Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tv Ihe ‘A Na-adịghị Achọpụta Ngwa Ngwa Na Ọ Na-akụzi Ihe’

Tv Ihe ‘A Na-adịghị Achọpụta Ngwa Ngwa Na Ọ Na-akụzi Ihe’

Tv Ihe ‘A Na-adịghị Achọpụta Ngwa Ngwa Na Ọ Na-akụzi Ihe’

APỤRỤ iji TV kụzie ezigbo ihe. Ọ na-eme ka anyị mata banyere obodo na mmadụ ndị anyị na-agaraghị amata ma eleghị anya. Anyị si na ya ahụ oké ọhịa dị iche iche, ebe mgbago mgbago na ebe ndịda ndịda ụwa nke bụ́ ice ice, tinyere ọnụ ọnụ ugwu na ala ala oké osimiri dị iche iche. TV na-emekwa ka anyị hụperetụ ụmụ irighiri ihe ndị Bekee na-akpọ atọm, tinyere kpakpando, bụ́ ndị dịcha ịtụnanya. Ọ na-eme ka anyị jiri anya anyị na-ahụ ihe ndị a na-akọ n’akụkọ ụwa kpọmkwem mgbe ha na-eme. Ọ na-eme ka anyị mata banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ihe ndị mere n’oge ochie, okwu ndị a kpụ n’ọnụ, na omenala obodo dị iche iche. TV na-eme ka anyị hụ ndị mmadụ ma n’oge ha nọ ná nsogbu ma n’oge ihe na-agaziri ha. Ọ na-eme anyị obi ụtọ, na-akụziri anyị ihe, ọbụna na-akpalikwa anyị ime ihe.

Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ihe ndị a na-egosi na ya adịghị mma, ha adịghịkwa akụzi ezigbo ihe. Ikekwe, ndị kasị akatọ TV bụ ndị imirikiti ihe ike na mmekọahụ a na-egosi na ya na-ewute. Dị ka ihe atụ, n’otu nnyocha e mere na United States, a chọpụtara na ihe ike na-adị n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ihe ndị a na-egosi na TV. Nke pụtara na n’ime awa ọ bụla, a na-egosi ebe isii a na-eme ihe ike. Tupu nwatakịrị etoruo ogo mmadụ, o kiriela ọtụtụ puku ihe ngosi ndị e mere ihe ike ma gbuo ọchụ na ha. Mmekọahụ karịkwara akarị na ya. Ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ihe ndị a na-ekwu na TV bụ okwu ndị metụtara mmekọahụ. Ihe fọrọ nke nta ka o ruo ụzọ abụọ n’ụzọ ise bụ ihe nkiri ndị metụtara mmekọahụ, bụ́ ndị a na-egosikarị dị ka ihe nsogbu na-adịghị na ha na ihe a pụrụ ime n’eyighị eyi, ọ bụkwa ndị na-abụghị di na nwunye ka a na-ejikarị eme ha. *

Fim ndị metụtara mmekọahụ na ihe ike na-aga ahịa n’ụwa nile. Fim America ndị a na-egosikarị ihe ike na mmekọahụ na ha, ndị a na-emesịkwa gosi na TV, na-aga ahịa nke ọma ná mba ndị ọzọ. Ọ bụchaghị na a na-eme fim ndị a nke ọma, ọ bụchaghịkwa na akụkọ ndị a na-eme fim ha bụ akụkọ ndị e chebaara nnọọ echiche wee dee, ma, a na-aghọta ha ngwa ngwa. Ndị na-emepụta ụdị fim a na-eme ka anya ndị na-ekiri ya ghara ịpụ apụ site n’igosi ebe ndị a na-alụ ọgụ, ebe ndị a na-egbu mmadụ, ihe ndị ga-agba ndị mmadụ gharịị, na ebe ndị a na-enwe mmekọahụ. Ma, ka ndị mmadụ wee nọgide na-enwe mmasị n’ikiri fim ndị a, ọ dị mkpa na a ga na-agbanwetụ ihe na ha. Ọ na-abụ ndị mmadụ kirigide otu ihe ruo ogologo oge, ya agbụọ ha; ihe ahụ e weere dị ka fim kara aka aghọzie ihe na-adịghị ihe ọ bụ. Iji hụ na ndị na-ekiri ụdị fim a nọgidere na-enwe mmasị na ya, ndị na-emepụta ya na-agba mbọ ịhụ na ha tinyere ihe ndị ga-awụkwụ ndị mmadụ akpata oyi n’ahụ́ ma kpalie mmasị ha. Ha na-eme nke a site n’igosikwu ihe ike, igosi ihe ndị a na-ezotụ ezo, igosirutụ mmekọahụ n’isi, nakwa site n’ime ka ndị na-eme ihe ike na ya takwuo obi mmiri.

