Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere E Ji Ejikarị M Atụnyere Ndị Ọzọ?

Gịnị Mere E Ji Ejikarị M Atụnyere Ndị Ọzọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Mere E Ji Ejikarị M Atụnyere Ndị Ọzọ?

“Ọ na-agba m ara ma ndị mụrụ m ma ọ bụ ndị nkụzi m jiri m na-atụnyere ndị ọzọ.”—Mia. *

“Iji m atụnyere ndị ọzọ na-eme ka ọ dị m ka abachaghị m uru, n’ihi na n’ime onwe m, ọ dịla mbụ dị m ka m bụrụ onye ahụ e ji m na-atụnyere.”—April.

N’ỤLỌ akwụkwọ, onye nkụzi gị na-abara gị mba na ị naghị eme nke ọma ná mgbakọ na mwepụ dị ka otu nwa klas gị. N’ụlọ unu, papa gị ma ọ bụ mama gị na-abara gị mba na ị naghị adị ọcha ka nwanne gị nwanyị. Mmadụ na-adị agwa gị, sị, “Mgbe mama gị ha ka gị, ọ mara nnọọ ezigbo mma!” Okwu dị otú a na-agbawa gị obi n’ihi na ọ na-eme ka i chewe ma onye ahụ ọ̀ na-ele gị anya dị ka onye jọrọ njọ. Nke a nwere ike ime ka ị chọọ iji oké olu kwuo, sị, “Ọ̀ bụ na ndị mmadụ anaghị ahụ mụnwa? Olee ihe mere ha ji ejikarị m atụnyere onye ọzọ?”

Gịnị mere o ji ewe mmadụ iwe ma e jiri ya na-atụnyere ọzọ? Ò nwere ezigbo ihe nwere ike isi na ya pụta? Olee otú ị ga-esi die ya ma ndị mmadụ jiri gị na-atụnyere ndị ọzọ?

Gịnị Mere O Ji Ewe Mmadụ Iwe Ma E Jiri Ya Na-atụnyere Ndị Ọzọ?

Otu ihe mere o ji ewe mmadụ iwe ma e jiri ya tụnyere onye ọzọ bụ na, mgbe ụfọdụ, ọ na-akọ onye ahụ ebe o ji ya. Ya bụ na, ihe ahụ ndị mmadụ na-ekwupụta na-abụkarị ihe onye ahụ na-agwa onwe ya. Dị ka ihe atụ, Becky kwetara, sị, “Ọ na-abụ m lechaa ụmụaka ndị ọtụtụ mmadụ nwere mmasị n’ebe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ, mụ echewe, sị, ‘A sị nnọọ na m dị ka ha, ọtụtụ mmadụ ga-enwe mmasị n’ebe m nọ.’”

Olee ihe na-akpali ndị mmadụ iche na ha anaghị eme nke ọma? Tụlee ihe na-eme n’ahụ́ gị nakwa n’uche gị. O nwere ike ịbụ na ahụ́ gị na-agbanwe n’ike n’ike. Ihe anaghị adabachaziri gị na ndị mụrụ gị. O nwekwara ike ịbụ na otú i si ele onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị anya agbanweela nke ukwuu. Ya mere, i nwere ike ịmalite iche, sị, ‘Otú m si eto ọ̀ bụkwa otú ndị ọzọ si eto?’

Ikekwe, ị na-eche na nanị otú i nwere ike isi chọpụta bụ site n’iji onwe gị atụnyere ndị ntorobịa ibe gị bụ́ ndị ahụ́ ha na-agbanwe otú ahụ́ nke gị si agbanwe. Ebe ahụ ka ị nọrọ daa ya! Ọ bụrụ na o yie ka hà na-eme nke ọma karịa gị, ị ga-echezi na ị naghị eme nke ọma. Mgbe ụfọdụ ndị toro eto jụziri gị, sị, ‘Gịnị mere na i nweghị ike ịdị ka onye a ma ọ bụ onye a?,’ i nweziri ike iche na ihe ahụ obi gị nọ na-agwa gị kemgbe bụ eziokwu—ya bụ, na ị dịghị ka ibe gị!

Otu onye a na-akpọ April kwuru ihe ọzọ mere mmadụ iji mmadụ atụnyere onye ọzọ ji akpasu iwe. O kwuru, sị, “Mgbe e ji gị tụnyere onye ọzọ, karịsịa onye gị na ya na-akpa, o nwere ike ime ka i nwewere ya anyaụfụ ma wesawa ya iwe.” Ụdị ihe ahụ emetụla nwa agbọghọ a na-akpọ Mia. O yiri ka ndị mụrụ ya na ndị nkụzi ya hà na-ejikarị ya atụnyere nwanne ya nke tọrọ ya. Mia kwuru, sị, “Ha na-agwa m ihe nile o mere mgbe ọ ha ka m.” Olee mmetụta nke a nwere n’ahụ́ ya? “Ọ na-adị m ka à ga-asị na mụ na nwanne m nwanyị na-ama aka. Mgbe ụfọdụ, ana m ewesodị ya iwe.”

