Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebee Ka Ụwa A Na-etinye Isi?

Ebee Ka Ụwa A Na-etinye Isi?

Ebee Ka Ụwa A Na-etinye Isi?

ERI ogologo oge gara aga, Bible buru amụma banyere omume ọma a na-ala ala n’oge a. Ọ kọwara ya otú a, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, . . . ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnarị ike ya.”—2 Timoti 3:1-5.

Ị pụrụ ikweta na amụma a e buru na Bible kọwara nnọọ ọnọdụ e nwere n’ụwa taa nke ọma. Ma, e dere ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga! Okwu e ji malite amụma ahụ bụ: “N’ụbọchị ikpeazụ.” Gịnị ka okwu ahụ bụ́ ‘ụbọchị ikpeazụ’ pụtara?

‘Ụbọchị Ikpeazụ” nke Gịnị?

Okwu ahụ bụ́ ‘ụbọchị ikpeazụ’ aghọọla okwu a ma nnọọ ama. N’asụsụ Bekee nanị, e jirila ya mere aha ọtụtụ akwụkwọ. Tụlee, dị ka ihe atụ, akwụkwọ ahụ e bipụtara na nso nso a, nke aha ya bụ The Last Days of Innocence—America at War, 1917-1918 (Ụbọchị Ikpeazụ nke Amaghị Ihe Ọjọọ—America Nọ n’Agha, 1917-1918). Okwu mmalite nke akwụkwọ ahụ mere ka o doo anya na mgbe e ji okwu ahụ bụ́ ‘ụbọchị ikpeazụ’ mee ihe n’akwụkwọ ahụ, na ọ na-ezo aka n’otu oge kpọmkwem, nke bụ́ oge omume ọma larala n’ụzọ dị egwu.

Okwu mmalite nke akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “N’afọ 1914, mba ahụ nọ na-agbanwe n’ike n’ike otú ọ na-agbanwetụbeghị mbụ.” N’ezie, a ma afọ ahụ bụ́ 1914 ama dị ka afọ agha dara n’ụwa nile, bụ́ ụdị agha a na-alụtụbeghị mbụ. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Nke a bụ agha onye ukwu na onye nta so lụọ, ya bụ, agha mba lụsoro mba ibe ya, ọ bụghị agha ndị agha lụsoro ndị agha ibe ha.” Dị ka anyị ga-ahụ, a lụrụ agha a ná mmalite oge Bible kpọrọ ‘ụbọchị ikpeazụ.’

Bible kwuru ya ekwu na tupu ụwa a ana-abịa ná njedebe, na a ga-enwe otu oge kpọmkwem nke a ga-akpọ ‘ụbọchị ikpeazụ.’ N’ezie, Bible kwuru na e nwere ụwa dịburu ma gabiga, ma ọ bụ bịa ná njedebe, ma kọwaa, sị: “Ụwa nke oge ahụ bịara ná mbibi mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya.” Olee oge ọ bụ, oleekwa ụwa nke bịara ná njedebe n’oge ahụ? Ọ bụ ‘ụwa oge ochie nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke’ bụ́ nke dịrị n’oge nwoke a na-akpọ Noa dịrị ndụ. N’otu aka ahụ, ụwa nke oge a ga-abịa ná njedebe. Ma, ndị na-ejere Chineke ozi ga-alanarị ọgwụgwụ ahụ, dị ka Noa na ezinụlọ ya lanarịrị.—2 Pita 2:5; 3:6; Jenesis 7:21-24; 1 Jọn 2:17.

Ihe Jizọs Kwuru Banyere Mgbe Ọgwụgwụ

Jizọs Kraịst kwukwara banyere “ụbọchị Noa,” bụ́ mgbe “iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.” O ji ọnọdụ ndị e nwere tupu Iju Mmiri ahụ—ya bụ, kpọmkwem tupu ụwa ahụ abịa ná njedebe—tụnyere ọnọdụ ndị a ga-enwe n’oge ọ kọwara dị ka “ngwụsị nke usoro ihe a.” (Matiu 24:3, 37-39) Nsụgharị Bible ndị ọzọ kpọrọ ya “ọgwụgwụ ụwa” ma ọ bụ “ọgwụgwụ oge a.”—Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society, na Bible Nsọ nke Union Version.