Ụka A Na-arụ Banyere Mmetụta TV Na-enwe

Olee mmetụta ihe ike na mmekọahụ ndị a na-egosi na TV mgbe nile na-enwe n’ahụ́ ndị na-ekiri ha? Ndị na-akatọ ha na-ekwu na ihe ike a na-eme na TV na-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe ike ike, na-emekwa ka ha ghara imetere ndị a na-emeso ihe ike ebere. Ha na-ekwukwa na ngosi a na-egosi mmekọahụ na-eme ka ndị mmadụ na-enwe mmekọahụ aghara aghara, na-emekwa ka ndị mmadụ gharazie ịdị na-eme omume ọma.

Ikiri TV ọ̀ na-akpata ihe ndị ahụ n’ezie? A rụọlara ajụjụ a ụka nke ukwuu ruo ọtụtụ iri afọ; e meela ọtụtụ narị nchọpụta banyere ya, deekwa ọtụtụ puku akwụkwọ banyere ya. Ihe kasị taa akpụ n’arụmụka a bụ igosi otú o si bụrụ na otu ihe kpatara ihe ọzọ—dị ka ihe atụ, na mmadụ ịmalite n’oge ọ dị obere kiriwe ihe ike a na-egosi na TV na-eme ka ọ bụrụ onye na-eme ihe ike ike ma o too. Igosi na otu ihe kpatara ihe ọzọ na-esi ike mgbe ụfọdụ. Iji maa atụ: Were ya na ihe a bụ nke mbụ ị na-aṅụ otu ọgwụ. N’ime awa ole na ole ị ṅụrụ ya, ihe agbakasịa gị n’ahụ́. N’ọnọdụ ahụ, ọ dị mfe ikwu na ọ bụ ọgwụ ahụ mere ihe ahụ ji gbakasịa gị n’ahụ́. Ma, mgbe ụfọdụ, ọgwụ mmadụ ṅụrụ na-eji nwayọọ nwayọọ amalite inye ya nsogbu n’ahụ́. Mgbe ọ dị otú ahụ, ọ pụrụ isiri ya nnọọ ike ime ka ndị ọzọ kweta na ọ bụ ọgwụ ahụ ọ ṅụrụ kpataara ya nsogbu ahụ, ebe ọ bụ na e nwere ihe ndị ọzọ na-akpata ya.

N’otu aka ahụ, o siela ike igosi otú o si bụrụ na ihe ike ndị a na-egosi na TV na-akpali ndị mmadụ ime mpụ na ịbụ ndị ha na ndị ọzọ na-anaghị adị ná mma. Ọtụtụ nchọpụta e mere na-egosi na e nwere ihe jikọrọ ihe abụọ ahụ. Ọzọkwa, ụfọdụ ndị omekome ekwuola na ọ bụ ihe ha hụrụ na TV mere ha ji malite ịkpa àgwà ọjọọ na ime ihe ike. N’aka nke ọzọ, e nwere ọtụtụ ihe na-emetụta àgwà ndị mmadụ. Egwuregwu vidio ndị a na-eme ihe ike na ha, otú mmadụ na ndị enyi ya nakwa ndị ezinụlọ ya si biri, ụdị ndụ mmadụ biri—ihe a nile nwere ike iso mee ka mmadụ bụrụ onye na-eme ihe ike ike.

N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na a na-arụrịta ụka banyere ya. Otu onye Canada bụ́ ọkà n’akparamàgwà mmadụ dere, sị: “E jiri ụzọ ndị ọkà mmụta sayensị ji achọpụta ihe nyochawa ya, ọ dịghị ihe gosiri na mmadụ ikiri ihe ike na-eme ka o mewe ihe ike ma ọ bụ ka ihe ike sie ya.” Otú ọ dị, Kọmitii Na-ahụ Maka Mgbasa Ozi na Mmekọrịta Mmadụ na Ibe Ya nke Òtù Na-ahụ Maka Akparamàgwà Mmadụ n’America guzobere kwuru, sị: “Obi abụọ adịtụghị ya na oké ihe ike a na-egosi na televishọn so eme ka ọtụtụ mmadụ na-anabata ihe ike, sorokwa na-eme ka ha na-eme ihe ike ike.”

