Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụbu M Nwa Mmefu

Abụbu M Nwa Mmefu

Abụbu M Nwa Mmefu

Dị ka Meros William Sunday si kọọ

A kụziiri m ịhụ Chineke n’anya site na mgbe m bụ nwata; ma, mgbe m gbara afọ 18, enupụụrụ m ndị mụrụ m isi ma gbapụ n’ụlọ. Ebiri m ndụ dị ka nwa mmefu ahụ dị n’ilu Jizọs ruo afọ 13. (Luk 15:11-24) Amalitere m ibu ọgwụ ike, ọ fọkwara obere ka m laa ndụ m n’iyi. Ka m kọọrọ gị ihe mere m ji malite ibi ndụ ọjọọ na otú m si kwụsị ya.

A MỤRỤ m n’afọ 1956. Ndị mụrụ m bụ Ndị Kraịst. Abụ m nwa nke abụọ n’ime ụmụaka itoolu. N’oge ahụ, anyị bi n’Ilesha (nke dị n’Osun Steeti ugbu a). Papa m na-ekpebu Katọlik, ma n’afọ 1945, nwanne papa ya nke nwoke nyere ya akwụkwọ bụ́ The Harp of God. * Mgbe papa m gụsịrị ya, ọ malitere ịchọ Ndịàmà Jehova. N’afọ 1946, e mere ya baptizim, e mekwara mama m baptizim obere oge mgbe nke ahụ gasịrị.

Aka m na-echeta otú m si jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe mgbe m ka dị obere, na otú m si eji ịnụ ọkụ n’obi eso ndị mụrụ m aga ozi ọma. Papa m duziiri m ọmụmụ Bible. Mgbe ụfọdụ, Alice Obarah, nke di ya bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ógbè anyị, na-amụkwara m ihe. Ndị mụrụ m chọrọ ka m bụrụ onye ozi oge nile. Ma, mama m kwuru ka m buru ụzọ gụọ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị.

Ozugbo m malitere akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ bụ eziokwu na adị m afọ 16, emetere m ụmụ akwụkwọ ibe m ndị na-adịghị eji ụkpụrụ Bible akpọrọ ihe enyi, bụ́kwanụ ihe amamihe na-adịghị na ya. Lee ụdị iberibe nke ahụ bụ! O teghị aka, mụ amalite ise siga na ime omume rụrụ arụ. Achọpụtara m na ụdị ndụ m na-ebizi ekwekọghị ná ntụziaka m nwetarala ná nzukọ Ndị Kraịst, n’ihi ya, akwụsịrị m ịga nzukọ Ndị Kraịst na ịga ozi ụlọ n’ụlọ. Nke a gbawara ndị mụrụ m obi, ma n’oge ahụ, anaghịzi m achọ ịma otú obi dị ndị ọzọ.

Ahapụ M Ụlọ

Mgbe m gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị ruo nanị afọ abụọ, esi m n’ụlọ anyị kwapụ ma sorozie ndị enyi m bi n’ógbè anyị biri. Mgbe ụfọdụ, ana m ezoro ezoro bata n’ụlọ anyị, were ihe oriri ọ bụla m hụrụ gbalaga. Nke a wutere papa m nke ukwuu nke na ọ kwụsịrị ịkwụrụ m ụgwọ akwụkwọ, na-eche na nke ahụ ga-eme ka m gbanwee.

Ma, n’oge ahụ, enwetara m ohere agụmakwụkwọ n’efu. Onye ahụ nyere m ohere agụmakwụkwọ n’efu na-esi Scotland ezitere m ụgwọ akwụkwọ m, mgbe ụfọdụkwa, ọ na-ezitere m onyinye, tinyere ego. Ka ọ dị mgbe ahụ, ụmụnne m ndị nwoke abụọ kwụsịrị iso Ndịàmà Jehova, ihe a nile butekwaara ndị mụrụ m obi mgbawa dị ukwuu. Ọtụtụ ugboro, mama m na-eji anya mmiri arịọ m arịrịọ. N’agbanyeghị na nke ahụ na-adị emetụ m n’obi, agbanweghị m omume m.

