Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Hà Ga-agwọtali Ọrịa Nile Dị n’Ụwa?

Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Hà Ga-agwọtali Ọrịa Nile Dị n’Ụwa?

Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Hà Ga-agwọtali Ọrịa Nile Dị n’Ụwa?

NDỊ ọkà mmụta sayensị nke oge a hà ga-agwọtali ọrịa nile dị n’ụwa? Amụma ndị ahụ e buru na Bible n’akwụkwọ Aịsaịa nakwa ná Mkpughe, hà na-ekwu banyere oge ụmụ mmadụ n’onwe ha ga-eme ka ọrịa gharazie ịdị n’ụwa? Ụfọdụ ndị na-ele ya anya dị ka ihe ụmụ mmadụ ga-emeli n’ihi nnukwu ọganihu e nwerela n’ịgwọ ọrịa.

Gọọmenti na ụlọ ọrụ ndị bụ́ omepụrụ onye ọ dịịrị, sozi Òtù Mba Ụwa arụkọ ọrụ ná mbọ a na-agbatụbeghị ụdị ya iji hụ na e kpochapụrụ ọrịa n’ụwa. Otu mbọ a na-agba bụ ịhụ na a gbara ụmụaka ndị bi ná mba ndị ka na-emepe emepe ọgwụ mgbochi ọrịa. Dị ka Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ụmụaka si kwuo, ọ bụrụ na mba ọ bụla emezuo ihe ndị a tụrụ anya n’aka ha, “tupu afọ 2015, a ga-enwe ike ịgba ihe karịrị iri nde ụmụaka asaa bi ná mba ndị kasị daa ogbenye n’ụwa otu ọgwụ mgbochi ọrịa kwa afọ maka ọrịa ndị a: ụkwara nta, ọrịa diphtheria, ọrịa tetanus, ụkwara tịkọ tịkọ, ákpàtà, ọrịa rubella, ịba anya odo, ahụ́ ọkụ ndị ọjọọ ya, ịba ọcha n’anya ụdị nke B, ọrịa polio, afọ ọsịsa, oyi ịba n’ahụ́, mgbakwo olu, na etuto ụbụrụ a na-arịakarị na Japan.” A na-agbakwa mbọ ịkụziri ndị mmadụ ụzọ bụ́ isi ha ga-esi na-ezere ibute ọrịa ma na-enyere ha aka ịgbaso ụzọ ahụ, dị ka site n’ịhụ na ha ji mmiri dị ọcha eme ihe ma na-eri nri ndị na-edozi ahụ́, nakwa site n’ịhụ na ha na-edebe onwe ha ọcha.

Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta sayensị na-agbasi mbọ ike ịhụ na ndị mmadụ nwetara ihe karịrị nnọọ ihe ndị bụ́ isi ma a bịa n’ihe metụtara ahụ́ ike. Nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ emewela ka ụzọ ndị e si agwọ ọrịa na-agbanwe. E kwuola na n’ime ihe dị ka afọ asatọ ọ bụla, ihe ndị ọkà mmụta sayensị na-amụta ma abịa n’ịgwọ ọrịa na-amụba okpukpu abụọ. Ihe ndị na-esonụ bụ nanị ụfọdụ n’ime ọganihu ndị ọkà mmụta sayensị nwere ugbu a n’ihe banyere ịgwọ ọrịa nakwa ihe ndị ha na-atụ anya ime.

Ise X-ray Ruo ihe karịrị afọ 30 ugbu a, ndị dọkịta na ụlọ ọgwụ dị iche iche ji ọkpọka ígwè ọrụ nwere kọmputa nke ndị Bekee na-akpọ CT scanner, ele ahụ́. A na-eji ígwè ọrụ a ese ime ahụ́ mmadụ X-ray, ọ na-esetekwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ime ahụ́ mmadụ. Foto X-ray ndị e ji ígwè ọrụ a see na-enye aka n’ịchọpụta ọrịa nakwa n’ịhụ ebe ndị e nwere nsogbu n’ime ahụ́.

N’agbanyeghị na a na-arụrịta ụka banyere ihe ize ndụ dị n’ọkụ X-ray ịchakwasị mmadụ n’ahụ́, ndị dọkịta nwere olileanya na ígwè ọrụ a ga-aba nnukwu uru n’ịchọpụta ọrịa n’ọdịnihu. Michael Vannier, bụ́ prọfesọ n’ihe banyere ise X-ray n’ụlọ ọgwụ bụ́ University of Chicago Hospital, kwuru, sị: “Ọganihu e nwerela nanị n’ime afọ ole na ole gara aga ezuola ime ka isi buo mmadụ.”