Ichebara TV Echiche

Cheta na ihe ndị ọkachamara na-arụrụ ụka bụ ma è nwere ihe akaebe—ma è nwere ihe akaebe a ga-eji kwadoo echiche bụ́ na mmadụ ikiri ihe ike na-eme ka o mewe ihe ike. Otú ọ dị, ọ bụ mmadụ ole na ole ga-ekwu na TV adịghị emetụta ụzọ anyị si eche echiche na ụzọ anyị si akpa àgwà. Chegodị echiche banyere ya. Otu foto pụrụ ime ka iwe wee anyị, ka anya mmiri gbaa anyị, ka anyị ṅụrịa ọṅụ. Egwú na-emetụkwa anyị n’obi nke ukwuu. Ọbụnadị ihe e dere n’akwụkwọ na-eme ka anyị chee echiche, na-emetụ anyị n’obi, na-akpalikwa anyị ime ihe. Lezienụ mmetụta foto na-agagharị agagharị, egwú, na okwu e kwuru ekwu, bụ́ ndị e ji nkà jikọta ọnụ ka ha ghọọ fim, na-aghaghị inwe n’ahụ́ ndị mmadụ! Ka a sịkwa ihe mere TV ji enweta ndị mmadụ! Ọ dịkwa n’ebe aka ndị mmadụ pụrụ iru. Otu onye edemede kwuru, sị: “Kemgbe ụmụ mmadụ malitere ide echiche ha ede, . . . ọ dịbeghị ụzọ ọ bụla e si agbasa ozi nke kparala ụdị ike TV kparala n’ime ka ụwa mepee anya.”

Ụlọ ọrụ dị iche iche na-emefu ọtụtụ ijeri dọla kwa afọ n’ịkpọsa ngwa ahịa ha n’ihi na ha ma na ihe mmadụ ji anya ya hụ, jirikwa ntị ya nụ, na-emetụta àgwà ya. Ihe mere ha ji emefu ego nile ahụ n’ịkpọsa ngwa ahịa ha abụghị n’ihi na ha chere na o nwere ike ime ka ahịa ha gaa agaa; ha maara na ọ ga-aga ma ha kpọsaa ya. Ọ na-eme ka ha repụ ngwa ahịa ha. N’afọ 2004, Ụlọ Ọrụ Coca-Cola mefuru ego dị ijeri dọla abụọ na narị puku nde abụọ n’iji akwụkwọ, redio, na TV kpọsaa ngwa ahịa ha n’ụwa nile. Ego ahụ ha mefuru ọ̀ baara ha uru? Eenụ! Uru ahịa ụlọ ọrụ ahụ nwetara n’afọ ahụ fọrọ obere ka o ruo ijeri dọla iri abụọ na abụọ. Ndị na-akpọsa ngwa ahịa ghọtara na ịkpọsa ngwa ahịa nanị otu ugbo nwere ike ọ gaghị akpali ndị mmadụ ịzụ ya. N’ihi ya, kama ịkpọsa ya nanị otu ugbo, ha na-akpọsa ya ruo ọtụtụ afọ.

Ọ bụrụ na mkpọsa e ji sekọnd 30 kpọsaa ngwa ahịa na-emetụta àgwà anyị, o kwesịrị ido anyị anya na iji ọtụtụ awa kirie TV na-emetụtakwa àgwà anyị. Onye dere akwụkwọ bụ́ Television—An International History dere, sị: “Ọ bụ ezie na a dịghị achọpụta ya ngwa ngwa, televishọn na-esi n’ihe ntụrụndụ ndị a na-egosi na ya mgbe dum ma ọ bụ ndị nke na-adịghị ihe e ji ha kpọrọ, arụ ọrụ dị ka ihe na-akụzi ihe.” Akwụkwọ bụ́ A Pictorial History of Television kwuru, sị: “Televishọn na-eme ka ụzọ anyị si eche echiche na-agbanwe.” Ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị bụ, ‘Ihe m na-ekiri ọ̀ na-emetụta echiche m otú m chọrọ ka o siri na-emetụta ya?’

