Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee otú m pụrụ isi nyere ndị nọ ná mkpa aka?

Olee otú m pụrụ isi nyere ndị nọ ná mkpa aka?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee otú m pụrụ isi nyere ndị nọ ná mkpa aka?

“M na-atụ anya na m gụchaa akwụkwọ, m ga-amalite ịrụ ọrụ imezi ọkụ eletrik. Achọrọ m iso na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze.”— Tristan, ọ dị afọ 14.

“M na-ezitere unu dọla 20 dị ka onyinye m na-enye maka ígwè obibi akwụkwọ ọhụrụ ahụ. Ọ bụ ego mmachi akpa m, ma m chọrọ inye ya unu.”— Abby, ọ dị afọ 9.

N’OGE a ụfọdụ ndị na-ewerekarị ndị na-eto eto dị ka ndị na-eche nanị banyere onwe ha, ọtụtụ ndị na-eto eto—gụnyere ndị a a kpọrọ aha n’elu—na-egosi na ha adịghị eche nanị banyere onwe ha. N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, e nwere ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na-eto eto bụ́ ndị na-eji oge, ike, na ihe onwunwe ha ejere ndị ọzọ ozi. (Abụ Ọma 110:3) Tụlekwuo ihe atụ ndị ọzọ.

E nwere otu nwatakịrị nwoke dị afọ asaa n’Australia nke aha ya bụ Jirah. Obere oge ka nne nne ya nwụchara, papa ukwu ya nyere ya dọla 50. Gịnị ka Jirah ji ego ahụ mee? Ná nzukọ ọgbakọ ọzọ ha nwere, o tinyere ego ahụ nile n’igbe onyinye. N’ihi gịnị? Jirah gwara nne ya, sị, “Enwere m ọtụtụ ihe m ji egwuri egwu, ha zukwaara m, ma nanị otu nne nne ka m nwere. Ama m na nne nne m gaara achọ ka m jiri ego a nye onyinye, n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu.”

Hannah, bụ́ nwatakịrị nwanyị dị afọ ise nke si United States, nwere mmasị n’ebe ịnyịnya dị. Ọ chọburu ịzụ ịnyịnya ụmụaka, bụ́ nke a na-ere dọla 75. Nne na nna Hannah na-adị enye ya ego mgbe ụfọdụ ka o tinye n’igbe nchekwa ego ya, bụ́ nke a rụrụ ka o yie ezì. Ihe mekwaranụ ha ji enye ya ego ahụ bụ iji kụziere ya uru ọ bara ichekwa ego. O teghị aka Hannah enweta ego karịrị ego ọ ga-eji zụta ịnyịnya ụmụaka ahụ.

Otú ọ dị, n’oge ọ chọrọ ịzụ ịnyịnya ụmụaka ahụ, oké ifufe a kpọrọ Hurricane Katrina kpara mkpamkpa n’ógbè Gulf Coast nke United States. Hannah meteere ndị oké ifufe ahụ metụtara ebere, n’ihi ya kwa, o kpebiri inye ego nile o chekwara—ihe karịrị 100 dọla—n’onyinye iji nyere ha aka. Hannah degaara isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova akwụkwọ, sị: “Ana m enye unu ego a n’ihi na m hụrụ Jehova n’anya, achọkwara m inye aka.” Jehova ọ̀ na-ahụ omume mmesapụ aka ndị dị otú ahụ? Bible kwuru, sị: “Unu echefula ime ihe ọma na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.”—Ndị Hibru 13:16.

Tiffany, bụ́ nwatakịrị nwanyị sikwa United States degaara isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova akwụkwọ mgbe oké ifufe abụọ kpara mba Florida aka ọjọọ n’afọ 2004. O dere, sị: “Mụ na nwanne m nwoke Timothy na-ezitere unu otu narị dọla na iri. Ụlọ anyị emebighị nnukwu, ma anyị hụrụ ihe oké ifufe ahụ mere ụlọ ndị ọzọ. Ebe ọ bụ na anyị chọrọ inye aka, anyị bidoro chekwawa ego anyị. Timothy nwetara dọla iri mgbe o nyesịrị aka n’iwepụsị osisi a kụrụ n’ahụ́ otu ụlọ. Mụ onwe m chekwaliri otu narị dọla.” Tiffany dị afọ 13, ebe nwanne ya nwoke bụ́ Timothy dị nanị afọ 7! Gịnị na-eme ma anyị bute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ tupu nke anyị? Ilu 11:25 kwuru, sị: “Onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ.”

Otu ìgwè Ndịàmà na-eto eto nọ na United States, bụ́ ndị onye nke a tọchara n’ime ha dị afọ 4, onye nke tọchara adịrị afọ 15, nụrụ na Ndịàmà ibe ha nọ n’Africa nwere mkpa maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha ekpebie ime ihe maka ya. “Anyị malitere ire biskit na keeki, anyị retekwara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ dọla 107. Anyị gwara ndị mmadụ na a pụrụ iji ego ahụ rụọ ebe ndị mmadụ ga na-ezukọ ma na-amụ Bible n’Africa. Ọtụtụ ndị mere ihe maka ya. O were anyị awa itoolu iji rechaa ihe ndị ahụ, ma o ruru mgbalị anyị tinyere maka ya n’ihi na ọ bụ Jehova ka anyị meere ya!”