Jizọs buru amụma banyere ihe ndụ ga-adị ka ya n’ụwa tupu ụwa a abịa ná njedebe—dị ka otu ụwa bịara ná njedebe mgbe e ji Iju Mmiri bibie ya n’oge Noa. O kwuru banyere agha, sị: “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze.” Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na nke a malitere imezu n’afọ 1914. Ọ bụ ya mere okwu mmalite nke akwụkwọ ahụ e hotara na mbụ ji kwuo banyere 1914 dị ka afọ a malitere “agha onye ukwu na onye nta so lụọ, ya bụ, agha mba lụsoro mba ibe ya, ọ bụghị agha ndị agha lụsoro ndị agha ibe ha.”

Jizọs kwukwara n’amụma ya, sị: “A ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji site n’otu ebe ruo ebe ọzọ. Ihe ndị a nile bụ mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya.” Ọ gara n’ihu ikwu na, tinyere ihe ndị ọzọ, a ga-enwe “ịba ụba nke mmebi iwu.” (Matiu 24:7-14) N’ezie, anyị ahụla ka nke a na-emezu n’oge anyị a. Otú omume ọma si na-ala taa dị nnọọ egwu nke na ọ na-emezu amụma Bible!

Olee otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ n’oge a omume ọma na-ala n’ike n’ike? Rịba ama ihe Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Rom n’akwụkwọ banyere otú omume si na-ala. O mere ka a mara banyere “agụụ mmekọahụ na-eme ihere” nke ndị mmadụ nwere, ma dee, sị: “Ụmụ nwanyị ha gbanwere ụzọ e kere ha isi na-eme ihe gaa n’ụzọ megidere okike; n’otu aka ahụkwa ọbụna ụmụ nwoke hapụrụ ụzọ e si kee ha iji ụmụ nwanyị na-eme ihe ma nwee oké mkpali n’agụụ ihe ọjọọ ha n’ebe ibe ha nọ, ụmụ nwoke na ụmụ nwoke, na-eme ihe rụrụ arụ.”—Ndị Rom 1:26, 27.

Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ọ bụ ezie na omume ọma nọ na-ala n’ike n’ike n’oge ahụ, “ezi omume na àgwà ọma nke obere ìgwè Ndị Kraịst mere ka ahụ́ ghara iru ndị ụwa na-ekpere arụsị, bụ́kwa ndị ihe ụtọ riri isi, ala.” Nke a kwesịrị ime ka anyị kwụsịtụ ma jụọ onwe anyị, sị: ‘Gịnị banyere mụ na ndị m họọrọ iso na-akpakọrịta? À ma anyị ama dị ka ndị na-eme omume ọma, ndị dị iche n’ebe ndị na-eme omume rụrụ arụ nọ?’—1 Pita 4:3, 4.

Agha Anyị Nwere Ịlụ

Bible na-akụziri anyị na n’agbanyeghị omume rụrụ arụ gbara anyị gburugburu, na ọ dị mkpa ka anyị bụrụ “ndị na-enweghị ụta na ndị aka ha dị ọcha, ụmụ Chineke ndị na-enweghị mmerụ n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ na nke hịgọrọ ahịgọ.” Iji mee nke a, ọ dị mkpa ka anyị ‘jidesie okwu nke ndụ ike.’ (Ndị Filipaị 2:15, 16) Ihe a akụkụ Akwụkwọ Nsọ a kwuru mere ka a mara otú Onye Kraịst pụrụ isi nọgide n’etinyeghị aka n’omume ọjọọ—ya bụ, ọ dị mkpa ka o jidesie ozizi nke Okwu Chineke ike ma ghọta na ụkpụrụ omume ndị dị na ya bụ ihe na-eme ka mmadụ bie ndụ n’ụzọ kasị mma.

