Okpukpe Ndị Kraịst Ọ̀ Kụọla Afọ n’Ala?
Echiche nke Bible
Okpukpe Ndị Kraịst Ọ̀ Kụọla Afọ n’Ala?
IHE dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa taa na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst. Ma, o yiri ka esemokwu a na-enwe n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa ihe ike a na-eme n’ụwa taa hà akarịala otú ha dịbu. Nke a ọ̀ pụtara na o nwere otú ihe Jizọs kụziri si gbaa ọrụ? Ka ihe gbara ọrụ ọ̀ bụ otú ọtụtụ ndị si etinye ihe Kraịst kụziri n’ọrụ?
N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe Kraịst kụziri n’ezie nakwa ihe nlereanya o setịpụụrụ ụmụazụ ya. Anyị ga-atụlekwa ọdịiche dị n’etiti ihe Kraịst kụziri na ihe ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst na-akụzi.
Okpukpe Ndị Kraịst nke Na-abụghị Ezigbo Ya
Ihe dị ka narị afọ anọ Kraịst nwụsịrị, okpukpe Ndị Kraịst nke na-abụghị ezigbo ya bịara ghọọ okpukpe Alaeze Ukwu Rom nakweere. Ebe ha na Alaeze Ukwu Rom na-erizi n’otu tebụl, ndị a sị na ha bụ Ndị Kraịst bịaziri ghọọ ndị ọnụ na-eru n’okwu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’ihe ndị metụtara ọhaneze n’okpuru ọchịchị ndị Rom. Ndị ụkọchukwu, dị ka Augustine, bịaziri na-akụzi na Alaeze Chineke ahụ a na-atụ anya ya abịala. Ndị ụkọchukwu a kwuru na ọnụ ha nwere ugbu a n’ọchịchị nakwa n’okpukpe, ga-eme ka e mee uche Chineke n’ụwa. N’ụzọ dị otú a, ha mesiri ya ike na ọ bụ ihe bara uru ka ụmụ mmadụ jiri aka ha na-eduzi ihe ndị na-eme n’ụwa.
N’ihi nke a, ọtụtụ ndị ekwerela na Onye Kraịst nwere ọrụ o kwesịrị ịrụ n’ihe banyere ọchịchị obodo ya. Ọtụtụ kwetakwara na ka Onye Kraịst wee nwee ike ime nke a, ọ ga-ahapụrịrị ihe ụfọdụ o kweere iji mee uche ndị obodo ya. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-ekwu nanị n’ọnụ na Kraịst kụziri ka a na-enwe ịhụnanya ma na-eme udo, n’otu mgbe ahụkwa, ha na-akwadokwa agha ndị e ji obi ịta mmiri alụ.
N’ihi otu ihe ahụ, ndị ndú okpukpe pụrụ ịgwa ndị òtù ha ka na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ma n’otu mgbe ahụ, na-akwado ndị ọchịchị obi fere azụ.Ọ bụghị Jizọs guzobere okpukpe Ndị Kraịst a bụ́ nke adịgboroja. Kama, ọ bụ ndị mmadụ ji aka ha guzobe ya, ọ bụkwa ya ka ọtụtụ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst na-ekpe. N’ezie, ụdị okpukpe Ndị Kraịst a akụọla afọ n’ala, n’ihi na dị ka ihe àmà na-egosi, ndị Krisendọm adịghị eji ụkpụrụ Bible akpọrọ ihe taa.
Gịnị n’Ezie Ka Jizọs Kụziri?
Ọ pụrụ iju ụfọdụ ndị anya ịnụ na Jizọs kwuru na ụmụazụ ya ekwesịghị ‘ịbụ akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka ya onwe ya na-abụghị akụkụ nke ụwa.’ (Jọn 17:15, 16) Olee ihe mere Kraịst ga-eji gbaa ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ghara ịbụ akụkụ nke ụwa? Onye na-eso ụzọ Jizọs nke Jizọs hụrụ n’anya, bụ́ Jọn onyeozi, zara ajụjụ a. O dere sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.