Ígwè ọrụ CT scanner ndị a na-arụpụta ugbu a na-ese X-ray ngwa ngwa karịa ndị nke mbụ, na-esete ya nke ọma karịa ha, dịkwa ọnụ ala karịa ha. Otu uru dị ịrịba ama ndị nke ọgbara ọhụrụ a bara bụ na ọ natụghị ewe ha oge iji see X-ray. Otú ahụ ka ọ dị karịsịa mgbe a na-esete ime obi. Ebe ọ bụ na obi na-akụ akụ mgbe nile, ọtụtụ foto X-ray ya adịbughị agbachapụ agbachapụ, nke a na-emekwa ka o sie ike iji ya chọpụta nsogbu onye ahụ nwere. Dị ka magazin bụ́ New Scientist si kọwaa, ọ na-ewe ígwè ọrụ CT scanner ndị nke a na-arụpụta ugbu a ‘ihe na-erutụghị otu sekọnd iji setechaa ime ahụ́ mmadụ, nke pụtara na tupu obi ana-akụ, o seela ya,’ nke a na-emekwa ka foto ọ na-ese na-agbachapụ nnọọ agbachapụ.

N’ihi ígwè ọrụ CT scanner ndị nke ọhụrụ a, ihe ndị dọkịta pụrụ ịchọpụta abụghịzi nanị otú ime ahụ́ dị, kamakwa, ha pụziri ịchọpụta otú akụkụ ahụ́ ụfọdụ kpọmkwem si arụ ọrụ. Nke a pụrụ ime ka o kwe omume ịchọpụta ọrịa cancer mgbe ọ ka na-amalite amalite.

Iji ígwè robot awa ahụ́ Ígwè robot ndị bụ́ ọkpọka abụghịzi ihe ndị ọkà mmụta sayensị na-arọ ná nrọ—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, n’ihe banyere ịgwọ ọrịa. Ka ọ dị ugbu a, e jirila ígwè robot waa ọtụtụ puku mmadụ ahụ́. N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị dọkịta na-eji ihe ndị Bekee na-akpọ remote-control eduzi aka robot ndị ahụ. N’aka robot ndị ahụ, a na-enwe mma e ji awa ahụ́, mkpà, kamera, ụdị mma ndị Bekee na-akpọ cautery, na ihe ndị ọzọ e ji awa ahụ́. Ígwè robot ndị a na-eme ka ndị dọkịta nwee ike ịwa onye na-arịa ọrịa dị ize ndụ ahụ́ kpọmkwem otú ha kwesịrị isi waa ya. Magazin bụ́ Newsweek na-akọ na “dọkịta ndị nke jirila ígwè ọrụ a waa ndị mmadụ ahụ́ chọpụtara na ọbara nke na-agba ndị e ji ya waa ahụ́ na ahụ́ mgbu ha na-enwe adịghị aharu ka nke ndị e ji aka nkịtị waa ahụ́, ha adịchaghị enwe nsogbu, ha adịchaghịkwa anọte aka n’ụlọ ọgwụ, ha na-agbakekwa ngwa ngwa karịa ndị e ji aka nkịtị waa ahụ́.

Iji ígwè robot a ga-eji nanị onyokomita na-ahụ agwọ ọrịa Ndị na-ahụ maka ụdị nkà na ụzụ a kweere na n’isi nso, ndị ọkà mmụta sayensị ga-emepụta robot ndị pere nnọọ mpe a ga-eji nanị onyokomita na-ahụ ma jiri ha na-agwọ ọrịa. Ụmụ obere robot ndị a ga na-ebu kọmputa ndị a ga-eji nanị onyokomita ahụ banye kpọmkwem n’ebe ndị a chọrọ ka ha gwọọ ọrịa n’ime ahụ́ mmadụ ma mee kpọmkwem ihe a gwara ha mee. Ọ bụ ihe dị ịtụnanya na a gaghị na-eji anya nkịtị ahụ ígwè ọrụ a dị mgbagwoju anya ma a rụchaa ya.