N’eziokwu, iji mmadụ atụnyere ndị ọzọ pụrụ imebi ihe. Tụlee ihe mere ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, “esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ” bilitere n’etiti ndịozi ahụ. Gịnị kpatara ya? Ihe kpatara ya bụ na ha ji onwe ha atụnyere ibe ha, na-arụkwa ụka banyere “onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu.” (Luk 22:24) Obi abụọ adịghị ya na iji mmadụ atụnyere onye ọzọ mgbe ụfọdụ na-agbawa obi. Ma, ọ̀ bụ mgbe nile ka iji mmadụ atụnyere ndị ọzọ na-adị njọ?

Mgbe Iji Mmadụ Atụnyere Ndị Ọzọ Dị Mma

Chegodị banyere nwa okoro bụ́ Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru, bụ́ ndị a kọrọ banyere ha n’ime Bible. Ndị ntorobịa a achọghị iri ihe oriri ọma eze Babịlọn n’ihi na iwu Chineke megidere ya. (Levitikọs 11:4-8) Iji mee ka onye na-elekọta ha kweta inyere ha aka, Daniel sịrị ka e mee nnwale. Ọ gwara onye na-elekọta ha na ọ bụrụ na ha erie nri ndị Iwu Chineke nabatara ruo ụbọchị iri, ya jiri ha tụnyere ụmụ okoro ndị ọzọ nọ n’obí eze. Gịnị siri na ya pụta?

Bible kwuru, sị: “N’ọgwụgwụ ụbọchị iri e wee hụ na [ndị Hibru ahụ] dị mma n’ile ha anya, ha makwara abụba n’anụ ahụ́, karịa ụmụ okoro ahụ nile ndị na-eri ihe oriri ọma eze.” (Daniel 1:6-16) Rịba ama na ihe mere nnwale ahụ ji gaziere ha abụghị n’ihi na o nwere otú Daniel na ndị enyi ya si emeta ihe nke ọma karịa ụmụ okoro ndị ọzọ. Kama ihe bụ́ isi kpatara ya bụ na ụmụ okoro Hibru ahụ họọrọ irube isi n’iwu Chineke nyere ndị ya.

Ị̀ nọ n’ọnọdụ yiri nke ndị Hibru atọ ahụ? Ọ bụrụ na ị na-ebi ndụ dị ọcha nke kwekọrọ n’ihe Bible na-akụzi, ị ga-adị iche n’ebe ndị ntorobịa ndị ọzọ nọ. Nke a nwere ike ịgba ụfọdụ ndị chọpụtara na ị dị iche gharịị, ha amalitekwa ‘ikwujọ gị.’ (1 Pita 4:3, 4) Ma, mgbe ndị ọzọ hụrụ ihe ọma ndị si n’àgwà ọma gị pụta, o nwedịrị ike ịkpali ha ịmụ banyere Jehova. (1 Pita 2:12) N’ọnọdụ a, iji gị tụnyere ndị ọzọ pụrụ ịdị mma.

E nwekwara ụzọ ọzọ iji mmadụ atụnyere ndị ọzọ pụrụ isi baa uru. Dị ka ihe atụ, i nwere ike iche na ị na-arụ ókè nke gị n’ọrụ ndị unu nwere n’ụlọ—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ma e jiri ya tụnyere ihe nwanne gị nwoke ma ọ bụ nwanne gị nwanyị na-arụ. Ma, o nwere ike ịbụ na ndị mụrụ gị echeghị otú ahụ. Iji gbazie echiche gị, ha nwere ike ịgụrụ gị banyere otu onye n’ime Bible ma gwa gị ka i jiri àgwà gị na omume gị tụnyere nke onye ahụ.

Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ichetara gị na ọ bụ ezie na a na-akpọ Jizọs Onyenwe Anyị na Onye Ozizi, ọ sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 13:12-15) Ha nweziri ike ịgba gị ume iṅomi Jizọs site n’ịbụ onye dị umeala n’obi na onye na-arụsi ọrụ ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na Bible na-agba Ndị Kraịst nile ume, ma okenye ma nwata, ka ha jiri onwe ha na-atụnyere Kraịst ma na-agbalị ‘ịdị na-agbasochi nzọụkwụ ya anya.’ (1 Pita 2:21) Ụdị ntụnyere a na-eme ka anyị na-adị umeala n’obi, ọ na-enyekwara anyị aka inwe àgwà ndị na-amasị Jehova.