Ajụjụ ahụ abụghị obere ajụjụ nye ndị na-ejere Chineke ozi. Ọtụtụ n’ime ihe ndị a na-egosi na TV ekwekọghị n’ụkpụrụ omume dị elu Bible na-akụzi. Na TV, a na-egosi omume Akwụkwọ Nsọ katọrọ dị ka ihe dị mma, ihe dị otú o kwesịrị ịdị, na ọbụna ihe e ji mara ndị ma nke a na-akọ. N’otu mgbe ahụ, a na-elegharakarị ụkpụrụ omume Ndị Kraịst na ndị yiri ka hà na-agbaso ha anya, na-akọkarị ha ọnụ, ma ọ bụ na-akwakarị ha emo. Otu onye edemede kwara arịrị, sị: “Ihe a na-eme abụghị nanị ime ka ihe na-adịghị mma yie ihe dị mma. A ghaghịkwa ime ka ihe dị mma yie ihe na-adịghị mma.” A pụrụ ikwu na, ọtụtụ mgbe, TV na-eji olu dị ala ekwu, sị: ‘Ezi ihe bụ ihe ọjọọ, ihe ọjọọ bụ ezi ihe.’—Aịsaịa 5:20.

Anyị aghaghị ịkpachara anya banyere ihe anyị na-ekiri, n’ihi na ọ na-emetụta ụzọ anyị si eche echiche. Bible na-ekwu, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Adam Clarke, bụ́ ọkà mmụta Bible kwuru, sị: “Ka i wee jesoo mmadụ, ọ pụtara na ị ga-ahụ onye ahụ n’anya, gị na ya ga-adịkwa ná mma; o kweghị omume na anyị agaghị eṅomi ndị anyị hụrụ n’anya. Ọ bụ ya mere anyị ji ekwu, sị, ‘Gosi m onye ya na ya na-akpa, ka m gwa gị ụdị mmadụ ọ bụ.’ M mara ndị bụ́ enyi mmadụ, ọ ga-adịrị m mfe ịkọta ụdị àgwà onye ahụ na-akpa.” Dị ka anyị hụrụla, ọtụtụ mmadụ na-eji oge dị ukwuu eso ndị a na-egosi na TV anọ, ndị a bụkwa ndị ezigbo Onye Kraịst na-agaghị arọwa nrọ ịkpọbata n’ụlọ ya ma ha jiri ụkwụ ha bịa.

Ọ bụrụ na dọkịta gị agwa gị ka ị ṅụọ otu ọgwụ na-akpa ike n’ahụ́, o doro anya na ị ga-asa anya mmiri chọpụta uru na ọghọm dị n’ịṅụ ọgwụ ahụ. Ịṅụ ọgwụ na-abụghị maka ọrịa gị—ma ọ bụ ịṅụfe ọgwụ nke bụ́ maka ọrịa gị aṅụfe—pụrụ ịkpatara gị ọrịa ọzọ. A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ikiri TV. Ya mere, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ichebara nnọọ ihe anyị na-ekiri echiche.

Pọl onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ gbara Ndị Kraịst ume ịtụle ihe ndị bụ́ eziokwu, ihe ndị kwesịrị nchebara echiche, ihe ndị bụ́ ezi omume, ihe ndị dị ọcha, ihe ndị na-akpali ịhụnanya, ihe ndị a na-ekwu okwu ọma banyere ha, ihe ndị bụ́ omume ọma, na ihe ndị kwesịrị otuto. (Ndị Filipaị 4:6-8) Ị̀ ga-agbaso ndụmọdụ ahụ? Ị ga-enwe obi ụtọ ma ị gbasoo ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ihe ndekọ e nwere maka obodo United States yiri nke e nwere maka obodo ndị ọzọ, n’ihi na ma ndị nọ n’America ma ndị nọ n’ebe ndị ọzọ n’ụwa na-ekiri ihe ụlọ ọrụ televishọn ndị dị n’America na-egosi, na-ekirikwa fim ndị e mepụtara n’America.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

“Televishọn bụ ihe mmadụ mepụtara nke na-eme ka ndị ị na-agaghị ekwe ka ha bata n’ụlọ gị nọrọ n’ime ụlọ gị na-eme gị obi ụtọ.”—David Frost, bụ́ onye Britain na-akọ akụkọ ụwa

[Igbe dị na peeji nke 5]

Gịnị Banyere Mmekọahụ na Ihe Ike Ndị A Kọrọ Banyere Ha n’Ime Bible?