Ebe ọ bụ na ha pere nnọọ mpe, a na-atụ anya na otu ụbọchị, ígwè ọrụ ndị a ga-enwe ike ịgagharị n’akwara ndị pere mpe ma buru ikuku ndụ ndị Bekee na-akpọ oxygen banye n’akụkụ ahụ́ ndị ọbara na-adịchaghị eru na ha, wepụ ihe ndị kpọchiri akwara ọbara na ihe ndị kpọchiri akwara ụbụrụ, ọbụnakwa chọta ma gbuo nje virus, nje bacteria, na nje ndị ọzọ na-akpatara mmadụ ọrịa. Ígwè ọrụ ndị a nwekwara ike buru ọgwụ gaa kpọmkwem ná mkpụrụ ndụ ndị a chọrọ ka ọgwụ ahụ rụọ ọrụ na ha.

Ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ọ ga-adịkwu mfe ịchọpụta ọrịa cancer ma a rụpụta ígwè robot a. Dr. Samuel Wickline, bụ́ prọfesọ n’ihe banyere ọgwụ na ahụ́ ike, kwuru, sị: “Ọ ga-abụ nnọọ ihe kwere omume ịchọpụta ọrịa cancer ndị ka na-apụta apụta ma jiri ọgwụ ndị dị ike gwọọ ha nanị n’ebe akpụ cancer ahụ toro, ma n’otu mgbe ahụ, mee ka nsogbu onye ọrịa ahụ ga-enwe belata.”

Ọ bụ eziokwu na ihe a nile nwere ike ịdị na-ada gị ka nrọ efu, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-atụsi anya ike na otu ụbọchị, ha ga-amalite iji ígwè ọrụ a gwọwa ọrịa. Ndị na-ahụ maka imepụta ígwè ọrụ a na-atụ anya na n’ime afọ iri na-abịanụ, a ga-eji ya na-agwọ ma na-ahazigharị mkpụrụ ndụ. Otu n’ime ha kwuru, sị: “A malite iji ígwè ọrụ a gwọwa ọrịa, ọ ga-eme ka e kpochapụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrịa nile ọtụtụ mmadụ rịara site n’afọ 1900 ruo 2000, kpochapụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe mgbu na ahụhụ nile ọrịa na-akpata, ma mee ka ụmụ mmadụ nwekwuo ikike imepụta ihe.” Ọbụna ka ọ dị ugbu a, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-akọ na ha enweela ezigbo ihe ịga nke ọma n’iji ígwè ọrụ a agwọ ụmụ anụmanụ ndị e ji na-anwale otú ígwè ọrụ a ga-esi arụ ọrụ.

Inyocha akụkụ ahụ́ nke na-egosi ihe mmadụ bu pụta ụwa Mkpụrụ ndụ ọ bụla dị mmadụ n’ahụ́ nwere ọtụtụ ihe ndị dị mkpa nke na-eme ka ndụ dịgide. Otu n’ime ha bụ otu ihe nke na-egosi ihe mmadụ bu pụta ụwa. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ya ihe dị ka puku iri atọ na ise. Ọ bụ ya na-ekpebi otú agịrị isi anyị ga na-acha, ya na-ekpebikwa ma ànyị ga-adị ọcha ma ọ bụ oji, ya na-ekpebi otú anya anyị ga na-acha, otú anyị ga-etoru n’ogologo, na ihe ndị ọzọ metụtara ọdịdị ahụ́ anyị. Ọ na-esokwa nnọọ ekpebi otú akụkụ ahụ́ ndị dị n’ime ahụ́ anyị ga-esiru n’ike.

Mgbe ihe ndị a na-egosi ihe mmadụ bu pụta ụwa mebiri, anyị pụrụ ịda ọrịa. N’ezie, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị kweere na ọrịa nile anyị na-arịa bụ n’ihi mmebi nke ihe ndị a na-egosi ihe anyị bu pụta ụwa mebiri. Anyị ketara ụfọdụ n’ime ndị nke ahụ mebiri emebi site n’ọmụmụ. Ihe mebiri ndị nke ọzọ bụ ihe ndị dị ize ndụ na-abanye anyị n’ahụ́.

