Ọ̀ Dị Njọ Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya?
Ọ̀ Dị Njọ Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya?
“ONYE na-akwa emo ka mmanya vaịn bụ, onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya bụ; onye ọ bụla nke na-awagharị site na ya amaghị ihe.” Ihe a e dere na Bible n’Ilu 20:1, ọ̀ na-egosi na ịṅụ mmanya na-aba n’anya dị njọ? Ụfọdụ chere otú ahụ. Iji kwadokwuo echiche ha, ha na-ezo aka n’ebe ndị Bible kwuru ihe ọjọọ ndị si n’ịṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè pụta.—Jenesis 9:20-25.
E wezụga nke ahụ, e nwere ihe ndị jọgburu onwe ha na-esi n’ịṅụbiga mmanya ókè apụta—dị ka ọrịa imeju ndị Bekee na-akpọ cirrhosis, ihe ọghọm, ịda ogbenye, imegbu ndị ezinụlọ, na imerụ nwa a ka bu n’afọ ahụ́. Ikekwe n’ihi ihe ọjọọ ndị a na-esi n’ịṅụbiga mmanya ókè apụta, “ọtụtụ okpukpe na-akụzi na ịṅụ mmanya na-aba n’anya bụ omume ọjọọ,” ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru. Ma, ịṅụ mmanya na-aba n’anya ọ̀ bụ omume ọjọọ? Bible ọ̀ katọrọ ịṅụ mmanya na-aba n’anya?
Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
Bible na-adọ aka ná ntị banyere ihe ọjọọ ndị na-esi n’ịṅụbiga mmanya ókè apụta. Ndị Efesọs 5:18 na-adụ anyị ọdụ, sị: “Unu adịla na-aṅụ mmanya gabiga ókè, bụ́ nke ndụ ịla n’iyi dị na ya.” Ilu 23:20, 21 na-agbakwa anyị ume, sị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya vaịn ókè; n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè: n’ihi na onye na-aṅụbiga mmanya ókè na onye na-eribiga ihe ókè ka a ga-anapụ ihe nile.” Aịsaịa 5:11 na-ekwukwa, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ịgbaso ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya; ndị na-anọ ogologo mgbe n’anyasị, mmanya vaịn ewee mee ka ahụ́ nwuru ha ọkụ.”
Bible kwukwara banyere obi ụtọ na uru ndị na-esi n’ịṅụru mmanya n’ókè kwesịrị ekwesị apụta. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 104:15 na-ekwu na otu n’ime onyinye ndị Chineke nyere anyị bụ “mmanya . . . nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa.” Dịkwa ka Eklisiastis 9:7 si kwuo, ụgwọ ọrụ nke ezi ọrụ mmadụ rụrụ bụ ka onye ahụ “were ọṅụ rie nri [ya], werekwa obi dị mma ṅụọ mmanya vaịn [ya].” Pọl maara na mmanya nwere ike ịgwọ ọrịa, ọ bụ ya mere o ji gwa Timoti ka ọ ghara ịṅụ “mmiri ọzọ, kama [ka ọ] na-eji obere mmanya eme ihe maka afọ [ya] na ọrịa nke [ọ] na-arịakarị.” (1 Timoti 5:23) N’ime Bible, e kwuru banyere ikike mmanya na-aba n’anya nwere inyere anyị aka ịnagide ihe na-enye anyị nsogbu n’obi.—Ilu 31:6, 7.
O doro anya na Bible akatọghị ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Kama, ihe ọ katọrọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè na ịbụ onye aṅụrụma. N’ihi ya, Pọl gbara Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta, ndị ohu na-eje ozi, na ụmụ nwanyị merela agadi ume ka ha ghara ịdị “na-aṅụ oké mmanya,” ọ gbakwara Timoti ume ka ọ na-aṅụ nanị “obere mmanya.” (1 Timoti 3:2, 3, 8; Taịtọs 2:2, 3) A na-echetara Ndị Kraịst nile na “ndị aṅụrụma” agaghị “eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
Ọ dị mma ịmara na Bible na-ekwukarị banyere ịṅụbiga mmanya ókè na iribiga nri ókè dị ka ihe ya na ibe ya na-agakọ, ma kwuo na anyị kwesịrị izere ha abụọ. (Deuterọnọmi 21:20) Ọ bụrụ na Bible kwuru ka anyị ghara ịṅụ mmanya ma otu, nke ahụ ọ́ dịghị egosi na iri nri dịkwu njọ? Kama ịbụ otú ahụ, ihe Bible na-ekwu na ọ dị njọ bụ mmadụ ịṅụbiga mmanya ókè na iribiga nri ókè—ọ bụghị iri nri na ịṅụ mmanya ruo n’ókè kwesịrị ekwesị.