Olee ọdịiche dị n’etiti ihe ike na mmekọahụ ndị a na-egosi na TV na ndị nke a kọrọ banyere ha n’ime Bible? A bịa ná mmekọahụ na ihe ike ndị a kọrọ banyere ha n’ime Bible, a kọrọ ha iji kụziere anyị ihe, ọ bụghị iji mee anyị obi ụtọ. (Ndị Rom 15:4) Okwu Chineke kọrọ ihe ndị mere eme. Ọ na-enyere anyị aka ịghọta otú Chineke si ele ihe ụfọdụ anya, na-enyekwara anyị aka isi n’ihe mere ndị ọzọ mụta ihe.

N’ọtụtụ mba ndị a na-ejikarị TV akpọsa ngwa ahịa, a na-egosikarị ihe ndị metụtara mmekọahụ na ihe ike na ya iji nweta ego—ọ bụghị iji kụziere ndị mmadụ ihe. Ndị na-akpọsa ngwa ahịa na-achọ inweta ọtụtụ mmadụ ruo ókè ha nwere ike. Ọ bụrụkwa na e gosi ihe ndị metụtara mmekọahụ na ihe ike mgbe a na-akpọsa ngwa ahịa ahụ, ọ na-eme ka anya ndị na-ekiri ya ghara ịpụ apụ. Ihe na-esi na ya apụta bụ na ha ga-ekiri mkpọsa ahụ e mere, zụọkwa ngwa ahịa ahụ a kpọsara. Ndị na-akọ akụkọ ụwa na-agbaso ụkpụrụ bụ́: “Ọ bụrụ na ihe ike dị n’akụkọ ahụ nke ọma, ọ ga-ehi ụdụ.” A sị ka e kwuo ya n’ụzọ dị mfe, akụkọ ndị dị egwu—akụkọ banyere mpụ, ọdachi, na agha—na-aka ede ude karịa akụkọ ndị ọzọ.

Ọ bụ eziokwu na Bible kọrọ banyere ihe ike, Bible na-agba ndị mmadụ ume ibi ndụ udo—ka ha ghara ịbọ ọ́bọ̀ kama ka ha na-edozi nsogbu ha n’udo. Ọ na-agba ndị mmadụ ume mgbe nile izere mmekọahụ rụrụ arụ. Ihe ndị a abụghị ihe ihe ka ọtụtụ n’ime ihe ndị a na-egosi na televishọn na-akụziri ndị mmadụ.—Aịsaịa 2:2-4; 1 Ndị Kọrint 13:4-8; Ndị Efesọs 4:32.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Televishọn Na Ụmụaka

“Dabere n’ihe nile a chọpụtara ná nnyocha ndị e mere n’ọtụtụ iri afọ ndị gara aga, ndị ọkà mmụta sayensị na ndị na-ahụ maka ahụ́ ike ji olu dara ụda na-ekwu na ụmụaka ikiri ihe ike na-etinye ha ná nsogbu.”—Ụlọ ọrụ bụ́ The Henry J. Kaiser Family Foundation.

“[Anyị kwenyere n’ihe] Òtù Na-ahụ Maka Ụmụaka n’America kwuru, nke bụ́ na ‘ụmụaka ndị dị site afọ abụọ gbadaa ekwesịghị [ikiri televishọn].’ Ahụ́ ụmụaka ndị a, bụ́ ndị ụbụrụ ha ka na-eto eto, chọrọ egwuregwu na iso ndị mmadụ na-emekọrịta ihe, ka ha wee nwee ike ịmụta otú e si emepụta ihe, otú e si arụ ọrụ ọkpụkpụ aka, na otú e si eso ndị ọzọ emekọ ihe.”—Ụlọ Ọrụ America nke Na-ahụ Maka Mgbasa Ozi na Ezinụlọ.

[Foto dị na peeji nke 6, 7]

Ihe m na-ekiri ọ̀ na-emetụta echiche m otú m chọrọ ka o siri na-emetụta ya?