Ndị ọkà mmụta sayensị na-atụ anya na n’isi nso, ha ga-enwe ike ịchọpụta kpọmkwem ndị nke ọ bụ ha na-eme ka anyị na-arịa ọrịa. Nke a ga-eme ka ndị dọkịta nwee ike ịghọta, dị ka ihe atụ, ihe mere ụfọdụ ji arịa ọrịa cancer karịa ndị ọzọ ma ọ bụ ihe mere otu ụdị ọrịa cancer ji akpa ike n’ahụ́ ụfọdụ ndị karịa ka o si akpa n’ahụ́ ndị ọzọ. Ọ ga-emekwa ka a mata ihe mere otu ọgwụ ji arụ ọrụ n’ahụ́ ụfọdụ ndị ọrịa ma ọ dịghị arụ n’ahụ́ ndị ọzọ.

Ọ bụrụ na a mata ihe ndị a, ọ ga-eme ka e nwee ike ịgwọ mmadụ dabere kpọmkwem n’ọnọdụ ahụ́ onye ahụ. Olee otú nke a pụrụ isi baara gị uru? Ihe ọ pụtara bụ na ndị dọkịta pụrụ ịchọpụta otú ahụ́ gị dị ma nye gị ọgwụ ndị kwekọrọ kpọmkwem n’ihe ahụ́ nke gị chọrọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nyochaa ihe a na-egosi ihe i bu pụta ụwa ma chọpụta na i nwere ike ịrịa ụdị ọrịa ụfọdụ, ndị dọkịta pụrụ ịchọpụta ọrịa ahụ ogologo oge tupu ọrịa ahụ apụtawadị. Ndị na-akwado nkà na ụzụ a na-ekwu na ọ bụrụgodị na ọrịa ahụ apụtabeghị, e nye onye ahụ ọgwụ kwesịrị ekwesị, ya ana-eri nri kwesịrị ekwesị, ma mee mgbanwe ụfọdụ n’akparamàgwà ya, na ọ pụdịrị ime ka onye ahụ ghara ịrịa ọrịa ahụ chaa chaa.

Ndị dọkịta pụkwara isi n’ihe a na-egosi ihe i bu pụta ụwa mara ma ụdị ọgwụ ụfọdụ ọ̀ ga-enye gị nsogbu n’ahụ́. Nke a pụrụ ime ka ndị dọkịta nwee ike inye gị kpọmkwem ụdị ọgwụ ahụ́ gị chọrọ ma gwa gị kpọmkwem otú ị ga-esi ṅụọ ya ka o wee rụọ ọrụ n’ahụ́ gị. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Boston Globe na-akọ, sị: “Tupu a na-eru afọ 2020, [inye ọgwụgwọ dabere kpọmkwem n’ihe ahụ́ mmadụ chọrọ] ga na-ehi ụdụ karịa ka onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịtụ anya ya taa. A ga-adabere n’ihe ahụ́ onye ọrịa ọ bụla chọrọ wee mepụta ọgwụ ọhụrụ ndị a ga-eji na-agwọ ọrịa shuga, ọrịa obi, ọrịa Alzheimer, isi ezughị okè, na ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ na-emebiri ọhaneze ihe.”

Ihe a nile anyị kwurula banyere ha bụ nanị ụfọdụ n’ime ihe ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwe nkwa na ha ga-eme n’ọdịnihu. A nọgidewo na-amụta ọtụtụ ihe banyere ọgwụ na ahụ́ ike n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị ụdị ya. Ma, ndị ọkà mmụta sayensị adịghị atụ anya ikpochapụ ọrịa kpamkpam n’isi nso. E nwere ọtụtụ ihe mgbochi ndị ọ ka yiri ka ha agaghị agafeli.

Ihe Mgbochi Ndị O Yiri Ka A Gaghị Agafeli

Akparamàgwà ụmụ mmadụ pụrụ isela aka elekere azụ ná mbọ a na-agba ịhụ na e kpochapụrụ ọrịa. Dị ka ihe atụ, ndị ọkà mmụta sayensị kweere na ụfọdụ osisi na ụmụ anụmanụ ndị mmadụ gburula n’oké ọhịa emeela ka e nwee ọrịa ndị ọhụrụ dị ize ndụ. N’ajụjụ ọnụ ndị na-ede magazin bụ́ Newsweek gbara Mary Pearl, bụ́ onyeisi oche nke Òtù Na-ahụ Maka Anụmanụ Ndị Bi n’Ọhịa, ọ kọwara, sị: “Kemgbe ihe dị ka afọ 1975, ihe karịrị ọrịa 30 ndị ọhụrụ apụtala, ụfọdụ n’ime ha bụ ọrịa AIDS, ụdị ahụ́ ọkụ a na-akpọ Ebola, ọrịa Lyme, na ọrịa SARS. E kweere na ọ bụ n’ahụ́ ụmụ anụmanụ bi n’ọhịa ka ihe ka ọtụtụ n’ọrịa ndị a si fere ụmụ mmadụ.”