Gịnị Ka Jizọs Mere?
Pita onyeozi kwuru na Kraịst hapụụrụ anyị “ihe nlereanya ka [anyị] wee gbasochie nzọụkwụ ya anya. Ọ dịghị mmehie o mere.” (1 Pita 2:21, 22) Ya mere, olee otú Jizọs si lee mmanya na-aba n’anya anya? Ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ bụ ime ka mmiri ghọọ mmanya. Olee ụdị mmanya Jizọs mere ka mmiri ghọọ? “Onye nhazi oriri ahụ” jara nwoke ahụ na-alụ nwanyị mma maka mmanya a e mepụtara n’ụzọ ọrụ ebube. O kwuru, sị: “Onye ọ bụla ọzọ na-ebu ụzọ ebupụta mmanya dị mma, mgbe mmanya gbuwakwara ndị mmadụ, ọ na-ebupụta nke na-adịchaghị mma. I debewo mmanya dị mma ruo ugbu a.”—Jọn 2:9, 10.
Ịṅụ mmanya bụ otu n’ime ihe ndị a na-eme n’Ememe Ngabiga, Jizọs jikwa mmanya mee ihe mgbe ọ na-ehiwe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. O nyere ndị na-eso ụzọ ya otu iko mmanya ma gwa ha, sị: “Ṅụọnụ, unu nile.” Ebe ọ bụ na ọ maara na oge ọnwụ ya eruwela, o kwukwara, sị: “Malite ugbu a gaa n’ihu, agaghị m aṅụ ihe ọ bụla sitere ná mmanya vaịn ma ọlị ruo ụbọchị mgbe mụ na unu ga-aṅụ ya nke ọhụrụ n’alaeze Nna m.” (Matiu 26:27, 29) Ee, ndị mmadụ maara na Jizọs ṅụrụ mmanya.—Luk 7:34.
Gịnị Ka Anyị Kwesịrị Ime?
Ọ bụ eziokwu na Bible anaghị akatọ ịṅụ mmanya na-aba n’anya, nke ahụ apụtaghị na anyị ga-aṅụrịrị mmanya. E nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji zere ịṅụ mmanya. Dị ka ihe atụ, onye bụbu onye aṅụrụma maara ihe ize ndụ dị n’ịṅụ ọbụna otu iko mmanya. Nwanyị dị ime nwere ike izere ịṅụ mmanya iji hụ na o merụghị nwa nọ ya n’afọ ahụ́. Ebe ọ bụ na onye na-anya ụgbọala maara otú mmanya si eme ka mmadụ ghara ime ezi mkpebi na iche echiche nke ọma, o kwesịghị ime ihe ọ bụla ga-etinye ndụ ya na ndụ ndị ọzọ n’ihe ize ndụ.
Onye Kraịst ekwesịghị ịghọrọ onye ọ bụla akọnuche ya na-anabataghị ịṅụ mmanya ihe ịsụ ngọngọ. (Ndị Rom 14:21) Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ma ọ bụrụ na onye ahụ aghara ịṅụ mmanya mgbe ọ nọ n’ozi ọma. Ọ dị mma ịmara na n’Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel oge gboo, a machibidoro ndị nchụàjà ịṅụ “mmanya vaịn ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya” mgbe ha nọ n’ọrụ ha. (Levitikọs 10:9) Ọzọkwa, n’obodo ndị a machibidoro ịṅụ mmanya na-aba n’anya iwu, Onye Kraịst kwesịrị irube isi n’iwu ahụ.—Ndị Rom 13:1.
Ọ bụ eziokwu na ọ bụ mmadụ ka ọ dịịrị ikpebi ma ọ̀ ga-aṅụ mmanya ma ọ bụ na ọ gaghị aṅụ, ma ọ bụkwanụ ókè ọ ga-aṅụru, Bible na-agba anyị ume ịṅụru ya n’ókè kwesịrị ekwesị. Ọ na-ekwu, sị: “Ma unu na-eri ihe ma unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe nile iji nye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrint 10:31.
Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?
▪ Olee ịdọ aka ná ntị Akwụkwọ Nsọ nyere banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya?—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
▪ Jizọs Kraịst ọ̀ ṅụrụ mmanya na-aba n’anya?—Luk 7:34.
▪ Olee ụkpụrụ na-eduzi Ndị Kraịst ma a bịa n’ihe metụtara iri ihe na ịṅụ mmanya?—1 Ndị Kọrint 10:31.