N’ihi ya, ihe Kraịst kụziri abụghị ka ndị mmadụ tụwa anya na ọ bụ òtù ụmụ mmadụ guzobere ga-eme ka e nwee ikpe ziri ezi na ezi omume n’ụwa, kama, na ọ bụ Alaeze Chineke nke dị n’eluigwe ga-eme ya. (Matiu 6:10) O nwetụghịdị otú Jizọs n’onwe ya si tinye aka n’ọchịchị mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ jụwapụrụ isi ịnara ọkwa ọchịchị. (Jọn 6:15) Ọ kwadoghịkwa iji ike edozi esemokwu. (Matiu 26:50-53; Jọn 18:36) Jizọs enyeghị iwu ọ bụla nke ga na-achịkwa ụmụ amaala obodo ya. O nweghị ebe ọ kwụ akwụ n’okwu ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ya. Dị ka ihe atụ, ọ gbachiteghịrị ndị ohu ka ha wee nweta ihe ndị ruuru ha n’obodo, o tinyeghịkwa aka ná mbọ ndị Juu na-agba inwere onwe ha pụọ n’aka ndị Rom.
Ma, nke a apụtaghị na Jizọs echebaraghị ndị mmadụ na nsogbu ha echiche. Jizọs kụziri ọtụtụ ihe banyere otú onye ọ bụla ga-esi na-emeso ibe ya ihe. Ọ gbara ndị mmadụ ume ka ha na-atụ ụtụ isi ha, kwusiekwa okwu ike banyere mkpa ọ dị ka ndị mmadụ na-erubere ndị na-achị ha isi. (Matiu 22:17-21) Ọ kụziri otú a ga-esi na-enyere ndị nọ ná mkpa aka. Ọ kụzikwara otú a ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù na otú a ga-esi na-egosi ezi ịhụnanya, otú a ga-esi na-agbaghara mmehie, nakwa otú a ga-esi na-eme ebere. (Matiu, isi 5-7) O doro onye ọ bụla anya na ihe Kraịst kụziri hiwere isi n’ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya.—Mak 12:30, 31.
Okpukpe Ndị Kraịst nke Bụ́ Ezigbo Ya Taa
Oleezi otú ezigbo onye na-eso ụzọ Kraịst ga-esi na-eme omume? Ọ ga-eme dị ka Jizọs mere. Ọ ga-eji obi ọcha ya na-erubere iwu obodo isi, n’otu mgbe ahụkwa, hụ na ọ naghị etinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 12:47, 48) Ọ gaghị ada iwu na-achị Ndị Kraịst, ọbụna mgbe a manyere ya ime otú ahụ. (1 Pita 2:21-23) N’otu mgbe ahụkwa, ọ gaghị anọrọ onwe ya dị ka à ga-asị na ihe banyere ndị ọzọ anaghị emetụ ya n’obi. Ezigbo Onye Kraịst ga-egosi ndị agbata obi ya na ya nwere nnọọ mmasị n’ebe ha nọ, dị ka Jizọs mere. (Mak 6:34) Ọ ga-enyekwara ndị ọzọ aka ka ha ghọta ma na-eme ihe Kraịst kụziri, bụ́ nke ga-eme ka ha biwe ụdị ndụ ga-eme ka ha nwekwuo obi ụtọ.—Jọn 13:17.
N’ihi nke a, Ndịàmà Jehova taa na-agbalịsi ike iṅomi Kraịst ná mmekọrịta ha na mmadụ ibe ha. Ha bụ ndị udo, bụrụkwa ụmụ amaala na-erube isi n’iwu, ma n’otu mgbe ahụ, ha abụghị akụkụ nke ụwa. Dị ka Jizọs mere, ha adịghị ekwe etinye aka n’ihe ike nakwa n’ọgba aghara ndị a na-ahụ ebe nile taa n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha nwere olileanya siri ike na ọ bụ Alaeze Chineke ga-agwọta nsogbu ndị dị n’ụwa. Ndị na-ekpe okpukpe Ndị Kraịst nke bụ́ ezigbo ya na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ ha, e jikwa ịdị n’otu mara ha. (Jọn 13:34, 35) N’ezie, okpukpe Ndị Kraịst nke bụ́ ezigbo ya akụbeghị afọ n’ala.
Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?
▪ Ò kwesịrị ekwesị ka Ndị Kraịst tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?—Jọn 6:15.
▪ Kraịst ò kwuru ka e jiri ike na-edozi esemokwu?—Matiu 26:50-53.
▪ Olee otú e si ama okpukpe Ndị Kraịst nke bụ́ ezigbo ya?—Jọn 13:34, 35.
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 26]
EL COMERCIO, Quito, Ecuador