Tụkwasị na nke ahụ, ụmụ mmadụ na-erikarịzi nri shuga, nnu, na abụba juru na ha ma kwụsịlatazie ịra mkpụrụ osisi na iri akwụkwọ nri. Ihe ndị a nakwa nkwụsị ndị mmadụ kwụsịlatara imega ahụ́, tinyere àgwà ndị ọzọ na-adịghị mma ha na-akpa, emeela ka ọtụtụ mmadụ na-arịazi ọrịa obi. Imirikiti mmadụ na-ese ụtaba, nke a na-akpatakwara ọtụtụ nde mmadụ ọrịa na ọnwụ n’ụwa nile. Kwa afọ, ihe dị ka nde mmadụ iri abụọ na-emerụ ahụ́ ma ọ bụ na-anwụ n’ihi ihe mberede okporo ụzọ. Agha na ụdị ihe ike ndị ọzọ na-egbu ma na-akwarụ imirikiti ndị ọzọ. Ọtụtụ nde mmadụ na-arịa ọrịa n’ihi ịṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụ ịṅụ ọgwụ ike.

Nke bụ́ eziokwu bụ na, n’agbanyeghị ihe ndị na-akpata ha, n’agbanyeghịkwa ọganihu nile ndị ọkà mmụta sayensị nwerela n’ịgwọ ọrịa, ụfọdụ ọrịa ka nọgidere na-akpa ike dị egwu. Dị ka Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike si kwuo, ‘ọ dịghị mgbe a na-adịghị enwe ihe karịrị otu narị nde mmadụ na nde iri ise dara mbà n’obi, ihe dịkwa ka nde mmadụ iri abụọ na ise na-arịa isi mgbaka, ebe nde mmadụ iri atọ na asatọ na-arịa akwụkwụ.’ Ọtụtụ nde mmadụ na-arịa ọrịa AIDS, afọ ọsịsa, ịba, ákpàtà, oyi ịba n’ahụ́, na ụkwara nta, ọrịa ndị a na-egbukwa imirikiti ụmụaka na ndị ka nọ n’ùjú ndụ ha.

E nwere ihe mgbochi ndị ọzọ o yiri ka à gaghị agafeli bụ́ ndị na-eme ka o sie ike ikpochapụ ọrịa. Ịda ogbenye na gọọmenti ọjọọ bụ nnukwu ihe mgbochi abụọ. N’otu akwụkwọ Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike dere n’oge na-adịbeghị anya, ha kwuru na ọtụtụ nde ndị ọrịa na-efe efe gburu agaraghị anwụ ma a sị na gọọmenti mere ihe maka ya nakwa ma a sị na ndị mmadụ wetara ego.

Ihe ndị ọkà mmụta sayensị mụtarala na ọganihu dị ukwuu e nwerela n’ịgwọ ọrịa hà ga-enye aka wepụ ihe mgbochi ndị a? Ànyị ga-ahụ ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya n’isi nso? N’eziokwu, ihe ndị a e kwurula adịghị aza ajụjụ a n’ụzọ doro anya. Otú ọ dị, Bible zara ajụjụ a. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe Bible kwuru banyere ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ise X-ray

Ọ bụrụ na foto “X-ray” ndị a na-ese agbachapụkwuo agbachapụ, o nwere ike inye aka mee ka a chọpụta ọrịa mgbe ọ ka na-apụta apụta

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

© Philips

Siemens AG

Iji ígwè robot awa ahụ́

Ígwè “robot” ndị a rụnyere ihe ndị e ji awa ahụ́ na-eme ka ndị dọkịta nwee ike ịwa onye na-arịa ọrịa dị ize ndụ ahụ́ kpọmkwem otú ha kwesịrị isi waa ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

© 2006 Intuitive Surgical, Inc.