Ihe Ndị Ị Ga-eme Ma E Jiri Gị Tụnyere Ndị Ọzọ n’Ụzọ Na-adịghị Mma

N’eziokwu, ọ pụrụ iwe gị iwe ma gbawaa gị obi ma e jiri gị na-atụnyere ụmụnne gị ma ọ bụ ndị ọgbọ gị n’ụzọ na-adịghị mma. Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ dị otú ahụ? Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” (Ilu 19:11) Olee otú ezi uche pụrụ isi nye aka? O nwere ike ị gaghị eche otú ahụ, ma ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye nkụzi gị nke na-eji gị atụnyere onye ọzọ nwere ike ibu ọdịmma gị n’obi. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Cathy kwuru, sị: “Mgbe mmadụ ji m tụnyere ndị ọzọ, ana m ajụ onwe m, sị, ‘Olee otú o si na-achọ inyere m aka?’” Cathy chọpụtara na ọ bụrụ na ya elee ntụnyere ahụ anya n’ụzọ dị mma, o nwedịrị ike ọ gaghị agbawa ya obi ma ọ bụ kpasuo ya iwe.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka à na-eji gị atụnyere ndị ọzọ mgbe nile? Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ na-adị gị ka mama gị ma ọ bụ papa gị ọ̀ na-ejikarị gị atụnyere otu nwanne gị n’ụzọ na-adịghị mma. I nwere ike ịgakwuru ya ma jiri nkwanye ùgwù kọwaara ya otú obi na-adị gị ma o jiri gị tụnyere nwanne gị ahụ. O nwere ike ịbụ na ndị mụrụ gị amaghị na ọ na-ewe gị iwe ma ha jiri gị tụnyere ya.

Chetakwa na e nwere “mgbe ikwu okwu,” nweekwa “mgbe ịgba nkịtị.” (Eklisiastis 3:7) Kama iji iwe bawa mba mgbe ọzọ e ji gị tụnyere mmadụ, chere ruo mgbe obi dajụrụ gị, ọ dajụchaa gị, gị agazie ka gị na ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye ahụ ji gị tụnyere onye ọzọ kwurịta ya. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ihe ị ga-agwa ya ga-aka eru ya n’obi karịa mgbe ị na-aba mba.—Ilu 16:23.

Ọtụtụ mgbe, ị pụrụ ime ka ntụnyere e ji gị tụnyere onye ọzọ n’ụzọ na-adịghị mma ghara iwecha gị iwe ma i lekwasị anya n’ihe ndị ị na-emeta nke ọma. Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “Ekwela ka onye ọ bụla lelịa onye ntorobịa ị bụ anya.” (1 Timoti 4:12) Timoti ka dị nnọọ obere mgbe a họpụtara ya dị ka okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị na-eji Timoti atụnyere ndị okenye ndị ọzọ katarala ahụ́, ndị kakwa ya nwee ahụmahụ. Ma o doro anya na ntụnyere ndị dị otú ahụ enweghị ebe ha gbakwasịrị ụkwụ. N’agbanyeghị na Timoti ka bụ nwa okorobịa, o nwetala ọtụtụ ahụmahụ mgbe ya na Pọl so na-eme njem. Timoti maara eji Okwu Chineke eme ihe nke ọma. O jikwa obi ya nile lekọta ụmụnna ime mmụọ ya.—1 Ndị Kọrint 4:17; Ndị Filipaị 2:19, 20.

N’ihi ya, mgbe ọzọ mmadụ ji gị tụnyere onye ọzọ n’ụzọ na-adịghị mma, jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe o kwuru banyere m ọ̀ bụ eziokwu?’ Ọ bụrụ na o nwetụrụ otú o si bụrụ eziokwu, gbalịa ịmụta ihe na ya. Ma, ọ bụrụ na o kwuru ihe dị ka, “Olee ihe mere na ị dịghị ka nwanne gị?”—nke pụtara na ọ kpọghị okwu aha—gbalịa iji obi ọcha lee ya anya. Gbalịa ike gị ịhụ ihe ndị dị mma banyere ntụnyere ahụ.

Jehova Chineke adịghị eji gị atụnyere onye ọzọ na-ezughị okè iji mata ma ị̀ na-eme nke ọma. (Ndị Galeshia 6:4) Ihe ọ na-ele abụghị ọdịdị elu ahụ́ gị, kama ọ na-ele obi iji ghọta ụdị mmadụ ị bụ. (1 Samuel 16:7) N’ezie, ọ bụghị nanị na Jehova maara ụdị mmadụ ị bụ, kamakwa ọ maara ụdị onye ị na-achọ ịbụ. (Hibru 4:12, 13) Ọ maara na ị pụrụ imehie ihe, ọ na-elekwasịkwa anya n’àgwà ọma ndị i nwere. (Abụ Ọma 130:3, 4) Nanị ịmara nke a ga-enyere gị aka idi ya mgbe e ji gị tụnyere ndị ọzọ.

Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanweela aha ndị dị n’isiokwu a.

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee ụdị ntụnyere na-ewe gị iwe?

▪ Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị na-eji gị atụnyere ndị ọzọ mgbe nile, olee ihe ị ga-eme?

[Ihe Odidde Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 12]

“Ọ ga-akara m mma ma ọ bụrụ na onye na-enye m ndụmọdụ ahapụ ịkpọ aha onye ọzọ ma kwuo, sị, ‘I kwesịrị ịgbalị ịdị ka onye a ma ọ bụ onye a,’ kama, ya buru ụzọ jaa m mma n’ebe ndị m na-eme nke ọma ma jirizie obiọma nyere m aka ịhụ ebe ndị m na-anaghị eme nke ọma.”—Natalie

[Foto dị na peeji nke 13]

I nwere ike iji nkwanye ùgwù kọwaa otú obi na-adị gị ma e jiri gị tụnyere onye ọzọ