Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Setan? Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?

Ònye Bụ Setan? Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?

Echiche nke Bible

Ònye Bụ Setan? Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?

ỤFỌDỤ ndị ọkà mmụta nke oge anyị a na-ekwu na Setan abụghị onye dị adị. Ha na-ekwu na ọ bụ onye ụmụ mmadụ na-eche nanị n’echiche. Ọ bụghị taa ka a malitere ịrụ ụka a. Otu onye na-ede uri na narị afọ nke iri na itoolu bụ́ Charles-Pierre Baudelaire kwuru, sị: “Otu aghụghọ kasịnụ Setan ji eme ihe bụ ime ka anyị kwenye na ya adịghị adị.”

Setan ọ̀ bụ onye dị adị n’ezie? Ya bụrụ na ọ dị adị, ebee ka o si bịa? Ọ̀ bụ ya bụ ike a na-adịghị ahụ anya nke na-akpata nsogbu ndị jupụtara n’ụwa taa? Olee otú ị pụrụ isi zere mmetụta ọjọọ ọ na-enwe n’ahụ́ ụmụ mmadụ?

Ihe Bible Na-ekwu

Bible kọwara Setan dị ka onye dị adị n’ezie nke bi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. (Job 1:6) Ọ gwakwara anyị banyere otú obi si taa ya mmiri nakwa omume ọjọọ ya dị iche iche. (Job 1:13-19; 2:7, 8; 2 Timoti 2:26) N’ime Bible, e dedịrị banyere mkparịta ụka Setan na Chineke nwere nakwa nke ya na Jizọs nwere.—Job 1:7-12; Matiu 4:1-11.

Ebee ka ajọ onye a si bịa? Ogologo oge tupu e kee mmadụ, Chineke kere Ọkpara ya “e buru ụzọ mụọ,” bụ́ onye e mesịrị mara dị ka Jizọs. (Ndị Kọlọsi 1:15) Ka oge na-aga, e kere ndị ọzọ bụ́kwa “ụmụ Chineke,” ndị a na-akpọ ndị mmụọ ozi. (Job 38:4-7) Ha nile zuru okè, bụrụkwa ndị ezi omume. Otú ọ dị, otu n’ime ndị mmụọ ozi ahụ mesịrị ghọọ Setan.

Setan abụghị aha e nyere ya mgbe e kere ya. Ọ bụ aha e nyere ya n’ihi omume ya. Ihe aha ahụ pụtara bụ “Onye Mmegide; Onye Iro; Onye Ebubo.” Ihe mere e ji nye ya aha ahụ bụ n’ihi na ọ họọrọ imegide Chineke.

Nwa mmụọ a malitere dịwa mpako ma mawa Chineke aka. Ọ chọrọ ka ndị ọzọ fewe ya ofufe. Oge Ọkpara Chineke e buru ụzọ mụọ, bụ́ Jizọs, nọ n’ụwa, Setan nwadịrị ime ka Jizọs ‘kpọọrọ ya isiala.’—Matiu 4:9.

Setan ‘eguzosighị ike n’eziokwu.’ (Jọn 8:44) O mere ka e chee na Chineke bụ onye ụgha, ebe nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ya onwe ya bụ onye ụgha. Ọ gwara Iv na ọ pụrụ ịdị ka Chineke, ebe ọ bụ ya onwe ya na-achọ ịdị ka Chineke. O jikwa ụzọ aghụghọ ya nweta ihe ọ na-achọ. O mere ka Iv were na ya onwe ya bụ́ Ekwensu ka Chineke elu. Ebe ọ bụ na Iv rubeere Setan isi, ọ pụtara na o kwetara ka Setan bụrụ chi ya.—Jenesis 3:1-7.