Iji ígwè robot a ga-eji nanị onyokomita na-ahụ agwọ ọrịa

Ígwè ọrụ ndị a ga-eji nanị onyokomita na-ahụ, bụ́ ndị ụmụ mmadụ mepụtara, nwere ike ime ka ndị dọkịta nwee ike ịgwọ ọrịa mgbe ọ ka na-apụta apụta. Foto a bụ ihe osise nke na-egosi otú e weere na ígwè “robot” nke ga na-arụ ọrụ mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nke na-adị n’ọbara na-arụ, ga-adị ma a rụchaa ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Onye sere ya: Vik Olliver (vik@diamondage.co.nz)/ Onye chepụtara ya: Robert Freitas

Inyocha akụkụ ahụ́ nke na-egosi ihe mmadụ bu pụta ụwa

Site n’inyocha akụkụ ahụ́ nke na-egosi ihe mmadụ bu pụta ụwa, ndị ọkà mmụta sayensị na-atụ anya ịchọpụta na ịgwọ ọrịa tupu ọrịa ahụ apụtawadị apụta

[Ebe E Si Nweta Foto]

Akụkụ ahụ́ nke na-egosi ihe mmadụ bu pụta ụwa: © Phanie/ Photo Researchers, Inc.

[Igbe dị na peeji nke 8 na 9]

Ndị Iro Isii A Na-emeribeghị

Ihe ndị ọkà mmụta sayensị mụtarala ma a bịa n’ịgwọ ọrịa nakwa n’imepụta ngwá ọrụ ndị e ji agwọ ọrịa anọgidela na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị ụdị ya. N’agbanyeghị nke a, ọrịa na-efe efe ka nọgidere na-echi ụwa ọnụ n’ala. E meribeghị ọrịa ọjọọ ndị a e depụtara n’okpuru ebe a.

Ọrịa AIDS

Ihe dị ka nde mmadụ iri isii bu ọrịa AIDS, ọrịa a egbuokwala ihe dị ka nde mmadụ iri abụọ. N’afọ 2005, e nwere nde mmadụ ise butere ọrịa AIDS, nweekwa ihe karịrị nde mmadụ atọ nwụrụ n’ihi ihe ndị ọrịa AIDS kpatara. Ihe karịrị narị puku ụmụaka ise so na ha. Imerime ndị bú ọrịa AIDS enweghị ego inweta ezigbo ọgwụgwọ n’aka ndị dọkịta.

Afọ Ọsịsa

Ebe ọ bụ na ihe dị ka ijeri mmadụ anọ na-arịa ya kwa afọ, a na-akọwa ya dị ka otu n’ime ọrịa ndị kasị egbu ndị ogbenye. Ebe e si ebute ya bụ na mmiri ma ọ bụ ná nri na-adịghị ọcha ma ọ bụkwanụ site n’edebeghị ihe ọcha. Ọrịa a na-egbu ihe karịrị nde mmadụ abụọ kwa afọ.

Ịba

Ihe dị ka narị nde mmadụ atọ na-arịa ịba kwa afọ. Ọ na-egbukwa ihe karịrị otu nde mmadụ kwa afọ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụaka. N’Africa, ịba na-egbu otu nwatakịrị n’ime ihe dị ka sekọnd iri atọ ọ bụla. Dị ka Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike si kwuo, “ndị ọkà mmụta sayensị enwebeghị ọgwụ bụ́ e jeecha ọ gwụ maka ịba, ụfọdụ na-enwekwa obi abụọ ma ọ̀ dịkwa mgbe a ga-enwe ọgwụ ga-enwe ike ịgwọchapụ ọrịa a.”

Ákpàtà

N’afọ 2003, ákpàtà gburu ihe karịrị narị puku mmadụ ise. Ọ bụ otu n’ime ọrịa ndị kasị egbu ụmụaka, bụrụkwa ọrịa na-efe nnọọ efe. Kwa afọ, ihe dị ka nde mmadụ iri atọ na-ebute ákpàtà. Nke a na-eju anya n’ihi na kemgbe afọ 40 gara aga, e nweela ezigbo ọgwụ na-adịghị oké ọnụ a na-agba iji gbochie ọrịa a.

Oyi Ịba Mmadụ n’Ahụ́

Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na-ekwu na ụmụaka ndị na-anwụ n’ihi oyi ịba ha n’ahụ́ karịrị ndị nke na-anwụ n’ihi ọrịa ọ bụla ọzọ na-efe efe. Ihe dị ka nde ụmụaka abụọ na-erubeghị afọ ise na-anwụ kwa afọ n’ihi oyi ịba ha n’ahụ́. Ọtụtụ n’ime ụmụaka ndị a bi n’Africa nakwa n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia. N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ndị na-arịa ọrịa a adịghị enweta ọgwụ ga-azọ ha n’ihi na ha ejighị ego ịga ụlọ ọgwụ.

