Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ọrịa Na-agaghịzi Adị!

Mgbe Ọrịa Na-agaghịzi Adị!

Mgbe Ọrịa Na-agaghịzi Adị!

ỌTỤTỤ mmadụ nwere olileanya na ha ga-enwere onwe ha pụọ n’ihe mgbu na ọrịa ma ha nwụọ gaa eluigwe. Ma, n’ụzọ dị iche n’ihe a ọtụtụ mmadụ kweere, olileanya Bible na-enye ụmụ mmadụ n’ezie bụ olileanya nke ịdị ndụ n’ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs. (Abụ Ọma 37:11; 115:16) N’ụwa ọhụrụ a e kwere nkwa ya, ahụ́ ga-adị ụmụ mmadụ mma n’ụzọ zuru okè, ha ga na-enwe obi ụtọ, ha ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Gịnị mere anyị ji arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ? Oleekwa otú ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya ga-esi bịa? Bible zara ajụjụ ndị ahụ.

Ihe mere ụmụ mmadụ ji arịa ọrịa Mgbe e kere nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, ha zuru nnọọ okè, ha anaghịkwa arịa ọrịa. (Jenesis 1:31; Deuterọnọmi 32:4) E kere ha ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ọ bụ nanị mgbe ha kpachapụrụ anya nupụrụ Chineke isi ka ha malitere ịrịa ọrịa. (Jenesis 3:17-19) N’ihi ọjụjụ ha jụrụ ido onwe ha n’okpuru Chineke, ha mere ka ha na Onye Okike, bụ́ Isi Iyi nke ndụ zuru okè, gharazie ịdị ná mma. Ha bịara nwee ntụpọ. N’ihi ya, ha malitere rịawa ọrịa ma nwụọ, dị nnọọ ka Chineke dọrọ ha aka ná ntị.—Jenesis 2:16, 17; 5:5.

Mgbe Adam na Iv nupụsịrị isi, nanị ihe ha pụrụ ikenye ụmụ ha bụ ezughị okè. (Ndị Rom 5:12) Dị ka e kwuru n’isiokwu bú nke a ụzọ, ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a ghọtara na e nwere ihe na-adịghị mma anyị ketara eketa nke so akpata ọrịa na ọnwụ. Mgbe otu ìgwè ndị ọkà mmụta sayensị mesịrị nnyocha ruo ogologo oge, ha kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Ọ bụ ihe dị mmadụ n’ọbara, nke ọ na-apụghị ịgbata n’ọsọ, na ozugbo a tụụrụ ime mmadụ, ahụ́ onye ahụ ga-akụnyerịrị mkpụrụ nke ga-emesị gbuo ya.”

Ọ gaghị esi ná mgbalị ụmụ mmadụ na-eme Ndị ọkà mmụta sayensị na-enwe ọganihu dị ukwuu n’ọgụ ha na-alụso ọrịa. Ma, o siiri ha nnọọ ike ịghọtacha ihe mere anyị ji arịa ọrịa. Nke a adịghị atụ ndị mmụta Bible n’anya, n’ihi na ha maara okwu a sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, nke bụ́: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.”—Abụ Ọma 146:3.

Ma, dị ka Bible kwuru, “ihe ndị na-ekweghị omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ na-ekwe omume n’ebe Chineke nọ.” (Luk 18:27) Jehova Chineke pụrụ ime ka ihe ahụ na-akpata ọrịa kwụsị ịkpata ya. Ọ ga-agwọ anyị ọrịa anyị nile. (Abụ Ọma 103:3) Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee kwere nkwa, sị: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Ihe i kwesịrị ime Jizọs Kraịst kwuru hoo haa ihe anyị na-aghaghị ime iji kporie ndụ n’ọdịnihu n’ime ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya. O kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ihe ọmụma banyere Chineke na ihe Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, kụziri dị n’ime Bible. Ihe ọmụma dị otú ahụ na-agụnye ezigbo ndụmọdụ ndị pụrụ ime ka ndụ gị ka mma ugbu a. Nke ka nke ahụ bụ na Chineke kwere ndị ji nrubeisi na-efe ya ofufe nkwa maka ụwa nke ihe mgbu na-agaghị adị na ya. Ee, Chineke na-ekwe nkwa ime ka i biri n’ụwa nke onye bi na ya na-agaghị asị, “Ana m arịa ọrịa”!—Aịsaịa 33:24.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 11]

Ile Ahụ́ Ike Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Bible na-agba ume ka a na-akwanyere ndụ ùgwù. Ndịàmà Jehova na-egosipụta nkwanye ùgwù dị otú ahụ site n’ịgbalịsi ike na-elebara ahụ́ ha anya. Ha na-ezere omume ndị dị ize ndụ, dị ka ịṅụ ọgwụ ike na ise ụtaba. Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya ofufe ghara ịdị na-aṅụbiga mmanya ókè na ịdị na-eribiga nri ókè. (Ilu 23:20; Taịtọs 2:2, 3) Izere ihe ndị dị otú ahụ, tinyere ịdị na-ezu ike nke ọma na ịdị na-emega ahụ́, nwere ọtụtụ ọrịa ndị ha pụrụ ime ka ị ghara ịrịa ngwa ngwa ma ọ bụ mee ka ị ghara ịrịadị ha arịa. Ọ pụrụ ịdị ndị ọrịa mkpa ịgakwuru dọkịta ma nke a na-akọ, nke ha tụkwasịrị obi.

Bible na-agba anyị ume inwe ezi uche na “uche zuru okè.” (Taịtọs 2:12; Ndị Filipaị 4:5) Ọtụtụ ndị taa adịghị emeru ihe n’ókè, ha na-ekwe ka otú ha ga-esi gwọọ ọrịa ha chugide ha ụra ruo ọbụna n’ókè nke imebi mmekọrịta ha na Chineke. Ụfọdụ na-anakwere ụdị ọgwụgwọ a na-enyo enyo bụ́ nke pụrụ ibutere ha nsogbu. Ndị ọzọ na-ala ego na oge n’iyi ka ha na-anara ụdị ọgwụgwọ ndị na-adịghị eme ka ha gbakee ma ọ bụ ọbụna ndị nke na-ebutere ha nsogbu.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ gabeghị ekwe omume inweta ahụ́ ike zuru okè. Ka ị na-echere ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya, amamihe na ezi uche ndị dị na Bible pụrụ inyere gị aka ịnọgide na-ele ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ka ị na-achọ inweta ezi ahụ́ ike.