Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Mmadụ Gwa M Ka Mụ na Ya Mewe Enyi Maka Mmekọahụ?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Mmadụ Gwa M Ka Mụ na Ya Mewe Enyi Maka Mmekọahụ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Mmadụ Gwa M Ka Mụ na Ya Mewe Enyi Maka Mmekọahụ?

“Ụfọdụ ndị na-eto eto na-eme enyi nanị ka ha wee hụ mmadụ ole ha pụrụ iso nwee mmekọahụ.”—Penny. *

“Ụmụ nwoke anaghị ezo ọnụ ekwu ya. Ha na-etu ọnụ na ha nwere enyi nwanyị ma nọrọkwa n’elu ya na-eso ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị ọzọ enwe mmekọahụ.”—Edward.

“Ndị gwara m ka mụ na ha mewe enyi maka mmekọahụ gwara m ya n’ezoghị ọnụ. M sịgodị ha mba, ọ naghị eme ka ha kwụsị!”—Ida.

OBODO dị iche iche nwegasịrị ihe ha na-akpọ ụdị enyi a. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ bi na Japan nke aha ya bụ Akiko kwuru na ‘aha ha ji mara ya bụ sefre, nke pụtara “enyi maka mmekọahụ.” Ihe mere ha ji bụrụ enyi bụ nanị ka ha wee na-enwe mmekọahụ.’

Ihe ọ sọrọ obodo ọ bụla ha kpọwa ya, ọ pụtara otu ihe ahụ—ya bụ, iso mmadụ enwe mmekọahụ n’enyeghị onye ahụ obi gị. * Ụfọdụ ndị ntorobịa na-etudị ọnụ na ha nwere ndị enyi ha na ha pụrụ inwe mmekọahụ n’enweghị ihe ọ na-efu ha. Otu nwa agbọghọ kwuru, sị: “Ihe a na-eme n’ụdị enyi a bụ imejụ agụụ mmekọahụ ozugbo. I nwetahaala ihe ị chọrọ, ị gawara ụwa gị.”

Dị ka Onye Kraịst, i kwesịrị ‘ịgbanahụ ịkwa iko.’ * (1 Ndị Kọrint 6:18) Ebe ọ bụ na ị ma nke a, ikekwe, ị na-agbalịsi ike izere ọnọdụ ndị pụrụ itinye gị ná nsogbu. Ma, mgbe ụfọdụ, nsogbu na-achọrọ gị bịa. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Cindy kwuru, sị, “N’ụlọ akwụkwọ, ọtụtụ ụmụ nwoke na-agwa m ka mụ na ha mewe enyi maka mmekọahụ.” Otu ihe ahụ pụrụ ime n’ebe ọrụ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Margaret kwuru, sị, “Ọga m gwara m ka mụ na ya mewe enyi maka mmekọahụ. O nyegidere m nsogbu maka ya nke na agbara m arụkwaghịm n’ọrụ ahụ!”

N’aka nke ọzọ, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na otu obi na-agwa gị ka i kwere. Bible na-ekwu, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa.” (Jeremaịa 17:9) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lourdes chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu. O kwetara, sị, “Enwere m mmasị n’ahụ́ nwoke ahụ gwara m ka mụ na ya nwee mmekọahụ.” Otú ahụ ka ọ dịkwa Jane. O kwuru, sị, “Obi m nabatara ya. Ịsị ya mba bụ ihe kasị sie ike omume m metụrụla.” Edward, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, kwetakwara na ọ dịghị mfe ịnọgide na-adị ọcha n’omume. O kwuru, sị, “Ọtụtụ ụmụ agbọghọ agwala m ka mụ na ha nwee mmekọahụ, ịsị ha mba bụ ihe kasị taa akpụ m na-eme dị ka Onye Kraịst. Ọ na-esiri m ike ịsị ha mba!”

Ọ bụrụ na ọ dịtụla gị otú ọ dị Lourdes, Jane, na Edward, ma gị emee ihe ziri ezi n’anya Jehova Chineke, e kwesịrị ịja gị mma maka ime ihe ziri ezi. Ị pụrụ inweta nkasi obi site n’ịmara na Pọl onyeozi n’onwe ya gbasiri mbọ ike iji na-ewepụ echiche ọjọọ ndị na-abata ya n’obi mgbe nile.—Ndị Rom 7:21-24.

Olee ụkpụrụ Bible ndị i kwesịrị iburu n’uche ma ọ bụrụ na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye gị agwa gị ka gị na ya nwee mmekọahụ?

Mata Ihe Mere O Ji Dị Njọ Iso Onye Na-abụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Enwe Mmekọahụ

Bible katọrọ mmadụ iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya enwe mmekọahụ. N’ezie, ịkwa iko bụ mmehie dị oké njọ nke na ndị na-akwa iko “agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ka i wee ghara ịbụ onye a nwatara iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye gị nwee mmekọahụ, gị onwe gị aghaghị ile omume ahụ anya otú Jehova si ele ya. Gị onwe gị aghaghị ịhọrọ izere mmekọahụ rụrụ arụ.

“Ekwenyesiri m ike na ụzọ Jehova bụ ụzọ kasị mma isi bie ndụ.”—Karen, o si Canada.

“Ọtụtụ ihe na-efunahụ mmadụ mgbe o leghaara iwu Jehova nyere banyere omume anya n’ihi ihe ụtọ ga-adịru nanị obere oge.”—Vivian, o si Mexico.

“Cheta na o nwere onye ị bụ nwa ya, na o nwere ọtụtụ ndị ị bụ enyi ha, nakwa na o nwere ọgbakọ ị nọ na ya. Ị ga-emechu ndị a nile ihu ma i kwere ịkwa iko!”—Peter, o si Britain.

Pọl onyeozi dere, sị: “Nọgidenụ na-ejide n’aka ihe Onyenwe anyị na-anara nke ọma.” (Ndị Efesọs 5:10) Ọ bụrụ na i lewe ịkwa iko anya otú Jehova si ele ya, ị ga-enwe ike ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị,’ n’agbanyeghị na ihe ọjọọ ahụ pụrụ ịdị na-agụ ahụ́ gị na-ezughị okè agụụ.—Abụ Ọma 97:10.

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a chọrọ ka ị gụọ: Jenesis 39:7-9. Rịba ama otú Josef si jiri obi ike guzogide ọnwụnwa nke inwe mmekọahụ na ihe nyeere ya aka iguzogide ya.

Jiri Ihe Ndị I Kweere Na-eme Ọnụ

Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ebe ndị na-eto eto ji nganga pụta ma gbachitere ihe ndị ha kweere. Dị ka Onye Kraịst, i nwere ihe ùgwù nke iji omume ọma gị gbachitere aha Chineke. Ekwela ka mkpebi gị, nke bụ́ na ọ dịghị ihe ga-eme ka i nwee mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, mewe gị ihere.

“Mee ka o doo anya site ná mmalite na i nwere ụkpụrụ omume ndị ị na-agbaso.”—Allen, o si Germany.

“Ekwela ka ihe ndị i kweere na-eme gị ihere.”—Esther, o si Nigeria.

“Ndị na-agwa gị ka gị na ha mewe enyi maka mmekọahụ agaghị ege gị ntị ma i kwuo ihe dị ka, ‘Ndị mụrụ m agaghị ekwe ka mụ na gị mewe enyi.’ Ị ghaghị ime ka ha mara na gịnwa enweghị mmasị ka gị na ha mewe enyi.”—Janet, o si South Africa.

“Ụmụ nwoke mụ na ha gakọrọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ma onye m bụ, ha makwa na mgbalị ọ bụla ha na-eme inweta m bụ igbu oge.”—Vicky, o si United States.

Gị iguzosi ike n’ihe i kweere bụ otu ihe na-egosi na ị ghọwala Onye Kraịst tozuru okè.—1 Ndị Kọrint 14:20.

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a chọrọ ka ị gụọ: Ilu 27:11. Chọpụta otú omume gị pụrụ isi gosi na ị kwadoro otu ihe kasị mkpa n’eluigwe na ụwa—ya bụ, ido aha Jehova nsọ!

Kwụsie Ike ná Mkpebi Gị!

Ọ dị mkpa ịsị mba. Ma ụfọdụ pụrụ iwere ya na ọ bụghị na ị chọghị kama na ị kpacha anya na-eme ka à ga-asị na ị chọghị.

“Ọ bụrụ na ị sị mba, onye ahụ pụrụ iwere ya dị ka ihe ịma aka, dị ka ihe mgbochi ọ dị mkpa ka o merie. Nke a ga-emekwa ka ọ chụpagide gị.”—Lauren, o si Canada.

“Ihe nile banyere gị—gụnyere otú i si eji ejiji, otú i si ekwu okwu, ndị gị na ha na-akparịta ụka, otú gị na ndị mmadụ si akpa—kwesịrị igosi na i kweghị.”—Joy, o si Nigeria.

“Ị ghaghị ịsị mba n’ụzọ dara ụda ma doo anya.”—Daniel, o si Australia.

“Emela anya ụra! Mgbe nwa okorobịa konyere m aka n’olu n’ụzọ na-egosi na ọ na-achọ ka mụ na ya nwee mmekọahụ, ana m agwa ya, sị, ‘Wepụ aka n’olu m!’ ana m agbarụkwa ihu pụọ.”—Ellen, o si Britain.

“Ị ghaghị ikwu ya hoo haa na i nweghị mmasị na ya nakwa na ọ dịghị mgbe ị ga-enwe mmasị na ya. Nke ahụ abụghị oge imewe anya ụra!”—Jean, o si Scotland.

“Otu nwa okorobịa nọgidere jiri arịrịọ na njakịrị na-enye m nsogbu. O megidere ya ruo mgbe m bịara kụsuo ya. Mgbe ahụzi ka ọ kwụsịrị inye m nsogbu.”—Juanita, o si Mexico.

“Ọ dị mkpa ka i mee ka o doo ha anya na ọ dịghị ihe ga-eme ka gị na ha nwee mmekọahụ. Ya adịla mgbe ị ga-anata ụmụ nwoke na-achọ inweta gị ihe. Ha pụrụ iji ya gbado gị, dị ka à ga-asị na i ji ha ụgwọ.”—Lara, o si Britain.

Jehova ga-enyere gị aka ma ị kwụsie ike ná mkpebi gị. N’ihi ahụmahụ ọbụ abụ bụ́ Devid nwere, o kwuru banyere Jehova, sị: “N’ebe onye ebere nọ Ị ga-egosi onwe Gị onye ebere.”—Abụ Ọma 18:25.

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a chọrọ ka ị gụọ: 2 Ihe E Mere 16:9. Rịba ama otú Jehova si nwee ọchịchọ inyere ndị obi ha zuru okè n’ebe ọ nọ aka.

Jiri Amamihe Mee Ihe

Bible na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya.” (Ilu 22:3) Olee otú ị pụrụ isi gbasoo ndụmọdụ ahụ? Ọ bụ site n’iji amamihe eme ihe!

“Zere nnọọ ndị na-ekwukarị banyere ihe ndị ahụ.”—Naomi, o si Japan.

“Zere mkpakọrịta na ọnọdụ ndị pụrụ ịdị ize ndụ. Dị ka ihe atụ, ama m ụfọdụ ndị a nwatarala n’ihi na mmanya na-egbu ha.”—Isha, o si Brazil.

“Ewerela ihe ndị dị ka adres gị ma ọ bụ nọmba fon gị nye onye ị na-ekwesịghị inye ya.”—Diana, o si Britain.

“Ekwela ka ụmụ klas gị na-ebi gị ọmà aghara aghara.”—Esther, o si Nigeria.

“Lezie ejiji gị anya. Ejiji gị ekwesịghị ịdị na-akpali agụụ mmekọahụ.”—Heidi, o si Germany.

“Gị na ndị mụrụ gị ịdị ná mma na iso ha na-ekwurịta ihe ndị a bụ ezigbo ihe nchebe.”—Akiko, o si Japan.

Wepụta oge tụlee okwu gị, omume gị, ndị gị na ha na-akpakọrịta, na ebe ndị ị na-agakarị. Jụzie onwe gị, sị, ‘M̀ na-etinye onwe m n’ọnọdụ nwere ike ime ka mmadụ gwa m ka mụ na ya nwee mmekọahụ, ma ọ bụkwanụ, m̀ na-eme n’amaghị ama ka ndị ọzọ chewe na m chọrọ ka mụ na ha nwee mmekọahụ?’

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a chọrọ ka ị gụọ: Jenesis 34:1, 2. Chọpụta otú ịnọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị si butere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Daịna nsogbu.

Cheta na Jehova Chineke adịghị ele mmadụ iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya enwe mmekọahụ anya dị ka ihe na-adịghị ihe ọ bụ; gị onwe gị ekwesịghịkwa ile ya anya dị ka ihe na-adịghị ihe ọ bụ. Bible na-ekwu, sị: “Ọ dịghị onye na-akwa iko ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha . . . nwere ihe nketa ọ bụla n’alaeze nke Kraịst ahụ na nke Chineke.” (Ndị Efesọs 5:5) Site n’iguzosi ike maka ezi ihe, ị pụrụ ịnọgide na-enwe akọnuche dị ọcha, nọgidekwa na-enwe ùgwù. Dị ka nwa agbọghọ aha ya bụ Carly si kwuo ya, “Gịnị mere ị ga-eji kwere ka onye ọzọ jiri gị mejụọ agụụ mmekọahụ ya ozugbo? Lezie ihe ị tara ahụhụ chekwaa anya!”

Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanweela aha ndị dị n’isiokwu a.

^ par. 7 Ọ pụkwara ịgụnye ihe ndị ọzọ, dị ka gị na onye ahụ ịdị na-amị ọnụ ma ọ bụ gị na ya ịdị na-apị ibe unu aka n’akụkụ ahụ́ unu ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.

^ par. 8 Ịkwa iko na-agụnye ihe ndị dị ka nwoke na nwanyị inwe mmekọahụ, isi n’ike enwe mmekọahụ, iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya, mmadụ ịpịgharị onye ọzọ aka n’akụkụ ahụ́ o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye ji akụkụ ahụ́ ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị eme n’ụzọ na-ezighị ezi.

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ N’agbanyeghị na mmekọahụ rụrụ arụ pụrụ ịdị na-atọ anụ ahụ́ na-ezughị okè ụtọ, gịnị mere o ji dị njọ?

▪ Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye gị agwa gị ka gị na ya nwee mmekọahụ?

[Igbe dị na peeji nke 15]

▪ Bible kwuru na onye na-akwa iko “na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Ndị Kọrint 6:18) Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Chọpụta ma ị̀ pụrụ icheta ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ahụ. Detuo nke ọ bụla i chetara n’okpuru ebe a.

․․․․․

Ihe Enyemaka: Iji nyere gị aka ịza ajụjụ ahụ a jụrụ n’elu, lee Teta! June 8, 1992, peeji nke 20, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Imehie Megide Ahụ nke Onwe Onye.” Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebipụta Teta!.

[Igbe dị na peeji nke 17]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

“N’ụlọ akwụkwọ, otu nwa klas anyị gwara m ka mụ na ya mewe enyi maka mmekọahụ. O were m oge tupu mụ enwee ike ịghọta ihe ọ na-agwa m. Adị m nanị afọ 11 mgbe ahụ.”—Leah.

N’oge a, a na-eme ka ụmụaka mata ihe mmekọahụ dị ka ya mgbe ha ka dị nnọọ obere. Ogologo oge gara aga, Bible buru amụma na a ga-eji “oge pụrụ iche nke siri ike obibi” mara ‘ụbọchị ikpeazụ’ a, bụ́ mgbe ndị mmadụ ga-abụ ndị “na-enweghị njide onwe onye” na “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1, 3, 4) Ime enyi maka mmekọahụ, bụ́ nke e kwuru banyere ya n’isiokwu a e dere maka ndị na-eto eto, bụ otu n’ime ọtụtụ ihe ndị na-egosi na amụma a emezuola.

Ụwa taa dị nnọọ iche n’ụwa nke a zụlitere unu bụ́ ndị nne na nna. Ma, nsogbu ndị unu nwere n’oge nke unu yitụrụ ndị ụmụ unu na-enwe taa. N’ihi ya, unu ekwela ka mmetụta ọjọọ ndị gbara ụmụ unu gburugburu rie unu ọnụ ma ọ bụ menye unu ụjọ. Kama nke ahụ, kpebisienụ ike inyere ha aka ime ihe ahụ Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ime n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, nke bụ́: “Yikwasịnụ ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:11) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto na-agbasi mbọ ike ime ihe ziri ezi, n’agbanyeghị mmetụta ọjọọ ndị ha na-enweta. Olee otú unu pụrụ isi nyere ụmụ unu aka ime otu ihe ahụ?

Otu ụzọ unu ga-esi mee ya bụ site n’iji ihe e dere n’isiokwu a soro nwa unu nwoke ma ọ bụ nwa unu nwanyị nwee mkparịta ụka. N’akụkụ bụ́ “akụkụ Akwụkwọ Nsọ a chọrọ ka ị gụọ,” e depụtara akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ga-eme ka mmadụ chee echiche. Ụfọdụ n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ kọrọ banyere ndị dịrị ndụ n’ezie bụ́ ndị guzosiri ike maka ezi ihe ma nweta ngọzi, ma ọ bụkwanụ ndị leghaara iwu Chineke anya ma taa ahụhụ ya. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị nke ọzọ kwuru ụkpụrụ ndị pụrụ inyere ụmụ unu aka ịghọta nnukwu ihe ùgwù unu na ha nwere ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Chineke. Ọ̀ bụ unu echeghị na ọ ga-adị mma ka unu na ha tụlekọọ isiokwu a na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ ọnụ?

Ịgbaso ụkpụrụ Chineke na-abara anyị uru mgbe nile. (Aịsaịa 48:17, 18) Ileghara ha anya na-ebute nsogbu mgbe nile. Ndị na-ebipụta Teta! na-arịọ ka Jehova gọzie unu ka unu na-agbalịsi ike ịkụnye iwu na ụkpụrụ Chineke n’ime obi ụmụ unu.—Deuterọnọmi 6:6, 7.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọ dị mkpa ka i mee ka o doo ya anya na ọ dịghị mgbe ị ga-ekwe ka gị na ya nwee mmekọahụ