N’ihi ime ka e nupụrụ Chineke isi, mmụọ ozi a a tụkwasịburu obi mere onwe ya Setan—nke pụtara na ọ bụ onye iro na onye na-emegide Chineke na mmadụ. E nyekwuru ajọ onye a aha bụ́ “Ekwensu,” nke pụtara “Onye Nkwutọ.” Onye a gbara onye mbụ ná mmehie mesịrị nweta ndị mmụọ ozi ndị ọzọ iso ya nupụrụ Chineke isi. (Jenesis 6:1, 2; 1 Pita 3:19, 20) Ndị mmụọ ozi a emeghị ka ọnọdụ ụmụ mmadụ kakwuo mma. ‘Ụwa bịara jupụta n’ihe ike’ n’ihi otú ndị mmụọ ozi a si bịa ṅomie Setan site n’ịchọ nanị ọdịmma nke onwe ha.—Jenesis 6:11; Matiu 12:24.

Olee Otú Ike Setan Na-akpa Haruru?

Onye omempụ nwere ike kpaa arụ ya n’ụdị ọ ga-abụ, a chọwa onye kpara arụ ahụ, a gaghị achọta ya. Ma, ndị uwe ojii bịa, ha na-aghọta na ebe ọ bụ na a kpara arụ, a ga-enwerịrị onye kpara arụ ahụ. Setan, bụ́ “ogbu mmadụ,” na-agba mbọ ịhụ na a mataghị ụdị onye ọ bụ. (Jọn 8:44; Ndị Hibru 2:14) Mgbe Setan na-agwa Iv okwu, o ji agwọ mee ihe n’ụdị a na-agaghị amata na ọ bụ ya na-ekwu okwu. Ọ ka na-agba mbọ izochi ụdị onye ọ bụ taa. O meela “ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì” ka ndị mmadụ wee ghara ịma otú ike ọ na-akpa haruru.—2 Ndị Kọrịnt 4:4.

Otú ọ dị, Jizọs kwuru na ọ bụ Setan bụ omempụ mebiri ụwa a anyị bi n’ime ya. Ọ kpọrọ ya “onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31; 16:11) Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Setan “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi” site n’ime ka ha na-enwe “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ.” (1 Jọn 2:16; Mkpughe 12:9) Ọ bụ ya bụ onye ụmụ mmadụ n’ozuzu ha na-erubere isi.

Dị nnọọ ka ọ dị n’ebe Iv nọ, ndị nile na-erubere Setan isi na-eme ka ọ bụrụ chi ha, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. N’ihi ya, Setan bụ “chi nke usoro ihe a.” (2 Ndị Kọrịnt 4:4) Ihe ndị e ji mara ọchịchị ya gụnyere omume ihu abụọ na ụgha; agha, mmekpọ ọnụ na mbibi; mpụ, anyaukwu na nrụrụ aka.

Otú Ị Pụrụ Isi Zere Ịbụ Onye Ọ Ga-anwata

Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Nọgidenụ na-enwe uche ziri ezi, na-echenụ nche.” N’ihi gịnị? N’ihi na “Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Ọ bụ ezie na akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-akpali iche echiche, ọ bụ ihe na-emesikwu obi ike ịmara na ọ bụ nanị ndị na-anọgideghị na-enwe uche ziri ezi—ndị na-anọgideghị na-eche nche—bụ ndị ‘Setan ga-aghọgbu.’—2 Ndị Kọrịnt 2:11.

Ọ dị oké mkpa ka anyị kweta na Setan dị adị n’ezie, ma kwere ka Chineke mee ka ‘anyị guzosie ike’ ma ‘siekwa ike.’ Anyị ga-esi otú ahụ ‘guzogide Setan’ ma nọrọ n’akụkụ Chineke.—1 Pita 5:9, 10.

Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?

▪ Ebee ka Setan si bịa?—Job 38:4-7; Jọn 8:44.

▪ Olee otú ike Setan na-akpa n’ụwa haruru?—Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:9.

▪ Olee ihe anyị pụrụ ime iji chebe onwe anyị pụọ n’aghụghọ Setan?—1 Pita 5:8-10.

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Setan ọ̀ bụ ike a na-adịghị ahụ anya nke na-akpata nsogbu ndị dị n’ụwa anyị a?