N’obodo Ukwu

Mgbe m gụsịrị akwụkwọ n’afọ 1977, agara m nweta ọrụ na Lagos. Obere oge m nwetasịrị ọrụ ahụ, enwetara m ego n’ụzọ megidere iwu ma zụta ụgbọala e ji agba tagzi. Ugbu a ego batakwuru m aka, amalitere m ịṅụ ọgwụ ike na ịga n’ụlọ ndị akwụna nakwa n’ụlọ oriri na nkwari n’oge abalị. N’oge na-adịghị anya, ike ibi na Lagos gwụrụ m, akwagakwara m London n’afọ 1981. Esikwa m ebe ahụ kwaga Belgium, bụ́ ebe m nọrọ mụọ asụsụ French ma nweta ọrụ m na-arụ awa ole na ole n’ụbọchị n’ebe a na-ere nri. Ma, ana m eji ihe ka ukwuu n’oge m atụpụ ụgbọala na ngwá electronic ndị a na-ebuga Nigeria.

Papa m degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Belgium akwụkwọ ma rịọ ha ka ha gakwuru m ma gbaa mbọ hụ na ha duziiri m ọmụmụ Bible. Ma, mgbe ọ bụla Ndịàmà bịara n’ụlọ m, anaghị m ekwe ege ha ntị. Amalitere m ịga otu chọọchị ọ na-abụ a gbasaa, e riwe nri, ṅụwa mmanya, ma gwuriwe ụdị egwuregwu dị iche iche.

Ndụ M Dị Ka Onye Na-ebu Ọgwụ Ike

N’afọ 1982, atụbatara m otu obere ụgbọala dị oké ọnụ na Nigeria ma lọta Nigeria iji gbapụta ya n’onwe m. Ndị na-ahụ maka ngwa ahịa ndị e si ná mba ofesi tụbata Nigeria bịara chọpụta na akwụkwọ m ji bịa ịgbapụta ụgbọala ahụ abụghị nke ezigbo ya, n’ihi ya, ha jichiri m ruo ihe dị ka ụbọchị 40. Papa m gbapụtara m. Ebe ọ bụ na ọ dị m mkpa inweta ego iji mechie okwu ahụ, ebuuru m ngwá ahịa ụfọdụ, tinyere akpa wii wii, laghachi Belgium. Mgbe e mechịsịrị okwu ahụ, abịara m buwezie ọgwụ ike.

N’otu oge m bu ọgwụ ike gaa ire, e jidere m na Netherlands. Ndị na-ahụ maka ndị si mba ofesi bịa ná mba ahụ gbaara m ụgbọ nwa mkpi, ma tinye m n’ụgbọelu na-aga Nigeria. Ka m nọ na-ala, ahụrụ m ndị ọzọ na-ebu ọgwụ ike, anyị gbakọkwara aka buwezie ya. Na January 1984, akwagara m ná mba ọzọ nke dị n’Africa. Ebe m ma asụ French, nke bụ́ asụsụ a na-asụ ebe ahụ, o weghị m oge imete ndị uwe ojii, ndị agha, na ndị na-ahụ maka ndị si mba ofesi bịa, enyi. N’ihi ya, anyị bịara nwee ike ịtụbata ọtụtụ akpa wii wii ná mba ahụ.

Ejide M Ma Tụọ M Mkpọrọ

Ka e mesịrị, adabara m ná nsogbu ọzọ. Emere m ndokwa ka otu onyeisi ndị agha nyere m aka hụ na ngwa ahịa m gafere n’ọdụ ụgbọelu dị ná mba ahụ. Ma, onyeisi ndị agha ahụ abịaghị n’oge, n’ihi ya, e jidere m. Ndị uwe ojii kụgidere m ihe ruo n’ókè nke na m tụbọrọ. Ha kpọgara m ụlọ ọgwụ ma hapụ m ebe ahụ, na-atụ anya na m ga-anwụ. Ma, anwụghị m, e mesịkwara kpụpụ m n’ụlọikpe, maa m ikpe, ma tụọ m mkpọrọ.