Ị Pụrụ Inye Aka

Ndị a na-eto eto a kọrọ ahụmahụ ha achọpụtala eziokwu dị n’okwu Jizọs, bụ́: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Gị onwe gị pụkwara ịchọpụta ọṅụ a a na-enweta site n’inye ihe. Olee ụzọ ndị ị pụrụ isi chọpụta ya?

Ò nwere ndị kwere ekwe ibe gị ị nụrụ na ha nọ ná mkpa? Dị ka ihe atụ, è nwere ebe ọdachi ndị na-emere onwe ha mere? Chegodị otú ọ ga-adị gị ma ụlọ gị na ihe onwunwe gị funahụ gị, ma ọ bụkwanụ ma onye ị hụrụ n’anya nwụnahụ gị. Pọl onyeozi dere na Ndị Kraịst kwesịrị ịdị “na-elekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara [ha], kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.” (Ndị Filipaị 2:4) Ọ bụrụgodị na i bi n’ebe dị anya site n’ebe ọdachi mere, ikekwe ị pụrụ inye onyinye Ndịàmà Jehova ga-eji gbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. *

E nwere ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi nyere ndị nọ ná mkpa aka. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, gịnị ma i legharịa anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? È nwere ndị agadi ma ọ bụ ndị ọzọ a pụrụ inyere aka? Ị̀ pụrụ inyere ha aka n’ọrụ ụlọ? Pọl onyeozi degaara ndị Rom akwụkwọ, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ mmetụta dị nro maka ibe unu. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Mgbe ọ bụla ị hụrụ na e nwere mkpa, wepụta onwe gị nye aka n’echeghị ka a gwa gị agwa. Dị njikere ịrụ ọbụna ọrụ ndị dị nta. Chetakwa na e nwere njikọ dị n’etiti ijere ndị ọzọ ozi na ijere Chineke ozi. Bible kwuru, sị: “Onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ, ọ bụkwa mmeso ọma ya ka Ọ ga-akwụghachi ya.”—Ilu 19:17.

N’eziokwu, ụzọ kasị mma ị ga-esi nyere ndị ọzọ aka bụ ịgwa ha ihe ị mụtara n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Jizọs kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ dị ndị mmadụ mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ịnụ ozi ọma a sitere na Bible, bụ́ nke na-azọpụta ndụ. Ya mere, nọgide jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekerechi òkè anya n’ọrụ ikwusa ozi ọma, na-enwe obi ike na “ndọgbu [ị] na-adọgbu onwe [gị] n’ọrụ abụghị n’efu.”—1 Ndị Kọrint 15:58.

Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ype

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 A na-eji obi ekele anabata onyinye ndị a kpọrọ aha ebe a chọrọ ka e jiri ha gbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka. Ma, ọ na-akacha mma inye onyinye ndị dị otú ahụ maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova, ebe ọ bụ na a na-esi na ya ewere ego eme ihe dị ka mkpa e nwere si dị.

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Ì nwere ike icheta onye chọrọ enyemaka?

▪ Olee ihe i nwere ike ime iji nye aka?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

“Unu echefula ime ihe ọma na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.”—Ndị Hibru 13:16

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

GỊNỊ MERE Ị GA-EJI MỤTA INYE IHE?

“Ịhụ ka ndị mụrụ m na-eji oge ha na ume ha ejere Jehova na ndị agbata obi ha ozi mere ka m chọọ ibi ndụ m otú ahụ. Papa m gwara m, sị: ‘N’agbanyeghị ókè ihe ọ bụla i meere Jehova dịruru ntakịrị, uru ya na-adịru ebighị ebi. Jehova na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ ga-echetakwa ya ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ndụ gị furu ọhịa ma ọ bụrụ na ị na-ebi ya nanị maka onwe gị. Ị nwụọ, ọrụ ị rụrụ esorokwa gị nwụọ.’”—Kentaro, ọ dị afọ 24, o si Japan.

“Ịgwa gị eziokwu, n’oge mbụ, ihe ikpeazụ m ga-eme bụ inyere ndị agadi aka rụọ ọrụ ụlọ n’ehihie Saturday. Ihe m na-achọ iji oge ahụ mee bụ iji ya soro ndị ọgbọ m kporie ndụ. Ma, mgbe m bịara soro ndị agadi na-anọ, ọ bịara tọwa m ụtọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m bịara mara na ha bụ mmadụ ndị dị ka m, na o nwekwara oge ha bụ ụmụaka. Nke a kpaliri m inyere ha aka.”—John, ọ dị afọ 27, o si England.

“Mgbe m dị obere, ana m eso edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, ma na-arụkwa ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ. Ana m enwekwa mmasị inyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka n’ọrụ ha. Mgbe ọ bụla i nyeere mmadụ aka, ị ga-achọpụta na obi na-adị onye ahụ ụtọ. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị, eso m ụfọdụ ndị gaa mapawa ihe e ji amachi ahụ́ ụlọ n’ụlọ otu nwanna nwanyị merela agadi. Obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu! Mgbe i mere ka mmadụ nwee obi ụtọ, obi na-adịkwa gị onwe gị ụtọ.”—Hermann, ọ dị afọ 23, o si France.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ọtụtụ ndị na-eto eto na-enye onyinye ego iji nyere ndị ọdachi dakwasịrị aka