“Chi nke usoro ihe a,” bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, na-anwa ike ya inweta obi ndị mmadụ. (2 Ndị Kọrint 4:4) Bible na-agwa anyị na ọ “[nọgidewo] na-enwogha onwe ya ịbụ mmụọ ozi nke ìhè.” Ndị ozi ya, ya bụ, ndị na-ejere ya ozi site n’ime ka ya, na-emekwa otu ihe ahụ. (2 Ndị Kọrint 11:14, 15) Ha na-ekwe nkwa ime ka ndị mmadụ nwere onwe ha ma kporie ndụ, ma dị ka Bible kwuru, “ha onwe ha nọ dị ka ndị ohu nke ire ure.”—2 Pita 2:19.

Echekwala na ọ bụ egwuregwu ka a na-egwu. Ndị na-eleghara ụkpụrụ Chineke setịpụrụ banyere omume anya ga-ata ahụhụ ya. Otu ọbụ abụ nke Bible dere, sị: “Nzọpụta dị anya n’ebe ndị na-emebi iwu nọ; n’ihi na ha achọghị ụkpụrụ [Chineke] nile.” (Abụ Ọma 119:155; Ilu 5:22, 23) Obi ò siri anyị ike na nke ahụ bụ eziokwu? Ọ bụrụ na o siri anyị, ka anyị chebe obi na uche anyị pụọ n’àgwà onye mere otú masịrị ya, nke juru ebe nile.

Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-eche n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya, sị, ‘Ọ bụrụ na ihe m na-eme emegideghị iwu, ọ pụtara na o nweghị ihe ọjọọ dị na ya.’ Ma, nke ahụ abụghị eziokwu. Nna anyị nke eluigwe ji ịhụnanya enye gị nduzi n’ihe banyere omume, ọ bụghị iji mee ka ndụ gwụ gị ike na iji mee ka ị ghara imegharị ahụ́, kama ọ bụ iji chebe gị. Ọ “na-ezi gị ime ihe na-aba uru.” Ọ chọrọ ka i zere ọdachi ma nwee obi ụtọ ná ndụ. N’ezie, dị ka Bible na-akụzi, mmadụ ijere Chineke ozi ga-eme ka o nweta “nkwa maka ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.” Nke ahụ bụ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ya bụ, ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ O kwere ná nkwa!—Aịsaịa 48:17, 18; 1 Timoti 4:8; 6:19.

Ya mere, jiri uru dị n’ịgbaso ozizi Bible tụnyere obi mgbawa ndị jụrụ ime otú ahụ na-emesị nweta. Inweta ihu ọma Chineke site n’ige ya ntị bụ n’ezie ụzọ kasị mma isi bie ndụ! Chineke kwere nkwa, sị: “Onye na-ege m ntị ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ ga-anọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.”—Ilu 1:33.

Ụwa nke Nanị Ndị Na-eme Omume Ọma Ga-ebi na Ya

Bible kwuru na mgbe ụwa a ga-agabiga, “onye na-emebi iwu agaghị adịkwa.” O kwukwara, sị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya.” (Abụ Ọma 37:10, 11; Ilu 2:20-22) Ya mere, a ga-ekpochapụ omume rụrụ arụ n’ụwa, tinyere ndị nile jụrụ ime ihe ndị dị mma Onye Okike anyị na-akụziri anyị. Mgbe nke ahụ mere, ndị hụrụ Chineke n’anya ga-abịazi jiri nwayọọ nwayọọ mee ka ụwa nile ghọọ ụdị paradaịs ahụ Chineke tinyere nwoke na nwanyị mbụ na ya.—Jenesis 2:7-9.

Tụlee ụdị obi ụtọ mmadụ ga-enweta site n’ibi n’ụwa dị ọcha otú ahụ, bụ́ nke a ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs! Ụfọdụ n’ime ndị ga-enweta ihe ùgwù nke iso biri na ya bụ ọtụtụ ijeri ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ. Ṅụrịa ọṅụ ná nkwa a Chineke kwere, nke bụ́: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 9]

Mgbe otu ụwa bịara ná njedebe, e nwere ndị na-atụ egwu Chineke lanarịrịnụ

[Foto dị na peeji nke 10]

Mgbe ụwa ochie a bịasịrị ná njedebe, ụwa ọhụrụ ga-aghọ paradaịs