Mgbe m na-esila mkpọrọ apụta, otu enyi m nke m rịọrọ ka o lekọtara m ụlọ m, ereela ngwongwo m nile, mie ala. Iji kpata ihe m ga-eri, amalitekwara m ire wii wii ozugbo ahụ. Ma, mgbe ụbọchị iri gasịrị, e jideghachiri m ma tụọ m mkpọrọ ọnwa atọ. N’oge a tọhapụrụ m, ọrịa ji m nnọọ aka ọjọọ nke na ọ fọghachikwara obere ka m nwụọ. Apụghị m ikwu kpọmkwem otú m si nwee ike ịlọghachi Lagos.

Amaliteghachi M “Achụmnta Ego” M

Na Lagos, ezutere m ụfọdụ ndị mụ na ha so ebu ọgwụ ike, anyị gakwara India, bụ́ ebe anyị zụtara anwụrụ ike ọnụ ahịa ya dị ihe dị ka narị puku dọla isii. Anyị si Bombay (nke bụ́zi Mumbai) gaa Switzerland, si ebe ahụ gaa Portugal, mesịakwa si Portugal gaa Spen. Onye ọ bụla n’ime anyị nwetara nnukwu uru ego na ya, anyị sikwa ụzọ dịgasị iche lọghachi Lagos. Ná ngwụsị afọ 1984, agara m ree ọgwụ ike ọzọ. Ọchịchọ m bụ ịkpata ihe ruru otu nde dọla ma gaa birizie na United States.

N’afọ 1986, achịkọtara m ego nile m nwere ma jiri ya zụọ anwụrụ ike a na-agwaghị agwa na Lagos. Ebuuru m ya gaa mba ọzọ, ma, ọ bara n’aka otu onye anyaukwu na-ebu ọgwụ ike, onye ahụ akwụghịkwa m kobo maka ya. N’ihi ụjọ m na-atụ na ọ ga-egbu m, alọghachiri m Lagos n’agwaghị onye ọ bụla ihe merenụ. Ego m nile funahụrụ m, nke a kpatakwaara m obi mgbawa. Na nke mbụ ya, anọdụrụ m ala ma chebara ndụ m echiche. Ajụrụ m onwe m, sị, ‘Gịnị mere na ọ dịghị ihe m tinyere aka na ya na-aga aga?’

Alaghachikwuru M Chineke

Otu abalị n’oge na-adịghị anya ihe a mesịrị, ekpekuru m Jehova ekpere ka o nyere m aka. N’ụtụtụ echi ya, otu agadi nwoke na nwunye ya kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ụlọ m. Ha bụ Ndịàmà Jehova. Eji m nnọọ nwayọọ gee ha ntị ma nata ha otu magazin. Agwara m ha, sị, “Ndị mụrụ m bụ Ndịàmà Jehova. Alice Obarah na-eduziburu m ọmụmụ Bible.”

Agadi nwoke ahụ, nke aha ya bụ P. K. Ogbanefe, zara m, sị: “Anyị ma Nwanna Obarah na nwunye ya nke ọma. Ha na-ejezi ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Lagos.” Ha gbara m ume ịga hụ ha. Mgbe m gara hụ ha, Nwanna Obarah na nwunye ya gbara m ume nke ukwuu. Mgbe nke ahụ gasịrị, Nwanna Ogbanefe malitere iduziri m ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghị anya, amalitekwara m ịkwụsị ndụ rụrụ arụ m na-ebi. Nke a adịghịrị m mfe n’ihi na o siiri m ike ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ike, ebe ọ bụ na o teela aka m ṅụwara ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ekpebisiri m ike ịhụ na m malitere biwe ndụ dị ọcha.

