Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Emere M Nhọrọ Dị Mma n’Ihe Banyere Ọrụ

Emere M Nhọrọ Dị Mma n’Ihe Banyere Ọrụ

Emere M Nhọrọ Dị Mma n’Ihe Banyere Ọrụ

Dị Ka Sonia Acuña Quevedo Si Kọọ

A chọrọ ibuli m n’ọkwá n’ụlọ akụ̀ m na-arụ ọrụ na ya. Ọ bụrụ na m anabata ya, ọ pụtara na m ga-enwekwu ùgwù, ụgwọ ọnwa m ga-agbagokwa. Ma, n’otu mgbe ahụ, a kpọrọ m ịga jee ozi dị ka onye ozi oge nile n’otu ọgbakọ dị nnọọ anya site n’ebe m bi. Ka m na-eleghachi anya azụ ugbu a afọ 32 gaferela, ama m na nhọrọ m mere bụ nke amamihe dị na ya.

A ZỤLITERE mama anyị dị ka onye Roman Katọlik, mana ọ nọ na-enwe obi abụọ banyere ihe ndị a na-akụzi na chọọchị ahụ. Ọ na-adị eche, sị, Gịnị mere a ga-eji na-efe ihe oyiyi—nke bụ́ ihe mmadụ ji aka ya rụpụta? Ọ chọrọ ịmata eziokwu Bible, n’ihi ya kwa, ọ bịara na-eme, o si na chọọchị nke a, ọ gaa n’ọzọ, ebe ọ na-achọ inweta azịza nke ajụjụ ndị o nwere, ma ọ dịghị nke nwere isi.

Otu ụbọchị, ọ nọdụrụ ala na-anara ikuku na mbara èzí anyị dị n’obodo Tuxtla, Mexico, mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara. Ebe ọ bụ na otú Onyeàmà ahụ si jiri Bible zaa ya ajụjụ tọrọ ya ụtọ, o kwere ka Onyeàmà ahụ bịaghachi. Mgbe ọ bịaghachiri, mama anyị na onye ụkọchukwu chọọchị Adventist, onye ụkọchukwu chọọchị Katọlik, na onye ụkọchukwu chọọchị Nazarene, nọ na-eche ya. Mama anyị jụrụ ajụjụ banyere Ụbọchị Izu Ike, ọ bụkwa nanị Onyeàmà ahụ ji Akwụkwọ Nsọ zaa ajụjụ ahụ otú juru ya afọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ nanị ya ji Bible! N’afọ 1956, bụ́ mgbe a mụsịịrị ya Bible ruo nanị ọnwa isii, e mere ya baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Adị m afọ asatọ n’oge ahụ.

Nchegbu Si n’Ezi Obi Papa Anyị Nwere

Papa anyị emegideghị mama anyị maka Bible ahụ ọ na-amụ. Ma mgbe mama anyị malitere ịkụziri anyị bụ́ ụmụaka anọ—ụmụ nwoke abụọ na ụmụ nwanyị abụọ—Bible ma kpọrọ anyị na-aga nzukọ Ndị Kraịst, papa anyị bibiri akwụkwọ ya. Ebe ọ bụ na o kwenyesiri ike na a na-eduhie anyị, ọ gbalịrị iji Bible ndị Katọlik gosi anyị na Ndịàmà tinyere aha Chineke—bụ́ Jehova—n’ime nsụgharị Bible nke ha iji na-eduhie ndị mmadụ. Mgbe mama anyị gosiri ya aha ahụ n’ime Bible nke ya, ọ tụrụ ya n’anya nke ukwuu, otú o si ele Ndịàmà anya malitekwara ịgbanwe.—Abụ Ọma 83:18.

N’obodo Mexico, nwatakịrị nwanyị ruo afọ 15, ememe ụbọchị ọmụmụ ya nke afọ ahụ na-apụ iche. Ebe ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ememe ụbọchị ọmụmụ, akwụsịla m ime nke m tupu mụ eruo afọ 15. * Ma papa anyị siri ọnwụ na ya ga-enyerịrị m onyinye pụrụ iche. Echebaara m okwu ahụ echiche ma gwa ya, sị, “Achọrọ m ka gịnwa bụrụ onyinye ahụ site n’iso m gaa mgbakọ ọzọ Ndịàmà Jehova ga-enwe.” O kwetara, ọ bịakwara nwekwuo mmasị na Bible.

