Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere M Na-eji Atụbọ?

Gịnị Mere M Na-eji Atụbọ?

Gịnị Mere M Na-eji Atụbọ?

Dọkịta chọrọ inyocha anya m, nke a pụtakwara na ọ ga-edetụ otu ngwá ọrụ ná mkpụrụ anya m. Amaara m ihe ga-eme m. Aga m atụbọ. Ana m atụbọkarị. Ana m atụbọ mgbe ọ bụla nọọsụ ji ntụtụ chọọ ịmịpụta ọbara n’ahụ́ m. Mgbe ụfọdụ, ana m atụbọ ma e kwuwe banyere mmerụ ahụ́.

Dị ka otu nchọpụta e mere na Canada gosiri, ihe dị ka mmadụ atọ n’ime otu narị mmadụ ọ bụla nọ n’ụwa na-atụbọkarị mgbe ọ bụla otu n’ime ihe ndị ahụ e kwuru n’elu mere ha. Ọ bụrụ na ọ na-eme gị, o nwere ike ịbụ na ị gbalịala ọtụtụ ugboro ka ị ghara ịtụbọ ma ọ naghị enwe isi. O nwere ike ịbụ na ị na-aba n’ebe ịsa ahụ́ ka i wee ghara ịtụbọ n’ihu ndị mmadụ. Ma, nke ahụ adịghị mma. I nwere ike ịda tụbọọ mgbe ị na-aga n’ebe ahụ ma merụọ ahụ́. Mgbe ihe a mesịrị m ọtụtụ ugboro, ekpebiri m ịchọpụta ihe na-akpata ya.

Mgbe mụ na otu dọkịta nke nyeere m aka kwurịtachara banyere ya, nakwa mgbe m gụsịrị akwụkwọ ole na ole kwuru banyere nsogbu ahụ, achọpụtara m na ndị Bekee na-akpọ ya vasovagal reaction. A sị na ihe na-akpata ya bụ mgbe e nwere nsogbu n’akụkụ ahụ́ nke na-ahụ na ọbara nọgidere na-erugharị nke ọma, dị ka mgbe mmadụ nọkatara ala ma bilie ọtọ.

N’ọnọdụ ụfọdụ, nke nwere ike ịgụnye oge ị hụrụ ọbara anya ma ọ bụ oge a na-enyocha anya gị, akwara ozi ndị dị gị n’ahụ́ na-amalite ịrụ ọrụ otú ha ga-esi arụ ma i dinara ala, n’agbanyeghị na ị nọdụrụ ala ma ọ bụ guzoro ọtọ. Na mbụ, obi gị na-amalitekarị ịkụsi ike n’ihi ụjọ. E mesịa, obi gị akwụsị ịkụsi ike n’otu ntabi anya, akwara ndị ọbara si erugharị n’ụkwụ gị asakwuo mbara. N’ihi ya, ọbara na-aga n’ụkwụ gị na-abịa hikwuo nne, nke na-agazi n’isi gị ebelatakwa. Ụbụrụ gị agaghịzi na-enweta ikuku ndụ otú o kwesịrị, ihe na-esochizi ya bụ ntụbọ. Olee otú ị pụrụ isi gbochie ihe a ka ọ ghara ime gị?

I nwere ike ilefu anya mgbe a na-amịrị ọbara gị, ma ọ bụkwanụ gị edinara edinara. Dị ka e kwurula, i nwere ike ịma mgbe ọ bụla ị na-achọ ịtụbọ. N’ihi ya, a na-enwekarị oge i nwere ike iji mee ihe tupu ị tụbọọ. Ọtụtụ ndị dọkịta na-atụ aro ka i dinara ala chịkwasị ụkwụ gị n’elu oche ma ọ bụ n’ahụ́ ụlọ. Nke a ga-eme ka ọbara ghara ịgbakọta n’ụkwụ gị, i nwekwara ike isi otú a zere ịtụbọ. Eleghị anya, n’ime minit ole na ole, ị ga-enwetaghachi onwe gị.

Ọ bụrụ na ihe a e kwuru n’isiokwu a enyere gị aka dị ka o sirila nyere m, ị ga-enwe ike ịma mgbe ị na-achọ ịtụbọ. I nweziri ike ime ihe iji kwụsị ya tupu ya emee.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 30]

Idina ala mgbe ị na-anara ọgwụgwọ nwere ike inyere gị aka