Ma, enwetara m ọtụtụ ọnwụnwa! Ndị sị na ha bụ ndị enyi m na-abịa n’ụlọ m ma na-ekwe m nkwa ndị nwere ike ime ka m daghachi azụ. O nwedịrị oge m maliteghachiri ise siga na ibi ndụ rụrụ arụ. Abịara m jiri obi m nile kpekuo Chineke ekpere. N’oge na-adịghị anya, aghọtara m na ebe ndị enyi m bụ́ ndị ụwa duhierela m, ha apụghị inyere m aka ugbu a. Achọpụtara m na, ka m wee nwee ike ịmalite jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe, aghaghị m isi Lagos pụọ. Ma ihere na-eme m ịlaghachi n’ụlọ anyị dị n’Ilesha. Ma, n’ikpeazụ, edegaara m papa m na nwanne m nwoke nke tọrọ m akwụkwọ ma jụọ ha ma hà ga-ekwe ka m lọta ụlọ.

Papa m mesiri m obi ike na nsogbu adịghị, na m nweere onwe m ịlọta, nwanne m nwoke ahụ gwakwara m na ya ga-achọrọ m ego. Ya mere, afọ iri m hapụsịrị ndị mụrụ m, alọghachiri m n’ụlọ anyị. Ha nabatara m nke ọma. Mama m ji olu dara ụda kwuo, sị, “Jehova, ekele dịrị gị!” Mgbe papa m lọtara n’uhuruchi ahụ, o kwuru, sị, “Jehova ga-enyere gị aka.” A kpọkọtara onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anyị, papa m ekpekuo Jehova ekpere, ma rịọ Ya ka O nyere m aka ugbu a m lọghachiri ime uche Ya.

Amalite M Ime Ihe Ndị M Kwesịrịla Imewe Kemgbe

Amaliteghachiri m ọmụmụ Bible m ma nwee ọganihu ngwa ngwa; e mere m baptizim n’April 24, 1988. Ozugbo ahụ, abịara m jiri ozi ọma kpọrọ ihe. Na November 1, 1989, amalitere m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ—ya bụ, onye na-ezisa ozi ọma oge nile. N’afọ 1995, a kpọrọ m iso na klas nke iri nke Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na Nigeria. E mesịa, na July 1998, e mere m onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ịga na-eleta ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova. Otu afọ mgbe e mesịrị m onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, Chineke ji Ruth nwunye m gọzie m, nke bụ́ onye mụ na ya so aga eleta ọgbakọ.

Ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ anyị enwewokwa ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. Otu n’ime ụmụnne m, nke kwụsịkwara ife Jehova, maliteghachiri ife ya, e meekwa ya baptizim. Obi dị m ụtọ na papa m nọ ndụ anyị alọghachi. O ji obi ụtọ jegide ozi dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1993, bụ́ mgbe ọ dị afọ 75. Mama m ka nọgidere jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi n’Ilesha.

Agara m mba 16 na Europe, Eshia, nakwa n’Africa, ka m na-achụ akụnụba. N’ihi ya, eji m ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe m aghara aghara. (1 Timoti 6:9, 10) Ọ na-abụ m cheta oge ahụ, ya ana-ewute m na alara m ihe ka ukwuu n’oge okorobịa m n’iyi n’ịṅụ ọgwụ ike nakwa n’ime omume rụrụ arụ. Obi mgbawa m kpataara Jehova Chineke na ezinụlọ m na-ewute m. Ma, ana m ekele Chineke na adịgidere m ndụ ruo mgbe anya doro m. Mkpebi m bụ ịnọgide na-erubere Jehova isi ma na-ejere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 4 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.

[Foto dị na peeji nke 29]

Mgbe m bụ nwa nnupụisi dị afọ iri na ụma

[Foto dị na peeji nke 31]

Ụbọchị e mere m baptizim

[Foto dị na peeji nke 31]

Mụ na Ruth nwunye m