Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Àgwà A?

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Àgwà A?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Àgwà A?

“Amalitere m mgbe m dị afọ asatọ pịwa aka n’amụ m iji mejụọ agụụ mmekọahụ m na-enwe. Ka e mesịrị, amatara m otú Chineke si ele àgwà a anya? Ọ na-ewute m nke ukwuu mgbe ọ bụla m mere ya. Ana m ajụ onwe m, sị, ‘Olee otú Chineke ga-esi hụ onye dị ka m n’anya?’ Obi m na-agwa m na agaghị m enwe ike ịba n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.”—Luiz. *

IKEKWE, dị ka ọ dị Luiz, omume nke ịpịgharị aka n’akụkụ ahụ́ i ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị iji mejụọ agụụ mmekọahụ ị na-enwe, eriela gị ahụ́. Ị maara na obi ga-adị Jehova ụtọ ma ị kwụsị àgwà ahụ ma nwee njide onwe onye, nke bụ́ otu n’ime ihe ndị mejupụtara mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Ndị Galeshia 5:22, 23; 2 Pita 1:5, 6) Ma mgbe ụfọdụ, ị na-emeghachi ya. Mgbe ọ bụla i meghachiri ya, gị ewere ya na ị bụ emete emete, na ị gaghị ebili ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke.

Ọ bụ nnọọ otú ahụ ka nwa okoro bụ́ Pedro si lee onwe ya anya. O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m meghachiri ya, ọ na-ewute m. Ọ na-adị m ka a gaghị agbaghara m ihe m mere. Ọ bịara na-esiri m ike ikpe ekpere. M chọọ ikpe ekpere n’oge ahụ, otú m na-esi amalite bụ: ‘Jehova, amaghị m ma ị̀ ga-anụkwa ekpere a, mana . . . ’” Otu nwa okorobịa aha ya bụ André chekwara otú ahụ. O kwuru, sị: “Ọ bịara dị m ka m bụ onye ihu abụọ. N’oge ahụ, ọ na-esiri m ike isi n’elu àkwà m bilie n’ụtụtụ iji mee ihe ndị dịịrị m n’ụbọchị. Ọ na-esiri m ike ịga nzukọ Ndị Kraịst ma ọ bụ ịga ozi ọma.”

Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ ọ dị Luiz, Pedro, ma ọ bụ André, nwee obi ike. Ọ bụghị nanị gị na-enwe ụdị nsogbu ahụ, olileanya dịkwa na i nwere ike ịkwụsị àgwà ahụ! Ọtụtụ ndị na-eto eto—nakwa ndị katarala ahụ́—enweela nsogbu a ma mesịa kwụsị ya. I nwekwara ike ịkwụsị nke gị. *

Ihe Ị Ga-eme Banyere Obi Amamikpe Ị Na-enwe

Dị ka anyị kwurula, obi na-amakarị ndị na-apị onwe ha aka n’akụkụ ahụ́ ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị iji mejụọ agụụ mmekọahụ, ikpe. Obi abụọ adịghị ya na ọ bụrụ na ị “na-enwe mwute n’ụzọ kwekọrọ na Chineke,” nke ahụ nwere ike ime ka ị kwụsị àgwà ahụ. (2 Ndị Kọrint 7:11) Ma inwebiga obi amamikpe ókè pụrụ imebi ihe. O nwere ike ịkụda gị mmụọ nke ukwuu nke na ike ga-agwụ gị ná mgbalị ị na-eme iji kwụsị àgwà ahụ.—Ilu 24:10.

N’ihi ya, gbalịsie ike ile nsogbu ahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Mmadụ ịdị na-apị akụkụ ahụ́ o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị aka iji mejụọ agụụ mmekọahụ, bụ otu n’ime ihe ndị na-eme ka mmadụ bụrụ onye na-adịghị ọcha. O nwere ike ime ka ị bụrụ “ohu nye ọchịchọ na ihe ụtọ dị iche iche,” ọ na-emekwa ka mmadụ malite ịkpa àgwà ndị nwere ike imebi echiche ya. (Taịtọs 3:3) N’otu mgbe ahụkwa, àgwà a abụghị otu n’ime omume ndị a na-ewere dị ka mmekọahụ jọgburu onwe ya, otú e si e were ịkwa iko. (Ndị Efesọs 4:19) N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-apị aka n’akụkụ ahụ́ gị a iji mejụọ agụụ mmekọahụ ị na-enwe, i kwesịghị ikwubi na i meela mmehie a na-adịghị agbaghara agbaghara. Ihe dị mkpa bụ ịbịanyụ ọchịchọ ị na-enwe ime omume a na ịhụ na ị nọgidere na-abịanyụ ya!

Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mfe inwe nkụda mmụọ ma i mechaa meghachi ya. Mgbe nke ahụ mere, cheta ihe ahụ dị n’Ilu 24:16, nke na-asị: “Ugbo asaa ka onye ezi omume na-ada, biliekwa ọzọ: ma ndị na-emebi iwu na-asụ ngọngọ n’ihe ọjọọ.” Na ị na-adị emeghachi omume a mgbe ụfọdụ apụtaghị na ị bụ ajọ mmadụ. Ya mere, ike agwụla gị. Kama, chọpụta ihe mere i ji emeghachi ya ma gbalịa izere ihe ahụ na-eme ka i meghachi ya.

Kama ịnọgide na-eleda onwe gị anya n’ihi àgwà a ị na-akpa, wepụta oge tụgharịa uche n’ịhụnanya na ebere Chineke. Ọbụ abụ bụ́ Devid, bụ́ onye nwekwara adịghị ike nke ya, kwuru, sị: “Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ́ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ́ ndị na-atụ egwu Ya. N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:13, 14) Ee, Jehova ghọtara na anyị ezughị okè, ọ dịkwa ‘njikere ịgbaghara’ anyị mgbe anyị mehiere. (Abụ Ọma 86:5) N’aka nke ọzọ, ọ chọrọ ka anyị na-agbalị ịhụ na anyị meziwanyere ọnọdụ anyị.

Olee ihe ndị i kwesịrị ime iji kwụsị omume a, ma ghara imeghachi ya ọzọ?

Uru Ọ Bara Ịgwa Onye Ọzọ Banyere Ya

N’agbanyeghị otú e si ekwusi okwu ike banyere mmekọahụ n’ọtụtụ mba, ọ ka na-esiri ọtụtụ ndị ike ikwu banyere mmekọahụ n’ụzọ dị ùgwù. A bịa n’akụkụ nke gị, ihere nwere ike ime ka o siere gị ike ịkọrọ ya ọbụna onye ị na-adị akọrọ ihe dị gị n’obi. Otu Onye Kraịst nke gbalịrị ruo ọtụtụ afọ iji kwụsị àgwà a, kwuru, sị: “Obi gaara adị m mma ma a sị na m katara obi kọọrọ mmadụ banyere ya mgbe m ka na-eto eto! Obi m nọgidere na-ama m ikpe ruo ọtụtụ afọ, nke a metụtakwara nnọọ mmekọrịta mụ na ndị ọzọ, ma karịsịakwa, mmekọrịta mụ na Jehova.”

Ònye ka i kwesịrị ịkọrọ ya? Onye ọ ga-akasị mma ka ị kọọrọ ya bụ onye maara nke a na-akọ n’ọgbakọ, ọ ga-akasịkwa mma ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ nne ma ọ bụ nna. I nwere ike isi otú a malite: “Achọrọ m ịkọrọ gị banyere otu ihe nọ na-enye m nnọọ nsogbu n’obi.”

Mário kpebiri ịkọrọ papa ya, bụ́ onye gosiri ya ọmịiko, gosikwa na ya ghọtara ọnọdụ ya. Ọ gwadịrị Mário na ya onwe ya nwekwara otu nsogbu ahụ mgbe ya ka na-eto eto. Mário kwuru, sị: “Otú papa m si jiri obi ọcha kọọrọ m banyere onwe ya n’ezoghị ọnụ gbara m ume nke ukwuu. Agwara m onwe m na ọ bụrụ na ọ kwụsịliri ya, mụ onwe m ga-akwụsịli ya. Àgwà papa m metụrụ m n’ahụ́ nke ukwuu nke na amalitere m ibe ákwá.”

André katara obi kọọrọ otu okenye ọgbakọ banyere àgwà ya ahụ, obi dịkwa ya ụtọ na o mere otú ahụ. * André kwuru, sị: “Ka okenye ahụ na-ege m ntị, anya mmiri juru ya anya. Mgbe m kwuchara, o mesiri m obi ike na Jehova hụrụ m n’anya. Ọ gwara m na ndị nwere nsogbu ahụ dị ọtụtụ. O kwere nkwa ilebara m anya iji hụ na m na-agbalị ịkwụsị àgwà a na igosikwu m ihe ndị e dere n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible banyere ya. Ebe ọ bụ na agwala m ya banyere ya, ekpebiri m ịhụ na m kwụsịrị omume ahụ—ọbụna ma o nwee ka m si meghachi ya n’ọdịnihu.”

Dị ka Mário na André mere, i nwere ike ịhụ ndị ga-enyere gị aka ná mbọ ị na-agba iji kwụsị àgwà a. Gbasoo ndụmọdụ dị n’igbe bụ́, “Gbaa Mbọ Iji Hụ na I Meghachighị Ya!” Ee, jide n’aka na ị ga-akwụsịli àgwà a!

Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanweela aha ndị dị n’isiokwu a.

^ par. 6 Ọ bụ ezie na ndị a kpọrọ aha n’isiokwu a bụ ụmụ nwoke, ọtụtụ ụmụ nwanyị na-emekwa ihe a a na-ekwu banyere ya. N’ihi ya, ndụmọdụ a na-enye ebe a bụ maka ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị. Ghọtakwa na isiokwu a na-ekwu banyere mmadụ ịdị na-apị akụkụ ahụ́ ya onwe ya ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị aka. Ime ya onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye gị so n’ihe Bible na-akpọ ịkwa iko, nke bụ́ mmehie dị oké njọ n’anya Chineke.—Lee Isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Inwe Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?” nke dị na Teta! August 8, 2004, peeji nke 14-16.

^ par. 17 Nwa agbọghọbịa nwere ike ịkọrọ mama ya ma ọ bụ nwanna nwanyị tozuru okè nke nọ n’ọgbakọ ha.

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Gịnị mere o ji dị mkpa icheta na Jehova “na-agbaghara mmehie”?—Abụ Ọma 86:5.

▪ Olee ihe ndị ị ga-eme iji kwụsị àgwà nke ịpị aka n’akụkụ ahụ́ i ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị iji mejụọ agụụ mmekọahụ ị na-enwe?

▪ Gịnị mere na i kwesịghị ime ihere ịrịọ maka enyemaka?

▪ Olee ụzọ kasị mma ị pụrụ isi tinye uche gị n’ihe ndị dị ọcha?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 13]

Na I Mere Ya Ọzọ Apụtaghị na Ị Gaghịzi Akwụsịli Ya!

Ọ dị nnọọ mfe iche, sị: ‘Emere m ya ọzọ, n’ihi ya, ọ baghịzi uru ịgbalịwa ịkwụsị ya.’ Echekwala otú ahụ. Ekwela ka omume i mere ya otu ugboro ma ọ bụ abụọ, ma ọ bụkwanụ ugboro ole na ole, mee ka i chewe na ị gaghịzi akwụsịli ya.

Tụlee ihe atụ a: Ọ bụrụ na ị na-arịgo steepụ ụlọ elu, gị adalaa azụ ruo otu steepụ ma ọ bụ abụọ, ị̀ ga-asị, ‘Ka m laghachi azụ gaa bido n’isi’? Mbanụ! Oleekwanụ ihe mere ị ga-eji mee ihe yiri nke ahụ mgbe ị na-agbalị ịkwụsị omume ọjọọ?

Mgbe mmadụ meghachiri omume ọjọọ, ihe na-esochikarị ya bụ obi amamikpe. Obi pụrụ ịnọgide na-ama gị ikpe ruo n’ókè nke na ị ga-ewere ya na ị bụ ajọ mmadụ, na ị gaghị akwụsịli ya, nakwa na i kwesịghị ka e meere gị ihe ọma. Ekwela ka obi gị maruo gị ikpe otú ahụ. Ọ ga-eme ka ị gharazie inwe ike ị ga-eji kwụsị omume ahụ. Otu ihe ị ga na-echeta bụ: Nwoke kasị ukwuu nke birila ndụ n’ụwa a, bụ́ Jizọs Kraịst, bịara ịzọpụta ndị mmehie, ọ bụghị ndị zuru okè. Ya mere, o nweghị onye n’ime anyị ga-eme ihe n’ụzọ zuru okè ugbu a.—O sitere na Teta! (Bekee) nke April 8, 1991, peeji nke 15.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

Gbaa Mbọ Iji Hụ na I Meghachighị Ya!

▪ Gbalịa ime ka obi gị gaa n’ihe ndị ọzọ.—Ndị Filipaị 4:8.

▪ Zere ịdị na-ekiri ihe ndị ga-akpali gị inwe ọchịchọ na-adịghị mma.—Abụ Ọma 119:37.

▪ Rịọ Jehova ka o nye gị “ike karịrị ike nkịtị.”—2 Ndị Kọrint 4:7.

▪ Na-arụ ọrụ Ndị Kraịst mgbe nile.—1 Ndị Kọrint 15:58.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

Ihe Ndị Ọzọ Ga-enyere Gị Aka

Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ga-enyere gị aka ịkwụsị àgwà nke ịpị aka n’akụkụ ahụ́ i ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị iji mejụọ agụụ mmekọahụ ị na-enwe, lee isi nke 25 na nke 26 nke akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ . . . Azịza Ndị Na-adị Irè, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.