Otu abalị, mgbe nnukwu mmiri zosịrị, papa anyị merụrụ ahụ́ nke ukwuu mgbe ahụ́ ya metụrụ na waya eletrik dara ada. Ka ọ nọ n’ụlọ ọgwụ na-agbake, Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè anyị lekọtara ya ma n’ehihie ma n’abalị—nke a bụ ịhụnanya Ndị Kraịst e gosiri ya, nke ọ na-echefughị echefu. Ka e mesịrị, ọ malitere ịga ozi ọma ma rara ndụ ya nye Jehova. Ọ dị mwute ikwu na ọ nwụrụ na September 30, 1975, nke bụ́ ihe fọrọ otu ọnwa ka o ruo ụbọchị a gaara eme ya baptizim. Anyị na-atụsi nnọọ anya ike ịnabata ya mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ!—Ọrụ 24:15.

Mmetụta Dị Mma Ezinụlọ Anyị Nwere n’Ebe M Nọ

Ọ dịla anya nwanne m nwanyị nke tọrọ m, bụ́ Carmen, nwewere mmasị n’ozi oge nile. N’oge na-adịghị anya e mesịrị ya baptizim n’afọ 1967, ọ malitere ọrụ ọsụ ụzọ oge nile, na-eji ihe dị ka 100 awa aga ozi ọma kwa ọnwa. Ka oge na-aga, ọ kwagara n’obodo Toluca, nke dị n’ebe etiti Mexico. Enwetara m ọrụ n’ụlọ akụ̀, e mekwara m baptizim na July 18, 1970.

Ozi oge nile nyere Carmen obi ụtọ dị ukwuu, ọ gbakwara m ume ịbịa soro ya jewe ya n’obodo Toluca. Ihe ahụ ka m nọ n’eche otu ụbọchị mgbe m na-ege otu okwu a nọ na ya kwuo na ụmụazụ Jizọs kwesịrị iji akụ̀ ime mmụọ ndị ha nwere na-enye Chineke otuto. (Matiu 25:14-30) Ajụrụ m onwe m, sị, ‘Èji m onyinye ime mmụọ ndị e nyere m arụsi ọrụ ike?’ Echiche dị otú ahụ mere ka m nwee ọchịchọ imekwuru Jehova ihe.

Ikpebi nke M Ga-ahọrọ n’Ime Ọrụ Abụọ

N’afọ 1974, etinyere m akwụkwọ ije ozi dị ka onye ozi oge nile n’ókèala ọzọ. N’oge na-adịghị anya m tinyesịrị akwụkwọ ahụ, otu Onye Kraịst bụ́ okenye nke nọ na Toluca kpọrọ m na fon n’ụlọ akụ̀ ahụ m na-arụ ọrụ. Ọ gwara m, sị, “Ọ dịla anya anyị chewere gị. Gịnị mere na ị bịabeghị?” Ọ tụrụ m nnọọ n’anya ịmata na a họpụtala m ije ozi n’obodo Toluca dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche, mana ikekwe e buuru akwụkwọ ozi nke a chọrọ ka o ruo m aka, bụ́ nke e dere ebe e kenyere m ọrụ, gawa ebe ọzọ! (Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-ekweta ije ozi oge nile n’ebe ọ bụla nzukọ Jehova gwara ha ka ha jee ozi.)

Emere m ka ndị isi ụlọ akụ̀ ahụ mara ozugbo banyere mkpebi m mere ịkwụsị ọrụ n’ụlọ akụ̀ ahụ. Ọga m gwara m ozugbo ahụ, ka ọ nọ na-egosi m otu mpempe akwụkwọ, sị, “Sonia cherekwa o. Ugbu a ka a ka gwara anyị na i so n’otu n’ime ụmụ nwanyị asaa ndị a họpụtara ka ha bụrụ osote manịja. Ụlọ ọrụ anyị ahọpụtatụbeghị nwanyị ịbụ osote manịja. Ọ̀ bụ na ị gaghị anabata ya?” Dị ka m kwuru ná mmalite, ọ bụrụ na m anabata mbuli a a chọrọ ibuli m n’ọkwá, ọ pụtara na m ga-enwekwu ùgwù, ụgwọ ọnwa m agbagookwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ekelere m ọga m ma gwa ya na ekpebisiri m ike ijekwuru Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu. Ọ gwaziri m, sị, “Gaa n’ihu. Ma cheta na ụlọ akụ̀ a dị njikere iwe gị n’ọrụ mgbe ọ bụla ị chọrọ ọrụ.” Ụbọchị abụọ ka e mesịrị, anọzi m na Toluca.

Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Pụrụ Iche na Mexico

Mgbe m sonyeere Carmen, ọ rụọla ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na Toluca ruo afọ abụọ. Lee nnọọ ihe obi ụtọ ọ bụụrụ anyị ibikọta ọnụ ọzọ! Ma, anyị ebiteghị aka. Ọnwa atọ ka e mesịrị, mama anyị nwere ihe ọghọm, ọ bịakwara dị mkpa na mmadụ ga-anọ na-elekọta ya n’ụlọ. Mgbe anyị na alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova kparịtasịrị banyere ya, mụ na Carmen kwekọrịtara na Carmen ga-ala ụlọ iji lekọta mama anyị, bụ́kwanụ ihe o mere ruo afọ 17. N’ime oge ahụ, Carmen jere ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile. Ọ na-adị akpọ ndị ọ na-amụrụ Bible ka ha bịa n’ụlọ maka ọmụmụ ihe ha ka o wee nwee ike ịnọ n’ụlọ na-elekọta mama anyị.

N’afọ 1976, e zigara m Tecamachalco, nke bụ́ obodo ndị ogbenye bi n’otu akụkụ ya, ndị ọgaranya ebiri n’akụkụ ya nke ọzọ. Amalitere m ịmụrụ otu agadi nwanyị na-alụghị di, nke ya na nwanne ya nwoke bara ọgaranya bi Bible. Mgbe ọ gwara nwanne ya nwoke ahụ na ya chọrọ ịbụ Onyeàmà, ọ gwara ya na ya ga-achụpụ ya ma ọ bụrụ Onyeàmà. Ma, nke ahụ emenyeghị agadi nwanyị ahụ egwu, mgbe e mesịkwara ya baptizim, nwanne ya nwoke chụpụrụ ya. N’agbanyeghị na ọ dị afọ 86 n’oge ahụ, ọ tụkwasịrị Jehova obi nke ukwuu. Ọgbakọ lekọtara ya, ọ nọgidekwara na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ya.

Ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead Ma Mesịa Gaa Bolivia

Ejere m ozi ruo afọ ise na Tecamachalco, enwetakwara m ọṅụ na ya. E mesịa, enwetara m akwụkwọ ịkpọ oku maka ịga ụlọ akwụkwọ Gilead nke mbụ e nwere na Mexico. Ụlọ akwụkwọ Gilead a a nọ na Mexico enwe bụkwa otu Ụlọ Akwụkwọ Gilead ahụ a na-enwe na New York, kama na nke Mexico a bụ ngalaba ya. Ma mama anyị ma Carmen siri ọnwụ ka m zaa oku ahụ a kpọrọ m. N’ihi ya, agara m n’alaka ụlọ ọrụ dị na Mexico City maka ọzụzụ a were izu iri, nke bụ́ ihe m na-adịghị echefu echefu ná ndụ m ma a bịa n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke. Klas anyị gụsịrị akwụkwọ na February 1, 1981, e zigakwara mụ na Enriqueta Ayala (ọ na-azazi Enriqueta Fernández) n’obodo La Paz, nke dị na Bolivia.

Mgbe anyị rutere n’ọdụ ụgbọelu dị na La Paz, ụmụnna ndị e dunyere ka ha bịa kpọrọ anyị abịabeghị. Anyị jụrụ onwe anyị, sị, “Gịnị ka anyị na-egburu oge?” N’ihi ya, anyị malitere ịgbara ndị nọ n’ọdụ ụgbọelu ahụ àmà. Mgbe anyị gbasịrị àmà tọrọ anyị ụtọ ruo awa atọ, ụmụnna ahụ si n’alaka ụlọ ọrụ bịarutere. Mgbe ha rịọsịrị anyị mgbaghara, ha gwara anyị na ihe mere na ha abịaghị n’oge bụ na ndị mmadụ nọchisịrị n’okporo ụzọ n’ihi ememe a na-eme n’obodo ahụ.

Ịgba Àmà n’Ebe Dị Elu Karịa Igwe Ojii

Obodo La Paz ji ihe karịrị mita 3,625 karịa ịdị elu nke oké osimiri, n’ihi ya, ọtụtụ mgbe, anyị na-anọ n’ebe dị elu karịa igwe ojii. Ebe ọ bụ na ikuku oxygen dị ebe ahụ ehighị nne, ọ bịara na-esiri m ike iku ume, m gaa ozi ọma ruo nanị nwa oge, ike agwụ m. N’agbanyeghị na o were otu afọ tupu ọnọdụ ihu igwe e nwere ebe ahụ amara m ahụ́, ngọzi m nwetara n’aka Jehova karịrị nnọọ ihe isi ike ndị m nwetara. Dị ka ihe atụ, n’otu ụtụtụ n’afọ 1984, arịgoro m otu ugwu bụ́ nkume nkume ma gara ruo n’otu ụlọ a rụkwasịrị n’ọnụ ọnụ ugwu. Mgbe m rutere ebe ahụ, ike gwụrụ m nke ukwuu. Akụrụ m aka n’ọnụ ụzọ, otu nwanyị apụta. Anyị kparịtara nnọọ ụka nke ọma, agwakwara m ya na aga m abịaghachi n’ime ụbọchị ole na ole.

Nwanyị ahụ jụrụ m, sị, “Ì jikwa n’aka?” Agaghachiri m, nwanyị ahụ gwakwara m ka m mụwara nwa ya nwanyị Bible. Agwara m ya, sị, “Nke ahụ bụ ọrụ dịịrị nne na nna. Ma, aga m enyere gị aka ma ị chọọ.” O kwetara ma gwa m ka m mụwakwuoro ya onwe ya Bible. Ebe ọ bụ na ọ maghị ka e si agụ na ka e si ede, amalitere m site n’ịmụrụ ya akwụkwọ bụ́ Learn to Read and Write (Mụta Ka E Si Agụ na Ka E Si Ede), bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara maka ọnọdụ dị otú ahụ.

Ka oge na-aga, ụmụaka e nwere n’ezinụlọ ahụ mụbara ruo ụmụ asatọ. Ọ na-abụ m gaa na nke ha, ụfọdụ n’ime ụmụaka ahụ na-adị eme otu onye jide aka m, onye nke ọzọ ejide aka onye nke ahụ, ha esi otú ahụ nyere m aka ịrịgo ugwu ahụ dị nnọọ elu. N’ikpeazụ, onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ahụ malitere ijere Jehova ozi—ma nna, ma nne, ma ụmụ ha asatọ. Mmadụ atọ n’ime ndị nke nwanyị bụ ọsụ ụzọ oge nile, otu onye n’ime ndị nke nwoke bụ okenye n’ọgbakọ. Papa ha abụrụlarị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ tupu ya anwụọ n’afọ 2000. Obi na-atọ m nnọọ ụtọ ma m cheta ezinụlọ ọma a na otú ha si na-ekwesị ntụkwasị obi! Ana m ekele Jehova maka ikwe ka m nyere ha aka.

Mụ na Carmen Anọkọtakwa Ọzọ

Mgbe mama anyị nwụsịrị n’afọ 1997, a kpọghachiri Carmen ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’afọ 1998, e zigara ya n’obodo Cochabamba, nke dị na Bolivia, bụ́ ebe m nọ na-eje ozi. Ee, ka afọ 18 gasịrị, anyị nọkọtara ọnụ ọzọ, e mekwara Carmen onye ozi ala ọzọ. Obodo Cochabamba dị anyị nnọọ mma n’ahụ́. Ọnọdụ ihu igwe dị nnọọ mma n’ebe ahụ nke na a na-ekwukarị banyere obodo ahụ, sị, Eleké bịara ebe ahụ anaghị ekwe ala ala! Ka ọ dị ugbu a, anyị na-eje ozi n’obodo Sucre, nke dị na Bolivia. Nke a bụ ọmarịcha obodo dị na ndagwurugwu nke narị puku mmadụ abụọ na iri puku abụọ bi na ya. Obodo a a na-akpọbu Vatican Nta n’ihi ọtụtụ chọọchị Katọlik dị na ya, nweziri ọgbakọ ise nke Ndịàmà Jehova.

A gụkọta afọ nile mụ na Carmen jere ozi ọsụ ụzọ, ọ dị ihe karịrị afọ 60. Anyị enwetakwala ihe ùgwù na-enweghị atụ nke inyere ihe karịrị otu narị mmadụ aka ruo n’ogo ime baptizim. Ee, ihe ịrụ ụka adịghị ya na iji mkpụrụ obi anyị dum jeere Jehova ozi bụ ụzọ ndụ uru kasị dịrị na ya!—Mak 12:30.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 8 Ememe ụbọchị ọmụmụ abụọ nanị a kọrọ banyere ha n’Akwụkwọ Nsọ bụ ndị ọgọ mmụọ mere ha, e kwughịkwa okwu ọma banyere ha. (Jenesis 40:20-22; Mak 6:21-28) Otú ọ dị, Okwu Chineke na-agba ume ka a na-enye onyinye sitere n’obi, ọ bụghị nke mmadụ nyere n’ihi ememe ma ọ bụ iji mechaa onwe ya ihu n’ihu ndị ọgbọ ya.—Ilu 11:25; Luk 6:38; Ọrụ 20:35; 2 Ndị Kọrint 9:7.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ana m adị arịgo ugwu bụ́ nkume nkume iji mụọrọ ezinụlọ a ihe

[Foto dị na peeji nke 23]

Ebe mụ na nwanne m nwanyị, bụ́ Carmen (n’aka nri) nọ n’ozi ubi