Raquel, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, chọpụtara. O kwuru, sị, “O were m ụbọchị ole na ole iji ghọta na ekwesịghị m imechi ọnụ ghara ime ka ndị ọzọ mara ihe ndị m kweere. Enyere m onye nkụzi m akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? bụ́ nke m kanyere ihe n’ebe ụfọdụ m chọrọ ka ọ mata ihe dị na ya. Ka e mesịrị, ọ gwara m na akwụkwọ ahụ mere ka ya malite ile ozizi evolushọn anya n’ụzọ dị nnọọ iche nakwa na, n’ọdịnihu, ya ga-eburu ihe ya gụtara n’akwụkwọ ahụ n’obi mgbe ọ bụla ya na-akụzi evolushọn na klas!”

Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ype

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Ọtụtụ ndị ntorobịa eritela uru site n’ịtụleghachi ihe e dere n’akwụkwọ ndị dị ka Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? na Is There a Creator Who Cares About You? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ abụọ ahụ.

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee ụfọdụ ụzọ ndị dị mfe ị pụrụ isi kọwaara ndị nkụzi na ụmụ akwụkwo ibe gị ihe mere i ji kwere na e kere ihe eke?

▪ Olee otú ị pụrụ isi gosi na i nwere ekele maka Onye kere ihe nile?—Ọrụ 17:26, 27.

[Foto dị na peeji nke 21]

“IHE ÀMÀ E NWERE KARỊRỊ AKARỊ”

“Gịnị ka ị ga-agwa onye na-eto eto e merela ka o kwere na e nwere Onye Okike, a bịazie na-akụziri ya evolushọn n’ụlọ akwụkwọ?” Ihe a ka a jụrụ otu onye ọkachamara n’ihe metụtara mkpụrụ ndụ, nke bụ́ Onyeàmà Jehova. Gịnị ka ọ zara? “I kwesịrị iwere ya dị ka ohere ị ga-eji gosi onwe gị na Chineke dị—ọ bụghị nanị n’ihi na ọ bụ ihe ndị mụrụ gị kụziiri gị kama n’ihi na tụleela ihe àmà ndị na-egosi na Chineke dị ma hụ n’onwe gị na Chineke dị. Mgbe ụfọdụ, a gwa ndị nkụzi ka ha ‘kọwaa’ ihe mere ha ji kwere n’evolushọn, ha na-achọpụta na ha agaghị akọwali ya. Nke a na-eme ka ha ghọta na nanị ihe mere ha ji kwere n’evolushọn bụ na ọ bụ ihe a kụziiri ha. Otu ọnyà ahụ nwekwara ike ịma gị ma a bịa ná nkwere i kweere na e nwere Onye Okike. Ọ bụ ya mere o ji dị mma igosi onwe gị na Chineke dị adị n’ezie. Ihe àmà e nwere karịrị akarị. Anaghị achọ ha achọ.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]

OLEE IHE MERE I JI KWERE NA YA?

N’okpuru ebe a, dee ihe atọ mere i ji kwere na e nwere Onye Okike:

1. ․․․․․

2. ․․․․․

3. ․․․․․