Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Magburu Onwe Ya”

“Ọ Magburu Onwe Ya”

“Ọ Magburu Onwe Ya”

Nke ahụ bụ ihe otu di na nwunye bi na Georgia, U.S.A., dere banyere akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, bụ́ akwụkwọ nwere ihe osise ndị mara mma, nke dị peeji 224, nke e bipụtakwara n’afọ 2005. Ha kwuru, sị: “Ọ dị nnọọ mfe nghọta nke na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile ga-agụli ma ghọta ya. N’otu mgbe ahụkwa, o nwere nnukwu ihe ọmụma nke nwere ike igbo mkpa ime mmụọ nke ndị gụrụ oké akwụkwọ.”

Isiokwu ya adọrọkwala mmasị ndị mmadụ, dị nnọọ ka ihe atụ nke otu di na nwunye bi na New Jersey, U.S.A., na-egosi. Mgbe ha si n’otu mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova e nwere na Florida lọta, bụ́ ebe ha nọrọ nweta akwụkwọ ahụ, di na nwunye ahụ ji ụgbọelu gaa Bahamas maka ezumike. Ka ndị na-ahụ maka ndị si mba ofesi bata nọ na-enyocha ibu ha n’ọdụ ụgbọelu, otu n’ime ha hụrụ akwụkwọ ahụ, gụọ isiokwu ya, ma kwuo, sị, “Ọ dịla anya m ji chọwa inweta azịza nye ajụjụ ahụ.” Obi dị nnọọ onye ọrụ ahụ ụtọ mgbe di na nwunye ahụ bụ́ Ndịàmà nyere ya otu akwụkwọ ahụ.

N’echi ya, mgbe di na nwunye ahụ nọ na-agụ akwụkwọ ahụ n’ụsọ osimiri, otu nwanyị nke na-eresị ndị bịara njem mkpagharị ihe hụrụ ya. O kwuru na n’ụtụtụ ụbọchị ahụ, o kpekuru Chineke ekpere ka o nyere ya aka inweta azịza nye otu ajụjụ ahụ bụ́, Gịnị n’ezie ka Bible na-akụzi? Ọ jụrụ ma è nwere otú ọ ga-esi enweta akwụkwọ ahụ, obi ya bịakwara jupụta n’aṅụrị mgbe di na nwunye ahụ nyere ya otu.

Akwụkwọ a bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? dị ugbu a n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri anọ na ise, e bipụtakwala ihe karịrị nde 40 nke akwụkwọ a. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.