Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
▪ N’ime afọ iri gara aga, ala nke ihe dị ka nde ndị ọrụ ugbo iri anọ nọ na China funahụrụ ha n’ihi mmepe obodo na-emepe n’ike n’ike.—AKWỤKWỌ AKỤKỌ BỤ́ CHINA DAILY, CHINA.
▪ N’ime afọ 2005, a lụrụ nnukwu agha dị 28 na agha 11 na-esichaghị ike n’ụwa nile.—AKWỤKWỌ BỤ́ VITAL SIGNS 2006-2007, NKE SI N’AKA ỤLỌ ỌRỤ BỤ́ WORLDWATCH INSTITUTE.
▪ Otu ìgwè ndị na-arụ n’ụlọ ọrụ Tokyo Institute of Technology arụpụtala otu ụgbọelu na-ebu mmadụ nke ịdị arụ ya na-eruchaghị kilogram 55, bụ́ nke nanị batrị redio na-enye ike. Ha anyarakwala ya felie elu n’enweghị nsogbu. Ụgbọelu ahụ fere mita 391 n’ime sekọnd 59.—AKWỤKWỌ AKỤKỌ BỤ́ MAINICHI DAILY NEWS, JAPAN.
▪ E nwere ụdị kamera a na-ejikọta n’Intanet nke na-eme ka ị na-ahụ onye gị na ya na-akparịta ụka n’Intanet, onye ahụ ana-ahụkwa gị. Ụfọdụ ndị ntorobịa dị site n’afọ 12 ruo afọ 20 na Netherlands na-eji kọmputa ndị nwere ụdị kamera ahụ achọ ihe n’Intanet. Mmadụ abụọ n’ime ụmụ nwoke ise ọ bụla gatụrụla n’ebe ndị Bekee sị na ọ bụ “profile site” n’Intanet nakwa ihe karịrị ọkara nke ụmụ nwanyị ndị gatụrụla ya, kwuru na a gwatụla ha ka ha yipụ uwe ha ma ọ bụ mee ihe ụfọdụ metụtara mmekọahụ n’ihu kọmputa ahụ.”—RUTGERS NISSO GROEP, NETHERLANDS.
Egwuregwu Vidio Ọ̀ Pụrụ Iri Mmadụ Ahụ́?
“Ụbụrụ isi ndị na-egwubiga egwuregwu kọmputa ókè na-arụ ọrụ otú nke ndị aṅụrụma na nke ndị ọgwụ ike ririla ahụ́ si arụ.” Ihe a ka ọkà n’akparamàgwà mmadụ bụ́ Ralf Thalemann, bụ́ onyeisi nke otu òtù na-eme nnyocha banyere ihe ndị na-eri ahụ́ n’ụlọ ọgwụ Charité University Hospital, nke dị na Berlin, Germany, kwuru. E kweere na ụdị mkpali onye na-egwubiga egwuregwu kọmputa ókè na-enwe pụrụ ime ka ụbụrụ ya nwetawakwuo mmiri ọgwụ ahụ́ ndị Bekee na-akpọ dopamine, bụ́ nke na-eme ka ọ́ dị onye ahụ ka ahụ́ ọdịka ya mma. Nke a pụkwara imesị mee ka egwuregwu ahụ “rie ya ahụ́.” Otu nnyocha e mere gosiri na nke a nwere ike ime ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ iri nke ndị na-egwu egwuregwu vidio.
Ndị Ọgaranya Na-abụkarị Ndị ‘Ahụ́ Na-erughị Ala na Ndị Na-echegbu Onwe Ha’
“Ahụ́ adịghị eru ndị aka ji akụ̀ ala, ha na-echegbukwa onwe ha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ China Daily, nke a na-ebipụta na Beijing, kwuru. E ji ndị si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na n’Ebe Ọdịda Anyanwụ China, bụ́ ndị nwere, ọ dịkarịa ala, ijeri abụọ na nari nde abụọ nke ego ndị China a na-akpọ yuan (narị nde dọla abụọ na iri nde asaa na ise), mee nnyocha. Ndị mere nchọpụta ahụ, bụ́ ndị nyochara ‘àgwà ndị ọgaranya na-enwe n’ebe alụmdi na nwunye, ndụ, ọrụ na ego dị,’ chọpụtara na “ihe ka ọtụtụ ná ndị bụ́ aka ji akụ̀ hụrụ ego n’anya ma kpọọ ya asị n’otu mgbe ahụ.” Ọtụtụ n’ime ndị zara ajụjụ a jụrụ ha mgbe a na-eme nnyocha ahụ kwuru na e wezụga ime ka ha nweta ọkwá ukwu na obi ụtọ n’ihi ihe ndị ha rụzuru, “ihe bụ́ isi ego merela ka ha nweta bụ obi ọjọọ.”
Ọrụ Ugbo Na-adị Ndị Nwere Nsogbu Ụbụrụ Mma n’Ahụ́
Ihe karịrị 100 ndị ọkachamara si mba 14 zukọrọ na nso nso a n’obodo Stavanger, nke dị na Norway, iji mụta banyere Green Care, nke bụ́ ụdị ọrụ jikọtara ma ọrụ ugbo, ma ọrụ nkụzi, ma ọrụ ilekọta ahụ́ ike. Dị ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ NRK si kọọ, ọ dịghịzi mkpa ịkpọga ụfọdụ ndị nọrọla na-arịa ọrịa ụbụrụ ruo ọtụtụ afọ n’ụlọ ọgwụ ma ha malite ịrụ ọrụ ugbo. Ọ na-eme ka “ahụ́ na ụbụrụ dị mmadụ mma.” Ihe karịrị narị ụlọ ọrụ isii na-arụ ọrụ ugbo na Norway na-akwado atụmatụ Green Care, bụ́ nke a na-akwụkwu ha ụgwọ maka ya.
Otu Ihe E Jizi Tọwa Chọọchị Eme
“Chọọchị ndị dị na New England [nke dị na United States] achọpụtala ihe ha ga na-eme banyere nsogbu ego ha na-enwe: ya bụ, ikwe ka ụlọ ọrụ ekwe ntị ndị na-achọ ebe ha ga-akwụnye satellite ha kwụnye ya n’ọmarịcha tọwa chọọchị ha,” ka magazin bụ́ Newsweek kwuru. N’ihi iwu gọọmenti tiri ka a ghara ime ihe ọ bụla n’ebe ndị e debere iche maka obibi, a hụghịzi ebe a ga-egwunye tọwa ndị a na-akwụnye ígwè satellite ndị ga na-enweta ma na-ezipụ ozi site n’ekwe ntị. Ndị bi n’ebe ndị ahụ anaghịkwa achọ iji anya ahụ tọwa ndị ahụ jọrọ njọ ile anya n’akụkụ ụlọ ha. N’ihi ya, ụlọ ọrụ ekwe ntị na-ezobanye satellite ha n’ime tọwa chọọchị. Onyeisi oche nke otu ụlọ ọrụ na-enyere chọọchị aka kwuru, sị: “Na chọọchị mbụ anyị kwụnyere satellite a, a kwụnyela ya satellite atọ, chọọchị a na-enwetakwa iri puku dọla asaa na puku anọ kwa afọ maka tọwa ọ [na-enwebughị] ihe e ji ya eme.”