Ụkwara Nta

N’afọ 2003, ụkwara nta gburu ihe karịrị otu nde na narị puku mmadụ asaa. Ihe kasị eche ndị dọkịta uche bụ na e nweela nje ụkwara nta ndị nke ọgwụ ụkwara nta na-adịghị egbuli. Ụfọdụ n’ime nje ndị a enweghị nke ọ bụla n’ime ọgwụ ụkwara nta ndị bụ́ ọkpọka na-egbu ha. Ndị nje a na-adị n’ahụ́ ha bụ ndị bu ụkwara nta ma e lebaghịrị ha anya nke ọma, ma ọ bụkwanụ ndị nke na-aṅụchaghị ọgwụ ha.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Imerime Mmadụ Na-achọzi Ọgwụ Na-abụghị Ọgwụ Bekee

E nwere ọgwụ dịgasị iche iche e ji agwọ ọrịa nke ndị dọkịta n’ozuzu ha na-adịghị anabata. A ma ọgwụ ndị a dị ka ọgwụ Igbo na ọgwụ ndị ọzọ na-abụghị nke Bekee. Ọtụtụ n’ime ndị bi ná mba ndị ka na-emepe emepe na-adabere n’ọgwụ Igbo iji gwọọ ọrịa ha. Ná mba ndị dara ogbenye, ọtụtụ ndị ejighị ego ọgwụ Bekee, ebe ndị ọzọ nwere mmasị n’ọgwụ Igbo karịa na nke Bekee.

Ná mba ndị bara ọgaranya, ọtụtụ mmadụ na-agbasokwa ụzọ ndị a na-abụghị ụzọ ndị Bekee si agwọ ọrịa. Ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ha na-agbaso isi na-agwọ ọrịa bụ: ịdụnye ụmụ obere agịga n’ahụ́ mmadụ iji gwọọ ya ọrịa, ịhịa mmadụ aka n’ebe o nwere nsogbu, inye mmadụ ọgwụ mkpá akwụkwọ, na ụzọ ndị ọzọ. Ndị ọkà mmụta sayensị enyochaala ụfọdụ n’ime ụzọ ndị a e si agwọ ọrịa, e jirikwala ha gwọọ ọrịa ụfọdụ. Ma, a chọpụtachabeghị ma ụfọdụ n’ime ụzọ ndị nke ọzọ hà na-arụ ọrụ. N’ihi otú imirikiti mmadụ si na-achọ ọgwụ ndị a na-abụghị ọgwụ Bekee, e nweela ọtụtụ ajụjụ banyere mmetụta ọgwụ ndị a na-enwe n’ahụ́. N’ọtụtụ mba, e nweghị iwu na-achịkwa ụzọ ndị a e si agwọ ọrịa. Nke a na-eme ka ndị mmadụ jiri aka ha na-enye onwe ha ọgwụ ga-egbu ha, na-eme ka e nwee ọgwụ adịgboroja, na-emekwa ka ndị na-amaghị anya ọgwụ na-enye ndị mmadụ ọgwụ na-abụghị ezigbo ya. Ọ bụ eziokwu na ha bu ezi ihe n’obi, ndị ikwu na ibe na-amaghị nke a na-akọ n’ịgwọ ọrịa na-eji aka ha mee onwe ha ndị dọkịta. Ihe a nile na-eme ka ọgwụ e nyere mmadụ gbuwezie ya ma ọ bụkwanụ kpatara onye ahụ nsogbu ndị ọzọ.

N’ọtụtụ mba ndị e nwere iwu na-achịkwa ịgwọ ọrịa, ọtụtụ ndị bi n’ebe ndị e ji ọgwụ Bekee mara na-achọzi ka e jiri ọgwụ ndị a na-abụghị ọgwụ Bekee gwọọ ha, ọ bụkwa ndị dọkịta Bekee na-enye ha ọgwụ ndị a. Ma, o yiri ka e nwebeghị ezigbo ihe mere a ga-eji kwuo na ụzọ nile a e si agwọ ọrịa ga-emesị mee ka e nwee ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya.