Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Mmadụ Ịbụ Onye Kraịst Pụtara?

Gịnị Ka Mmadụ Ịbụ Onye Kraịst Pụtara?

Echiche nke Bible

Gịnị Ka Mmadụ Ịbụ Onye Kraịst Pụtara?

“N’OBODO m, onye e weere dị ka Onye Kraịst bụ onye na-aga chọọchị otu ugboro n’izu,” ka Kingsley, bụ́ onye si n’otu mba dị n’Africa kwuru. Raad, nke si n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, kwuru, sị: “N’obodo anyị, a na-ele Ndị Kraịst anya dị ka òtù na-eṅomi mba ndị mepere emepe na Europe nakwa n’America ma a bịa n’ihe metụtara ejiji, ememe, na otú e si emeso ụmụ nwanyị ihe.”

Ma, ịbụ Onye Kraịst ọ̀ pụtara nanị mmadụ ịga chọọchị otu ugboro n’izu na ịgbaso ụkpụrụ na omenala ụfọdụ a ma ama? Ọ bụrụ na e lee ya anya nke ọma, ihe okwu ahụ bụ́ “Onye Kraịst” pụtara ó kwesịghị ịbụ onye na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụdị ndụ Kraịst biri nakwa n’ụdị àgwà, omume, na ụkpụrụ ọ kụziri banyere ya? * Olee otú Ndị Kraịst si soo ụzọ Kraịst mgbe okpukpe ahụ ka malitere ọhụrụ?

Okpukpe Ndị Kraịst n’Oge Gboo Metụtara Ụzọ Ndị Kpere Ya Si Bie Ndụ

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.” (Jọn 15:14) Ebe ọ bụ na ozizi Jizọs metụtara akụkụ nile nke ndụ ndị na-eso ụzọ ya, ihe ha kpọrọ okpukpe ha n’oge ahụ bụ “Ụzọ Ahụ.” (Ọrụ 9:2) Ka obere oge gasịrị, “site ná nduzi Chineke [a gụrụ ha] aha bụ́ Ndị Kraịst.” (Ọrụ 11:26) Aha ọhụrụ ahụ ha malitere ịza gosiri na ha kweere na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, onye mere ka ụmụ mmadụ mara ihe bụ́ uche Nna ya nke eluigwe. Ihe a ha kweere mere ka ha malite ibi ụdị ndụ nke dị iche na nke ndị ọzọ gbara ha gburugburu na-ebi.

Ozizi Kraịst mere ka ndị na-eso ụzọ ya gbasoo ihe Bible kụziri, nke pụtara na ha aghaghị izere “ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, ikpere arụsị, ime mgbaasị, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, . . . ịṅụ oké mmanya, oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị dị ka ndị a.” (Ndị Galeshia 5:19-21; Ndị Efesọs 4:17-24) Pọl onyeozi chetaara Ndị Kraịst nọ na Kọrint na ụfọdụ n’ime ha emetụla ihe ndị a. Ya agwazie ha, sị: “Ma a sachawo unu, ma e dowo unu nsọ, ma a kpọwo unu ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

N’akwụkwọ ya bụ́ The Rise of Christianity, E. W. Barnes kọrọ, sị: “N’ihe ndekọ ya ndị mbụ nke a nabatara, e gosiri okpukpe Ndị Kraịst n’ụzọ bụ́ isi dị ka ndị na-eme omume ọma na ndị na-erube isi n’iwu. Ndị òtù ya chọsiri ike ịbụ ezigbo ụmụ amaala na ndị na-erubere ọchịchị isi. Ha anabataghị agazighị agazi na arụrụala nke ndị ọgọ mmụọ. Ná ndụ nke onwe ha, ha na-agbalị ịhụ na ha na ndị agbata obi ha dị n’udo, ha bụkwa ndị enyi a pụrụ ịtụkwasị obi. A kụziiri ha inwe anya udo, ịrụsi ọrụ ike, na ibi ndụ dị ọcha. Ọ bụrụ na ha agbasoo ụkpụrụ ha n’ezie, n’agbanyeghị àgwà ọjọọ na ndụ ịla n’iyi gbara ha gburugburu, ha na-eme ihe n’eziokwu ma na-ekwu eziokwu. Ụkpụrụ ha n’ihe banyere mmekọahụ dị elu: ha sọpụụrụ njikọ alụmdi na nwunye, ndụ ezinụlọ ha dịkwa ọcha.” Ihe ndị a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị e ji mara Onye Kraịst n’oge mbụ.

Ihe ọzọ pụtara ìhè e ji mara Ndị Kraịst n’oge mbụ bụ ịnụ ọkụ n’obi ha ji kwusaa ozi ọma. Kraịst nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Matiu 28:19, 20) Jean Bernardi, bụ́ prọfesọ na Mahadum Sorbonne, nke dị na Paris, France, kwuru, sị: “[Ndị Kraịst] kwesịrị ịdị na-aga agwa mmadụ nile okwu n’ebe nile. Ma n’okporo ámá ma n’obodo ukwu, ma n’ebe ọhaneze na-anọkarị ma n’ụlọ ha. Ma à nabatara ha ma à nabataghị ha. Ha kwesịrị ịdị na-agwa ma ndị ogbenye ma ndị ọgaranya ha bara na-ebu isi okwu. . . . Ha aghaghị isi n’okporo ụzọ, jirikwa ụgbọ mmiri, ma hụ na ha gazuru ụwa nile.”

Okpukpe Ndị Kraịst nke Bụ́ Ezigbo Ya Taa

Ezi Ndị Kraịst nke oge a kwesịrị ịdị iche n’otú ha si ebi ndụ dị nnọọ ka ezi Ndị Kraịst mere na narị afọ mbụ. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova na-agbalị ịgbasochi ihe nlereanya Ndị Kraịst oge gboo setịpụrụ anya. Ndị ọzọ na-ahụkwa mgbalị ha na-eme ibi ndụ n’ụzọkwekọrọ n’ozizi Bible.

Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru na a maara Ndịàmà Jehova dị ka “otu n’ime ìgwè ndị kasị akpa àgwà ọma n’ụwa.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ Deseret News nke a na-ebipụta na Salt Lake City, Utah, kwuru na Ndịàmà Jehova “na-agba ndị ezinụlọ ume ịdị na-akpachi anya, ha na-azụpụtakwa ụmụ amaala na-arụsi ọrụ ike ma na-eme ihe n’eziokwu.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Ndị òtù ha na-agbaso ụkpụrụ omume ndị dị elu. Ha kweere na ise siga, ịnụ oké mmanya, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịgba chaa chaa, inwe mmekọahụ aghara aghara na mmadụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ bụcha omume na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. Ha na-akụziri ndị mmadụ ịdị na-eme ihe n’eziokwu na ịdị uchu n’ọrụ.”

Ndịàmà Jehova ejighịkwa ọrụ ha nwere nke bụ́ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma egwuri egwu. Banyere nke a, akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “Ọrụ bụ́ isi onye ọ bụla n’ime ha nwere . . . bụ ịgbara Jehova àmà site n’ịkpọsa Alaeze Ya nke na-abịanụ. . . . Iji bụrụ ezi Onyeàmà, mmadụ aghaghị ime nkwusa dị irè n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ.”

N’ụzọ doro anya, mmadụ ịbụ onye òtù nke otu n’ime ọtụtụ okpukpe ndị Krisendọm apụtaghị na onye ahụ bụ ezigbo Onye Kraịst. Jizọs n’onwe ya buru amụma na a ga-enwe Ndị Kraịst adịgboroja. (Matiu 7:22, 23) Ndịàmà Jehova na-agba gị ume ịbịa mụta ihe Jizọs kụziri ma tinye ha n’omume. Nke ahụ bụ ihe mmadụ ịbụ Onye Kraịst pụtara. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu emee ha.”—Jọn 13:17.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 4 Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara Onye Kraịst dị ka onye kweere na Jizọs bụ Kraịst ma ọ bụ onye na-ekpe okpukpe nke dabeere n’ụzọ ndụ Jizọs nakwa n’ihe ndị ọ kụziri.

Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?

▪ Ole ndị ka Jizọs kpọrọ ndị enyi ya?—Jọn 15:14.

▪ Olee àgwà ezi Ndị Kraịst kwesịrị izere?—Ndị Galeshia 5:19-21.

▪ Olee ọrụ Ndị Kraịst kwesịrị ịrụ?—Matiu 28:19, 20.

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Ezi Ndị Kraịst ji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma dị nnọọ ka ha mere ọtụtụ narị afọ gara aga